Josaịa Dị Umeala n’Obi Nwere Ihu Ọma Jehova
Josaịa Dị Umeala n’Obi Nwere Ihu Ọma Jehova
EGWU aghaghị ịtụ Nwa Eze bụ́ Josaịa nke Juda bụ́ onye dị afọ ise. Nne ya, bụ́ Jedida, na-eru újú. Jedida nwere ihe mere ọ ga-eji ebe ákwá n’ihi na nna nna Josaịa, bụ́ Eze Manase, anwụọla.—2 Ndị Eze 21:18.
Nna Josaịa, bụ́ Amọn, ga-abụzi eze Juda. (2 Ihe E Mere 33:20) Afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị (659 T.O.A.), ndị ohu Amọn egbuo ya. Ndị obodo egbuo ndị kpara nkata ọjọọ ahụ ma chie Josaịa na-eto eto eze. (2 Ndị Eze 21:24; 2 Ihe E Mere 33:25) N’oge ọchịchị Amọn, ísìsì ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-anụ n’ebe nile na Jerusalem n’ihi ọtụtụ ebe ịchụàjà ndị dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ndị mmadụ na-anọ akpọ isiala enye chi ụgha dị iche iche, amarawo Josaịa ahụ. A pụrụ ịhụ ndị nchụàjà bụ́ ndị ọgọ mmụọ ka ha na-agagharị, ndị na-efe ofufe—ọbụna ụfọdụ ndị zọọrọ na ha na-efe Jehova—jikwa chi bụ́ Malkam na-aṅụ iyi.—Zefanaịa 1:1, 5.
Josaịa maara na Amọn mere omume jọgburu onwe ya site n’ife chi ụgha dị iche iche ofufe. Eze na-eto eto nke Juda abịakwa ghọta n’ụzọ ka mma, mkpọsa ndị ahụ onye amụma Chineke bụ́ Zefanaịa mere. Ka ọ na-erule oge Josaịa dị afọ 15 (652 T.O.A.), ọ nọ n’afọ nke asatọ nke ọchịchị ya, o kpebisikwara ike ịṅa ntị n’okwu Zefanaịa. Mgbe ọ ka bụ nwa okoro, Josaịa malitere ịchọ Jehova.—2 Ihe E Mere 33:21, 22; 34:3.
Josaịa Amalite Ime Ihe!
Afọ anọ agafee, Josaịa amalitekwa ikpochapụ okpukpe ụgha n’ime Juda na Jerusalem (648 T.O.A.). Ya ebibie arụsị, Asherim, na ebe ịchụàjà ndị ahụ e ji mee ihe n’ofufe Beal. A kụpịara ihe oyiyi nke chi ụgha dị iche iche ma mee ka ha ghọọ ntụ ndị e fesasịziri n’ili nke ndị ahụ na-achụrụ ha àjà. E merụrụ ebe ịchụàjà ndị e ji fee ofufe na-adịghị ọcha ma mesịa bibie ha.—2 Ndị Eze 23:8-14.
Ọrụ mkpochasị Josaịa na-arụ nọ n’uju ya mgbe Jeremaịa, bụ́ nwa onye nchụàjà si n’ebo Livaị, bịara Jerusalem (647 T.O.A.). Jehova Chineke ahọpụtawo Jeremaịa na-eto eto ịbụrụ ya onye amụma, leekwa ka o si na-akpọsasi ozi Jehova ike megide okpukpe ụgha! Josaịa na Jeremaịa nwere ike ịbụ ọgbọ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ọrụ mkpochasị Josaịa ji obi ike na-arụ na mkpọsa Jeremaịa na-eme n’atụghị egwu, ndị ahụ laghachiri n’ofufe ụgha ngwa ngwa.—Jeremaịa 1:1-10.
A Chọta Otu Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa!
Ihe dị ka afọ ise agaala. Josaịa bụ́ onye dị afọ 25 achịwo ruo ihe dị ka afọ 18. Ya akpọọ Shefan, bụ́ odeakwụkwọ; Maaseia, bụ́ onyeisi obodo ahụ; na onye ncheta bụ́ Joa. Eze ahụ enye Shefan iwu, sị: ‘Gwa Hilkaịa, bụ́ onyeisi nchụàjà, ka o were ego ahụ ndị na-eche mbata ụzọ nke ụlọ nsọ ahụ chịkọtaworo n’aka ndị Israel nye ndị ọrụ ka ha wee nwee ike ịrụzi ụlọ Jehova.’—2 Ndị Eze 22:3-6; 2 Ihe E Mere 34:8.
Site n’isi ụtụtụ, ndị na-arụzi ụlọ nsọ ahụ na-arụsi ọrụ ike. N’ezie, Josaịa nwere ekele n’ebe Jehova nọ n’ihi na ndị ọrụ ahụ na-edozigharị ụfọdụ n’ime ihe ndị nna ya ha na-emebi iwu mebiri n’ụlọ Chineke. Ka ọrụ ahụ na-aga n’ihu, Shefan abịa izi ya ozi. Ma gịnị ka o ji? Leenụ, o ji akwụkwọ mpịakọta! Ya ekwuo na Hilkaịa Onyeisi 2 Ihe E Mere 34:12-18) Lee oké nchọpụta ọ bụ—obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ihe odide mbụ nke Iwu ahụ!
