Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Ji Ihe Nketa Pụrụ Iche Gọzie M

E Ji Ihe Nketa Pụrụ Iche Gọzie M

Akụkọ Ndụ

E Ji Ihe Nketa Pụrụ Iche Gọzie M

DỊ KA CAROL ALLEN SI KỌỌ

Ọ bụ nanị m nọ, ka m jigidesiri ọmarịcha akwụkwọ ọhụrụ m ike. Ụjọ jidere m, anya mmiri na-asọdakwa m n’ihu. E kwuwerị, abụ m nanị nwata nwanyị dị afọ asaa, nke nọ n’otu obodo ọ na-amaghị, nke ọtụtụ iri puku ndị mmadụ gbara gburugburu!

NA NSO nso a, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 mgbe nke ahụ gasịrị, nleta mụ na di m, bụ́ Paul, letara Ogige Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, chetaghachiiri m ahụmahụ ahụ m nwere n’oge m bụ nwatakịrị. A kpọrọ ya ịbịa n’ebe ahụ maka klas nke abụọ nke ụlọ akwụkwọ maka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova.

Ka anyị na-elegharị anya n’ebe a na-anabata ndị ọbịa bụ́ nke anyanwụ mere ka ìhè dịrị na ya, ahụrụ m nnukwu ebe a mapawasịrị ihe osise bụ́ nke e dekwasịrị n’elu ha “MGBAKỌ DỊ ICHE ICHE.” N’ebe etiti ya ka otu foto ochie dị nke nwere àgwà ọcha na àgwà ojii nanị nke ụmụ ntakịrị na-efegharị akwụkwọ nke ha bụ́ ụdị ahụ m nwetara n’oge m bụ nwatakịrị! Ngwa ngwa, agụrụ m okwu nkọwa dị na foto ahụ: “1941—Na St. Louis, Missouri, mgbe usoro ihe omume nke ụtụtụ meghere, ụmụaka 15,000—ndị dị n’agbata afọ 5 na 18—gbakọtara n’ime ọgbọ egwuregwu ahụ kpọmkwem n’ihu ikpo okwu. . . . Nwanna Rutherford kwupụtara mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Children.”

E nyere nwata ọ bụla otu. Ụmụaka ahụ laghachiziri n’ebe nne na nna ha nọ—ha nile ma e wezụga m. Amaghị m ebe m nọ! Otu onye na-enye ndị mmadụ oche bụ́ onye nwere omume enyi kuuru m ma guzo m n’elu otu igbe onyinye toro ogologo ma gwa m ka m legharịa anya ma m ga-ahụ onye m maara. N’ahụ erughị ala, enyobara m anya n’etiti ìgwè mmadụ ahụ si na steepụ ahụ dị obosara na-enuda. Na mberede, ahụrụ m onye m maara! “Deede Bob! Deede Bob!” Achọtara m! Bob Rainer kpọọrọ m gaa n’ebe nne na nna m nọ na-eche m n’ahụ erughị ala.

Ihe Omume Ndị Mbụ Bụ́ Ndị Kpụziri Ndụ M

Ile anya n’ihe osise ahụ chetaghachiiri m ọtụtụ ihe—ihe omume ndị kpụziri ndụ m ma duga n’anyị ịnọ n’ọmarịcha ihe owuwu Patterson ahụ. Echetaziri m ihe ndị mere n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga, bụ́ ihe ndị m nụrụ karịsịa site n’ọnụ nne na nna m ochie na nne na nna m.

Na December 1894, otu onye ozi oge nile nke Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, kpọtụụrụ nna m ochie, bụ́ Clayton J. Woodworth, n’ebe obibi ya dị na Scranton, Pennsylvania, U.S.A. Clayton ka lụrụ nwunye ọhụrụ. O degaara onyeisi oche Watch Tower Bible and Tract Society, bụ́ Charles Taze Russell, akwụkwọ ozi, e bipụtakwara ya n’Ụlọ Nche (Bekee) nke June 15, 1895. Ọ kọwara sị:

