Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọmụmụ Ihe—Ihe Na-akwụghachi Ụgwọ Ma Na-atọ Ụtọ

Ọmụmụ Ihe—Ihe Na-akwụghachi Ụgwọ Ma Na-atọ Ụtọ

Ọmụmụ Ihe—Ihe Na-akwụghachi Ụgwọ Ma Na-atọ Ụtọ

“Ọ bụrụ na ị chọọ ya . . . ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”—ILU 2:4, 5.

1. Olee otú ịgụ ihe maka ntụrụndụ pụrụ isi wetara anyị obi ụtọ dị ukwuu?

ỌTỤTỤ mmadụ na-agụ ihe nanị iji kporie ndụ. Ọ bụrụ na akwụkwọ a na-agụ bụ nke na-ewuli elu, ịgụ ihe pụrụ ịbụ ihe ntụrụndụ dị mma. E wezụga usoro ihe omume ha nke ịgụchi Bible anya, ụfọdụ ndị Kraịst na-enweta ezi obi ụtọ site n’ịgụ akụkụ dị iche iche n’Abụ Ọma, Ilu, Oziọma ndị ahụ, ma ọ bụ n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible. Ọmarịcha okwu na echiche ndị e ji mee ihe na ha na-enye ha obi ụtọ dị ukwuu. Maka ntụrụndụ, ndị ọzọ na-ahọrọ ịgụ Yearbook of Jehovah’s Witnesses, magazin Teta!, akụkọ ndụ ndị e bipụtara n’akwụkwọ ndị a, ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ dabeere n’akụkọ ihe mere eme, nkà mmụta ọdịdị mbara ala, na ihe ndị e kere eke.

2, 3. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi jiri ihe ọmụma ime mmụọ miri emi tụnyere nri siri ike? (b) Gịnị ka ọmụmụ ihe na-agụnye?

2 Ọ bụ ezie na ịgụ ihe nkịtị pụrụ ịbụ ụdị nke ntụrụndụ, ọmụmụ ihe na-achọ itinye uche n’ihe. Onye England bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Francis Bacon dere, sị: “Ụfọdụ akwụkwọ bụ ndị a ga-edetụ ire, ndị ọzọ bụ ndị a ga-elo elo, ole na ole bụkwa ndị a ga-ata ata ma gbarie.” N’ezie, Bible so ná ndị nke ikpeazụ ahụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Onye okwu anyị nwere ikwu banyere ya [Kraịst, bụ́ onye Eze na Onye Nchụàjà bụ́ Melkizedek sere onyinyo ya] dị ukwuu, dịkwa ike ịsụgharị asụsụ, ebe unu ghọworo ndị nwere ntị ike. . . . Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Ndị Hibru 5:11, 14) A ghaghị ịta nri siri ike nke ọma tupu a na-elo ya ka ọ gbarie. Ihe ọmụma ime mmụọ miri emi na-achọ ntụgharị uche tupu a na-anakwere ma na-ejigide ya.

3 Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa “ọmụmụ ihe” dị ka “omume ma ọ bụ usoro nke itinye uche n’ihe iji nweta ihe ọmụma ma ọ bụ nghọta, dị ka site n’ịgụ ihe, ime nnyocha, na ihe ndị ọzọ.” Ya mere, ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịgụ ihe ọkụ ọkụ, ikekwe na-aka ihe n’okpuru okwu ka anyị na-agụ na-aga. Ọmụmụ ihe bụ ọrụ, itinye uche n’ihe, na iji ikike iche echiche na-eme ihe. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ọmụmụ ihe chọrọ mgbalị, nke a adịghị apụta na ọ pụghị ịbụ ihe na-atọ ụtọ.

Ime Ka Ọmụmụ Ihe Bụrụ Ihe Na-atọ Ụtọ

4. Dị ka ọbụ abụ ahụ si kwuo, olee otú ịmụ Okwu Chineke pụrụ isi bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ma na-akwụghachi ụgwọ?