Nchụàjà achọtawo “akwụkwọ iwu Jehova nke e nyere site n’aka Mosis.” (Josaịa enwee nnọọ mmasị ịnụ okwu nile dị n’akwụkwọ ahụ. Ka Shefan na-agụ ya, eze ahụ agbalịa ịhụ otú iwu nke ọ bụla si metụta ya na ndị ahụ. O nwere mmasị karịsịa n’otú akwụkwọ ahụ si mesie ezi ofufe ike ma buo amụma banyere ihe otiti a ga-eti ha nakwa nchụpụ a ga-achụpụ ha n’ala ha ma ọ bụrụ na ndị ahụ etinye aka n’okpukpe ụgha. Ka Josaịa ghọtara ugbu a na e mezubeghị iwu nile Chineke nyere, ya adọwaa uwe ya ma nye Hilkaịa, Shefan, na ndị ọzọ iwu, sị: ‘Jụọrọnụ m Jehova ase banyere okwu nile nke akwụkwọ a: n’ihi na ọnụma Jehova dị ukwuu, bụ́ nke a mụnyeworo dị ka ọkụ megide anyị, n’ihi na nna anyị hà egeghị okwu nile nke akwụkwọ a ntị.’—2 Ndị Eze 22:11-13; 2 Ihe E Mere 34:19-21.
E Kwughachi Okwu Jehova
Ndị ozi Josaịa ejekwuru onye amụma nwanyị bụ́ Hulda na Jerusalem ma jiri ozi lọta. Hulda ekwughachiwo okwu Jehova, na-egosi na ọdachi ndị ahụ e dekọrọ n’akwụkwọ ahụ a chọtara ọhụrụ ga-adakwasị mba ahụ si n’ezi ofufe dapụ. Otú ọ dị, n’ihi mweda Josaịa wedara onwe ya ala n’ihu Jehova Chineke, ọ gaghị ahụ ọdachi ahụ. A ga-achịkọta ya na nna ya hà ma lie ya n’udo.—2 Ndị Eze 22:14-20; 2 Ihe E Mere 34:22-28.
Amụma Hulda ò mezuru, ebe ọ bụ na Josaịa nwụrụ n’agha? (2 Ndị Eze 23:28-30) Ee, n’ihi na ‘udo’ nke e ji lie ya dị iche ma e were ya tụnyere “ihe ọjọọ” nke gaje ịdakwasị Juda. (2 Ndị Eze 22:20; 2 Ihe E Mere 34:28) Josaịa nwụrụ tupu ọdachi ahụ mere na 609-607 T.O.A. bụ́ mgbe ndị Babilọn nọchibidoro ma bibie Jerusalem. Mmadụ ‘ịbụ onye a chịkọtara ya na nna ya hà’ adịchaghịkwa agụpụ ịnwụ ọnwụ ike. A na-eji okwu yiri nke ahụ eme ihe iji zoo aka n’ebe ma ọnwụ ike ma nke nkịtị dị.—Deuterọnọmi 31:16; 1 Ndị Eze 2:10; 22:34, 40.
Ezi Ofufe Agaa n’Ihu
Josaịa akpọkọta ndị Jerusalem n’ụlọ nsọ ahụ ma gụọrọ ha “okwu nile nke akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ” bụ́ nke a chọtaworo n’ụlọ Jehova. Ya agbazie ndụ “ijeso Jehova, na iwere obi ya nile na mkpụrụ obi ya nile debe ihe nile O nyere n’iwu, na ihe àmà Ya nile, na ụkpụrụ Ya nile, ime ka okwu nile nke ọgbụgba ndụ nke a nke e deworo n’akwụkwọ a guzosie ike.” Ndị ahụ nile kwenyekwara n’ọgbụgba ndụ ahụ.—2 Ndị Eze 23:1-3.
Eze Josaịa amalitezie ime ihe ọzọ bụ́kwa nke ihe àmà na-egosi na ọ ka sie ike, megide ikpere arụsị. A napụrụ ndị nchụàjà nke chi ala ọzọ nke Juda ọrụ ha. Ihe ùgwù nke ije ozi n’ebe ịchụàjà Jehova efunahụ ndị nchụàjà Livaị bụ́ ndị tinyere aka n’ofufe na-adịghị ọcha, e meekwa ka ebe ndị ahụ dị elu a rụrụ n’oge ọchịchị Eze Solomọn ghara ịdị mma maka ofufe. A rụrụkwara ọrụ mkpochasị ahụ banye n’ókèala nke ebe bụbu alaeze ebo iri nke Israel, bụ́ nke ndị Asiria kwaturu tupu mgbe ahụ (740 T.O.A.).
