Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-egosipụta Ụzọ Iche Echiche Nke Kraịst

Na-egosipụta Ụzọ Iche Echiche Nke Kraịst

Na-egosipụta Ụzọ Iche Echiche Nke Kraịst

“Ka Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi kwe ka unu nwee n’etiti onwe unu otu ụzọ iche echiche ahụ nke Kraịst Jisọs nwere.”—NDỊ ROM 15:5, NW.

1. Olee otú àgwà mmadụ pụrụ isi metụta ndụ ya?

ÀGWÀ na-enwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ. Àgwà ọ gbasaghị m ma ọ bụ nke ịdị uchu, àgwà ziri ezi ma ọ bụ nke na-ezighị ezi, àgwà nnupụisi ma ọ bụ nke ikwenye ekwenye, àgwà ime mkpesa ma ọ bụ nke inwe ekele pụrụ inwe mmetụta siri ike n’otú mmadụ si edozi nsogbu nakwa n’otú ndị ọzọ si emeso ya ihe. Ọ bụrụ na mmadụ enwee àgwà ọma, ọ pụrụ inwe obi ụtọ ọbụna n’ọnọdụ ndị tara nnọọ akpụ. Nye onye nwere àgwà ọjọọ, ọ dịghị ihe na-eyi ka ò ziri ezi, ọbụna mgbe—ọ bụrụ na e jiri obi ziri ezi tụlee ya—ndụ na-agazi agazi.

2. Olee otú mmadụ si amụta àgwà?

2 Àgwà—ma nke ọma ma nke ọjọọ—bụ ihe a pụrụ ịmụta amụta. N’ezie, a ghaghị ịmụta ha amụta. Mgbe ọ na-ekwu banyere nwa a mụrụ ọhụrụ, akwụkwọ bụ́ Collier’s Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ọ ghaghị ịmụta àgwà ọ bụla ọ ga-emesị nwee amụta, dị nnọọ ka ọ na-aghaghị ịmụta asụsụ ma ọ bụ nkà ọ bụla ọzọ, ruo n’ókè ụfọdụ.” Olee otú anyị si amụta àgwà? Ọ bụ ezie na ọtụtụ ihe na-atụnye ụtụ, gburugburu ebe obibi na mkpakọrịta na-enwe mmetụta dị ukwuu ná ndụ mmadụ. Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ a kpọtụburu aha, na-ekwu, sị: “Anyị na-amụta ma ọ bụ na-eji nwayọọ nwayọọ amịkọrọ àgwà nke ndị anyị na ha na-akpachi anya.” Ọtụtụ puku afọ gara aga, Bible kwuru ihe yiri nke ahụ, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33.

Ihe Nṅomi Maka Àgwà Kwesịrị Ekwesị

3. Ònye setịpụrụ ihe nlereanya n’ihe banyere àgwà ya, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya?

3 Dị ka ọ dị n’ihe nile ọzọ, Jisọs Kraịst setịpụkwara ihe nṅomi kasị mma n’ihe banyere àgwà. O kwuru, sị: “Enyewo m unu ihe nṅomi, ka unu onwe unu wee na-emekwa dị ka Mụ onwe m mere unu.” (Jọn 13:15) Iji dị ka Jisọs, anyị aghaghị ibu ụzọ mụta banyere ya. * Anyị na-amụ banyere ndụ Jisọs ná nzube nke ime ihe Pita onyeozi tụrụ aro ya: “A kpọrọ unu ime nke a: n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe ilereanya, ka unu wee soo ijeụkwụ Ya nile.” (1 Pita 2:21) Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịdị ka Jisọs ruo n’ókè o kwere mee. Nke ahụ na-agụnye ịzụlite ụzọ iche echiche ya.

4, 5. Akụkụ dị aṅaa nke ụzọ iche echiche Jisọs ka e mere ka ọ pụta ìhè ná Ndị Rom 15:1-3, oleekwa otú ndị Kraịst pụrụ isi ṅomie ya?