4 Ịgụ na ịmụ Okwu Chineke pụrụ ịbụ ihe na-enye ume ọhụrụ. Ọbụ abụ ahụ kwupụtara, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi; ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ: ihe Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè.” (Abụ Ọma 19:7, 8) Iwu na ihe ncheta Jehova na-eweghachi mkpụrụ obi anyị, na-eme ka ọdịmma ime mmụọ anyị ka mma, na-ewetara anyị ọṅụ, na-emekwa ka anya anyị na-egbukepụ site n’ime ka anyị na-ahụ nzube dị ebube nke Jehova nke ọma. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ!

5. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọmụmụ ihe pụrụ isi wetara anyị obi ụtọ dị ukwuu?

5 Mgbe anyị na-arụpụta ezi ihe n’ọrụ anyị, anyị na-anụ ụtọ ịrụ ya. N’ihi ya, iji mee ka ọmụmụ ihe bụrụ ihe na-atọ ụtọ, anyị aghaghị ịdị ngwa iji ihe ọmụma anyị nwetara ọhụrụ na-eme ihe. Jemes dere, sị: “Onye nyochaworo n’ime iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe ya, nke na-anọgidekwa otú a, ghara ịghọ onye na-anụ anụ nke na-echezọ, kama ọ bụ onye na-eme eme nke na-arụ ọrụ, onye a ga-abụ onye ngọzi n’omume ya.” (Jemes 1:25) Mmadụ itinye isi ihe ndị ọ mụtara n’ọrụ ozugbo na-eweta afọ ojuju dị ukwuu. Ime nnyocha kpọmkwem n’ihi nzube nke ịza ajụjụ a jụrụ anyị n’oge anyị na-arụ ọrụ nkwusa ma ọ bụ izi ihe ga-ewetakwara anyị obi ụtọ dị ukwuu.

Ime Ka Okwu Chineke Na-atọ Anyị Ụtọ nke Ukwuu

6. Olee otú onye dere Abụ Ọma nke 119 si kwupụta na okwu Jehova na-atọ ya ụtọ nke ukwuu?

6 Onye dere Abụ Ọma nke 119, ikekwe Hezekaịa mgbe ọ ka bụ nwa eze na-eto eto, kwupụtara na okwu Jehova na-atọ ya ụtọ nke ukwuu. O ji uri kwuo, sị: “Ihe ụkpụrụ Gị nile ga-atọ m ụtọ nke ukwuu: m gaghị echezọ okwu Gị. Ọzọ, ihe àmà Gị nile bụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu . . . Ihe nke ihe nile I nyere n’iwu ga-atọkwa m ụtọ nke ukwuu, bụ́ nke m hụworo n’anya. Ka obi ebere Gị nile bịakwute m, ka m wee dị ndụ; n’ihi na iwu Gị bụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu. Achọsiwo m nzọpụta Gị ike, Jehova; iwu Gị bụkwa ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu.”—Abụ Ọma 119:16, 24, 47, 77, 174.

7, 8. (a) Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, gịnị ka Okwu Chineke ‘ịtọ mmadụ ụtọ nke ukwuu’ pụtara? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere maka Okwu Jehova? (ch) Olee otú Ezra si dozie onwe ya tupu ya agụọ Iwu Jehova?

7 N’ịkọwa okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “ga-atọ m ụtọ nke ukwuu” n’Abụ Ọma nke 119, otu akwụkwọ ọkọwa okwu nke na-akọwa Akwụkwọ Nsọ Hibru na-ekwu, sị: “N’otú e si jiri ya mee ihe n’amaokwu nke 16, o yiri [ngwaa] e ji eme ihe maka ịṅụrị ọṅụ . . . nakwa ntụgharị uche . . . Okwu ndị yiri ya bụ; ṅụrịa ọṅụ, tụgharịa uche, nwee obi ụtọ n’ihe . . . Njikọ a pụrụ inye echiche na mmadụ iji nzube obi na-atụgharị uche bụ ụzọ okwu Yahweh ga-esi na-atọ ya ụtọ. . . . Ihe ọ pụtara na-agụnye ihe na-akpali mmasị.” *

