Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-egosipụta Àgwà Nke Ichere Ihe!

Na-egosipụta Àgwà Nke Ichere Ihe!

Na-egosipụta Àgwà Nke Ichere Ihe!

“M [ga-egosipụta àgwà nke ichere] Chineke nke nzọpụta m: Chineke m ga-anụ olu m.”—MAỊKA 7:7.

1, 2. (a) Olee otú àgwà na-ezighị ezi si merụọ ụmụ Israel ahụ n’ọzara? (b) Gịnị pụrụ ime onye Kraịst nke na-adịghị azụlite àgwà kwesịrị ekwesị?

ANYỊ pụrụ ile ọtụtụ ihe ná ndụ anya ma ọ́ bụghị n’ụzọ ziri ezi ọ bụrụ n’ụzọ na-ezighị ezi, na-adabere n’àgwà anyị. Mgbe ụmụ Israel nọ n’ọzara, e nyere ha mana n’ụzọ ọrụ ebube. Ha kwesịrị ilegharịwo anya gburugburu ala ahụ ihe na-adịghị ma nwee ekele miri emi n’ebe Jehova nọ maka inye ha ihe e ji akwado ndụ. Nke ahụ gaara egosipụtawo àgwà ziri ezi. Kama nke ahụ, ha chetara ụdị nri dị iche iche dị n’Ijipt ma mee mkpesa na mana adịghị agụ agụ oriri. Lee àgwà na-ezighị ezi ọ bụ!—Ọnụ Ọgụgụ 11:4-6.

2 N’otu aka ahụ, àgwà onye Kraịst taa pụrụ ime ka ihe yie ma ọ́ bụghị ihe na-akpali akpali ọ bụrụ ihe na-akụda mmụọ. Ọ bụrụ na onye Kraịst enweghị àgwà kwesịrị ekwesị, ọṅụ ya pụrụ ifunahụ ya n’ụzọ dị mfe, nke ahụ ga-adịkwa oké njọ n’ihi na, dị ka Nehemaịa kwuru: “Ọṅụ Jehova bụ ike [anyị].” (Nehemaịa 8:10) Àgwà ziri ezi na nke ọṅụ na-enye aka ime ka anyị nọgide na-adị ike, ọ na-akwalitekwa udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ.—Ndị Rom 15:13; Ndị Filipaị 1:25.

3. Olee otú àgwà kwesịrị ekwesị si nyere Jeremaịa aka n’oge ihe siri ike?

3 Jeremaịa gosipụtara àgwà ziri ezi n’agbanyeghị na o biri ndụ n’oge ihe siri ike. Ọbụna mgbe ọ hụrụ ọdịda dị egwu nke Jerusalem na 607 T.O.A., ọ hụrụ ihe ndị dị mma. Jehova agaghị echezọ Israel, mba ahụ ga-alanarịkwa. Jeremaịa dere n’akwụkwọ Abụ Ákwá, sị: “O sitere n’ebere nile nke Jehova na e meghị ka anyị gwụsịa, n’ihi na obi ebere Ya nile agwụghị. Ha dị ọhụrụ kwa ụtụtụ; ihe hiri nne ka ikwesị ntụkwasị obi Gị bụ.” (Abụ Ákwá 3:22, 23) N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ohu Chineke ndị nọ n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ agbalịwo ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi, ọbụna nke ọṅụ.—2 Ndị Kọrint 7:4; 1 Ndị Tesalọnaịka 1:6; Jemes 1:2.

4. Àgwà dị aṅaa ka Jisọs nwere mgbe nile, oleekwa otú o si nyere ya aka?

4 Narị afọ isii mgbe Jeremaịa nwụsịrị, àgwà ziri ezi Jisọs nwere nyeere ya aka ịtachi obi. Anyị na-agụ, sị: “N’ihi ọṅụ e debere n’ihu [Jisọs, ọ tachiri obi n’osisi ịta ahụhụ] ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:2) N’agbanyeghị mmegide ma ọ bụ mkpagbu Jisọs na-aghaghị iche ihu—ọbụna ihe mgbu nke osisi ịta ahụhụ—ọ tụkwasịrị uche ya ‘n’ọṅụ e debere n’ihu Ya.’ Ọṅụ ahụ bụ ihe ùgwù nke iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta na ido aha ya nsọ nakwa atụmanya nke iwetara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi dị ukwuu n’ọdịnihu.

