Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-akwụghachi Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ihe Ụgwọ Mgbe Nile

Jehova Na-akwụghachi Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ihe Ụgwọ Mgbe Nile

Akụkọ Ndụ

Jehova Na-akwụghachi Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ihe Ụgwọ Mgbe Nile

DỊ KA VERNON DUNCOMBE SI KỌỌ

Atasịrị m mgbadume anyasị m ma mụnye siga dị ka m na-emekarị. Mgbe ahụ, ajụrụ m nwunye m, bụ́ Aileen, sị: “Olee otú nzukọ si gaa n’anyasị a?”

Ọ GGBATỤRỤ nkịtị ma kwuo, sị: “A gụrụ otu akwụkwọ ozi nke kwupụtara nhọpụta ndị ọhụrụ e mere, a kpọkwara aha gị. Ị gaje ịbụ onye na-ahụ maka ígwè okwu. Ahịrịokwu ikpeazụ dị n’akwụkwọ ozi ahụ gụrụ, sị: ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnna a a họpụtara ọhụrụ na-eji ụtaba eme ihe, iwu ji ya idere Society akwụkwọ iji gwa ha na ya apụghị ịnakwere ọrụ ahụ.’” * Ejisiri m ike zaghachi n’obi ike, sị, “Mmm-mm-m! Ya bụ, ihe ahụ ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.”

Atachiri m ezé ma sọnyụọ siga ahụ n’efere ntụ siga dị m n’akụkụ. “Amaghị m ihe mere e ji họpụta m maka ọrụ a. Ma ajụtụbeghị m nke ọ bụla, achọghịkwa m ịmalite jụwa.” Ekpebiri m na agaghị m ese siga ọzọ. Mkpebi ahụ metụtara ndụ m n’ụzọ dị ukwuu dị ka onye Kraịst na onye na-akụ egwú. Ka m kọọrọ unu ihe ụfọdụ dugara ná mkpebi m ahụ.

Mmalite nke Ndụ Ezinụlọ

A mụrụ m na Toronto, Canada, na September 21, 1914, abụkwa m nwa mbụ nke nne na nna na-arụsi ọrụ ike ma na-ahụ n’anya, bụ́ Vernon na Lila, ndị na-azụ ụmụ okoro anọ na ụmụ agbọghọ abụọ. Onye na-eso m n’afọ ndụ bụ Yorke, e mesịa mụọ Orlando, mụọ Douglas, mụọ Aileen, bịa mụzie Coral. Mgbe m gbara nanị afọ itoolu, nne m nyere m violin ma mee ndokwa ka m mụọ egwú n’Ụlọ Akwụkwọ Egwú nke Harris. Ihe siri ike, ma nne na nna m chọtara ụzọ ha si na-akwụrụ m ụgwọ tagzi na ụgwọ akwụkwọ. E mesịa, amụrụ m banyere ụkpụrụ ndị dị n’egwú na otú e si akụ egwú na Royal Conservatory of Music nke dị na Toronto, mgbe m gbakwara afọ 12, esonyere m n’asọmpi ịgụgharị egwú nke ndị si n’akụkụ nile nke obodo ahụ mere n’Ụlọ Ezumezu Massey, bụ́ ụlọ mgbakọ mara mma a na-anọ akụ egwú n’ebe ndịda obodo ahụ. A họpụtara m dị ka onye meririnụ, e nyekwara m violin mara mma nke e ji akpụkpọ agụ iyi mee ọ́bọ́ ya.

Ka oge na-aga, amụtakwara m ịkpọ piano na violin na-azụ gbim gbim. Mgbe mgbe, anyị na-akpọ egwú n’ìgwè ná nnọkọ oriri ndị dị obere n’uhuruchi Friday na Saturday nakwa ná nnọkọ ite egwú ụmụ akwụkwọ. Ọ bụ n’otu n’ime nnọkọ ite egwú a ka m zutere Aileen na nke mbụ ya. N’afọ ikpeazụ m na kọleji, eso m ọtụtụ ìgwè ndị egwú kụọ egwú n’obodo ahụ dum. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, a kpọrọ m òkù isonyere Ìgwè Ndị Egwú Ferde Mowry, ọ ghọrọ ọrụ na-enye ezigbo ego ma dịtee aka ruo 1943.