8 Ee, ịhụnanya anyị nwere maka Okwu Jehova kwesịrị isi anyị n’obi, bụ́ ebe e si enwe mmetụta uche. O kwesịrị ịdị na-atọ anyị ụtọ ịtụgharị uche n’ihe ụfọdụ ndị anyị ka gụchara nnọọ. Anyị kwesịrị ichebara ihe ime mmụọ ndị miri emi echiche, tinye uche anyị na ha, ma na-atụgharị uche na ha. Nke a na-achọ iche echiche n’ụzọ dị jụụ na ekpere. Dị ka Ezra, ọ dị anyị mkpa idozi obi anyị maka ịgụ na ịmụ Okwu Chineke. E dere banyere ya, sị: “Ezra doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ Ya na ikpe Ya n’Israel.” (Ezra 7:10) Rịba ama nzube atọ Ezra ji maka ha dozie obi ya: ịmụ ihe, itinye ihe ọ mụtara n’ọrụ, na izi ihe. Anyị kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya ya.

Ọmụmụ Ihe Dị Ka Ife Ofufe

9, 10. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ọbụ abụ ahụ si tụgharịa uche n’Okwu Jehova? (b) Gịnị ka ngwaa Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘mmadụ ịtụgharị uche’ pụtara? (ch) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị were ọmụmụ Bible dị ka “ife ofufe”?

9 Ọbụ abụ ahụ kwuru na ya tụgharịrị uche n’iwu na ihe ncheta Jehova. Ọ na-abụ, sị: “N’ihe ịrịba ama Gị nile ka m ga-atụgharị uche, m ga-elegidekwa ụzọ Gị nile anya. M ga-achịlikwara ihe nile I nyere n’iwu ọbọ aka m, bụ́ ihe nke m hụworo n’anya; m [ga-enwekwa nchegbu] n’ụkpụrụ Gị nile. Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya! Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche. Karịa ndị nile na-ezi m ihe ka m nwere uche; n’ihi na ihe àmà Gị nile bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:15, 48, 97, 99) Gịnị ka ‘mmadụ ịtụgharị uche’ n’Okwu Jehova pụtara?

10 Ngwaa Hibru a sụgharịrị ịbụ ‘mmadụ ịtụgharị uche’ pụtakwara “ichebara ihe echiche,” “icheghachi echiche n’ihe.” “E ji ya eme ihe maka iche echiche n’ụzọ dị jụụ n’ọrụ Chineke . . . nakwa n’okwu Chineke.” (Theological Wordbook of the Old Testament) Ụdị mkpọaha ya bụ́ “nchegbu” na-ezo aka ná “ntụgharị uche nke ọbụ abụ ahụ,” “ọmụmụ o ji ịhụnanya na-amụ” iwu Chineke, dị ka “ife ofufe.” Iwere ịmụ Okwu Chineke dị ka akụkụ nke ofufe anyị na-eme ka anyị jiri ya kpọrọkwuo ihe. Ya mere, e kwesịrị iji nlezianya na ekpere, nke a na-erita uru na ya, na-eme ya. Ọmụmụ ihe bụ akụkụ nke ofufe anyị, anyị na-emekwa ya iji mee ka ofufe anyị ka mma.

Igwumikwu n’Ime Okwu Chineke

11. Olee otú Jehova si ekpughere ndị ya echiche ime mmụọ miri emi?

11 Ọbụ abụ ahụ ji nsọpụrụ dị ukwuu kwuo, sị: “Lee ka ọrụ gị nile si dị ukwuu, Jehova! Echiche Gị miri emi nke ukwuu.” (Abụ Ọma 92:5) Pọl onyeozi kwukwara banyere “ihe nile dị omimi nke Chineke,” echiche ndị miri emi nke Jehova na-ekpughere ndị ya “site n’aka Mmụọ Nsọ” nke na-arụ ọrụ n’ebe òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche nọ. (1 Ndị Kọrint 2:10; Matiu 24:45) Òtù ohu ahụ ji ịdị uchu na-enye mmadụ nile nri ime mmụọ—“mmiri ara” maka ndị ọhụrụ ma “nri siri ike” maka “ndị tozuru okè.”—Ndị Hibru 5:11-14.

