Arịrịọ Maka Enyemaka
Arịrịọ Maka Enyemaka
“CHINEKE echefuola m!” ka otu nwanyị bụ́ onye Brazil tiri ná mkpu. Mgbe di ya nwụsịrị na mberede, o chere na ndụ ya enweghịzi nzube ọ bụla. Ọ̀ dịtụwo mgbe ị gbalịrị ịkasi onye nwere obi erughị ala otú ahụ ma ọ bụ ikekwe onye na-arịọ maka enyemaka, obi?
Ụfọdụ na-enwe nnọọ nkụda mmụọ nke na ha na-egbu onwe ha—ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị ntorobịa. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Folha de S. Paulo si kwuo, nnyocha e mere na Brazil na-egosi na “ọnụ ọgụgụ ndị ntorobia na-egbu onwe ha ejirila pasent 26 rịa elu.” Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Walter, * bụ́ nwa okorobịa nọ na São Paulo. O nweghị nne na nna, o nweghị ebe obibi, o nweghị ebe dịịrị nanị ya, na ndị enyi ọ pụrụ ịdabere na ha. Iji mee ka nhụsianya ya kwụsị, Walter kpebiri isi n’elu àkwà mmiri mapụ.
Otu nne na-azụ ụmụ nanị ya, bụ́ Edna, amụọlarị ụmụ abụọ mgbe o ji zute nwoke ọzọ. Mgbe nanị otu ọnwa gasịrị, ha malitere ibikọ ọnụ n’ụlọ nne nwoke ahụ, bụ́ onye na-eme mgbaasị bụrụkwa onye aṅụrụma. Edna mụrụ nwa ọzọ, malite ịṅụbiga mmanya ókè, ma daa nnọọ mbà n’obi nke na ọ nwara igbu onwe ya. N’ikpeazụ, a kpọnaara ya ụmụ ya.
Gịnị banyere ndị kataworo ahụ? Maria bụbu onye na-eme ihe ọchị na onye ekwurekwu. Otú ọ dị, ka ọ na-emekwu okenye, ọ malitere inwe nchegbu banyere ọrụ nọọsụ ọ na-arụ n’ihi na ụjọ na-atụ ya na ọ ga-emehie ihe. Nke a mere ka ọ daa mbà n’obi. Mgbe ọ gbalịsịrị iji aka ya gwọọ onwe ya, ọ gakwuuru dọkịta, ọgwụgwọ o nwetakwara yiri ihe nyere aka. Ma mgbe a chụrụ ya n’ọrụ mgbe ọ dị afọ 57, ọ daghachiri mbà n’obi n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ nke na ọ pụghị ịhụ ihe ngwọta ya. Maria malitere iche echiche igbu onwe ya.
“Ihe dị ka pasent 10 nke ndị dara mbà n’obi na-anwa igbu onwe ha,” ka Prọfesọ José Alberto Del Porto nke Mahadum São Paulo, na-ekwu. “O siri ike ikweta na ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị jiworo aka ha gbuo onwe ha karịrị nke ndị e gburu n’ọchụ, ma, ọ bụ eziokwu dị mwute,” ka dọkịta ukwu nke United States, bụ́ Dr. David Satcher, na-akọ.
Mgbe ụfọdụ, ịnwa igbu onwe onye na-abụ ịriọ maka enyemaka, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. N’eziekwa, ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi ga-achọ imere onye nke na-enweghịzi olileanya ihe kwesịrị ekwesị. N’ezie, ọ gaghị enye aka ikwu okwu
ndị dị ka: “Kwụsị imere onwe gị ebere,” “E nwere ọtụtụ ndị ọnọdụ ha ka nke gị njọ” ma ọ bụ, “Ihe ọjọọ na-adakwasị anyị nile site n’oge ruo n’oge.” Kama nke ahụ, gịnị ma ị bụrụ ezi enyi na onye na-ege ntị nke ọma? Ee, gbalịa inyere onye ahụ nwere nkụda mmụọ aka ịhụ na ndụ dị ụtọ obibi.Onye edemede bụ́ onye France bụ́ Voltaire dere, sị: “Onye gburu onwe ya taa n’ihi nkụda mmụọ, gaara achọ ịdị ndụ ma a sị na o cheere ruo otu izu.” Mgbe ahụzi, olee otú ndị nwere obi nkoropụ ga-esi achọpụta na ndụ dị ụtọ obibi?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị ntorobịa na ndị meworo okenye na-egbu onwe ha
[Foto dị na peeji nke 4]
Olee otú ị pụrụ isi nyere onye na-enweghịzi olileanya aka?