“Anyị bụ di na nwunye na-akatabeghị ahụ bụ́ ndị kpeworo otu chọọchị na-efe ofufe n’ọnụ ruo afọ iri; ma ugbu a, anyị nwere ntụkwasị obi na anyị na-esi n’ọchịchịrị ya na-abanye n’ìhè nke ụbọchị ọhụrụ na-abọziri ụmụ dị nsọ nke Onye Kasị Ihe Nile Elu. . . . Ogologo oge tupu anyị ezute onwe anyị, ọ bụwo ọchịchọ anyị siri ike ijere Onyenwe anyị ozi, ikekwe, ya bụrụ uche ya, dị ka ndị ozi ala ọzọ n’ubi ala ọzọ.”

Mgbe e mesịrị, na 1903, Sebastian na Catherine Kresge, bụ́ ndị mụrụ nne mụtara mama m ji obi ụtọ gee ntị n’ozi Bible nke ndị nnọchiteanya abụọ nke Watch Tower ji bịa ná nnukwu ugbo ha bi, n’Ugwu Pocono mara mma nke Pennsylvania. Ụmụ ha ndị inyom, bụ́ Cora na Mary, sokwa di ha, bụ́ Washington na Edmund Howell, biri n’ebe ahụ. Ndị nnọchiteanya Watch Tower ahụ, bụ́ Carl Hammerle na Ray Ratcliffe, nọnyeere ha ruo otu izu zuru ezu, na-akụziri ha ọtụtụ ihe. Mmadụ isii nile ahụ so n’ezinụlọ ahụ gere ntị, mụọ ihe, ma ghọọ Ndị Mmụta Bible na-anụ ọkụ n’obi n’oge na-adịghị anya.

Kpọmkwem n’afọ ahụ, bụ́ 1903, Cora na Washington Howell nwetara nwa nwanyị aha ya bụ Catherine. Akụkọ banyere otú o si mesịa lụọ nna m, bụ́ Clayton J. Woodworth, Jr., na-akpali mmasị, echekwara m na ọ bara uru. Ọ na-ekpughe nghọta ịhụnanya na nchebara echiche nke nna m ochie bụ́ Clayton J. Woodworth, Sr. nwere.

Nna M Enweta Enyemaka Ịhụnanya

A mụrụ nna m, bụ́ Clayton nke nta, na Scranton na 1906, n’ebe dị ihe dị ka kilomita 80 ma ọ bụ ihe yiri ya site n’ugbo ndị ezinụlọ Howell ahụ. N’afọ ndị mbụ ahụ, nna m ochie bụ́ Woodworth bịara mara ezinụlọ buru ibu nke Howell nke ọma, mgbe mgbe ha na-ele ya ọbịa bụ́ ihe e ji mara ha. O nyeere ọgbakọ Ndị Mmụta Bible dị n’ógbè ahụ aka nke ukwuu. Ka oge na-aga, a kpọrọ nna m ochie ikwu okwu agbamakwụkwọ nke ụmụ atọ nke ndị ezinụlọ Howell, n’iburukwa ọdịmma nke nwa ya nwoke n’obi, ọ kpọọrọ ya gaa nke ọ bụla n’ime agbamakwụkwọ ndị a.

N’oge ahụ, papa m ekerechiwebeghị òkè anya n’ozi nke Ndị Mmụta Bible. N’eziokwu, ọ na-akwọrọ nna m ochie n’ụgbọala aga nleta ozi ndị ọ na-eme, ma n’agbanyeghị agbamume nna m ochie na-enye ya, papa m ekereghị òkè chiri anya n’onwe ya. N’oge ahụ, mmasị nna m nwere n’egwú karịrị ihe nile ọzọ, ọ nọkwa na-eru n’ókè nke ịghọ ọrụ ọ bụ ọkachamara na ya.

Catherine, bụ́ ada Cora na Washington Howell, aghọwokwa oti egwú maara nke a na-akọ, ọ na-apị ma na-akụzi otú e si apị piano. Ma ka ọ na-aga ịbụ ọkachamara n’ọrụ ahụ, ọ hapụrụ nchụso ahụ ma malite ikere òkè n’ozi oge nile. Ọ dịghị onye ọzọ nna m ochie gaara ebu n’uche ka nwa ya nwoke lụọ—ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’echiche nke m! E mere papa m baptism, ọ lụkwara mama m mgbe ọnwa isii gasịrị, na June 1931.

