Ịkpọsa Alaeze Chineke n’Àgwàetiti Ndị Dị na Fiji
Anyị Dị N’etiti Ndị Kwere Ekwe
Ịkpọsa Alaeze Chineke n’Àgwàetiti Ndị Dị na Fiji
JISỌS KRAỊST kwuru n’otu oge banyere ụzọ abụọ. Otu dị obosara ma na-eduba n’ọnwụ. Nke ọzọ dị mkpagide ma na-eduba ná ndụ. (Matiu 7:13, 14) Iji mee ka ndị mmadụ nwee ike ịhọrọ ụzọ nke ziri ezi, Jehova Chineke zubere ka e kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa nile. (Matiu 24:14) N’ihi ya, ụmụ mmadụ nọ n’ebe nile na-ege ntị n’ozi Alaeze ahụ, ụfọdụ na-ahọrọkwa ndụ site n’ịghọ “ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.” (Ndị Hibru 10:39) Anyị na-agba gị ume ịgụ banyere nhọrọ ndụ bụ́ nke ụfọdụ ndị bi na Fiji nakwa n’àgwàetiti ndị ọzọ dị ya nso n’Ebe Ndịda Pacific mere.
Ha Tụkwasịrị Jehova Obi
Mere ka bụ nwata nwanyị na-aga akwụkwọ mgbe mbụ ọ nụrụ ozi Alaeze ahụ na 1964. N’ihi ibi n’àgwàetiti dịpụrụ adịpụ, ya na Ndịàmà Jehova adịghị ahụkebe. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, o nwetara ezi ihe ọmụma nke Bible. Ka ọ na-erule n’oge ahụ, ọ lụrụ otu nwoke nke bụ́ chiifu n’obodo nta ya. N’ihi nhọrọ Mere mere ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, di ya na ndị ikwu ya mesoro ya ihe n’ụzọ obi ọjọọ, ndị obodo ya lelịkwara ya. Otú o sina dị, e mere ya baptism na 1991.
N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, di Mere, bụ́ Josua, belatara ụzọ obi ọjọọ o si emeso ya ihe, ọbụnakwa malite ịnọ na-ege ntị ná nkwurịta okwu Bible nke Mere na ụmụ ya na-enwe. Josua kwụsịrị ịga Chọọchị Metọdist. Otú ọ dị, dị ka chiifu, ọ ka na-eduzi nzukọ ndị a na-enwe n’obodo nta ahụ kwa izu. N’anya ndị obodo, Josua anaghị eguzosi ike n’ihe, n’ihi na Chọọchị Metọdist bụ akụkụ dị oké mkpa nke ndụ ndị bi n’ime obodo Fiji. N’ihi ya, onye pastọ nọ n’ógbè ahụ gbara Josua ume ịlaghachi n’okpukpe mbụ ya.
Josua ji obi ike kwupụta na ya na ezinụlọ ya emewo nhọrọ ha, na ha ekpebisiwo ike ife Jehova Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Ná nzukọ obodo e nwere mgbe nke ahụ gasịrị, chiifu kasị elu n’obodo ahụ kwubiri na Josua na ezinụlọ ya ga-esi n’obodo nta ahụ pụọ dị ka ndị osu. E nyere ha ụbọchị asaa iji hapụ àgwàetiti ahụ na ụlọ, ala, na ihe ọkụkụ ha—ee, ihe nile ha ji biri.
Ụmụnna ime mmụọ ha ndị nọ n’àgwàetiti ọzọ gbataara Josua na ezinụlọ ya ọsọ enyemaka, na-enyere ha aka inweta ebe ha ga-anọ na ala ha ga-akụ ihe ọkụkụ. Josua na diọkpara ya bụ ndị e mere baptism ugbu a, nwa ya nwoke nke ọzọ na-ejekwa ozi dị ka onye nkwusa ozi ọma a na-emebeghị baptism. N’oge na-adịbeghị anya, Mere debanyere aha dị ka ọsụ ụzọ oge nile (onye nkwusa Alaeze oge nile). Nhọrọ ha mere ijere Jehova ozi mere ka ọnọdụ na ihe onwunwe ha funahụ ha, ma dị ka Pọl onyeozi, o nweghị ihe nke ahụ pụtara nye ha ma ha jiri ya tụnyere ihe ha nwetaworo.—Ndị Filipaị 3:8.
Nhọrọ Metụtara Akọ na Uche
Ịhọrọ ịgbaso akọ na uche e ji Bible zụọ na-achọ okwukwe na obi ike. N’ezie, otú ahụ ka ọ dị n’ebe Suraang e mere baptism ọhụrụ nọ, bụ́ nwa agbọghọbịa bi na Tarawa, bụ́ otu n’ime àgwàetiti ndị dị na Kiribati. Suraang rịọrọ ka a gụpụ ya n’otu akụkụ nke ọrụ nọọsụ ọ na-arụ n’ụlọ ọgwụ. A nabataghị arịrịọ ya nke ọma, nke a mere ka e ziga ya ilekọta otu obere ụlọ ahụ ike dị n’otu àgwàetiti dịpụrụ adịpụ bụ́ ebe ndị òtù okpukpe ya na-anọghị.