Ịmara Jehova

Nne na nna m nụrụ eziokwu Bible na nke mbụ ya kpọmkwem tupu ntiwapụ nke Agha Ụwa Mbụ, bụ́ mgbe nna m na-arụ ọrụ dị ka onye na-akpọpụta ngwá ahịa n’otu nnukwu ụlọ ahịa dị n’ebe ndịda obodo Toronto. N’ọnụ ụlọ a na-eri nri ehihie, ọ na-ege ntị n’ihe ndị ọrụ abụọ ndị ọzọ, bụ́ ndị Mmụta Bible (dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ), na-ekwurịta, e mesịzie, ọ na-akọrọ nne m ihe ọ nụrụ ma ya lọta n’ụlọ n’anyasị. Afọ ụfọdụ mgbe e mesịrị, na 1927, Ndị Mmụta Bible ahụ nwere otu nnukwu mgbakọ na Toronto n’Ụlọ Egwuregwu nke dị n’Ogige Ihe Ngosi nke Mba Canada. E nyere mmadụ 25 si Ohio, U.S.A., ụlọ n’ụlọ anyị, bụ́ nke a ga-agafe ụlọ abụọ tupu e rute ya ma ọ bụrụ na e site n’ọnụ ụzọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke e si aba n’ogige ihe ngosi ahụ.

Mgbe nke ahụ gasịrị, otu n’ime Ndị Mmụta Bible ahụ, bụ́ Ada Bletsoe, malitere ịkpọtụrụ nne m ugboro ugboro, na-ahapụrụ ya akwụkwọ ndị kasị ọhụrụ. Otu ụbọchị, o kwuru, sị: “Odoziakụ Duncombe, anọwo m na-ahapụrụ gị akwụkwọ ruo oge ụfọdụ. Ị̀ gụtụwo nke ọ bụla n’ime ha?” N’agbanyeghị na nne m na-azụ ụmụ isii, o kpebiri ịmalite ịgụ magazin ndị ahụ site n’oge ahụ gawa, ọ kwụsịghịkwa ma ọlị. Otú ọ dị, adịghị m elebachara akwụkwọ ndị ahụ anya. Ana m agbalị ịgụsị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ, emikpukwara m onwe m n’egwú.

Na June 1935, mụ na Aileen lụrụ n’otu chọọchị Anglịkan. Kemgbe m hapụrụ United Church n’oge m dị afọ 13, ọ dịghị okpukpe ọzọ m na-ekpe; ya mere edebara m aha n’akwụkwọ ndekọ alụmdi na nwunye dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ bụ ezie na abụbeghị m Onyeàmà.

Anyị nwere atụmanya ịzụlite ezinụlọ n’ọdịnihu ma nwee ọchịchọ ịbụ ezi nne na nna. N’ihi ya, anyị malitere ịgụkọ Agba Ọhụrụ ọnụ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ezi ebumnobi anyị, ihe ndị ọzọ wetara ihe mgbochi. Anyị gbalịrị ọzọ nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, otu ihe ahụ mekwara. Mgbe e mesịrị, anyị nwetara onyinye nke akwụkwọ a fụchiri afụchi bụ́ nke aha ya bụ The Harp of God, maka Krismas e mere na 1935. Nwunye m kwuru, sị: “Haa, onyinye Krismas a nne gị ziteere anyị dịkwa egwu.” Ka o sina dị, mgbe m gara ọrụ, ọ malitere ịgụ ya, ihe ọ gụrụ masịkwara ya. Ruo nnọọ oge ụfọdụ, amaghị m ihe ọ bụla banyere ya. Atụmanya anyị nke ịzụlite ezinụlọ emezughịkwa. Nwa nwanyị anyị mụrụ na February 1, 1937, nwụrụ. Lee iru újú miri emi anyị nwere!