Nna m ochie na-enwe obi ụtọ mgbe nile maka nkà egwú nwa ya nwoke nwere. O nwere obi ụtọ nke ukwuu mgbe a gwara papa m ka o nye ìgwè bụ́ isi nke nnukwu ìgwè ndị egwú nke mgbakọ ọzụzụ maka mgbakọ mba nile nke 1946 e nwere na Cleveland, Ohio. N’afọ ndị sochirinụ, papa m duziri ìgwè ndị egwú n’ọtụtụ mgbakọ ndị ọzọ nke Ndịàmà Jehova.

Ikpe Nna M Ochie Ikpe na Ndụ Ya n’Ụlọ Mkpọrọ

N’ebe ahụ a na-anabata ndị ọbịa na Patterson, mụ na Paul hụkwara ihe ngosi nke nwere foto ahụ dị na peeji na-esonụ. Amatara m foto ahụ ozugbo ebe ọ bụ na nna m ochie ziteere m otu n’ihe karịrị nnọọ afọ 50 gara aga. Ọ bụ nna m ochie guzo n’isi isi aka nri.

N’oge oké ịhụ mba n’anya nke e nwere n’oge Agha Ụwa Mbụ, a tụrụ Ndị Mmụta Bible asatọ a—gụnyere Joseph F. Rutherford (nọ n’etiti), bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society—mkpọrọ ma jichie ha n’ụzọ na-ezighị ezi, n’ekweghị ka a gbapụta ha agbapụta. Ebubo ndị e boro ha hiwere isi n’okwu ndị dị ná mpịakọta nke asaa nke Studies in the Scriptures, bụ́ nke aha ya bụ The Finished Mystery. A ghọtahiere okwu ndị ahụ dị ka nke ga-akụda United States mmụọ ikere òkè n’Agha Ụwa Mbụ.

N’ime ọtụtụ afọ, Charles Taze Russell edewo mpịakọta isii ndị mbụ nke Studies in the Scriptures, ma ọ nwụrụ tupu e dee nke asaa. Ya mere, e nyere nna m ochie na Onye Mmụta Bible ọzọ ihe ndekọ ndị o dere, ha edezie mpịakọta nke asaa. E wepụtara nke a na 1917, tupu agha ahụ ebie. N’ikpe ahụ, a mara nna m ochie na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ọzọ ahụ ikpe ụzọ anọ nke ha ga-anọ mkpọrọ afọ 20 maka nke ọ bụla.

Okwu nkọwa dị na foto ahụ dị n’ebe a na-anabata ndị ọbịa na Patterson na-akọwa, sị: “Ọnwa itoolu mgbe a masịrị Rutherford na ndị enyi ya ikpe—ka agha bisiwokwara—na March 21, 1919, ụlọikpe mkpegharị ikpe nyere iwu ka a gbapụta mmadụ asatọ nile ahụ na-azara ọnụ ha, na March 26 kwa, a tọhapụrụ ha na Brooklyn mgbe a kwụrụ ụgwọ mgbapụta nke $10,000 n’isi onye nke ọ bụla. Na May 5, 1920, e kwuru na J. F. Rutherford na ndị ọzọ ahụ emeghị ihe ahụ e boro ha ebubo ya.”

Mgbe a masịrị ha ikpe, ma tupu a kpọga ha n’ụlọ mkpọrọ gọọmenti etiti dị n’Atlanta, Georgia, mmadụ asatọ ahụ nọrọ ụbọchị ole ole ndị mbụ nke mkpọrọ ha n’ụlọ nga dị na Raymond Street dị na Brooklyn, New York. Nna m ochie si n’ebe ahụ dee akwụkwọ na-akọwa na e debere ya n’ụlọ nga dị mita 1.8 n’obosara na 2.4 n’ogologo “n’etiti unyi na ọgba aghara dị egwu.” O kwuru, sị: “E nwere ikpo akwụkwọ akụkọ dị n’ebe ahụ, ị nwaa ileghara ha anya na mbụ, n’oge na-adịghị anya ị ga-achọpụta na akwụkwọ ndị ahụ na ncha na nkịrịka ákwà nhicha ahụ dị n’ebe ahụ, bụ nanị ihe i nwere ike iji na-edebetụ onwe gị ọcha ma na-enwe ùgwù onwe onye.”

