Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ha Na-ekwu Banyere Ịdị Mma Na Ịhụnanya’

‘Ha Na-ekwu Banyere Ịdị Mma Na Ịhụnanya’

‘Ha Na-ekwu Banyere Ịdị Mma Na Ịhụnanya’

N’AFỌ ndị na-adịbeghị anya, e kwutọwo Ndịàmà Jehova nọ na France n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Ndị na-emegide ha ejiriwo okwu ndị na-abụchaghị eziokwu na ihe ọmụma na-ezighị ezi mee ihe iji mebie aha ha n’ebe ọha na eze nọ. Ná mmalite 1999, Ndịàmà Jehova nọ na France nile kesara nde 12 nke traktị bụ́ People of France, You Are Being Deceived! (Ndị France, A Na-aghọgbu Unu!) Na traktị a, ha katọrọ okwu ndị ahụ e kwuru iji mebie aha ha.

Ụbọchị ole na ole mgbe mkpọsa ahụ gasịrị, Maazị Jean Bonhomme, bụ́ dọkịta, bụrụkwa onye sobu ná Nzukọ Ndị Isi, zigaara otu ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ n’ógbè ya otu akwụkwọ ozi ọ chọrọ ka ọha na eze gụọ. O dere, sị: “Ndịàmà Jehova na-abịa n’ụlọ m site n’oge ruo n’oge. Ha na-abịa agwa m banyere ịdị mma na ịhụnanya ga-ejupụta ebe nile. . . . Ha adịghị abata n’ike. Ha na-eji nwayọọ akọwa onwe ha, na-ejikwa obiọma ege ntị n’arụmụka m.”

N’ikwu banyere otú Ndịàmà Jehova si ele ihe anya n’ụzọ ime mmụọ, Maazị Bonhomme kwuru, sị: “Ha ịbụ ndị na-awaghị anya n’ụzọ ụwa adịtụghị nnọọ ihe ọ pụrụ imebi. N’aka nke ọzọ, awaghị anya n’ụzọ ụwa nke ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ nnọọ ihe na-eyi udo nke ụmụ amaala na ịdị n’otu nke ọha na eze egwu.”