Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’isi Nso—Ụwa nke Obi Nkoropụ Na-agaghị Adị

N’isi Nso—Ụwa nke Obi Nkoropụ Na-agaghị Adị

N’isi Nso—Ụwa nke Obi Nkoropụ Na-agaghị Adị

NDỤ na-achọwanye ihe dị ukwuu, ihe ndị na-akpata obi nkoropụ dịkwa ọtụtụ. Mgbe e mere ka anyị nwee obi nkoropụ, ọ pụrụ isiri anyị ike ịchịkwa mmụọ anyị. Leenụ, ọbụna ndị ndụ dị ụtọ pụrụ ịghọ ndị na-adịtụghị enwe obi ụtọ! Tụlee ihe atụ ole na ole.

N’oge ochie, onye amụma bụ́ Mosis nwere nnọọ nkụda mmụọ nke na ọ gwara Chineke, sị: “Biko, gbusịa m, ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu Gị; ka m gharakwa ilekwasị ihe ọjọọ m anya.” (Ọnụ Ọgụgụ 11:15) Mgbe Elaịja onye amụma na-agbara ndị iro ya ọsọ, o kwupụtara, sị: “O zuwo; ugbu a, Jehova, wepụ ndụ m.” (1 Ndị Eze 19:4) Jona onye amụma kwukwara, sị: “Jehova, biko, wepụ ndụ m n’ahụ m; n’ihi na ọ [kaara] m mma ịnwụ ọnwụ karịa ịdị ndụ.” (Jona 4:3) Ma Mosis, Elaịja, ma ọ bụ Jona adịghị onye nke gburu onwe ya. Ha nile maara iwu Chineke bụ́: “Gị egbula mmadụ.” (Ọpụpụ 20:13) Ebe ọ bụ na ha nwere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ, ha maara na ọ dịghị ọnọdụ olileanya na-adịghị na ya nakwa na ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke.

Gịnị banyere nsogbu ndị anyị na-enwe ugbu a? Tụkwasị ná nsogbu mmetụta uche ma ọ bụ nke anụ ahụ, ọ pụrụ ịbụ na mgbe ụfọdụ anyị aghaghị ịnagide mmeso ọjọọ site n’aka ndị òtù ezinụlọ, ndị agbata obi, ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị. Bible na-ekwu banyere ndị jupụtara “n’ajọ omume nile, ajọ ọrụ, anyaukwu, obi ọjọọ; jupụtakwa n’ekworo, ogbugbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ; ndị ntakwu, ndị na-ekwutọ mmadụ, ndị na-akpọ Chineke asị, ndị na-eme mmadụ ihe ihere, ndị mpako, ndị na-anya isi, ndị na-achọpụta ihe ọjọọ, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị nghọta, ndị na-emebi ọgbụgba ndụ, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-enweghị obi ebere.” (Ndị Rom 1:28-31) Ịbụ onye ndị dị otú ahụ gbara gburugburu site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị pụrụ ime ka ndụ yie ibu arọ. Ànyị pụrụ isi aṅaa nyere ndị nkasi obi na ahụ efe dị mkpa aka?

Ịdị Njikere Ige Ntị

Ahụhụ na nhụjuanya pụrụ ime ka mmadụ ghara iche echiche nke ọma. Onye amamihe ahụ kwuru, sị: “Mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.” (Eklisiastis 7:7) Ya mere e kwesịghị iji onye na-ekwu banyere igbu onwe ya gwurie egwu. Nsogbu ndị ọ na-enwe, ma ọ̀ bụ nke mmetụta uche, nke anụ ahụ, nke uche, ma ọ bụ nke ime mmụọ, pụrụ ịchọ ka e lebara ha anya ozugbo. N’ezie, ọgwụgwọ na usoro ọgwụgwọ ndị bụ́ ịgba dịgasị iche, mmadụ aghaghịkwa imere onwe ya mkpebi banyere ụdị ọgwụgwọ ọ chọrọ.—Ndị Galetia 6:5.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya na-akpata mmetụta nke ịchọ igbu onwe onye, mmadụ inwe onye na-aghọta ihe, nke dị ọmịiko, ma na-enwe ndidi bụ́ onye ọ pụrụ ịkọrọ izu nzuzo ya, pụrụ nnọọ ime ka ihe gbanwee. Ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi bụ́ ndị dị njikere ige ntị pụrụ inye aka. Tụkwasị n’inwe mmetụta maka ndị ọzọ na obiọma, echiche ndị na-ewuli elu bụ́ ndị sitere n’Okwu Chineke pụrụ ịbụ nnọọ ihe enyemaka nye ndị na-enweghịzi olileanya.