Ma, nna m ochie nọgidere na-enwe omume ịkpa ọchị, o zoro aka n’ụlọ nga ahụ dị ka “Hôtel de Raymondie,” na-arịba ama, sị, “aga m ahapụ ebe a ozugbo nri m gwụsịrị.” Ọ kọwakwara ngagharị ọ na-eme n’ogige ahụ. N’otu oge mgbe ọ kwụsịtụrụ iji bọọ isi ya, otu onye aka n’akpa dọọrọ elekere akpa uwe ya, ma dị ka o si dee, “Chen ya dọbiri o wee wụnyekwa m n’akpa.” Mgbe m gara Betel dị na Brooklyn na 1958, Grant Suiter, bụ́ odeakwụkwọ na onye nchebe ego nke Watch Tower Society n’oge ahụ, kpọbatara m n’ọfịs ya ma nye m elekere ahụ. Ọ ka bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nye m.

Mmetụta Ihe Ndị ahụ Nwere n’Ebe Nna M Nọ

Mgbe a tụrụ nna m ochie mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi na 1918, nna m dị nanị afọ 12. Nne m ochie kpọchiri ebe obibi ha ma kpọrọ ya gaa ibinyere nne ya na ụmụnne ya ndị inyom atọ. Aha nna nne m ochie n’oge ọ na-alụbeghị di bụ Arthur, ezinụlọ ha jikwa nganga na-azọrọ na otu n’ime ndị ikwu ha, bụ́ Chester Alan Arthur, bụbu president nke 21 nke United States.

Mgbe a masịrị nna m ochie bụ́ Woodworth ikpe ịnọ mkpọrọ ruo ogologo oge maka ịbụ onye e boro ebubo ime mpụ megide United States, o doro anya na ndị ezinụlọ Arthur weere ya na o mebiwo aha ezinụlọ ha. Ọ bụụrụ nna m oge ihe mgbu nke mmetụta uche. Ikekwe mmeso dị otú ahụ tụnyere ụtụ n’ọjụjụ ọ jụrụ na mbụ ikere òkè n’ozi ihu ọha.

Mgbe a tọhapụrụ nna m ochie n’ụlọ mkpọrọ, ọ kpọọrọ ezinụlọ ya kwaga n’otu ụlọ e ji blọk rụọ na Quincy Street dị na Scranton. Dị ka nwatakịrị, amaara m ya—na ọmarịcha efere ájá nne m ochie—nke ọma. Anyị na-akpọ ha efere ya ndị dị nsọ n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ e kwere ka ọ na-asacha ha ma e wezụga nne m ochie. Mgbe nne m ochie nwụsịrị na 1943, mama m na-ejikarị efere ndị ahụ mara mma eri ihe.

Iji Ọrụ n’Aka n’Ozi Alaeze

N’ụbọchị ọzọ n’ogige Patterson ahụ, ahụrụ m otu foto Nwanna Rutherford ebe ọ na-ekwu okwu ná mgbakọ 1919 e nwere na Cedar Point Ohio. N’ebe ahụ, ọ gbara mmadụ nile ume iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ikwupụta Alaeze Chineke na iji magazin ọhụrụ e wepụtara ná mgbakọ ahụ, bụ́ The Golden Age mee ihe. A họpụtara nna m ochie ịbụ editọ ya, o sokwa dee isiokwu dị iche iche na ya ruo n’afọ ndị 1940, obere oge tupu ọnwụ ya. Na 1937, a gbanwere aha magazin ahụ ịbụ Consolation, na 1946, a gbanwekwara ya ịbụ Teta!

