Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Ụtọ Ebighị Ebi—Ọ̀ Bụ n’Eluigwe Ka Ọ̀ Bụ n’Ụwa?

Obi Ụtọ Ebighị Ebi—Ọ̀ Bụ n’Eluigwe Ka Ọ̀ Bụ n’Ụwa?

Obi Ụtọ Ebighị Ebi—Ọ̀ Bụ n’Eluigwe Ka Ọ̀ Bụ n’Ụwa?

OBI ụtọ gị ọ̀ na-adabere n’ụzọ bụ́ isi n’ebe i bi? Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ga-ekweta n’egbughị oge na obi ụtọ na-aka adabere n’isi ihe ndị dị ka ezi ahụ ike, inwe nzube ná ndụ, na iso ndị ọzọ na-enwe ezi mmekọrịta. Otu ilu Bible si otú a kwuo ya: “Ọ dị mma, bụ́ òkè ihe oriri nke bụ́ nanị akwụkwọ nri, ma ịhụnanya dị n’ebe ahụ, karịa ehi a zụrụ azụ igbu egbu, ma ịkpọasị adị ya.”—Ilu 15:17.

Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọ dịwo anya ịkpọasị, ime ihe ike, na ụdị ihe ọjọọ ndị ọzọ malitere ịdị n’ebe obibi anyị bụ́ ụwa. Ma gịnị banyere eluigwe, ma ọ bụ ógbè ndị bụ́ mmụọ, bụ́ ebe ọtụtụ ndị nwere olileanya ịga mgbe ha nwụsịrị? Ọ̀ bụwo mgbe nile ebe e nwere udo nke ọṅụ zuru okè na ịdị jụụ, n’enweghị nsogbu n’ụdị ọ bụla, dị ka a na-ewerekarị ya?

Bible na-akụzi na Chineke na ọtụtụ nde ndị mmụọ e kere eke bụ́ ndị a na-akpọ ndị mmụọ ozi, bi n’eluigwe. (Matiu 18:10; Mkpughe 5:11) A kọwara ndị a dị ka “ụmụ Chineke” ndị bụ́ mmụọ. (Job 38:4, 7) Dịkwa ka ụmụ mmadụ, ndị mmụọ ozi nweere onwe ha ime nhọrọ; ha abụghị ígwè ọrụ e ji kọmputa achịkwa. Ya mere, ha onwe ha kwa pụrụ ịhọrọ ime ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi. Ndị mmụọ ozi hà ga-ahọrọ ime ihe na-ezighị ezi? Ọ pụrụ iju ụfọdụ ndị anya ịnụ na ọtụtụ puku afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị mmụọ ozi mehiere, n’ezie, megide Chineke—ha nupụụrụ ya isi!—Jud 6.

Ndị Nnupụisi n’Eluigwe

Mmehie malitere n’ógbè ndị bụ́ mmụọ n’ihi nnupụisi nke otu mmụọ ozi, bụ́ onye a bịara na-akpọ Setan (Onye Nguzogide) na Ekwensu (Onye Nkwutọ). Mmụọ ozi a na-erubebu isi ji aka ya họrọ ime ihe na-ezighị ezi. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ bịara nwee mmetụta na-emerụ emerụ n’ebe ndị mmụọ ndị ọzọ e kere eke nọ, nke na ka ọ na-erule n’oge Noa, tupu Iju Mmiri ahụ, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ime ha sonyeere Setan n’inupụrụ Chineke isi.—Jenesis 6:2, ihe odide ala ala peeji nke NW; 2 Pita 2:4.

A chụpụghị ndị mmụọ ozi a mehierenụ n’eluigwe ozugbo. Kama nke ahụ, e kwere ka ha na-agagharị—ihe àmà na-egosi na ha nwere ihe mgbochi ụfọdụ—ruo ọtụtụ puku afọ. * Otú ọ dị, mgbe oge Chineke gbachiri ndị ajọ omume a nkịtị gasịrị, a ‘chụpụrụ’ ha n’eluigwe, iji bibie ha n’ikpeazụ. Otu olu nke sitere n’eluigwe kwuziri, sị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha.” (Mkpughe 12:7-12) N’ụzọ doro anya, ndị mmụọ ozi kwesịrị ntụkwasị obi ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu na, n’ikpeazụ, a chụpụwo ndị ọjọọ ahụ na-akpata nsogbu n’eluigwe!

N’ịtụle nkọwa a zuru ezu nke a na-amachaghị, o doro anya na a gaghị enwe ezi udo mgbe ọ bụla ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi na-eleghara iwu na ụkpụrụ Chineke anya. (Aịsaịa 57:20, 21; Jeremaịa 14:19, 20) N’aka nke ọzọ, mgbe mmadụ nile na-erubere iwu Chineke isi, udo na ịdị jụụ na-ejupụta ebe nile. (Abụ Ọma 119:165; Aịsaịa 48:17, 18) Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ nile hụrụ Chineke n’anya ma na-erubere ya isi, hụkwa ibe ha n’anya, ụwa ọ́ garaghị abụ ebe obibi dị mma, nke na-enye obi ụtọ n’ezie? Bible na-aza ee!