N’oge a, ndị òtù ezinụlọ m nọ na-ekerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa ahụ, anụkwara m na ọ bụ nanị papa m bụ onye nkwusa Alaeze nọ n’ezinụlọ anyị nke na-enyefebeghị ụtụ Consolation (nke bụ́ Teta! ugbu a). Nke a bụ ihe mgbaru ọsọ ozi ubi n’ọnwa ahụ. N’agbanyeghị na m agụtụbeghị akwụkwọ ọ bụla Society bipụtara, ọnọdụ ya wutere m m wee kwuo, sị: “Ọ dị mma, Papa, natara m ụtụ; ka i wee dịkwanụ ka ndị ọzọ.” Oge okpomọkụ ruru, ìgwè ndị egwú ahụ sikwa n’obodo ahụ pụọ iji tie egwú n’otu ogige ntụrụndụ. Magazin Consolation ahụ sikwa na post ọfịs na-abịa. Oge mgbụsị akwụkwọ ruru, ìgwè ndị egwú ahụ alaghachikwa na Toronto. Magazin ndị ahụ nọgidere na-abịa n’adres ọhụrụ anyị, ewepụtabeghịdị m otu n’ime ha n’ihe e ji fụchie ya.

N’otu oge ezumike Krismas, elere m anya n’ùkwù magazin ahụ ma kwubie na ọ bụrụ na m kwụrụ ụgwọ ihe ndị a, ekwesịrị m ịgụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ n’ime ha iji mara ihe ha na-ekwu. Nke mbụ m meghere wụrụ m akpata oyi n’ahụ. Ọ na-ekpughe aghụghọ na nrụrụ aka nke oge a. Amalitere m ịgwa ndị egwú ibe m ihe m na-agụta. Otú ọ dị, ha mara ịbụ eziokwu nke ihe m na-ekwu aka, aghaghịkwa m ịnọgide na-agụ iji zọọ onwe m. N’amaghị ama, amalitewo m ịgba àmà banyere Jehova. Kemgbe ahụ kwa, ọ dịtụbeghị mgbe m kwụsịrị ịgụ akwụkwọ ndị magburu onwe ha e ji amụ Bible bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ebipụta.—Matiu 24:45.

Ọ bụ ezie na ọrụ mere ka m ghara inwe ohere n’ime izu, n’oge na-adịghị anya, mụ na Aileen nọ na-aga nzukọ ndị a na-enwe n’ụbọchị Sunday. Mgbe anyị bịarutere maka nzukọ n’otu Sunday na 1938, ụmụnna nwanyị abụọ mere agadi kelere anyị, otu kwuru, sị: “Nwanna nwoke na-eto eto, ị̀ kwụrụwokwa n’akụkụ Jehova? Ị manụ na Amagedọn dị ezi nso!” Amaara m na Jehova bụ nanị ezi Chineke ahụ, ekwenyesikwara m ike na nke a bụ nzukọ ya. Achọrọ m iso na ya, ya mere n’October 15, 1938, e mere m baptism. E mere Aileen baptism ihe dị ka ọnwa isii mgbe e mesịrị. Obi dị m ụtọ ikwu na ndị òtù ezinụlọ m nile ghọchara ndị ohu Jehova raara onwe ha nye.

Lee obi ụtọ m nwetara site n’iso ndị Chineke na-akpakọrịta! N’oge na-adịghị anya, ahụ ruru m ala n’etiti ha. Mgbe m na-enweghị ike ịga nzukọ, ọ na-agụsikarị m agụụ ike ịmara ihe mere ná nzukọ. Anyasị ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite ghọrọ oge oké mgbanwe n’ozi m na-ejere Jehova.

Oge Anyị Mere Oké Mgbanwe

Mgbanwe ọzọ pụtara ìhè weere ọnọdụ n’ebe anyị nọ na May 1, 1943. Anyị agawo mgbakọ mbụ anyị bụ́ isi, Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Ụwa Ọhụrụ nke e mere na Cleveland, Ohio na September 1942. N’ebe ahụ, ka agha ụwa dị egwu, bụ́ agha a na-amaghị mgbe ọ ga-akwụsị, nọ na-akpọtụ, anyị nụrụ ka Nwanna Knorr, bụ́ onyeisi oche Watch Tower Society mgbe ahụ, ji obi ike na-ekwu okwu ihu ọha na-akpali akpali, bụ́ “Udo—Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide?” Anyị na-echeta nke ọma otú o si jiri Mkpughe isi nke 17 gosipụta na a ga-enwe udo mgbe agha ahụ gasịrị bụ́ mgbe a ga-arụ ọrụ nkwusa dị ukwuu.