4 Gịnị ka iche echiche n’ụzọ Kraịst Jisọs si chee na-agụnye? Isi nke 15 nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom na-enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ. N’amaokwu ole na ole ndị bu ụzọ n’isiakwụkwọ a, Pọl na-ezo aka n’àgwà pụtara ìhè nke Jisọs mgbe ọ na-ekwu, sị: “Ma anyị onwe anyị, bụ́ ndị nwere ike, anyị aghaghị ibu adịghị ike nile nke ndị na-enweghị ike, na ịghara ime ihe na-atọ onwe anyị ụtọ. Onye ọ bụla n’etiti anyị, ya mee ihe na-atọ onye agbata obi ya ụtọ iwetara ya ezi ihe, ka o wee wulie ya elu dị ka ụlọ. N’ihi na Kraịst anyị emeghịkwa ihe tọrọ Onwe ya ụtọ; kama, dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, Ịta ụta nile nke ndị na-ata Gị ụta dakwasịrị m.”—Ndị Rom 15:1-3.

5 N’iṅomi àgwà Jisọs, a na-agba ndị Kraịst ume ịdị njikere iji ịdị umeala n’obi na-egbo mkpa nke ndị ọzọ kama ịchọ ime ihe na-atọ nanị onwe ha ụtọ. N’ezie, iji obi umeala na-adị njikere ijere ndị ọzọ ozi n’ụzọ dị otú ahụ bụ ihe e ji amata ndị “nwere ike.” Jisọs, bụ́ onye dị ike n’ụzọ ime mmụọ karịa mmadụ ọ bụla nke dịworo ndụ, kwuru banyere onwe ya, sị: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Dị ka ndị Kraịst, anyị onwe anyị n’otu aka ahụ na-achọ ịga jeere ndị ọzọ ozi, gụnyere “ndị na-enweghị ike.”

6. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi ṅomie mmeghachi omume Jisọs n’ebe mmegide na nkọcha dị?

6 Àgwà ọma ọzọ Jisọs gosipụtara bụ ụzọ iche echiche na nke ime omume bụ́ ndị ziri ezi mgbe nile. O kwetụbeghị ka àgwà na-ezighị ezi nke ndị ọzọ metụta àgwà ọma ya n’ebe ijere Chineke ozi dị; anyị ekwesịghịkwa ikwe. Mgbe a kọchara ma kpagbuo Jisọs n’ihi ife Chineke ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi, o ji ndidi tachie obi n’emeghị mkpesa. Ọ maara na ndị na-agbalị ime onye agbata obi ha obi ụtọ “iwetara ya ezi ihe, ka [e] wee wulie ya elu dị ka ụlọ,” pụrụ ịtụ anya mmegide sitere n’aka ụwa nke na-ekweghị ekwe na nke na-adịghị aghọta ihe.

7. Olee otú Jisọs si gosipụta ndidi, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ime otu ihe ahụ?

7 Jisọs gosipụtara àgwà kwesịrị ekwesị n’ụzọ ndị ọzọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o gosipụtara omume enweghị ndidi n’ebe Jehova nọ kama o ji ndidi chere ka uche Ya mezuo. (Abụ Ọma 110:1; Matiu 24:36; Ọrụ 2:32-36; Ndị Hibru 10:12, 13) Ọzọkwa, Jisọs egosipụtaghị omume enweghị ndidi n’ebe ụmụazụ ya nọ. Ọ gwara ha, sị: “Mụtakwanụ ihe n’ọnụ m”; ebe ọ bụ “Onye nwayọọ,” ozizi ya bụ nke na-ewuli elu ma na-enye ume ọhụrụ. Ebe ọ bụkwa “Onye wedatara Onwe ya ala n’obi,” ọ dịtụghị mpako ma ọ bụ nganga. (Matiu 11:29) Pọl na-agba anyị ume iṅomi akụkụ ndị a nke àgwà Jisọs mgbe ọ na-ekwu, sị: “Nweenụ [ụzọ iche echiche a, NW] n’ime onwe unu, nke dịkwa n’ime Kraịst Jisọs: Onye, ọ bụ ezie na Ọ dịrị n’ụdị nke Chineke na mbụ, ma Ọ gụghị ya n’ihe Ọ ga-ejidesi ike, bụ́ ịha ka Chineke, kama O mere Onwe ya ihe efu, n’ịnara ụdị nke ohu, e wee mee Ya n’oyiyi nke mmadụ.”—Ndị Filipaị 2:5-7.