Ma gịnị banyere ndị ahụ ji ọchịchọ onwe onye nanị jụ ịgbanwe ụzọ ọjọọ ha? Hà ga-anọgide na-emebi udo nke ndị chọrọ ime uche Chineke n’ezie, ruo mgbe ebighị ebi? Ee e, Chineke mere ihe banyere ajọ ndị mmụọ ozi ahụ n’eluigwe, ọ ga-emekwa ihe banyere ndị ajọ omume n’ụwa.

Ụwa A Zachara Azacha

“Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m,” ka Chineke kwuru. (Aịsaịa 66:1) N’ịbụ onye kasị dị nsọ, Chineke agaghị ekwe ka ihe ọjọọ metọọ “ihe mgbakwasị ụkwụ” ya ruo mgbe ebighị ebi. (Aịsaịa 6:1-3; Mkpughe 4:8) Dị nnọọ ka o wepụchara ndị mmụọ ọjọọ n’eluigwe, otú ahụ ka ọ ga-ewepụ ndị ọjọọ nile n’ụwa, dị ka akụkụ Bible ndị na-esonụ na-egosi:

“A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.”—Abụ Ọma 37:9.

“Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:21, 22.

“O ziri ezi n’ebe Chineke nọ inyeghachi ndị na-akpagbu unu mkpagbu, na inyeghachi unu, bụ́ ndị a na-akpagbu, ahụ efe, anyị na unu, n’ime mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, Ya na ndị mmụọ ozi nke ike Ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọbọ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs: bụ́ mmadụ ndị ga-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, bụ́ mbibi ebighị ebi nke sitere n’ihu Onyenwe anyị, sitekwa n’ebube nke ike Ya.”—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.

“Ụwa [nke ajọ ihe a kpọrọ mmadụ] na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Ụwa Ọ̀ Ga-adịgide n’Udo?

Ọ bụ ezie na Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na nkwere Chineke kweere ka ndị ajọ omume dịrị bụ nke a kpaara ókè, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ihe ọjọọ agaghị apụtaghachi ma e wepụhaala ya? E kwuwerị, mgbe Iju Mmiri nke ụbọchị Noa gasịrị, ọ pụtaghachiri ọzọ n’ókè nke na Chineke aghaghị ime ka atụmatụ ọjọọ nke ihe a kpọrọ mmadụ kụọ afọ n’ala site n’ịghagbu asụsụ ha.—Jenesis 11:1-8.

Ihe bụ́ isi mere anyị ji enwe obi ike na ihe ọjọọ agaghị apụta ọzọ bụ na ọ gaghịzi abụ ụmụ mmadụ ga na-achị ụwa dị ka ọ dịịrị mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. Kama nke ahụ, ọ bụ Alaeze Chineke ga na-achị ya. Ọ bụ Alaeze a, bụ́ nke ga na-achị site n’eluigwe, ga-abụ nanị ọchịchị a ga-enwe n’ụwa. (Daniel 2:44; 7:13, 14) Ọ ga-eme ihe ngwa ngwa megide onye ọ bụla nke nwara iwetaghachi ihe ọjọọ. (Aịsaịa 65:20) N’ezie, ọ ga-emesị bibie kpọmkwem onye ahụ malitere ihe ọjọọ—Setan bụ́ Ekwensu—ya na ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ajọ ndị mmụọ ozi ahụ gbasoro ya.—Ndị Rom 16:20.

Tụkwasị na nke a, ihe a kpọrọ mmadụ agaghị enwe ihe ndị mere ha ga-eji na-echegbu onwe ha banyere nri, uwe, ebe obibi, na ọrụ—ndị ụkọ ha taa na-eduga ụfọdụ ndị n’ibi ndụ ime mpụ. Ee, a ga-agbanwe ụwa nile ịbụ paradaịs na-emepụta ihe n’ụba maka mmadụ nile.—Aịsaịa 65:21-23; Luk 23:43.

Nke ka mkpa, Alaeze ahụ ga-akụziri ndị ọ na-achị ụzọ isi bie ndụ n’udo, n’otu oge ahụkwa na-ebuli ha gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke izu okè. (Jọn 17:3; Ndị Rom 8:21) Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe a kpọrọ mmadụ agaghịzi adị na-alụso adịghị ike na ọchịchọ ime mmehie ọgụ, na-eme ka irubere Chineke isi n’ụzọ zuru ezu bụrụ ma nke ga-ekwe omume ma nke ga-adị ụtọ, dị ka ọ dịịrị n’ebe nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs nọ. (Aịsaịa 11:3) N’ezie, Jisọs nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke n’agbanyeghị ọnwụnwa na mmekpọ ọnụ dị ukwuu—ihe ndị a na-agaghị enwetụ ná ndụ n’ime Paradaịs.—Ndị Hibru 7:26.