Ihe metụtara anyị karịsịa bụ okwu Nwanna Knorr bu ụzọ kwuo, “Jefta na Nkwa Ya.” A rịọziri maka inwekwu ndị ọsụ ụzọ! Mụ na Aileen lerịtara onwe anyị anya ma kwuo n’otu mgbe (tinyere ọtụtụ ndị ọzọ n’oge ahụ), sị: “Anyị ga-abụ!” Anyị malitere ime atụmatụ ozugbo ịmalite ọrụ ka mkpa.

A machibidowo ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Canada kemgbe July 4, 1940. Mgbe anyị malitere ịsụ ụzọ na May 1, 1943, ọ ka megidere iwu bụ́ ịgba àmà banyere Jehova na inyefe akwụkwọ Society n’ozi ubi. Ka anyị na-eje ozi dị ka ndị Kraịst, anyị na-eji nanị nsụgharị Bible King James nke aka anyị. Nanị n’ụbọchị ole na ole mgbe anyị rutesịrị ebe mbụ e kenyere anyị ịsụ ụzọ na Parry Sound, Ontario, alaka ụlọ ọrụ zitere Stewart Mann, bụ́ onye ọsụ ụzọ nwere ahụmahụ, iso anyị rụọ ọrụ n’ubi. Lee ndokwa ịhụnanya nke a bụ! Nwanna Mann nwere àgwà na-adọrọ mmasị, ihu ya na-abụkwa ọchị ọchị. Anyị mụtara ihe n’aka ya, anyị na ya nọkọkwara nke ọma. Anyị nọ na-eduzi ọtụtụ ọmụmụ Bible mgbe Society kenyegharịrị anyị ọrụ n’obodo Hamilton. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, e debara aha m n’usuu ndị agha n’agbanyeghị na etofeela m ịga agha. Ọjụjụ m jụrụ isonye n’usuu ndị agha mere ka e jide m na December 31, 1943. Mgbe a gbasosịrị usoro ụlọikpe, a mara m ikpe ịnọ n’ogige a na-eje ozi nkịtị, bụ́ ebe m nọrọ ruo August 1945.

Mgbe a tọhapụrụ m, e kenyere mụ na Aileen ọrụ ịsụ ụzọ bụ́ nke dugara anyị na Cornwall, Ontario. Nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, Ngalaba Okwu Ikpe nke Society zigara anyị Quebec ịga rụọ ọrụ pụrụ iche n’ụlọikpe majie. Nke a bụ n’oge Duplessis chịrị Quebec bụ́ mgbe mkpagbu a kpagburu Ndịàmà Jehova kpụ ọkụ n’ọnụ. Ọtụtụ ụbọchị kwa izu, ana m ahụ onwe m n’ụlọikpe anọ dịgasị iche, na-enyere ụmụnna anyị aka. Oge ndị ahụ bụ ndị na-akpali akpali ma na-ewusi okwukwe ike.

Mgbe mgbakọ e nwere na Cleveland na 1946 gasịrị, anyị nwetara ọrụ sekit na nke distrikti bụ́ ndị duuru mụ na nwunye m site n’otu ụsọ oké osimiri gaa n’ọzọ. Ihe nọ na-eme ngwa ngwa. Na 1948, a kpọrọ anyị ịga klas nke 11 nke Watchtower Bible School of Gilead. Nwanna Albert Schroeder na Nwanna Maxwell Friend bụ mmadụ abụọ n’ime ndị nkụzi anyị, ndị e tere mmanụ 40 sokwa na klas anyị, bụ́ nke ụmụ akwụkwọ 108 mejupụtara. N’inwe ọtụtụ ndị jewooro Jehova ozi ruo ogologo oge nọ na ya, ọ bụ ahụmahụ na-ewuli elu na nke na-akwụghachi ụgwọ n’ezie!