Nna m ochie dere ihe odide ya ma n’ụlọ anyị dị na Scranton ma n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower dị na Brooklyn, bụ́ nke ji ihe dị ka kilomita 240 dịpụ adịpụ, na-anọ izu abụọ n’otu mgbe n’ebe nke ọ bụla. Papa m kwuru na ya na-echeta ka ụda ígwè typewriter nna m ochie na-ada n’elekere anya ise n’ọtụtụ ụtụtụ. Ma, nna m ochie jikwa ibu ọrụ nke ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa ihu ọha kpọrọ oké ihe. N’ezie, ọ kwara uwe ụmụ nwoke nke nwere akpa ndị buru ibu n’ime ha bụ́ ndị na-aba akwụkwọ e ji amụ Bible. Nwunye nwanne nne m nke nwoke bụ́ Naomi Howell, nke dị afọ 94, ka nwere otu. Ọ kwakwara akpa akwụkwọ maka ụmụ nwanyị.

Otu oge, mgbe nna m ochie sosịrị mmadụ nwee nkwurịta okwu Bible na-akpali akpali, onye ya na nna m ochie na-ejekọ ozi kwuru, sị: “C. J., i mehiere otu ihe.”

“Gịnị ka m mehiere?” ka nna m ochie jụrụ. Ọ manye aka n’akpa uwe ya. O nweghị ihe dị n’akpa abụọ ahụ.

“I chefuru inyefe ya ụtụ The Golden Age.” Ha chịrị nnọọ ezigbo ọchị banyere nchefu onye editọ chefuru inyefe magazin ya.

Ihe Ndị M Na-echeta Banyere Oge M Na-eto Eto

Echetara m oge m nọdụrụ n’apata nna m ochie dị ka nwatakịrị, obere aka m dị n’aka ya ka ọ na-akọrọ m “Akụkọ Mkpịsị Aka.” N’ịmalite na “Mkpịsị Aka Ukwu bụ́ Tommy” gaa na “Mkpịsị Aka Na-esote nke Ukwu bụ́ Peter,” ọ kọọrọ m ihe pụrụ iche banyere mkpịsị aka nke ọ bụla. E mesịa, o ji nwayọọ chịkọta mkpịsị aka nile ahụ ka ọ na-enye ihe mmụta dị na ya: “Ha na-arụpụta ihe kasị mma site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ, nke ọ bụla ana-enyere ndị ọzọ nile aka.”

Mgbe nne na nna m lụsịrị, ha kwagara Cleveland, Ohio, ma ghọọ ezigbo ndị enyi Ed na Mary Hooper. Ezinụlọ ha abụwo Ndị Mmụta Bible kemgbe narị afọ ahụ malitere. Nne na nna m na Deede Ed na Daada Mary, dị ka m si akpọ ha, bụ a hụghị ikwe a sụghị ụtara. Otu nwa ezinụlọ Hooper ahụ mụtara, nwata nwanyị, nwụnahụrụ ha, ya mere mgbe a mụrụ m na 1934, aghọrọ m ‘nwa ha nwanyị’ pụrụ iche. N’ịbụ onye a zụlitere na gburugburu ebe obibi e ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe otú ahụ, araara m onwe m nye Chineke, e mekwara m baptism tupu m gbaa afọ asatọ.

Ọgụgụ Bible bụ akụkụ nke ndụ m n’oge m bụ nwata. Nkọwa a kọwara ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke n’Aịsaịa 11:6-9 bụ otu n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị kasị amasị m. Mgbalị mbụ m mere ịgụcha Bible bụ na 1944, mgbe m nwetasịrị American Standard Version nke m, bụ́ nke e wepụtara ná nsụgharị ya pụrụ iche ná mgbakọ e nwere na Buffalo, New York. Lee mkpali m nwere ịgụ nsụgharị a bụ́ ebe e weghachiworo aha Chineke, bụ́ Jehova, gaa n’ebe ndị o kwesịrị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 ‘n’Agba Ochie’!