Enyemaka Ime Mmụọ Maka Ndị Obi Na-erughị Ala

Ọ pụrụ iju gị anya ịchọpụta otú ọgụgụ Bible pụrụ ịgbaru ume. Ọ bụ ezie na Bible abụghị akwụkwọ nduzi nke ahụ ike uche, ọ pụrụ inyere anyị aka iji ndụ kpọrọ ihe. Eze Solomọn kwuru, sị: “Amawo m na ọ dịghị ezi ihe dịịrị ha, ma ọ́ bụghị ka mmadụ ṅụrịa ọṅụ, meekwa ezi ihe n’ogologo ndụ ya. Ọzọkwa, mmadụ ọ bụla nke na-eri ihe, nke na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, nke na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ, onyinye Chineke ka nke ahụ bụ.” (Eklisiastis 3:12, 13) E wezụga ọrụ ndị na-enye afọ ojuju bụ́ ndị na-eme ka ndụ nwee nzube, ihe ndị dị nta—dị ka ikuku ndụ, ìhè anyanwụ, okooko osisi, osisi, na nnụnụ—bụcha onyinye ndị si n’aka Chineke bụ́ ndị anyị pụrụ ịnụ ụtọ ha.

Ọbụna ihe kakwu ewuli elu bụ mmesi obi ike Bible nke bụ́ na Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, na-eche banyere anyị. (Jọn 3:16; 1 Pita 5:6, 7) N’ụzọ dabara adaba, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, kwa ụbọchị ka Ọ na-eburu anyị ibu, bụ́ Chineke Nke bụ́ nzọpụta anyị.” (Abụ Ọma 68:19) Ọ bụ ezie na anyị pụrụ iche na anyị bụ ndị na-abaghị uru na ndị na-erughị eru, Chineke na-agba anyị ume ikpeku ya ekpere. Ka obi sie anyị ike na ọ gaghị eleghara onye ọ bụla nke ji obi umeala na obi eziokwu na-arịọ maka enyemaka ya, anya.

Ọ dịghị onye pụrụ izi ezi n’ịtụ anya ụwa nke nsogbu na-adịghị na ya taa. (Job 14:1) Ma, eziokwu sitere n’Okwu Chineke egosiwo ọtụtụ mmadụ na igbu onwe onye abụghị ụzọ ziri ezi isi dozie nsogbu ndị ha nwere. Tụlee nnọọ otú Pọl onyeozi si nyere onye nche ụlọ mkpọrọ nke na-enweghị olileanya aka bụ́ onye, “ebe e mere ka o teta n’ụra, ebe ọ hụkwara ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ka ha megheworo, o wee mịpụta mma agha ya, gaje igbu onwe ya, ebe ọ na-eche na ndị mkpọrọ agbapụworị.” N’otu ntabi anya, onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ ekpebiwo na ọ kaara ya mma igbu onwe ya karịa ịnwụ ọnwụ ihere na nke ga-ewe oge, n’ihi arụtaghị ọrụ. Onyeozi ahụ ji oké olu kwuo, sị: “Emerụla onwe gị ahụ: n’ihi na anyị nile nọ n’ebe a.” Pọl akwụsịghị ebe ahụ. N’ezie, ya na Saịlas kasiri onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ obi ma zaa ya ajụjụ ya bụ́: “Ndị nwe anyị, gịnị dị mkpa ka m mee ka e wee zọpụta m?” Ha zara, sị: “Kwere n’Onyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụtakwa gị, gị onwe gị na ezinụlọ gị.” Mgbe ahụ, ha gwara ya na ezinụlọ ya okwu Jehova, ihe si na ya pụta bụ na “ngwa ngwa e wee mee ya baptism, ya onwe ya na ndị ya nile.” Onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ na ezinụlọ ya nile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu ma chọta nzube ọhụrụ ná ndụ.—Ọrụ 16:27-35.

Taa, lee ihe na-enye ahụ efe ọ bụ ịmara na ọ bụghị Chineke ka ihe ọjọọ si n’aka! Okwu ya na-akọwa otu ajọ mmụọ, “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan,” dị ka onye “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” Ma oge ya agwụwala. (Mkpughe 12:9, 12) N’isi nso, Chineke ga-eme ihe iji wepụ nsogbu nile ahụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya wetawooro ndị bi n’ụwa. Mgbe ahụ, ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke kwere ná nkwa ga-eme ka ihe ndị na-akpata enweghị olileanya na igbu onwe onye jedebe n’ụzọ na-adịgide adịgide.—2 Pita 3:13.