Zụlite Àgwà nke Ichere Ihe

5. Olee ihe atụ nke ọnọdụ ebe àgwà nke ichere ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ele ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

5 Ọ bụrụ na anyị azụlite ụzọ iche echiche yiri nke Jisọs, ọṅụ Jehova agaghị efunahụ anyị ọbụna ma ọ bụrụ na ihe adịghị emekarị dị ka nakwa n’ụzọ anyị tụrụ anya ha. Maịka onye amụma kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, n’ime Jehova ka m ga-eche nche nke ọma; m [ga-egosipụta àgwà nke ichere] Chineke nke nzọpụta m: Chineke m ga-anụ olu m.” (Maịka 7:7; Abụ Ákwá 3:21) Anyị onwe anyị kwa pụrụ igosipụta àgwà nke ichere ihe. N’ụzọ dị aṅaa? N’ọtụtụ ụzọ. Otu ihe bụ na, tinyere ihe ndị ọzọ, anyị pụrụ iche na nwanna nwere ikike ịbụisi mehiere ihe nakwa na ọ dị mkpa ka a gbazie ya ozugbo. Àgwà nke ichere ihe ga-eme ka anyị tụlee, sị, ‘Ò mehiere ihe n’ezie, ka m na-ehie ụzọ? Ọ bụrụ na o mehiere ihe, ọ̀ pụrụ ịbụ na Jehova kwere ka ihe dịgide n’ihi na o chere na onye ahụ ga-emeziwanye ihe nakwa na mgbazi siri ike agaghị adị mkpa?’

6. Olee otú àgwà nke ichere ihe ga-esi enyere onye na-alụso nsogbu onwe onye ọgụ, aka?

6 Àgwà nke ichere ihe pụrụ ịdị mkpa ma ọ bụrụ na anyị nwere nsogbu onwe onye ma ọ bụ na-alụso adịghị ike ọgụ. Gịnị ma ọ bụrụ na anyị rịọrọ maka enyemaka Jehova, ma nsogbu ahụ adịgide. Gịnịzi ka anyị ga-eme? Anyị aghaghị ịnọgide na-eme ihe ọ bụla ike kwere anyị ime iji dozie nsogbu ahụ ma nwezie okwukwe n’okwu Jisọs, bụ́: “Rịọnụ, a ga-enyekwa unu; chọọnụ, unu ga-achọtakwa; kụọnụ, a ga-emeghekwara unu.” (Luk 11:9) Nọgide na-ekpe ekpere, ma na-echere Jehova. Jehova ga-aza ekpere gị n’oge kwesịrị ekwesị nakwa n’ụzọ nke ya.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:17.

7. N’ụzọ dị aṅaa ka àgwà nke ichere ihe ga-esi enyere anyị aka n’otú anyị si ele nghọta Bible bụ́ nke a na-agbazi n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu, anya?

7 Ka amụma Bible na-emezu, a na-eme ka nghọta anyị nwere banyere Akwụkwọ Nsọ dokwuo anya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ iche na ọ dị ihe e kwesịrịla ịkọwa. Ọ bụrụ na ọ bịaghị mgbe anyị ga-achọ ka ọ bịa, ànyị na-adị njikere ichere? Cheta na Jehova lere ya anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ikpughe ‘ihe omimi nke Kraịst’ nke nta nke nta nakwa n’ime ogologo oge ruru ihe dị ka afọ 4,000. (Ndị Efesọs 3:3-6) Mgbe ahụ, ànyị nwere ihe mere anyị ga-eji hapụ inwe ndidi? Ànyị na-enwe obi abụọ ma a họpụtara ‘ohu kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche’ inye ndị Jehova “ihe e ji azụ ha n’oge ya”? (Matiu 24:45, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji anapụ onwe anyị ọṅụ nke Chineke n’ihi na a ghọtazubeghị ihe nile? Cheta na Jehova na-ekpebi mgbe ọ ga-ekpughe “izu nzuzo” ya na otú ọ ga-esi eme ya.—Emọs 3:7.

8. Olee otú ndidi Jehova siworo baara ọtụtụ ndị uru?

8 Ụfọdụ pụrụ inwe nkụda mmụọ n’ihi na ha na-eche na mgbe ha jesịrị ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ, ha nwere ike ghara ịdị ndụ hụ “ụbọchị Jehova . . . ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.” (Joel 2:30, 31) Ma, ha pụrụ inweta agbamume mgbe ha lere anya n’akụkụ ndị dị mma. Pita dụrụ ọdụ, sị: “Na-agụkwanụ ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta.” (2 Pita 3:15) Ndidi Jehova emewo ka ọtụtụ nde ndị ọzọ obi ha ziri ezi mụta eziokwu ahụ. Nke ahụ ọ́ dịghị mma? Ọzọkwa, ka Jehova na-enwekwu ndidi ruo ogologo oge, otú ahụ ka anyị na-enwekwu oge “[iwere] egwu na ịma jijiji rụpụta karịa nzọpụta nke onwe [anyị].”—Ndị Filipaị 2:12; 2 Pita 3:11, 12.