8, 9. (a) Gịnị mere anyị na-aghaghị iji rụọ ọrụ iji zụlite àgwà achọghị ọdịmma onwe onye nanị? (b) Gịnị mere anyị ekwesịghị inwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na anyị adịghị eru ihe nṅomi ahụ Jisọs hapụụrụ anyị, oleekwa otú Pọl si bụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a?

8 Ọ dị mfe ikwu na anyị chọrọ ijere ndị ọzọ ozi, chọọkwa ibute mkpa ha ụzọ tupu nke anyị. Ma anyị iji ezi obi nyochaa ụzọ iche echiche anyị pụrụ ikpughe na obi anyị adịchaghị otú ahụ. N’ihi gịnị? Nke mbụ, n’ihi na anyị eketawo àgwà nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị site n’aka Adam na Iv; nke abụọ, n’ihi na anyị bi n’ụwa nke na-akwalite ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. (Ndị Efesọs 4:17, 18) Ịzụlite àgwà nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-apụtakarị ịzụlite ụzọ iche echiche nke dị iche n’ọdịdị na-ezughị okè anyị bu pụta ụwa. Nke ahụ na-achọ mkpebi siri ike na mgbalị.

9 Ezughị okè anyị nke pụtara ìhè, bụ́ nke na-ekwekọtụghị n’ihe nṅomi zuru okè nke Jisọs hapụụrụ anyị, pụrụ ime ka anyị nwee nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ. Anyị pụrụ ọbụna inwe obi abụọ ma ọ̀ ga-ekwe omume iche echiche n’otu ụzọ ahụ Jisọs si chee. Ma, rịba okwu agbamume Pọl ama: “Amatara m na ezi ihe adịghị ebi n’ime m, nke ahụ bụ, n’anụ ahụ m: n’ihi na ịchọ ihe ọma dị nso n’ebe aka m ga-eru, ma ịrụta ihe ọma adịghị nso n’ebe aka m ga-eru. N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme. N’ihi na mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.” (Ndị Rom 7:18, 19, 22, 23) N’eziokwu, ezughị okè Pọl gbochiri ya ugboro ugboro ime uche Chineke dị ka o si chọọ, ma àgwà ya—echiche na mmetụta o nwere banyere Jehova na iwu Ya—kwesịrị nṅomi. Nke anyị pụkwara ịdị otú ahụ.

Idozi Àgwà Ndị Na-ezighị Ezi

10. Ụzọ iche echiche dị aṅaa ka Pọl gbara ndị Filipaị ume ịzụlite?

10 Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ dị ụfọdụ ndị mkpa idozi àgwà na-ezighị ezi? Ee. Ihe àmà na-egosi na ọ dị otú ahụ n’ebe ụfọdụ ndị Kraịst na narị afọ mbụ nọ. Pọl kwuru banyere inwe àgwà ziri ezi n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Filipaị. O dere, sị: “Ọ bụghị na anatara m ya rịị [ndụ eluigwe site ná mbilite n’ọnwụ bu ụzọ], ma ọ bụ na e mewo m ka m zuo okè ugbu a: ma ana m agbaso, ka m wee jide, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe m, ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidekwara m n’ihi ya. Ụmụnna m, mụ onwe m agụghị onwe m na ejidewo m ruo ugbu a: ma otu ihe ka m na-eme, ebe m na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru oké ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs. Ya mere, ka anyị hà, bụ́ ndị tozuru okè, [nwee ụzọ iche echiche a, NW].”—Ndị Filipaị 3:12-15.

11, 12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si ekpughere anyị echiche uche kwesịrị ekwesị?