12. Nye ihe atụ nke “ihe nile dị omimi nke Chineke” bụ́ nke òtù ohu ahụ kọwaworo.

12 Iji ghọta ihe ndị dị otú ahụ “dị omimi nke Chineke,” ọ dị mkpa iji ekpere na-amụ ihe ma na-atụgharị uche n’Okwu ya. Dị ka ihe atụ, e bipụtawo ọmarịcha isiokwu ndị na-egosi otú Jehova pụrụ isi kpee ikpe ziri ezi ma mee ebere n’otu mgbe ahụ. Ya ime ebere abụghị ime ka ikpe ya ghara izicha ezi; kama, ebere Chineke bụ ngosipụta nke ikpe ziri ezi nakwa ịhụnanya ya. Mgbe Jehova na-ekpe onye mmehie ikpe, ọ na-ebu ụzọ achọpụta ma ò kwere omume ime ebere ná ndabere nke àjà mgbapụta nke Ọkpara ya. Ọ bụrụ na onye mmehie ahụ enweghị nchegharị ma ọ bụ na-enupụ isi, Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi n’emeghị ebere na-enweghị isi. N’ọnọdụ nke ọ bụla, ọ na-ekwesị ntụkwasị obi nye ụkpụrụ ya ndị dị elu. * (Ndị Rom 3:21-26) ‘Aa! omimi nke amamihe nke Chineke!’—Ndị Rom 11:33.

13. Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-egosipụta ekele maka “ọnụ ọgụgụ nile” nke eziokwu ime mmụọ e kpugheworo ka ọ dị ugbu a?

13 Dị ka ọbụ abụ ahụ, anyị na-enwe mkpali n’eziokwu ahụ bụ́ na Jehova na-eme ka anyị mata ọtụtụ n’ime echiche ya. Devid dere, sị: “Lee ka echiche Gị nile si dị oké ọnụ ahịa n’anya m, Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne! Ọ bụrụ na agụọ m ha ọnụ, ha bara ụba karịa ájá.” (Abụ Ọma 139:17, 18) Ọ bụ ezie na ihe ọmụma anyị nwere taa na-anọchi anya nanị akụkụ dị nta nke echiche a na-apụghị ịgụta ọnụ nke Jehova ga-ekpughe ruo mgbe ebighị ebi, anyị na-enwe ekele miri emi ‘n’ọnụ ọgụgụ nile’ nke eziokwu ime mmụọ dị oké ọnụ ahịa e kpughewooro anyị ka ọ dị ugbu a ma na-egwumikwu mgbe nile n’ime ọnụ ọgụgụ, ma ọ bụ ihe ndị bụ́ isi, nke Okwu Chineke.—Abụ Ọma 119:160, ihe odide ala ala peeji nke NW.

Mgbalị na Ngwá Ọrụ Ndị Dị Irè Dị Mkpa

14. Olee otú Ilu 2:1-6 si emesi ike mkpa mgbalị dị n’ịmụ Okwu Chineke?

14 Ịmụ Bible n’ụzọ miri emi na-achọ mgbalị. Eziokwu a na-apụtakwu nnọọ ìhè site n’iji nlezianya gụọ Ilu 2:1-6. Rịba ama ngwaa ime ihe ndị Eze Solomọn ji mee ihe iji mesie mgbalị a chọrọ iji nweta ihe ọmụma, amamihe, na nghọta Chineke, ike. O dere, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, ọmụmụ ihe nke na-akwụghachi ụgwọ na-achọ ime nnyocha, igwu ihe, dị ka a ga-asị na a na-achọ akụ̀ zoro ezo.