Ngwụsị izu na-abụ oge obi ụtọ. Nne na nna m na ndị ezinụlọ Hooper na-akpọrọ m aga ime nkwusa n’ime ime obodo. Anyị na-eburu nri ehihie ma mee mkpapụ ntụrụndụ n’iyi. E mesịa, anyị agaa n’ugbo mmadụ maka okwu a ga-anọ n’èzí kwuo bụ́ nke anyị na-akpọ ndị agbata obi nile òkù ịbịa gere. Ndụ dị mfe. Anyị nwere ọṅụ dị ka ezinụlọ. Ọtụtụ n’ime ezinụlọ ndị mbụ a anyị na ha bụ enyi mesịrị ghọọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, gụnyere Ed Hooper, Bob Rainer, na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Richard Rainer ka na-arụ ọrụ a, ya na nwunye ya, bụ́ Linda.

Oge okpomọkụ na-abụkarị oge obi ụtọ. Mụ na ụmụ nwanne nne m na-anọ n’ugbo ndị ezinụlọ Howell. Na 1949, nwa nwanne nne m bụ́ Grace lụrụ Malcolm Allen. Amaghị m na m ga-emecha lụọ nwanne ya nwoke n’afọ ndị dị n’ihu. Nwa nwanne nne m nke Grace tọrọ bụ́ Marion bụ onye ozi ala ọzọ na Uruguay. Ọ lụrụ Howard Hilborn na 1966. Ụmụ nwanne nne m ndị a sooro di ha jee ozi n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn ruo ọtụtụ afọ.

Nna M Ochie na Ngụsị Akwụkwọ M

N’oge m na-aga kọleji, nna m ochie bụ onye na-enwe ọchịchọ idetara m akwụkwọ ozi. Akwụkwọ ozi ndị o dere na-ebu ọtụtụ foto ochie nke ezinụlọ ya ndị a na-eji ígwè typewriter ede nkọwa zuru ezu n’azụ ha, na-akọrọ m akụkọ ezinụlọ ya. Ọ bụ otú ahụ ka m si nweta otu n’ime foto ahụ ya na ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi nọ na ya.

Ka ọ na-erule ngwụsị nke 1951, nna m ochie enweghịzi ike ikwu okwu n’ihi ọrịa cancer akpịrị. Ọ ka nwere ụbụrụ na-aghọ nkọ, ma ọ ghaghị idetu ihe ọ chọrọ ikwu n’otu obere akwụkwọ ọ na-eji mgbe nile. Klas m na kọleji ga-agụsị akwụkwọ n’etiti tam, na January 1952. Ná mmalite December, ezigaara m nna m ochie akwụkwọ m ji detuo okwu m ga-ekwu n’ụbọchị ngụsị akwụkwọ anyị. O dezigharịrị ihe ụfọdụ, mgbe ahụ, na peeji ikpeazụ, o dere okwu isii nke bara m n’obi ozugbo: “Nna gị ochie nwere obi ụtọ.” O jesịrị ozi elu ala ya mgbe ọ dị afọ 81, na December 18, 1951. * M ka ji akwụkwọ ahụ chanwụworo achụnwụ m dere okwu m ga-ekwu n’oge ngụsị akwụkwọ m bụ́ nke okwu isii ahụ dị na peeji ikpeazụ ya.

Ozugbo m gụsịrị akwụkwọ, amalitere m ozi ọsụ ụzọ, dị ka Ndịàmà Jehova na-akpọ ọrụ nkwusa oge nile. Na 1958, agara m mgbakọ ukwu ahụ e nwere na New York City, bụ́ ebe ọnụ ọgụgụ kasị elu nke mmadụ 253,922 si mba 123 jupụtara n’Ámá Egwuregwu Yankee na Polo Grounds. N’ebe ahụ, n’otu ụbọchị, ezutere m otu onye si Africa bịa mgbakọ ahụ bụ́ onye mapawara baajị e dere “Woodworth Mills.” A gụrụ ya aha nna m ochie ihe dị ka afọ 30 gara aga!