N’imezu okwu “onye nke Chineke” a na-ekwughị aha ya kwuru afọ 300 tupu mgbe ahụ, Josaịa esuree ọkpụkpụ nke ndị nchụàjà Beal n’ebe ịchụàjà ahụ Eze Jeroboam nke Mbụ guzobere na Betel. A kwaturu ebe ndị dị elu dị n’ebe ahụ nakwa n’obodo ndị ọzọ, chụọkwa ndị nchụàjà na-ekpere arụsị n’àjà kpọmkwem n’elu ebe ịchụàjà ndị ahụ ha onwe ha chụrụ àjà na ha.—1 Ndị Eze 13:1-4; 2 Ndị Eze 23:4-20.
E Mee Ememe Ngabiga Dị Ebube
Chineke kwadoro omume Josaịa n’ịkwalite ofufe dị ọcha. Ruo ogologo oge eze ahụ ga-adịru ndụ, ọ ga-ekele Chineke na ndị ahụ “esighị n’iso Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ́ nna ha, wezụga onwe ha.” (2 Ihe E Mere 34:33) Josaịa ga-esikwa aṅaa chefuo ihe omume dị egwu nke mere n’afọ nke 18 nke ọchịchị ya?
Eze ahụ nyere ndị ahụ iwu, sị: “Meerenụ Jehova, bụ́ Chineke unu, ememe ngabiga, dị ka e deworo ya n’akwụkwọ ọgbụgba ndụ [ahụ a chọtara n’oge na-adịbeghị anya].” (2 Ndị Eze 23:21) Josaịa aṅụrịa ọṅụ ịhụ mmeghachi omume ahụ dị mma. Maka ememe a, ya onwe ya enye anụmanụ Ememe Ngabiga 30,000 nakwa ehi 3,000. Lee ọmarịcha Ememe Ngabiga nke ahụ bụ! N’àjà ndị a chụrụ, ndokwa ndị e mere nke ọma, nakwa n’ọnụ ọgụgụ ndị ofufe, ọ karịrị Ememe Ngabiga ọ bụla e mere kemgbe oge Samuel onye amụma.—2 Ndị Eze 23:22, 23; 2 Ihe E Mere 35:1-19.
Onye A Kwaara Ákwá nke Ukwuu Mgbe Ọ Nwụrụ
N’afọ ndị fọdụrụnụ n’ime afọ 31 nke ọchịchị ya (659-629 T.O.A.), Josaịa chịrị dị ka eze ọma. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke ọchịchị ya, ya anụ na Fero Neko na-eme atụmatụ isi na Juda gafee iji gbochie usuu ndị agha Babilọn ma si otú ahụ nyere eze Asiria aka na Kakemish nke dị n’Osimiri Yufretis. N’ihi ihe a na-ekwughị na ọ bụ ya kpatara ya, Josaịa apụọ ịga lusoo onye Ijipt ahụ agha. Neko ezigara ya ndị ozi, na-asị: “Haa aka gị n’ebe Chineke nọ, Onye nọnyeere m, ka Ọ ghara ibibi gị.” Ma, Josaịa gbanwere ọdịdị ya ma gbalịa ime ka ndị Ijipt laghachi azụ na Megido.—2 Ihe E Mere 35:20-22.
Ajọ ihe emee eze Juda! Ndị iro ya gbatara ya akụ́, o wee gwa ndị ohu ya, sị: “Bubiganụ m; n’ihi na ọrịa na-arịa m nke ukwuu.” Ha esi n’ụgbọ ịnyịnya agha Josaịa bupụta ya, buba ya n’ọzọ, ma gawa Jerusalem. N’ebe ahụ ma ọ bụ ka ha na-aga n’obodo ahụ, Josaịa ekubie ume. “O wee nwụọ, e lie ya n’ili nna ya hà,” ka ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, “Juda na Jerusalem nile wee ruoro Josaịa újú.” Jeremaịa bụọrọ ya abụ ákwá, e jikwa eze ahụ mere isiokwu nke abụ ákwá ndị a bụrụ n’ihe omume ndị pụrụ iche mgbe nke ahụ gasịrị.—2 Ihe E Mere 35:23-25.
Ee, Eze Josaịa hiere ụzọ dị mwute mgbe ọ lụsoro ndị Ijipt agha. (Abụ Ọma 130:3) Otú o sina dị, ịdị umeala n’obi ya na nguzosi ike ya maka ezi ofufe wetaara ya ihu ọma Chineke. Lee ka ndụ Josaịa si egosipụta nke ọma na Jehova na-egosi ihu ọma n’ebe ndị ohu ya raara onwe ha nye bụ́ ndị dị umeala n’obi nọ!—Ilu 3:34; Jemes 4:6.
[Foto dị na peeji nke 29]
Eze Josaịa na-eto eto ji ezi obi chọọ Jehova
[Foto dị na peeji nke 31]
Josaịa bibiri ebe ndị ahụ dị elu ma kwalite ezi ofufe