Otu ụbọchị, Nwanna Knorr si na Brooklyn leta anyị. N’okwu ya, ọ kpọrọ òkù maka ndị ozi afọ ofufo 25 ga-amụ asụsụ Japanese. Anyị mmadụ 108 nile ahụ wepụtachara onwe anyị! Ọ dịziiri onyeisi oche ahụ n’aka ịhọpụta ndị a ga-akụziri ya. Echere m na Jehova duziri nhọpụta ahụ n’ihi na ọ gara nnọọ nke ọma. Ọtụtụ n’ime mmadụ 25 ahụ a họpụtara bụ́kwa ndị nweziri ihe ùgwù nke ịmalite ọrụ ahụ na Japan ka nọ n’ọrụ ha—n’ezie ha emewo agadi, ma ha ka nọ ebe ahụ. E kenyegharịrị ụfọdụ n’ime ha, dị ka Lloyd na Melba Barry, ọrụ ndị ọzọ. Lloyd so n’Òtù Na-achi Isi ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ gara aga. Anyị so ha nile aṅụrị ọṅụ n’ụgwọ ọrụ Jehova nyeworo ha.

Ụbọchị ngụsị akwụkwọ anyị ruru, e kenyekwara anyị ọrụ na Jamaica. Otú ọ dị, n’ihi oge ndị e yiri anyị ka ga-aga ụlọikpe na Quebec, e nyere anyị ntụziaka ịlaghachi Canada.

Ịkụkwu Egwú!

Ọ bụ ezie na m hapụrụ egwú maka ịsụ ụzọ, o yiri ka egwú ahapụghị m. N’afọ sochirinụ, onyeisi oche Society, bụ́ Nathan Knorr, na odeakwụkwọ ya, bụ́ Milton Henschel, bịara na Maple Leaf Gardens nke dị na Toronto. Okwu ihu ọha Nwanna Knorr kwuru nke isiokwu ya bụ “Ọ Dị Nso Karịa Ka Unu Chere!” kpaliri mmasị mmadụ nile. Na nke mbụ ya, a kpọrọ m ilekọta ìgwè ndị egwú nke mgbakọ ahụ. Anyị haziri ụdị egwú walzt maka ụfọdụ n’ime abụ ndị a ma ama dị n’akwụkwọ abụ bụ́ Kingdom Service Song Book (1944). O yiri ka ọ̀ masịrị ụmụnna. Mgbe ihe omume ahụ mechiri n’ehihie Saturday, anyị mụgharịrị ihe omume ndị e mere atụmatụ na anyị ga-eme na Sunday. Ahụpeere m Nwanna Henschel ka ọ na-agafeta n’ebe ahụ, akwụsịrị m ìgwè ndị egwú ahụ iji nwee ike ije zute ya. Ọ jụrụ, sị, “Ndị egwú ole ka i nwere n’ìgwè ndị egwú gị n’ebe a?” “Mgbe ha nile nọcha ya, ha na-adị ihe dị ka 35,” ka m zara. “Ị ga-enwe ọnụ ọgụgụ ahụ okpukpu abụọ na New York n’oge okpomọkụ ọzọ,” ka ọ zaghachiri.

Otú ọ dị, tupu oge okpomọkụ ahụ eruo, a kpọrọ m na Brooklyn. N’ihi ọnọdụ ndị dịnụ, na mbụ, Aileen enweghị ike iso m jee. A rụchabeghị ụlọ ọhụrụ ahụ dị na 124 Columbia Heights, ya mere e nyere m ihe ndina n’ụlọ mbụ ahụ, n’otu ọnụ ụlọ nta nke ụmụnna nwoke abụọ e tere mmanụ bi—Nwanna Payne bụ́ onye meworo agadi na Karl Klein, bụ́ onye m na-ezute na nke mbụ ya ugbu a. Mmadụ ọ̀ dị ọtụtụ karịa ka o kwesịrị n’ụlọ ahụ? Ee. Otu o sina dị, anyị nọgidere na-emekọrịta ihe n’ụzọ dị nnọọ mma. Ụmụnna ndị ahụ ka mee agadi nwere ogologo ntachi obi na ndidi. Agbalịrị m nnọọ ịghara ịdị na-anọchi ụzọ! Ọ bụ ihe mmụta dị mma banyere ihe mmụọ nsọ Chineke pụrụ ịrụzu. Izute na iso Nwanna Klein rụọ ọrụ wetaara m nnọọ ngọzi! Ọ dị obiọma ma na-enye aka mgbe nile. Anyị rụkọrọ ọrụ nke ọma, anyị anọgidewokwa na-abụ ezi ndị enyi ruo ihe karịrị afọ 50.