N’àgwàetiti ahụ, ọ bụ omenala bụ́ ndị ọhụrụ ịchụrụ “mmụọ” nke ógbè ahụ àjà. Ndị ahụ kweere na onye jụrụ ime otú ahụ ga-anwụ. Ebe ọ bụ
na Suraang ekweghị ka e meere ya na ndị òtù ya ihe omume ikpere arụsị a, ndị obodo ahụ cheere ka mmụọ ahụ o mejọrọ gbuo ya. Mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụla mere Suraang ma ọ bụ ndị òtù ya, ọtụtụ ohere megheere ya maka ịgba àmà dị mma.Ma ọnwụnwa Suraang agwụbeghị. Ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa nọ n’àgwàetiti ahụ na-ewere ya dị ka ihe ịma aka bụ́ ịrata ụmụ agbọghọ si esi bịa. Otú ọ dị, Suraang guzogidere omume ndọrọ mmekọahụ ha ma nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. N’ezie, ọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile, n’agbanyeghị na ọ na-arụ ọrụ nọọsụ ya awa 24 n’ụbọchị.
Tupu e nwee oriri e mere iji sị Suraang gaa nke ọma mgbe ọ na-akwado isi n’àgwàetiti ahụ pụọ, ndị okenye obodo ahụ kwuru na ọ bụ n’ezie onye ozi ala ọzọ mbụ letara ha. N’ihi nguzo ya siri ike maka ụkpụrụ Bible, ndị ọzọ nọ n’àgwàetiti ahụ emeghachiwo omume n’ụzọ dị mma n’ebe ozi Alaeze ahụ dị.
Ihe Ịma Aka Ndị A Na-ahụ Anya
Ndịpụ nke ụfọdụ obodo nta pụtara na ndị Jehova aghaghị itinye mgbalị dị ukwuu iji kere òkè n’ozi na iji gaa nzukọ ndị Kraịst. Tụlee ihe atụ nke Ndịàmà anọ e mere baptism—otu nwoke na ụmụ nwanyị atọ—ndị ọ na-ewe ọtụtụ awa iji gaa nzukọ ma laghachi. Njem ha na-agụnye ịgafe mmiri atọ. Mgbe mmiri ndị ahụ tojuru etoju, nwanna nwoke ahụ na-ebu ụzọ egwufe, na-esekpụ otu nnukwu ite isi nri bụ́ nke ha na-etinye akpa, akwụkwọ, na uwe ndị ha ga-eyi ná nzukọ na ya. E mesịa, ọ na-egwuru laghachi azụ iji nyere ụmụnna nwanyị atọ ahụ aka.
Ìgwè nta ọzọ, bụ́ ndị na-aga nzukọ n’àgwàetiti dịpụrụ adịpụ bụ́ Nonouti nke dị na Kiribati, na-enwe ihe ịma aka dị iche iche. Ụlọ ha na-ezukọ na ya na-aba nanị mmadụ asaa ma ọ bụ asatọ. Ndị ọzọ na-abịa nzukọ na ya na-anọdụ n’èzí ma na-esi n’ebe ndị gheere oghe n’ahụ ájá ya na-enyoba anya. Ụlọ nzukọ ahụ dị n’ebe ndị ọzọ bi n’obodo nta ahụ na-ahụ nke ọma, bụ́ ndị na-esi ebe ahụ agafe mgbe ha na-aga ma na-ala site ná nnukwu chọọchị ha. N’ezie, ndị ohu Jehova na-aghọta na ọ bụ ndị mmadụ, ọ bụghị ụlọ, bụ ihe na-amasị Chineke n’ezie. (Hagaị 2:7) Nwanna nwanyị nke nanị ya bụ nwanyị e mere baptism n’àgwàetiti ahụ emeela agadi, ọ pụghịkwa ịgate ije aka. Ma, otu nwa agbọghọ, bụ́ onye nkwusa a na-emebeghị baptism na-enyere ya aka n’ozi site n’ịkwagharị ya n’ụgbọ e ji aka akwagharị. Lee ekele ha na-egosipụta n’ebe eziokwu ahụ dị!
Ihe karịrị ndị nkwusa 2,100 na-eje ozi n’àgwàetiti ndị dị na Fiji na-ekpebisi ike ịnọgide na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ha nwekwara obi ike na ọtụtụ ndị ọzọ ka ga-aghọ “ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.”
[Map dị na peeji 8]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Australia
Fiji