11 Okwu Pọl na-egosi na onye ọ bụla nke, mgbe ọ ghọsịrị onye Kraịst, na-echeghị na ọ dị ya mkpa inwe ọganihu, nwere àgwà na-ezighị ezi. Ọ dịghị azụlite ụzọ iche echiche nke Kraịst. (Ndị Hibru 4:11; 2 Pita 1:10; 3:14) Ọnọdụ onye dị otú ahụ ọ̀ bụ nke enweghị olileanya? Ọ dịghị ma ọlị. Chineke pụrụ inyere anyị aka ịgbanwe àgwà anyị ma ọ bụrụ n’ezie na anyị chọrọ. Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụrụkwa na unu tụkwasị uche n’ihe ọ bụla n’ụzọ dị iche, ọbụna nke a ka Chineke ga-ekpughere unu.”—Ndị Filipaị 3:15.

12 Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị achọọ ka Jehova na-ekpughere anyị àgwà ziri ezi, anyị aghaghị ime òkè nke anyị. Iji ekpere na-amụ Okwu Chineke site n’enyemaka nke mbipụta ndị Kraịst bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta ga-eme ka ndị ‘na-atụkwasị uche n’ihe n’ụzọ dị iche’ nwee ike ịzụlite àgwà ziri ezi. (Matiu 24:45) Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, bụ́ ndị mmụọ nsọ họpụtara “[ịzụ] nzukọ Chineke dị ka atụrụ,” ga-enwe obi ụtọ inye nkwado. (Ọrụ 20:28) Lee ekele anyị na-enwe na Jehova na-echebara ezughị okè anyị echiche ma na-eji ịhụnanya enyere anyị aka! Ka anyị nakwere ya.

Ịmụta Ihe Site n’Aka Ndị Ọzọ

13. Gịnị ka anyị na-amụta banyere àgwà kwesịrị ekwesị site n’ihe ndekọ Bible banyere Job?

13 Ndị Rom isi nke 15, Pọl na-egosi na ịtụgharị uche n’ihe atụ ndị mere eme pụrụ inyere anyị aka idozi àgwà anyị. Ọ na-ede, sị: “Ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Ọ dị ụfọdụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie mkpa idozi akụkụ ụfọdụ nke àgwà ha. Dị ka ihe atụ, Job nwere àgwà ọma n’ozuzu ya. Ọ dịtụghị mgbe o kwuru na Jehova bụ onye ajọ omume, ọ dịghịkwa mgbe o kwere ka nhụjuanya mee ka obi ike o nwere n’ebe Chineke nọ gharazie isi ike. (Job 1:8, 21, 22) Ma, ọ na-ekwukarị na ya ziri ezi. Jehova duziri Elaịhu inyere Job aka idozi echiche uche a. Kama iche na a kparịala ya, Job ji obi umeala kweta na ọ dị ya mkpa ịgbanwe àgwà ya, ọ malitekwara ime ya ozugbo.—Job 42:1-6.

14. Olee otú anyị pụrụ isi dị ka Job ma ọ bụrụ na e nye anyị ndụmọdụ banyere àgwà anyị?

14 Ànyị ga-emeghachi omume dị ka Job ma ọ bụrụ na onye Kraịst ibe anyị ejiri obiọma gwa anyị na anyị na-egosipụta àgwà na-ezighị ezi? Dị ka Job, ka anyị ghara “[ịsị] na Chineke mere ihe nzuzu” ma ọlị. (Job 1:22) Ọ bụrụ na anyị ataa ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi, ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-eme mkpesa ma ọ bụ taa Jehova ụta maka ihe isi ike ndị anyị na-enwe. Ka anyị zere ịnwa ime ka anyị yie ndị ziri ezi, na-echeta na n’agbanyeghị ihe ùgwù ndị anyị nwere n’ozi Jehova, anyị ka bụ nanị “ohu ndị na-abaghị n’ihe.”—Luk 17:10.

15. (a) Àgwà dị aṅaa na-ezighị ezi ka ụfọdụ n’ime ụmụazụ Jisọs gosipụtara? (b) Olee otú Pita si gosipụta ezi àgwà?