Ihe Mere Ụfọdụ Ji Eje Eluigwe

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-agụ Bible maara banyere okwu Jisọs, bụ́: “N’ụlọ nna m ọtụtụ ebe obibi dị; . . . Ana m aga idoziri unu ebe.” (Jọn 14:2, 3) Nke a ọ́ dịghị emegide echiche nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala?

Ozizi ndị a adịghị emegiderịta onwe ha. N’ezie, otu na-akwado nke ọzọ. Iji malitegodị, Bible na-ekwu na ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè nke ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi—ya bụ, 144,000 n’ime ha—ka a na-akpọlite n’ọnwụ dị ka ihe e kere eke bụ́ mmụọ ibi n’eluigwe. N’ihi gịnị ka e ji enye ha ụgwọ ọrụ a dị ebube? Ọ bụ n’ihi na ha mejupụtara ìgwè ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ bụ́ ndị “dị ndụ, sokwa Kraịst bụrụ eze [otu puku afọ].” (Mkpughe 14:1, 3; 20:4-6) E jiri ha tụnyere ọtụtụ ijeri mmadụ bi n’ụwa, 144,000 ahụ bụ n’ezie “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) Ọzọkwa, n’ịbụ ndị nweworo ahụmahụ nke nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ na-enwekarị, dị ka Jisọs, ha ga-enwe ike “iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị” ka ha na-ahụ maka ịkpụzigharị uche nke ihe a kpọrọ mmadụ na ịrụzigharị ụwa.—Ndị Hibru 4:15.

Ụwa—Ebe Obibi Ebighị Ebi nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ

Site n’inye àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, Chineke malitere ịchịkọta 144,000 ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, ihe àmà na-egosikwa na ìgwè a ezuwo ugbu a. (Ọrụ 2:1-4; Ndị Galetia 4:4-7) Otú ọ dị, àjà Jisọs abụghị nanị maka mmehie nke 144,000 ahụ, “ọ bụkwa . . banyere mmehie nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:2) N’ihi ya, ndị nile na-egosipụta okwukwe n’ebe Jisọs nọ nwere atụmanya nke ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) A ga-akpọlite ndị nọ n’ụra ọnwụ n’ili bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke, gaa ọ bụghị n’eluigwe, kama gaa ná ndụ n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha. (Eklisiastis 9:5; Jọn 11:11-13, 25; Ọrụ 24:15) Gịnị ga-echere ha n’ebe ahụ?

Mkpughe 21:1-4 na-aza, sị: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyere mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Cheedị banyere ya—ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha pụọ n’ọnwụ, ihe mgbu na ịkwa ákwá ọ na-akpata agaghịkwa adị ruo mgbe ebighị ebi! N’ikpeazụ, nzube mbụ nke Jehova maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ ga-emezu n’ụzọ dị ebube.—Jenesis 1:27, 28.

Nhọrọ Anyị—Ndụ Ka Ọ̀ Bụ Ọnwụ

Ọ dịghị mgbe ọ bụla e nyere Adam na Iv nhọrọ nke ịga eluigwe. Nhọrọ e nyere ha bụ irubere Chineke isi ma dị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs ma ọ bụ inupụrụ ya isi ma nwụọ. N’ụzọ dị mwute, ha họọrọ nnupụisi, ya mere ha laghachikwara ‘n’ájá’ nke ala. (Jenesis 2:16, 17; 3:2-5, 19) Ọ bụtụghị nzube Chineke ka ezinụlọ ụmụ mmadụ n’ozuzu ya nwụọ ma site n’ili gaa jupụta n’eluigwe. Chineke kere imerime ndị mmụọ ozi ibi n’eluigwe; ndị mmụọ a e kere eke abụghị ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe.—Abụ Ọma 104:1, 4; Daniel 7:10.

Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta ngọzi nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala? Nzọụkwụ mbụ bụ ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ. “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ,” ka Jisọs kwuru n’ekpere, “ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Itinye ihe ọmụma ahụ n’ọrụ bụ nzọụkwụ ọzọ na-eduga ná ndụ obi ụtọ n’ime Paradaịs. (Jemes 1:22-24) Ndị na-adị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke nwere atụmanya nke iji anya ha hụrụ mmezu nke amụma ndị na-akpali akpali dị ka nke e dekọrọ n’Aịsaịa 11:9, bụ́ nke na-asị: “Ha [ihe a kpọrọ mmadụ] agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji gụkwuo ebe e kwuru ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ dịrị n’eluigwe na n’elu ala, lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peeji nke 70-79.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

“Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29