Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịzụchapụta Oge Maka Ọgụgụ Ihe na Ọmụmụ Ihe

Ịzụchapụta Oge Maka Ọgụgụ Ihe na Ọmụmụ Ihe

Ịzụchapụta Oge Maka Ọgụgụ Ihe na Ọmụmụ Ihe

“Na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.”—NDỊ EFESỌS 5:16.

1. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ike oge anyị eke, gịnịkwa ka ụzọ anyị si eji oge anyị eme ihe pụrụ ikpughe banyere anyị?

EKWUWO na “ịhọrọ oge bụ ichekwa oge.” Onye na-ekewapụta oge maka ihe ndị dị ya mkpa ime ga na-eji oge ya arụpụta ihe dị ukwuu. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Ihe nile nwere oge a kara aka, e nwere oge maka ihe nile dị n’okpuru eluigwe.” (Eklisiastis 3:1, Moffatt) Anyị nile nwere oge hà nhata; ọ dị anyị n’aka ịmara otú anyị ga-esi na-eji ya eme ihe. Ihe ndị anyị na-ebute ụzọ na ụzọ anyị si eke oge anyị na-ekpughe n’ụzọ dị ukwuu ihe ndị kasị dịrị oké ọnụ ahịa nye anyị.—Matiu 6:21.

2. (a) N’Ozizi Elu Ugwu ya, gịnị ka Jisọs kwuru banyere mkpa ime mmụọ anyị? (b) Nnyocha onwe onye dị aṅaa ga-ekwesị ekwesị?

2 Anyị ga na-ewepụtarịrị oge maka iri nri na ihi ụra n’ihi na ha bụ mkpa anụ ahụ. Ma gịnị banyere mkpa ime mmụọ anyị? Anyị maara na a ghaghị igbokwa ha. Jisọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, NW) Ọ bụ ya mere “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ji echetara anyị mgbe nile ịdị mkpa nke iwepụta oge maka ọgụgụ Bible na ọmụmụ ihe. (Matiu 24:45) Ị pụrụ ịghọta otú nke a dịruru ná mkpa, ma ị pụrụ iche na i nweghị nnọọ oge maka ịmụ ihe ma ọ bụ ịgụ Bible. Ọ bụrụ otú ahụ, ka anyị tụlee ụzọ na usoro anyị ga-eji na-ewepụtakwu oge ná ndụ anyị maka ịgụ Okwu Chineke, maka ọmụmụ ihe onwe onye, nakwa maka ntụgharị uche.

Ịchọta Oge Maka Ọgụgụ Bible na Ọmụmụ Ihe

3, 4. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi nyere banyere iji oge anyị eme ihe, gịnịkwa ka nke a na-agụnye? (b) Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o nyere anyị ndụmọdụ ‘ịzụchapụrụ onwe anyị oge’?

3 N’iburu oge anyị bi na ya n’uche, ọ dị anyị nile mkpa ịṅa ntị n’okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ. N’ihi nke a unu aghọla ndị na-enweghị uche, kama ghọtanụ ihe bụ́ ihe Onyenwe anyị na-achọ.” (Ndị Efesọs 5:15-17) N’ezie, ndụmọdụ a metụtara akụkụ nile nke ndụ anyị dị ka ndị Kraịst raara onwe ha nye, gụnyere ịchọta oge maka ekpere, ọmụmụ ihe, nzukọ, na ikere òkè ruo ókè o kwere mee n’ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze.’—Matiu 24:14; 28:19, 20.

4 O yiri ka ọ na-esiri ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova taa ike ime ka ọgụgụ Bible na ọmụmụ ihe siri ike bụrụ akụkụ nke ndụ ha. O doro anya na anyị apụghị ịtụkwasị awa ọ bụla n’ụbọchị anyị, n’ihi ya, ihe ndụmọdụ Pọl pụtara aghaghị ịdị iche. N’asụsụ Grik, nkebi ahịrịokwu bụ́ ‘na-azụchapụta oge’ na-enye echiche nke ịchụ ihe n’àjà iji zụta ihe. N’akwụkwọ ya bụ́ Expository Dictionary, W. E. Vine kwuru na ọ pụtara “iji ohere ọ bụla na-eme ihe n’ụzọ kasị mma, iji nke ọ bụla na-eme ihe n’ụzọ kasị baa uru ebe ọ bụ na ọ dịghị nke a pụrụ inwetaghachi ma ọ gafee.” Na gịnị ma ọ bụ ebee ka anyị pụrụ isi zụchapụta oge maka ịgụ na ịmụ Bible?