Ọ bụụrụ m ihe ùgwù inye aka n’egwú ndị a kụrụ ná mgbakọ ndị e nwere n’Ámá Egwuregwu Yankee na 1950, 1953, 1955, na 1958, nakwa iso Al Kavelin kere òkè n’ịhụ maka ìgwè ndị egwú ná mgbakọ e nwere n’ámá egwuregwu Rose Bowl dị na Pasadena, California, na 1963. Ná mgbakọ ahụ e nwere n’Ámá Egwuregwu Yankee na 1953, a kụrụ egwú na Sunday tupu okwu ihu ọha. Erich Frost kpọbatara Edith Shemionik (nke mesịziri bụrụ Weigand), Soprano, bụ́ onye bụrụ abụ o dekọrọ bụ́ “Gaanụ n’Ihu, Unu Ndịàmà!” ka ìgwè ndị egwú anyị na-akụrụ ya ngwá egwú. Mgbe ahụ, a kpaliri mmasị anyị ka anyị nụrụ, na nke mbụ ya, olu ụtọ nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị si Africa. Onye ozi ala ọzọ bụ́ Harry Arnott si n’Ebe Ugwu Rhodesia (nke bụ́ Zambia ugbu a) weta tepụ a gụnyere abụ ka anyị gere. Olu abụ ahụ jupụtara n’ámá egwuregwu ahụ dum.

Ịgụnye Abụ Dị n’Akwụkwọ Abụ 1966 na Tepụ

Ì chetara akwụkwọ abụ ahụ na-acha pinki pinki ma nwee azụ na-esighi ike, bụ́ “Na-abụnụ Abụ, Na-ekwekwanụ Ukwe n’Ime Obi Unu”? Mgbe odide nke akwụkwọ abụ ahụ (n’asụsụ Bekee) na-eru ná njedebe ya, Nwanna Knorr kwuru, sị: “Anyị na-aga ịgụnye egwú ụfọdụ na tepụ. Achọrọ m ka ị kpọkọta obere ìgwè ndị egwú, ka ha jiri nanị violin na ọjà ole na ole mee ihe. Achọghị m ka onye ọ bụla ‘fụwa opi!” Ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị na Betel ka anyị ga-anọ kụọ egwú ahụ, ma e nwere ihe ụfọdụ na-echegbu anyị banyere iji ebe ahụ mee ihe. Olee ihe a ga-eme ụda ndị na-adaghasị adaghasị n’ihi ahụ ájá a na-egechighị ákwà, ala ndị e ji tile mee, na oche mpịachi ndị e ji ígwè rụọ? Ònye pụrụ inyere anyị aka idozi nsogbu nke ụda ndị na-adakọghị adakọ? Otu onye tụrụ aro, sị: “Tommy Mitchell! Ọ na-arụ ọrụ na ABC Network Studios.” Anyị kpọtụụrụ Nwanna Mitchell, bụ́ onye nwere obi ụtọ inye aka.

Ụtụtụ Saturday mbụ ahụ a ga-agụnye abụ na tepụ ruru, ka a na-akpọpụtakwa ndị egwú ahụ, otu n’ime ụmụnna ahụ bu igbe opi trombone. Echetara m ịdọ aka ná ntị Nwanna Knorr: “Achọghị m ka onye ọ bụla ‘fụwa opi’!” Ugbu a, gịnị ka m pụrụ ime? Anọ m na-ele anya ka nwanna ahụ wepụtara opi trombone ahụ n’igbe ya, kwadebe ya ma jikerewa. Nwanna ahụ bụ Tom Mitchell, ahịrị ndị mbụ ọ fụrụ dị ụtọ. O mere ka opi trombone ahụ daa ka violin! Echere m sị, ‘nwanna a aghaghị iso!’ Nwanna Knorr ajụghịkwa ma ọlị.