15. Ihe atụ dị aṅaa nke Bible na-egosi mkpa inwe usoro ọmụmụ ihe dị mma dị?

15 Ọmụmụ ihe nke na-akwụghachi ụgwọ n’ụzọ ime mmụọ na-achọkwa inwe usoro ọmụmụ ihe dị mma. Solomọn dere, sị: “Ọ bụrụ na ígwè anyụọ nkọ, ma onye ahụ amụghị ihu ya amụ, ọ ga-etinyekwa ike karị.” (Eklisiastis 10:10) Ọ bụrụ na onye ọrụ ejiri mma na-adịghị nkọ na-arụ ọrụ ma ọ bụ ọ bụrụ na o jighị nkà jiri ya na-arụ ọrụ, ọ ga-ala ike ya n’iyi, ọrụ ya agaghịkwa adị mma. N’otu aka ahụ, uru ndị a na-erite n’oge e ji mụọ ihe pụrụ ịdịgasị iche n’ụzọ dị ukwuu, na-adabere n’usoro anyị ji amụ ihe. A pụrụ ịhụ ọmarịcha aro ndị dị irè maka imeziwanye ụzọ anyị si amụ ihe n’Ihe Ọmụmụ nke 7 nke Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke. *

16. Olee aro ndị dị irè a tụrụ iji nyere anyị aka inwe ọmụmụ ihe miri emi?

16 Mgbe omenkà na-amalite ọrụ ya, ọ na-ewepụta ngwá ọrụ ndị ga-adị ya mkpa. N’otu aka ahụ, mgbe anyị na-amalite ịmụ ihe, anyị kwesịrị isi n’ọ́bá akwụkwọ anyị họrọ akwụkwọ ndị ga-adị anyị mkpa. N’icheta na ọmụmụ ihe bụ ọrụ ma na-achọ itinye uche n’ihe, ọ dịkwa mma ịnọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka uche anyị dị nkọ, ịnọdụ ala n’oche e dewere tebụl ma ọ bụ desk n’ihu ya pụrụ ịdị irè karịa idina n’elu àkwà ma ọ bụ ịnọdụ ala n’oche nwere aka ma dị ntụsara ahụ. Mgbe i tinyesịrị uche na ya ruo oge ụfọdụ, ọ pụrụ ịbara gị uru ịgbatị onwe gị ma ọ bụ ịpụ n’èzí iji nara ikuku ndụ.

17, 18. Nye ihe atụ nke otú e si eji ngwá ọrụ ndị e ji amụ ihe bụ́ ndị i nwere eme ihe.

17 Anyị nwekwara ọtụtụ ngwá ọrụ na-enweghị atụ e ji amụ ihe. Nke mbụ n’ime ha bụ Bible New World Translation, nke dị ugbu a n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya n’asụsụ 37. Mbipụta nke mbụ nke New World Translation nwere ntụaka na “Ndepụta nke Akwụkwọ Ndị Dị na Bible” bụ́ ebe e depụtara aha onye dere ya, ebe a nọ dee ya, na ogologo oge o were. O nwekwara ndepụta ntụaka nke okwu ndị dị na Bible, ihe odide ntụkwasị, na map. N’asụsụ ụfọdụ, e bipụtara Bible a n’ụdị ka ibu, bụ́ nke a maara dị ka Reference Bible. O nwere ihe nile a e kwuru n’elu na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, gụnyere ihe odide ala ala peeji sara mbara, bụ́ ndị nwekwara ndepụta ntụaka. Ị̀ na-ejizu ihe e nwere n’asụsụ gị eme ihe iji nyere gị aka igwumikwu n’ime Okwu Chineke?