Anyị Aghaghị Isetịpụ Ihe Ndị Ka Mkpa

5. Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ijide ihe ndị ka mkpa n’aka,’ n’ụzọ dịkwa aṅaa?

5 Tụkwasị n’ọrụ ego ndị anyị na-arụ, anyị nwere ọtụtụ ihe ime mmụọ ndị anyị ga-elebara anya. Dị ka ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, anyị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè.” (1 Ndị Kọrint 15:58) N’ihi nke a, Pọl nyere ndị Kraịst nọ na Filipaị ntụziaka ‘ijide ihe ndị ka mkpa n’aka.’ (Ndị Filipaị 1:10, NW) Nke a pụtara na a ghaghị isetịpụ ihe ndị ka mkpa. Ihe ime mmụọ kwesịrị ibute ihe anụ ahụ ụzọ mgbe nile. (Matiu 6:31-33) Ma, a chọkwara ime ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ịrụzu ọrụ ime mmụọ anyị. Olee otú anyị si eke oge anyị maka akụkụ dị iche iche nke ndụ anyị dị ka ndị Kraịst? Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-akọ na n’etiti “ihe ndị ka mkpa” nke ndị Kraịst kwesịrị ilebara anya, o yiri ka a na-eleghara ọmụmụ ihe onwe onye na ọgụgụ Bible anya.

6. Gịnị ka ịzụchapụta oge pụrụ ịgụnye ma a bịa n’ọrụ ego ma ọ bụ n’ọrụ dị n’ụlọ?

6 Dị ka anyị hụworo, ịzụchapụta oge na-agụnye “iji ohere ọ bụla na-eme ihe n’ụzọ kasị mma” na “iji nke ọ bụla na-eme ihe n’ụzọ kasị baa uru.” Ya mere, ọ bụrụ na àgwà ọgụgụ Bible na nke ọmụmụ ihe anyị adịghị mma, ọ ga-adị mma ime nnyocha onwe onye iji hụ otú anyị si eji oge anyị eme ihe. Ọ bụrụ na ọrụ ego anyị na-achọ ihe n’aka anyị gabiga ókè, na-eri oge na ume ọrụ anyị n’ụzọ gabigara ókè, anyị kwesịrị ikpeku Jehova ekpere banyere ya. (Abụ Ọma 55:22) Anyị pụrụ ime mgbanwe ndị ga-eme ka anyị nwekwuo oge maka ihe ndị dị mkpa metụtara ofufe Jehova, gụnyere ọmụmụ ihe na ọgụgụ Bible. E kwuwo n’ụzọ ziri ezi na ọ dịghị mgbe nwanyị na-arụcha ọrụ dịịrị ya. Ya mere, ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst aghaghịkwa isetịpụ ihe ndị ka mkpa ma wepụta oge maka ọgụgụ Bible na iji mụsie ihe ike.

7, 8. (a) N’ihe omume ndị dị aṅaa ka a pụrụ isi zụchapụta oge maka ọgụgụ ihe na ọmụmụ ihe? (b) Gịnị bụ nzube nke ntụrụndụ, oleekwa otú icheta nke a pụrụ isi nyere anyị aka isetịpụrụ onwe anyị ihe ndị ka mkpa?

7 N’ozuzu, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị pụrụ ịzụchapụta oge maka ọmụmụ ihe site n’ịhapụ ihe omume ndị na-adịchaghị mkpa. Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Oge ha aṅaa ka m na-etinye n’ịgụ magazin ndị ụwa ma ọ bụ akwụkwọ akụkọ, ikiri ihe omume telivishọn, ige egwú, ma ọ bụ igwu egwuregwu vidio? M̀ na-etinye oge ka ukwuu n’ihu kọmpụta karịa ka m na-etinye n’ịgụ Bible?’ Pọl na-ekwu, sị: “Unu aghọla ndị na-enweghị uche, kama ghọtanụ ihe bụ́ ihe Onyenwe anyị na-achọ.” (Ndị Efesọs 5:17) Iji telivishọn eme ihe n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya yiri ka ọ bụ otu isi ihe mere ọtụtụ Ndịàmà adịghị etinye oge zuru ezu n’ọmụmụ ihe onwe onye na ọgụgụ Bible.—Abụ Ọma 101:3; 119:37, 47, 48.