9. Ọ bụrụ na a kpaara ihe anyị pụrụ ime n’ozi Jehova ókè, olee otú àgwà nke ichere ihe pụrụ isi nyere anyị aka ịtachi obi n’ọnọdụ ahụ?

9 Àgwà nke ichere ihe na-enyere anyị aka ịghara inwe nkụda mmụọ mgbe mmegide, ọrịa, ịka nká, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ na-adọla anyị azụ n’ozi Alaeze. Jehova na-atụ anya n’aka anyị iji obi anyị dum na-ejere ya ozi. (Ndị Rom 12:1) Otú ọ dị, Ọkpara Chineke, bụ́ onye “[na-emere] onye na-enweghị ike na ogbenye ebere,” adịghị achọ n’aka anyị ihe karịrị ihe anyị pụrụ ime; Jehova adịghịkwa eme otú ahụ. (Abụ Ọma 72:13) N’ihi ya, a na-agba anyị ume ime ihe anyị pụrụ ime, na-eji ndidi echere ruo mgbe ọnọdụ ga-agbanwe—ma ọ̀ bụ n’usoro ihe a ma ọ bụ na nke gaje ịbịa. Cheta: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.”—Ndị Hibru 6:10.

10. Olee àgwà ọjọọ nke onye nwere àgwà nke ichere ihe pụrụ izere? Kọwaa.

10 Àgwà nke ichere ihe na-enyekwara anyị aka izere nganga. Ụfọdụ ndị siworo n’ezi ofufe dapụ adịghị njikere ichere. Ha pụrụ ichewo na ọ dị mkpa ime mgbanwe, ma ọ bụ ná nghọta Bible ma ọ bụ n’ihe ndị metụtara nhazi. Ma, ha aghọtaghị na mmụọ Jehova na-akwali ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche ime mgbanwe n’oge Ọ kara aka, ọ bụghị mgbe anyị pụrụ iche na nke a dị mkpa. Mgbanwe ọ bụla e mere aghaghịkwa ikwekọ n’uche Jehova, ọ bụghị n’echiche nke aka anyị. Ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwe ka àgwà nke nganga gbagọọ echiche ha ma mee ka ha sụọ ngọngọ. Ma, ọ bụrụ na ha zụlitere ụzọ iche echiche nke Kraịst, ha pụrụ ịnọgidewo na-enwe ọṅụ ma nọgide n’etiti ndị Jehova.—Ndị Filipaị 2:5-8.

11. Olee otú anyị pụrụ isi jiri oge anyị ji na-echere na-eme ihe n’ụzọ bara uru, n’ịgbaso ihe nlereanya ole ndị?

11 N’ezie, ịnọgide na-enwe àgwà nke ichere ihe apụtaghị ịdị umengwụ ma ọ bụ ịnọ nkịtị. Anyị nwere ihe ndị anyị ga-eme. Dị ka ihe atụ, ọ dị anyị mkpa imikpu onwe anyị n’ọmụmụ Bible onwe onye ma si otú a na-egosi otu oké mmasị ahụ ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi na ọbụna ndị mmụọ ozi gosipụtara n’ihe ime mmụọ. N’ikwu banyere mmasị dị otú ahụ, Pita na-ekwu, sị: “Ọ bụkwa nzọpụta nke a ka ndị amụma chọrọ, nyochaakwa ihe banyere ya, . . . ihe ọ na-agụ ndị mmụọ ozi inyocha ha.” (1 Pita 1:10-12) Ọ bụghị nanị na ọmụmụ ihe onwe onye bụ ihe anyị na-aghaghị ime kamakwa anyị aghaghị ịdị na-agachi nzukọ anya, na-ekpechikwa ekpere anya. (Jemes 4:8) Ndị na-egosipụta na ha maara mkpa ime mmụọ ha site n’iri nri ime mmụọ mgbe nile na iso ndị Kraịst ibe ha na-akpachi anya na-egosipụta na ha azụlitela ụzọ iche echiche nke Kraịst.—Matiu 5:3

Nwee Echiche Ziri Ezi

12. (a) Nnwere onwe dị aṅaa ka Adam na Iv chọrọ? (b) Gịnị siworo ná mgbaso ihe a kpọrọ mmadụ na-agbaso ụzọ Adam na Iv pụta?