N’ime ìgwè ndị egwú ahụ, anyị nwere ìgwè ndị maara egwú eti bụkwa ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-ahụ n’anya. E nweghị ndị na-eme aghara na ya! Ịgụnye ihe na tepụ bụ ọrụ siri ike, ma e nweghị onye mere mkpesa. Mgbe a rụsịrị ọrụ ahụ, anyị bere ákwá mgbe anyị bịara ịhapụ ibe anyị, e nwekwara mmetụta siri ike nke ọbụbụenyi n’etiti ndị keere òkè. Onye ọ bụla n’ime anyị nụrụ ụtọ ihe ùgwù ahụ, sitekwa n’enyemaka Jehova, anyị rụchara ọrụ ahụ.

Ihe Ùgwù Ndị Ọzọ Na-akwụghachi Ụgwọ

Mgbe ọtụtụ afọ gasịworo, anọgidere m na-eje ozi oge nile. Arụwo m ọrụ sekit na distrikt afọ 28—anụrụ m ụtọ nke ọ bụla n’ime ha. Afọ ise nke ilekọta Ụlọ Mgbakọ Norval dị na Ontario, sochiri. Mụ na Aileen na-eji ọrụ n’aka mgbe nile ebe ọ bụ na a na-enwe mgbakọ sekit ná ngwụsị izu nile nakwa mgbakọ distrikti n’asụsụ ndị mba ọzọ. Na 1979 na 1980, ndị na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ na ndị injinịa ji ihe owuwu ndị dị n’Ụlọ Mgbakọ ahụ mee ihe mgbe ha na-atụpụta ụkpụrụ nke alaka ụlọ ọrụ Society a ga-arụ na Halton Hills. Mgbe anyị rụchara ọrụ n’Ụlọ Mgbakọ ahụ, anyị nwetara ọrụ ọzọ nke dugara m n’ikerekwu òkè n’egwú na Brooklyn, site 1982 ruo 1984.

Ezigbo nwunye m m hụrụ n’anya nwụrụ na June 17, 1994, nanị ụbọchị asaa mgbe anyị mesịrị ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ nke 59 anyị. Anyị ejiwo obi anyị dum sụkọọ ụzọ ọnụ ruo afọ 51.

Ka m na-atụgharị uche n’ọtụtụ ahụmahụ ndị m nwere ná ndụ, ana m echeta otú Bible siworo bụụrụ m ihe nduzi dị oké ọnụ ahịa. Mgbe ụfọdụ, ana m eji Bible Aileen na-eme ihe, ana m enwetakwa obi ụtọ dị ukwuu site n’ịrịba ihe ndị metụrụ ya n’obi ama—amaokwu dum, nkebi ahịrịokwu ụfọdụ, na okwu ndị ọ kara ihe n’okpuru ha. Dị ka ọ dị n’ebe Aileen nọ, mụ onwe m nwekwara akụkụ akwụkwọ nsọ ndị nwere ihe pụrụ iche ha pụtara nye m. Otu n’ime ha bụ Abụ Ọma nke 137, bụ́ nke na-ekwupụta ọmarịcha ekpere a nye Jehova: “Ọ bụrụ na echezọọ m gị, Jerusalem, ka m ghara inwe ike ịkpọ ụbọ akwara ọzọ ma ọlị! Ka m ghara inwe ike ịbụ abụ ọzọ ma ọlị ma ọ bụrụ na adịghị m echeta gị, ma ọ bụrụ na adịghị m eche banyere gị dị ka ihe kasị enye m ọṅụ!” (Abụ Ọma 137:5, 6, Today’s English Version) Ọ bụ ezie na m nwere mmasị n’egwú, ọṅụ m kasịnụ na-esite n’iji nguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi, bụ́ onye jiworo ndụ zuru ezu ma na-enye afọ ojuju gọzie m.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ụlọ Nche nke June 1, 1973, kọwara ihe mere o ji dị mkpa site n’oge ahụ gaa n’ihu, ka mmadụ kwụsị ise siga tupu e nwee ike ime ya baptism o wee ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova.

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na Aileen na 1947

[Foto dị na peeji nke 30]

Oge ndị mbụ anyị na-agụnye ihe na tepụ