8 Ụfọdụ pụrụ ikwu na ọ bụghị mgbe nile ka ha ga na-amụ ihe, na ọ dị ha mkpa ịtụrụtụ ndụ. Ọ bụ ezie na nke a bụ eziokwu, ọ pụrụ ịdị mma ịtụle ókè oge anyị na-eji atụrụ ndụ haruru ma jiri ya tụnyere oge anyị na-eji amụ ihe ma ọ bụ na-agụ Bible. Ihe anyị ga-achọpụta pụrụ ịtụ anyị n’anya. Ọ bụ ezie na ntụrụndụ na ezumike dị mkpa, a ghaghị idebe ha n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. Nzube e ji eme ha bụ iji mee ka anyị nwee ume ọhụrụ maka ịmaliteghachi ihe omume ime mmụọ. Ọtụtụ ihe omume telivishọn na egwuregwu vidio na-eme ka ike gwụ mmadụ, ebe ịgụ na ịmụ Okwu Chineke na-enye ume ọhụrụ.—Abụ Ọma 19:7, 8.

Otú Ụfọdụ Si Ewepụta Oge Maka Ịmụ Ihe

9. Gịnị bụ uru ndị dị n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ e nyere n’akwụkwọ nta bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—1999?

9 Okwu nkọwa nke mbipụta 1999 nke akwụkwọ nta bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ kwa Ụbọchị na-asị: “Ọ ga-akasị baa uru ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ya site n’akwụkwọ nta a n’ụtụtụ. Ọ ga-adị gị ka Jehova, bụ́ Onye Nkụzi Ukwu ahụ, ò ji ntụziaka ya na-akpọte gị n’ụra. E kwuru banyere Jisọs Kraịst n’ụzọ amụma dị ka onye na-erite uru site ná ntụziaka Jehova kwa ụtụtụ: ‘Ọ [Jehova] na-akpọte ntị m kwa ụtụtụ, Ọ na-akpọte ntị m ịnụ ihe dị ka ndị mmụta.’ Ntụziaka ndị dị otú ahụ nyere Jisọs ‘ire nke ndị mmụta’ ka o wee ‘mara iwere okwu kwagide onye dara mbà.’ (Aịsa. 30:20; 50:4; Mat. 11:28-30) Ịbụ onye a na-akpọte kwa ụtụtụ ịṅa ntị na ndụmọdụ bịara n’oge ya site n’Okwu Chineke abụghị nanị na ọ ga-enyere gị aka ịnagide nsogbu ndị nke gị kamakwa ọ ga-enye gị ‘ire nke ndị mmụta’ iji nyere ndị ọzọ aka.” *

10. Olee otú ụfọdụ ndị si ewepụta oge maka ọgụgụ Bible na ọmụmụ ihe, oleekwa uru ndị ha na-erite?

10 Ọtụtụ ndị Kraịst na-agbaso ndụmọdụ a site n’ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ya nakwa site n’ịgụ Bible ma ọ bụ ịmụ ihe n’isi ụtụtụ. Na France, otu ọsụ ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi na-ebili n’isi ụtụtụ nile ma jiri minit 30 gụọ Bible. Gịnị meworo ka o nwee ike ime nke a kemgbe ọtụtụ afọ? Ọ na-ekwu, sị: “Ana m enwe mkpali miri emi, ana m anọgidesikwa ike n’usoro ọgụgụ ihe m ihe ọ sọkwara ya mee!” N’agbanyeghị oge anyị họọrọ n’ụbọchị, ihe dị mkpa bụ ịnọgidesi ike n’usoro ihe omume anyị. René Mica, bụ́ onye jeworo ozi ọsụ ụzọ ruo ihe karịrị afo 40 na Europe nakwa n’Ebe Ugwu Africa, na-ekwu, sị: “Kemgbe 1950, ọ bụwo ihe mgbaru ọsọ m ịgụchapụ Bible kwa afọ, bụ́ ihe m meworo ugboro 49 ugbu a. Echere m na nke a dị mkpa ka m wee nọgide soro Onye Okike m na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na-enyere m aka ịghọta ikpe ziri ezi nke Jehova na àgwà ya ndị ọzọ n’ụzọ ka mma, ọ bụrụwokwa ebe m si enweta ike pụrụ iche.” *

Nri n’Oge Ya’

11, 12. (a) “Òkè nri” ime mmụọ dị aṅaa ka “onye ahụ na-achị ezinụlọ” wetaworo? (b) Olee otú e siworo weta “òkè nri” ahụ n’oge ya?