18 Ngwá ọrụ ọzọ dị oké ọnụ ahịa e ji amụ ihe bụ akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible ahụ dị mpịakọta abụọ bụ́ Insight on the Scriptures. Ọ bụrụ na i nwere akwụkwọ a n’asụsụ ị pụrụ ịghọta, i kwesịrị iji ya na-eme ihe mgbe ọ bụla ị na-amụ ihe. Ọ ga-enye gị ihe ọmụma banyere ihe ka ọtụtụ n’isiokwu ndị dị na Bible. Ngwá ọrụ ọzọ yiri ya nke na-enye aka bụ akwụkwọ bụ́ “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial.” Mgbe ị na-amalite ịgụ akwụkwọ ọhụrụ nke Bible, ọ dị mma ịtụle ihe ọmụmụ ya na ya kwekọrọ n’akwụkwọ“All Scripture” iji mara ebe ihe ndị dị na ya mere na akụkọ ndị gbara ya gburugburu, tinyere nchịkọta nke ihe ndị dị n’akwụkwọ Bible ahụ na uru ha baara anyị. Ngwá ọrụ ọzọ a tụkwasịrị n’oge na-adịbeghị anya n’elu ngwá ọrụ ndị a e bipụtara ebipụta bụ́ ndị e ji amụ ihe bụ Watchtower Library nke na-arụ ọrụ na kọmputa, nke dị n’asụsụ itoolu ugbu a.

19. (a) N’ihi gịnị ka Jehova jiworo nye anyị ngwá ọrụ ndị dị mma maka ọmụmụ Bible? (b) Gịnị dị mkpa iji na-agụ ma na-amụ Bible n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

19 Jehova ewepụtawo ngwá ọrụ a nile site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” iji mee ka ndị ohu ya nọ n’ụwa nwee ike ‘ịchọ ma chọta ihe ọmụma Chineke.’ (Ilu 2:4, 5) Inwe àgwà ọmụmụ ihe dị mma na-enyere anyị aka inweta ihe ọmụma ka mma banyere Jehova na iso ya na-enwe mmekọrịta chiri anya karị. (Abụ Ọma 63:1-8) Ee, ọmụmụ ihe bụ ọrụ, ma ọ bụ ọrụ na-atọ ụtọ ma na-akwụghachi ụgwọ. Otú ọ dị, ọ na-ewe oge, ma eleghị anya ị na-eche, sị, ‘Olee ebe m pụrụ isi nweta oge m ga-eji elebara ọgụgụ Bible na ọmụmụ ihe onwe onye m anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?’ A ga-atụle akụkụ a n’isiokwu ikpeazụ nke usoro isiokwu a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 New International Dictionary of Old Testament Theology & Exegesis, Mpịakọta nke 4, peeji nke 205–207.

^ par. 12 Lee Ụlọ Nche, August 1, 1998, peeji nke 13, paragraf nke 7. Dị ka ihe omume ị ga-eme n’ọmụmụ Bible gị, ị pụrụ ịtụle isiokwu abụọ ahụ dịịrị ọmụmụ ná mbipụta ahụ nakwa isiokwu ndị bụ́ “Ikpe Ziri Ezi,” “Ebere,” na “Ezi Omume” n’akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible bụ́ Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 15 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ajụjụ Ntụleghachi

• Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe onwe onye anyị bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ma na-akwụghachi ụgwọ?

• Dị ka ọbụ abụ ahụ, olee otú anyị pụrụ isi na-egosi ‘mmasị’ ma ‘na-atụgharị uche’ n’Okwu Jehova?

• Olee otú Ilu 2:1-6 si egosi mkpa mgbalị dị n’ịmụ Okwu Chineke?

• Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa e ji amụ ihe ka Jehova wepụtaworo?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 14]

Iche echiche n’ụzọ dị jụụ na ekpere na-enyere anyị aka ịzụlite ịhụnanya maka Okwu Chineke

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ị̀ na-ejizu ngwá ọrụ ndị e ji amụ ihe eme ihe iji gwumikwuo n’ime Okwu Chineke?