12 Mgbe Chineke kere di na nwunye mbụ ahụ, o debeere onwe ya ikike nke isetịpụ ụkpụrụ nke ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 2:16, 17) Adam na Iv chọrọ inwere onwe ha pụọ ná nduzi Chineke, nke a mekwara ka e nwee ụdị ọnọdụ anyị na-ahụ gburugburu anyị taa. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Puku afọ isii nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ eri oge Adam egosipụtawo ịbụ eziokwu nke okwu Jeremaịa, bụ́: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ikweta na okwu Jeremaịa bụ eziokwu abụghị enweghị nchekwube. Ọ bụ ikwu ihe otú ọ dị. Ọ na-eme ka a mara ihe mere e ji nwee ọtụtụ narị afọ nile ahụ “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya” n’ihi na ụmụ mmadụ achịwo n’adabereghị n’ebe Chineke nọ.—Eklisiastis 8:9.

13. Echiche ziri ezi dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nwere banyere ihe ụmụ mmadụ pụrụ ịrụzu?

13 N’iburu ọnọdụ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’uche, Ndịàmà Jehova na-aghọta na a kpaara ihe a pụrụ ịrụzu n’usoro ihe dị ugbu a ókè. Àgwà ziri ezi pụrụ inye aka ichekwa ọṅụ anyị, ma ọ bụghị ihe ngwọta nye ihe nile. Ná mmalite afọ ndị 1950, otu onye ụkọchukwu bụ́ onye America bipụtara otu akwụkwọ gara ahịa nke ọma a kpọrọ The Power of Positive Thinking (Ikike nke Echiche Ziri Ezi). Akwụkwọ ahụ na-enye echiche na a pụrụ imeri ihe ka ọtụtụ n’ihe mgbochi ndị dịnụ ma ọ bụrụ na e jiri àgwà ziri ezi lebara ha anya. Echiche ziri ezi dị mma n’ezie. Ma ahụmahụ na-egosi na ihe ọmụma, nkà, ihe onwunwe, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-akpara ihe anyị n’otu n’otu pụrụ ịrụzu ókè. N’ọ̀tụ̀tụ̀ zukwara ụwa ọnụ, nsogbu ndị ahụ dị nnọọ ukwuu nye ụmụ mmadụ idozi ha n’ụzọ ga-aga nke ọma—n’agbanyeghị otú echiche ha si zie ezi!

14. Ndịàmà Jehova hà nwere àgwà nke enweghị nchekwube? Kọwaa.

14 N’ihi echiche ziri ezi ha nwere n’ihe ndị dị otú ahụ, a na-ebo Ndịàmà Jehova ebubo mgbe ụfọdụ ịbụ ndị nwere àgwà nke enweghị nchekwube. Kama nke ahụ, ha na-enwe oké mmasị ịgwa ndị mmadụ banyere Onye ọ bụ nanị ya pụrụ ime ka ọnọdụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ka mma n’ụzọ na-adịgide adịgide. Na nke a kwa, ha na-eṅomi ụzọ iche echiche nke Kraịst. (Ndị Rom 15:2) Ha na-arụsikwa ọrụ ike n’inyere ndị mmadụ aka iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta. Ha maara na n’ikpeazụ, nke a ga-arụzu ihe ọma kasịnụ.—Matiu 28:19, 20; 1 Timoti 4:16.