11 Ọbụna dị ka àgwà irichi nri anya si atụnye ụtụ n’inwe ezi ahụ ike anụ ahụ, inwe usoro ihe omume nke ọmụmụ ihe na ọgụgụ Bible chiri anya na-enye aka n’inwe ezi ahụ ike ime mmụọ. N’Oziọma Luk, anyị na-agụ okwu Jisọs bụ́: “Ònyekwa bụ onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onye nwe ya ga-eme onyeisi ezinụlọ ya, inye ha òkè nri ha n’oge ya?” (Luk 12:42) Ruo ihe karịrị afọ 120 ugbu a, e wepụtawo ‘nri ime mmụọ n’oge ya’ n’Ụlọ Nche, nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible.

12 Rịba okwu bụ́ “n’oge ya” ama. N’oge kwesịrị ekwesị, ‘Onye Nkụzi Ukwu’ anyị, bụ́ Jehova, site n’aka Ọkpara ya na òtù ohu ahụ, eduziwo ndị ya n’okwu ndị metụtara ozizi na omume. Ọ dịwo ka a ga-asị na anyị nile anụwo olu na-asị anyị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:20, 21) Ọzọkwa, mgbe ndị mmadụ ji nlezianya gụọ Bible na mbipụta nile dabeere na Bible, ha na-enwe mmetụta ugboro ugboro na ọ bụ ha onwe ha kpọmkwem ka a na-agwa ihe ndị dị n’ime ya. Ee, ndụmọdụ na ntụziaka Chineke ga na-abịara anyị n’oge ya, na-eme ka anyị nwee ike iguzogide ọnwụnwa ma ọ bụ ime mkpebi amamihe dị na ya.

Zụlite Àgwà Iri Ihe Dị Mma

13. Gịnị bụ ụfọdụ àgwà iri nri ime mmụọ na-adịghị mma?

13 Iji ritezuo uru ‘n’òkè nri’ dị otú ahụ a na-eweta n’oge ya, ọ dị anyị mkpa inwe àgwà iri ihe dị mma. Ọ dị oké mkpa inwe usoro ihe omume nke ọgụgụ Bible na ọmụmụ ihe onwe onye a na-eme mgbe dum ma gbasochie ya anya. Ị̀ na-enwe àgwà iri nri ime mmụọ dị mma na oge maka ọmụmụ ihe onwe onye miri emi mgbe nile? Ka ị̀ na-eji ọsọ agụ akwụkwọ ndị e jiworo nlezianya kwadebere anyị, na-eri ya ọkụ ọkụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma ọ bụ ọbụna na-ahapụ iri nri ụfọdụ kpam kpam? Inwe àgwà iri nri ime mmụọ na-adịghị mma emewo ka ụfọdụ ghọọ ndị na-adịghị ike n’okwukwe—ọbụna dapụ.—1 Timoti 1:19; 4:15, 16.

14. N’ihi gịnị ka o ji baa uru iji nlezianya na-amụ isiokwu pụrụ iyi ihe anyị dị mbụ mara?

14 Ụfọdụ pụrụ iche na ha amaraworị ozizi ndị bụ́ isi nakwa na ọ bụghị isiokwu nile na-ekwu ihe dị nnọọ ọhụrụ. N’ihi ya, ịmụchi ihe na ịgachi nzukọ anya adịghị mkpa. Otú ọ dị, Bible na-egosi na ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị a na-echetara ihe ndị anyị mụtawororịị. (Abụ Ọma 119:95, 99; 2 Pita 3:1; Jud 5) Dị nnọọ ka ezigbo osi ite si esi otu ụdị nri n’ọtụtụ ụzọ ụtọ ha dịgasị iche, òtù ohu ahụ na-ewepụta nri ime mmụọ na-edozi ahụ n’ụzọ dịgasị nnọọ iche. Ọbụna n’isiokwu ndị bu ihe ndị e kwurula okwu banyere ha ugboro ugboro na mbụ, a na-enwe isi ihe ndị ka mma anyị na-agaghị achọ ka ha gafee anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na uru anyị na-erite n’akwụkwọ anyị na-agụ na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’otú oge na mgbalị anyị na-etinye n’ịmụ ya haruru.