15 Na narị afọ mbụ, ụfọdụ ndị gere Jisọs ntị gosipụtara àgwà na-ezighị ezi. N’otu oge, Jisọs kwuru ihe siri ike nghọta. Ná nzaghachi, “ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Ya, mgbe ha nụrụ okwu ahụ, ha sịrị, Okwu a dị ike; ònye pụrụ ịnụ ya?” O doro anya na ndị ahụ kwuru ihe a nwere àgwà na-ezighị ezi. Àgwà na-ezighị ezi ha nwere mekwara ka ha kwụsị ige Jisọs ntị. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Site na nke a ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Ya wee laghachi azụ, ha esoghịkwa Ya ejegharị ọzọ.” Ọ̀ bụ ha nile nwere àgwà na-ezighị ezi? Ee e. Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ya mere Jisọs sịrị ndị ozi iri na abụọ ahụ, Ùnu onwe unu na-achọkwa ịla? Saịmọn Pita zara Ya, sị, Onyenwe anyị, Ònye ka anyị ga-ejekwuru?” Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Pita zaziri ajụjụ ahụ ya onwe ya jụrụ: “I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:60, 66-68) Lee àgwà ọma nke ahụ bụ! Mgbe e nyere anyị nkọwa ma ọ bụ mgbazi n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị pụrụ isiri anyị ike nnakwere na mbụ, ọ́ gaghị adị mma igosipụta àgwà ahụ Pita gosipụtara? Lee ihe nzuzu ọ ga-abụ ịkwụsị ijere Jehova ozi ma ọ bụ ikwu okwu n’ụzọ megidere “ihe ilereanya nke okwu na-enye ezi ndụ” nanị n’ihi na ihe ụfọdụ siri ike nghọta na mbụ!—2 Timoti 1:13.

16. Àgwà dị aṅaa na-awụ akpata oyi ka ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge Jisọs gosipụtara?

16 Ndị ndú okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ enweghị ụzọ iche echiche ahụ Jisọs nwere. Ha gosipụtara mkpebi siri ike ha ịghara ige Jisọs ntị mgbe e si n’ọnwụ kpọlite Lazarọs. Nye onye ọ bụla nwere àgwà ziri ezi, ọrụ ebube ahụ gaara abụwo ihe akaebe zuru ezu na ọ bụ Chineke zitere Jisọs. Otú ọ dị, anyị na-agụ, sị: “Ya mere ndị isi nchụàjà na ndị Farisii kpọrọ nnọkọ ikpe ka ha zukọọ, sị, Gịnị ka anyị na-eme? n’ihi na Nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ Ya otú a, mmadụ nile ga-ekwere na Ya: ndị Rom ga-abịakwa napụ ebe nke anyị na mba nke anyị.” Gịnị bụ ihe ngwọta ha nwere? “Site n’ụbọchị ahụ ha gbara izu ka ha wee gbuo Ya.” E wezụga ịkpa nkata igbu Jisọs, ha kpebiri ibibi ihe àmà a na-ahụ anya nke na-egosi na ọ bụ onye ọrụ ebube. “Ndị isi nchụàjà gbara izu ka ha wee gbuokwa Lazarọs.” (Jọn 11:47, 48, 53; 12:9-11) Lee ihe na-asọ oyi ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na anyị azụlite àgwà yiri nke ahụ ma na-enwe mgbakasị ahụ ma ọ bụ na-ewe iwe n’ihe ndị anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ na ha n’ezie! Ee, leekwa ihe ize ndụ ọ bụ!

Iṅomi Àgwà Ziri Ezi nke Kraịst

17. (a) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Daniel gosipụtara àgwà atụghị egwu? (b) Olee otú Jisọs si gosi na ya nwere obi ike?