15. Olee otú ọrụ Ndịàmà Jehova si eme ka ndị mmadụ mewanye ezi ihe?

15 Ndịàmà Jehova adịghị eleghara nsogbu ọha na eze anya—karịsịa omume ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị bụ́ ndị na-emerụ emerụ—ndị gbara ha gburugburu. Tupu onye nwere mmasị aghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ na-eme mgbanwe, ọ na-abụkarị na ọ ghaghị imeri omume ndị riri ya ahụ bụ́ ndị na-adịghị eme Chineke obi ụtọ. (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’ụzọ dị otú a, Ndịàmà Jehova enyeworo ndị nabatara ozi ha aka imeri ịṅụbiga mmanya ókè, iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ, omume rụrụ arụ, na iri ahụ nke ịgba chaa chaa. Ndị dị otú ahụ a gbanwere n’ụzọ ka mma amụtawo igbo mkpa ezinụlọ ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị na n’ime ihe n’eziokwu. (1 Timoti 5:8) Mgbe e nyeere ndị mmadụ na ezinụlọ aka n’ụzọ dị otú a, a na-eme ka nsogbu e nwere n’ógbè belata—a na-enwe ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ, nsogbu nke ime ihe ike ezinụlọ, na ihe ndị ọzọ. Site n’ịbụ ụmụ amaala na-edebe iwu n’onwe ha nakwa site n’inyere ndị ọzọ aka ịgbanwe ndụ ha n’ụzọ ka mma, Ndịàmà Jehova na-ebelata ibu nke ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka nsogbu ọha na eze.

16. Gịnị mere Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka n’atụmatụ mgbanwe ndị ụwa?

16 Ọ̀ pụtara na Ndịàmà Jehova agbanweela ọnọdụ omume nke e nwere n’ụwa? N’afọ iri gara aga, ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà rụsiri ọrụ ike rịrị elu site n’ihe na-eruchaghị 3,800,000 ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 6,000,000. Nke ahụ bụ ịrị elu nke ihe dị ka mmadụ 2,200,000, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha kwụsịrị omume ọjọọ mgbe ha ghọrọ ndị Kraịst. Lee ọtụtụ ụzọ ibi ndụ e meziwanyeworo! Ma, ọnụ ọgụgụ a pere nnọọ mpe ma e were ya tụnyere ịrị elu e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa n’otu oge ahụ—875,000,000! Ndịàmà Jehova ahụtawo ya dị ka ihe na-enye ọṅụ inyere ndị na-anabata ozi ha aka, ọ bụ ezie na ha na-aghọta na ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime ihe a kpọrọ mmadụ ga-agbaso ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ. (Matiu 7:13, 14) Ka Ndịàmà na-echere mgbanwe ndị ka mma a ga-enwe n’ụwa nile bụ́ ndị ọ bụ nanị Chineke pụrụ iweta, ha adịghị etinye aka n’atụmatụ mgbanwe ndị ụwa, bụ́ ndị na-ejikarị ezi ebumnobi amalite ma na-ejedebe ná ndakpọ olileanya na ọbụna n’ihe ike.—2 Pita 3:13.

17. Gịnị ka Jisọs mere iji nyere ndị gbara ya gburugburu aka, ma gịnị ka ọ na-emeghị?

17 N’ịgbaso ụzọ a, Ndịàmà Jehova na-egosipụta otu obi ike ahụ Jisọs gosipụtara n’ebe Jehova nọ mgbe ọ nọ n’ụwa. Laa azụ na narị afọ mbụ, Jisọs rụrụ ọrụ ebube nke ịgwọ ọrịa. (Luk 6:17-19) Ọbụna ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. (Luk 7:11-15; 8:49-56) Ma o wepụghị nsogbu nke ọrịa ma ọ bụ merie onye iro ahụ bụ́ ọnwụ. Ọ maara na oge Chineke kara aka maka nke a erubeghị. Ebe Jisọs nwere ikike dị elu dị ka nwoke zuru okè, o yiri ka ọ̀ pụrụ imewo ihe dị ukwuu iji dozie nsogbu dị ukwuu nke ọchịchị na nke ọha na eze. O yiri ka ụfọdụ n’ime ndị ha na ya dịkọrọ ndụ hà chọrọ ka o weghara ọchịchị ma mee otú ahụ, ma Jisọs ekweghị. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ndị ahụ hụrụ ihe ịrịba ama O mere, ha sịrị, N’ezie Onye a bụ onye amụma ahụ nke na-abịa n’ụwa. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ na ha gaje ịbịa ịdọkpụrụ Ya n’ike, ka ha wee mee Ya eze, O wezụgara Onwe ya ọzọ n’ugwu nanị Ya onwe ya.”— Jọn 6:14, 15.

18. (a) Olee otú Jisọs siworo mgbe nile na-egosipụta àgwà nke ichere ihe? (b) Olee otú ọrụ Jisọs siworo gbanwee kemgbe 1914?