Uru Ime Mmụọ A Na-erite Site n’Ịgụ Ihe na Ịmụ Ihe

15. Olee otú ịgụ na ịmụ Bible si enyere anyị aka ịbụ ndị ozi ka mma nke Okwu Chineke?

15 Uru anyị na-erite site n’ịgụ na ịmụ Bible dị ọtụtụ. A na-enyere anyị aka iru eru maka otu n’ime ibu ọrụ anyị ndị bụ́ isi dị ka ndị Kraịst, ya bụ, na anyị nile n’otu n’otu pụrụ ịghọ “onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime ya, onye na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.” (2 Timoti 2:15) Ka anyị na-agụkwu ma na-amụkwu Bible, otú ahụ ka echiche Chineke ga na-emejupụtakwu uche anyị. Mgbe ahụ, dị ka Pọl, anyị ga-enwe ike ‘ịgwa ndị mmadụ okwu site n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, na-emeghe ha, na-echekwa n’ihu ha’ eziokwu dị ebube banyere nzube Jehova. (Ọrụ 17:2, 3) Nkà izi ihe anyị ga-aka mma, mkparịta ụka, okwu, na ndụmọdụ anyị ga-abụkwa ihe na-ewulikwu elu n’ụzọ ime mmụọ.—Ilu 1:5.

16. N’ụzọ onwe onye ndị dị aṅaa ka anyị si erite uru site n’ịgụ na n’ịmụ Okwu Chineke?

16 Ọzọkwa, oge e tinyere n’inyocha Okwu Chineke ga-enyere anyị aka ime ka ndụ anyị kwekọọ n’ụzọ Jehova ruo n’ókè ka zuo ezuo. (Abụ Ọma 25:4; 119:9, 10; Ilu 6:20-23) Ọ ga-eme ka àgwà ime mmụọ anyị sikwuo ike, dị ka ịdị umeala n’obi, iguzosi ike n’ihe, na obi ụtọ. (Deuterọnọmi 17:19, 20; Mkpughe 1:3) Mgbe anyị na-etinye ihe ọmụma anyị na-enweta site n’ịgụ na ịmụ Bible n’ọrụ, mmụọ Chineke ga na-arụ ọrụ ná ndụ anyị n’enweghị ihe mgbochi, na-eduga n’anyị ịmịpụtakwu mkpụrụ nke mmụọ nsọ n’ụba n’ihe nile anyị na-eme.—Ndị Galetia 5:22, 23.

17. Olee otú oge na nkà anyị na-etinye n’ọgụgụ na n’ọmụmụ Bible onwe onye si emetụta mmekọrịta anyị na Jehova?

17 Nke kasị mkpa bụ na oge e si n’ihe ndị ọzọ zụchapụta iji na-agụ ma na-amụ Okwu Chineke ga-eweta abamuru dị ukwuu n’ihe banyere mmekọrịta anyị na Chineke. Pọl kpere ekpere ka ndị Kraịst ibe ya “jupụta ná mmazu nke ihe [Chineke] na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ, ka [ha] jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile.” (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) N’otu aka ahụ, ka anyị wee “jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị,” anyị aghaghị ‘ijupụta ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ.’ N’ụzọ doro anya, anyị inweta ngọzi na nnwapụta Jehova na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’oge na nkà anyị na-etinye n’ọgụgụ na n’ọmụmụ Bible onwe onye.

18. Ngọzi ndị dị aṅaa ga-abụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị agbasoo okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Jọn 17:3?

18 “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Nke ahụ bụ otu n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ Ndịàmà Jehova na-ejikarị eme ihe iji nyere ndị ọzọ aka ịghọta mkpa ịmụ Okwu Chineke dị. N’ezie, ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị mkpa ime otú ahụ n’onwe ya. Olileanya anyị nke ịdị ndụ ebighị ebi na-adabere n’anyị ito eto n’ihe ọmụma banyere Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Cheekwa nnọọ echiche ihe nke ahụ pụtara. Ọ dịghị mgbe anyị ga-akwụsị ịmụkwu ihe banyere Jehova—a ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi wee na-amụ banyere ya!—Eklisiastis 3:11; Ndị Rom 11:33.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 10 Lee isiokwu bụ́ “Mgbe Ha Na-agụ Ya na Otú Ha Si Erite Uru,” nke e bipụtara n’Ụlọ Nche nke May 1, 1995, peeji nke 20-21.

Ajụjụ Ntụleghachi

• Gịnị ka otú anyị si eji oge anyị eme ihe na-ekpughe?

• N’ihe omume ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi na-azụchapụta oge maka ịgụ na ịmụ Bible?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ilebara àgwà iri nri ime mmụọ anyị anya?

• Uru ndị dị aṅaa ka a na-erite site n’ịgụ na n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]

Ịgụchi na ịmụchi Bible anya ga-enyere anyị aka ‘ikwuzi okwu nke eziokwu ahụ’

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ime ka ihe omume ndị ọzọ anyị ji n’aka ná ndụ na nchụso ime mmụọ anyị nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị ga-eweta abamuru dị ukwuu