Enwere M Obi Ụtọ Maka Ihe Nketa M

Mgbe m dị afọ 14, nne m malitere ịsụ ụzọ ọzọ. Ọ ka na-asụkwa ụzọ mgbe ọ nwụrụ afọ 40 mgbe e mesịrị! Papa m keere òkè n’ọrụ ịsụ ụzọ mgbe o nwere ike. Ọ nwụrụ ọnwa itoolu tupu mama m anwụọ. Ndị ahụ anyị mụụrụ ihe ghọrọ ezigbo ndị enyi anyị ná ndụ anyị nile. Ụfọdụ n’ime ụmụ ha gara ije ozi n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, ndị ọzọ malitekwara ọrụ ọsụ ụzọ.

Afọ 1959 bụ afọ pụrụ iche nye m. Ọ bụ mgbe ahụ ka m matara Paul Allen. A họpụtara ya ịbụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na 1946 bụ́ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na klas nke asaa nke Gilead, bụ́ ụlọ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova. N’oge anyị zutere, ọ dịghị onye nke ọ bụla n’ime anyị maara na ebe ọzọ a ga-ekenye Paul ọrụ ga-abụ na Cleveland, Ohio, bụ́ ebe m na-asụ ụzọ. Papa m hụrụ ya n’anya, otú ahụkwa ka mama m hụrụ ya. Anyị lụrụ na July 1963 n’ugbo ndị ezinụlọ Howell, ndị ezinụlọ anyị bịazukwara, Ed Hooper bụkwa onyeisi oche ya. Ọ bụ atụmanya mezuru emezu.

Paul enweghị ụgbọala ma ọlị. Mgbe anyị hapụrụ Cleveland iji gaa ebe ọzọ e kenyere ya ọrụ, ihe onwunwe anyị nile bara n’ime obere ụgbọala Volkswagen m a rụrụ na 1961. Mgbe mgbe ndị enyi anyị na-abata n’ụbọchị Monday, bụ́ ụbọchị anyị na-akwaga ọgbakọ ọzọ, iji nyere anyị aka ịkwanye ngwongwo anyị n’ụgbọala. Ọ dị ka ihe a na-eme n’ọgbọ ihe nkiri, bụ́ ịhụ akpati nile, igbe faịlụ, ígwè typewriter, na ihe ndị ọzọ ka ha na-abanyecha n’ime obere ụgbọala ahụ.

Mụ na Paul emekọwo njem ruo imerime kilomita, na-anụ ụtọ akụkụ ndị dị mma ma na-atachi obi n’akụkụ ndị tara akpụ nke ndụ a dị ugbu a—na-eme ihe nile site n’ume nke ọ bụ nanị Jehova pụrụ inye. Afọ ndị gafeworonụ abụwo ndị nke obi ụtọ, bụ́ ndị ịhụnanya n’ebe Jehova nọ, n’ebe ibe anyị nọ, nakwa n’ebe ndị enyi anyị ochie na ndị ọhụrụ nọ, jupụtara na ha. Ọnwa abụọ ahụ anyị nọrọ na Patterson ka Paul na-anara ọzụzụ bụ ihe pụtara ìhè ná ndụ anyị ka ọ dị ugbu a. Ịnọ n’ebe dị nnọọ nso kirie nzukọ elu ala nke Jehova mere ka ihe e mere ka m kwere dị ka akụkụ nke ihe nketa ime mmụọ m dị oké ọnụ ahịa, sikwuo ike: Nke a bụ n’ezie nzukọ Chineke. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịbụ ọbụna akụkụ dị nta na ya!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 44 Lee Ụlọ Nche (Bekee), February 15, 1952, peeji nke 128.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na Ed Hooper nwa obere oge tupu mgbakọ 1941 ahụ e nwere na St. Louis, bụ́ ebe m nwetara akwụkwọ “Children” nke m

[Foto dị na peeji nke 26]

Nna m ochie na 1948

[Foto dị na peeji nke 26]

N’ugbo ndị ezinụlọ Howell mgbe nne na nna m (ndị nọ n’akara ahụ dị gburugburu) lụrụ di na nwunye

[Foto dị na peeji nke 27]

Ndị Mmụta Bible asatọ ahụ a tụrụ mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi na 1918 (Nna m ochie guzo n’isi isi aka nri)

[Foto dị na peeji nke 29]

Ihe nile anyị nwere n’ụwa bara n’ụgbọala Volkswagen anyị

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na di m, bụ́ Paul