Ngụgụ Obi Nye Ndị Na-arịọ Maka Enyemaka

Ọbụna ugbu a, ndị na-enwe nkụda mmụọ pụrụ inweta nkasi obi site n’Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Rom 15:4) Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” (Abụ Ọma 51:17) N’eziokwu, anyị na-ezute ọnwụnwa ụfọdụ n’ụzọ anyị na-apụghị izere ezere ma na-enwe mmetụta nke ezughị okè. Ma inweta ezi ihe ọmụma banyere Nna anyị nke eluigwe dị obiọma, nke na-ahụ n’anya, ma nwee ezi uche ga-emesighachi anyị obi ike na anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. Chineke pụrụ ịghọ Enyi na Onye Nkụzi kasịnụ anyị nwere. Ọ bụrụ na anyị esoro Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya, ọ gaghị emechu anyị ihu ma ọlị. “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị,” ka Onye Okike anyị na-ekwu, “Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—Aịsaịa 48:17.

Ịdabere n’ebe Chineke nọ enyeworo ọtụtụ ndị aka. Iji maa atụ: “Mara adaworị mbà n’obi ruo ogologo oge mgbe otu nwa nanị ọ mụtara nwụnahụrụ ya n’ihe mberede okporo ụzọ. * Ọ mara jijiji ma nwaa igbu onwe ya. Otú ọ dị, ọ na-ebilizi n’isi ụtụtụ kwa ụbọchị iji rụọ ọrụ dịịrị ya n’ụlọ. Ọ na-enwe mmasị n’ịkpọ egwú nakwa n’inyere ndị ọzọ aka. Olileanya bụ́ na “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị” ebelatawo ihe mgbu ọ na-enwe n’ihi ọnwụ dị mwute nke nwa ya nwoke ọ hụrụ n’anya, o mewokwa ka okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ sikwuo ike. (Ọrụ 24:15) Ebe ọ bụ na ọ dịbeghị mgbe Mara nwere ọchịchọ ịdị ka mmụọ ozi n’eluigwe, okwu ndị dị n’Abụ Ọma 37:11 emetụwo ya n’obi: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”

Nwanyị ọzọ bụ́ onye Brazil, bụ́ Sandra, rụsiri nnọọ ọrụ ike ịbụ ezigbo nne nye ụmụ ya atọ. Ọ na-ekweta, sị: “Eji m nnọọ ọrụ n’aka nke na mgbe nna m nwụrụ na mberede, mụ achọpụtakwa n’otu mgbe ahụ na di m na nwanyị ọzọ nọ na-eme enyi, echetụdịghị m echiche ikpeku Chineke ekpere maka enyemaka.” Sandra nwara igbu onwe ya n’ihi obi nkoropụ. Gịnị nyewooro ya aka inwetaghachi onwe ya? Ọ bụ ekele o nwere maka ihe ime mmụọ. “Kwa anyasị, ana m agụ Bible tupu m lakpuo ụra, ana m agbalịkwa itinye onwe m n’ọnọdụ nke ndị m na-agụ banyere ha. Ana m agụkwa magazin Ụlọ Nche na Teta!, akụkọ ndụ na-amasịkwa m karịsịa n’ihi na ha na-enyere m aka inwe afọ ojuju n’ọnọdụ m ná ndụ.” N’ịmara na Jehova bụ ezi enyi ya, ọ mụtawo ịkpọ okwu aha n’ekpere ya.

Ọdịnihu nke Obi Nkoropụ Na-agaghị Adị

Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na nhụjuanya nke mmadụ agaghị adịte aka! N’okpuru ịchịisi nke Alaeze Chineke, ụmụaka na ndị okenye bụ́ ndị na-ata ahụhụ ugbu a n’ihi mpụ, ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụ ajọ mbunobi, ga-aṅụrị ọṅụ. Dị ka e buru n’amụma n’abụ ọma, Eze Jehova họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka.” Ọzọkwa, “ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.” N’ezie, “ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:12-14.

Oge a ga-emezu okwu amụma ndị ahụ dị nso. Echiche nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ọ̀ na-amasị gị? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ihe mere ị ga-eji ṅụrịa ọṅụ ma jiri ndụ kpọrọ ihe dị ka onyinye sitere n’aka Chineke. Ọ bụrụkwa na i soro ndị ọzọ na-ekerịta nkwa ndị a na-enye nkasi obi bụ́ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ, ị pụrụ iwetara ndị na-arịọ maka enyemaka n’ime ụwa a nke na-adịghị enwe mmetụta, nke na-adịghịkwa ahụ n’anya, obi ụtọ dị ukwuu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 6]

E nwere ọtụtụ ọnọdụ ndị na-eme ka e nwee obi ụtọ taa

[Foto dị na peeji nke 7]

Ị̀ na-atụ anya ụwa nke obi nkoropụ na-agaghị adị?