18 Jisọs jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’ọrụ ọha na eze kpọmkwem n’ihi na ọ maara na oge ọ ga-eweghara ike ọchịchị ma rụọ ọrụ ịgwọ ọrịa nye onye ọ bụla n’ebe ọ bụla erubeghị. Ọbụna mgbe ọ rịgosịrị n’eluigwe na-adị ndụ dị ka mmụọ na-adịghị anwụ anwụ, ọ dị njikere ichere oge Jehova kara aka tupu ya ana-eme ihe. (Abụ Ọma 110:1; Ọrụ 2:34, 35) Otú ọ dị, kemgbe ọ nọkwasịrị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze Chineke na 1914, ọ na-aga n’ihu “na-emeri, ya na ka O wee merie.” (Mkpughe 6:2; 12:10) Lee ekele anyị na-enwe ido onwe anyị n’okpuru ịchịisi ya, ebe ndị ọzọ bụ́ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst na-ahọrọ ịnọgide n’amaghị ozizi Bible ndị metụtara Alaeze ahụ!

Ichere IheỌ̀ Na-akpata Nkụda Mmụọ Ka Ọ̀ Bụ Ọṅụ?

19. Olee mgbe ichere ihe “na-eme ka obi na-arịa ọrịa,” oleekwa mgbe ọ na-enye ọṅụ?

19 Solomọn maara na ichere ihe pụrụ ịbụ ihe na-akụda mmụọ. O dere, sị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” (Ilu 13:12) N’ezie, ọ bụrụ na mmadụ na-atụ anya ihe ndị na-enweghị isi, ndakpọ olileanya pụrụ ime ka obi ya rịa ọrịa. Otú ọ dị, ichere ihe omume ndị na-enye obi ụtọ—ikekwe agbamakwụkwọ, ọmụmụ nke nwa ọhụrụ, ma ọ bụ iso ndị anyị hụrụ n’anya nọkọrịtaghachi—pụrụ ime ka anyị nwee atụmanya ọṅụ ga-adịru ogologo oge tupu ụbọchị ahụ eruo. Ọṅụ ahụ ga-adịkwu ukwuu ma ọ bụrụ na anyị ejiri oge ahụ anyị ji na-echere mee ihe n’ụzọ amamihe, na-akwadebe maka ihe omume ahụ na-abịanụ.

20. (a) Ihe omume ndị dị aṅaa dị ebube ka anyị ji obi ike na-atụ anya ịhụ? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa achọta ọṅụ ka anyị na-echere ka e mezuo nzube Jehova?

20 Mgbe anyị nwere obi ike zuru ezu na a ga-emezu atụmanya anyị—ọbụna ma ọ bụrụ na anyị amaghị mgbe a ga-emezu ha—oge ahụ anyị ji na-echere ekwesịghị ibụ nke “na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” Ndị na-efe Chineke ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi maara na Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst dị nso. Obi siri ha ike na ha ga-ahụ ọgwụgwụ nke ọnwụ na ọrịa. N’inwe atụmanya siri ike, ha ji ọṅụ na-echere oge ha ga-anabataghachi ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ, gụnyere ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. (Mkpughe 20:1-3, 6; 21:3, 4) N’oge a e metọworo mbara ụwa, ha na-enwe atụmanya e ji n’aka nke ịhụ ka e guzobere Paradaịs n’ụwa. (Aịsaịa 35:1, 2, 7) Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe amamihe iji oge anyị ji na-echere mee ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya, “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile”! (1 Ndị Kọrint 15:58) Nọgide na-eri nri ime mmụọ. Soro Jehova na-enwe mmekọrịta na-echiwanye anya. Chọọ ndị ọzọ bụ́ ndị obi ha na-akwali ijere Jehova ozi. Na-agba ndị kwere ekwe ibe gị ume. Jiri oge ọ bụla Jehova ka ga-eme ka e chere na-eme ihe n’ụzọ kasị baa uru. Mgbe ahụ, ichere Jehova agatụghị eme ka ‘obi gị rịa ọrịa.’ Kama nke ahụ, ọ ga-eme ka i jupụta n’ọṅụ!

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú Jisọs si gosipụta àgwà nke ichere ihe?

• N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka àgwà nke ichere ihe dị ndị Kraịst mkpa?

• N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji enwe afọ ojuju n’ichere Jehova?

• Olee otú a pụrụ isi mee ka ichere Jehova bụrụ ihe na-enye ọṅụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Jisọs tachiri obi n’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya

[Foto dị na peeji nke 13]

Ọbụna mgbe ọtụtụ afọ nke ije ozi gasịrị, anyị pụrụ ịnọgide na-enwe ọṅụ

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ọtụtụ nde mmadụ emeziwanyewo ndụ ha site n’ịghọ Ndịàmà Jehova