17 Ndị ohu Jehova na-anọgide na-enwe àgwà ziri ezi. Mgbe ndị iro Daniel gbara izu ka e mee iwu ga-amachibido ịrịọ chi ma ọ bụ mmadụ ọ bụla arịrịọ ma e wezụga eze ruo ụbọchị 30, Daniel maara na nke a ga-emetụta mmekọrịta ya na Jehova Chineke. Ọ̀ ga-akwụsị ikpeku Chineke ekpere ruo ụbọchị 30? Ee e, ọ nọgidere na-ekpeku Jehova ekpere n’atụghị egwu ugboro atọ n’ụbọchị, dị ka ọ na-emebu. (Daniel 6:6-17) N’otu aka ahụ, Jisọs ekweghị ka ndị iro ya majaa ya. N’otu Ụbọchị Izu Ike, o zutere otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Jisọs maara na obi agaghị adị ọtụtụ ndị Juu nọ n’ebe ahụ ụtọ ma ọ bụrụ na ọ gwọọ mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ọ gwara ha hoo haa ka ha kwuo ihe bụ́ echiche ha n’okwu ahụ. Mgbe ha jụrụ ikwu, Jisọs gara n’ihu ma gwọọ nwoke ahụ. (Mak 3:1-6) Jisọs alaghị azụ ma ọlị n’ịrụzu ọrụ ya n’ụzọ o lere anya dị ka nke kwesịrị ekwesị.

18. N’ihi gịnị ka ụfọdụ mmadụ ji emegide anyị, oleekwa otú anyị kwesịrị isi meghachi omume nye àgwà na-ezighị ezi ha?

18 Ndịàmà Jehova taa na-aghọta na ha onwe ha kwa ekwesịghị ịbụ ndị mmeghachi omume na-adịghị mma nke ndị mmegide pụrụ igosipụta, na-amaja. Ma ọ́ bụghị ya, ha agaghị na-egosipụta ụzọ iche echiche nke Jisọs. Ọtụtụ mmadụ na-emegide Ndịàmà Jehova, ụfọdụ bụ n’ihi na ha enweghị ezi ihe ọmụma, ndị ọzọkwa bụ n’ihi na ha kpọrọ Ndịàmà ma ọ bụ ozi ha asị. Ma ka anyị ghara ikwe mgbe ọ bụla ka àgwà enweghị omume enyi ha metụta àgwà ọma anyị. Anyị ekwesịghị ma ọlị ikwe ka ndị ọzọ kpebiere anyị ụzọ anyị ga-esi na-efe ofufe.

19. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ụzọ iche echiche yiri nke Jisọs Kraịst?

19 Jisọs gosipụtara ụzọ iche echiche ziri ezi mgbe nile n’ebe ụmụazụ ya nọ nakwa n’ebe ndokwa Chineke dị, n’agbanyeghị otú o si sie ike omume. (Matiu 23:2, 3) Anyị kwesịrị iṅomi ihe nlereanya ya. N’eziokwu, ụmụnna anyị ezughị okè, otú ahụ ka anyị dịkwa. Oleekwa ebe anyị pụrụ ịchọta ndị ka mma anyị na ha ga na-akpakọrịta na ndị enyi na-eguzosi ike n’ihe n’ezie ma ọ́ bụghị n’òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ? Jehova enyebeghị anyị nghọta zuru ezu nke Okwu ya e dere ede, ma olee òtù okpukpe kasị aghọta ya? Ka anyị na-eche echiche n’ụzọ ziri ezi mgbe nile, bụ́ ụzọ iche echiche ahụ Jisọs Kraịst nwere. Tinyere ihe ndị ọzọ, nke a na-agụnye ịmara otú anyị ga-esi na-echere Jehova, dị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, na-atụle ndụ na ozi Jisọs.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee otú àgwà anyị si emetụta ndụ anyị?

• Kọwaa ụzọ iche echiche nke Jisọs Kraịst.

• Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’àgwà Job?

• Gịnị bụ àgwà dị mma inwe mgbe mmegide chere anyị ihu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Onye Kraịst nke nwere àgwà ziri ezi na-aga enyere ndị ọzọ aka

[Foto dị na peeji nke 9]

Iji ekpere na-amụ Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịzụlite ụzọ iche echiche nke Kraịst