Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ Ịbịaru Chineke nke A Na-apụghị Ịhụ Anya Nso?

Ị̀ Pụrụ Ịbịaru Chineke nke A Na-apụghị Ịhụ Anya Nso?

Ị̀ Pụrụ Ịbịaru Chineke nke A Na-apụghị Ịhụ Anya Nso?

‘Olee otú m pụrụ isi wulite mmekọrịta chiri anya n’ebe onye m na-apụghị ịhụ anya nọ?’ ka ị pụrụ ịjụ. Nke ahụ pụrụ iyi ajụjụ dabara adaba. Ma tụlegodị:

OLEE ókè ịhụ ihe dịruru ná mkpa n’iwulite mmekọrịta ịhụnanya na nke na-adịgide adịgide? Ọ̀ bụ na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya adịghị mkpa n’otu ụzọ ahụ, ma ọ bụrụdị na ha akaghị mkpa? N’ezie, ha dị! N’ihi nke ahụ, ụfọdụ ndị ewulitewo mmekọrịta chiri anya n’ebe ndị ọzọ nọ site n’iderịta akwụkwọ ozi n’ụzọ chiri anya—akwụkwọ ozi ha ana-egosipụta n’ezie ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị na-adịghị amasị ha, ihe mgbaru ọsọ, ụkpụrụ, omume ịkpa ọchị, na àgwà ha ndị ọzọ.

Ndị ìsì n’onwe ha kwa na-egosipụta na ịhụ ihe adịghị oké mkpa n’iwulite mmekọrịta chiri anya n’etiti mmadụ na onye ọzọ. Tụlee ihe atụ nke Edward na Gwen, bụ́ di na nwunye kpuru ìsì. * Edward zutere Gwen n’ụlọ akwụkwọ maka ndị ìsì, bụ́ ebe Gwen bụ nwa akwụkwọ ibe ya toruworo ogo mmadụ. O nwere mmasị n’àgwà Gwen, karịsịa ime ihe n’eziokwu ya n’okwu na n’omume, nakwa omume ọma ya n’ebe ọrụ dị. N’aka nke ya, Edward dọọrọ mmasị Gwen n’ihi na, n’ikwu ya otú o si kwuo ya, “o gosipụtara àgwà nile a zụlitere m ikwere na ha dị mkpa.” Ha malitere mbedo, afọ atọ mgbe e mesịkwara, ha lụrụ.

“Mgbe unu nọkọrọ ọnụ,” ka Edward na-ekwu, “ikpu ìsì adịghị ihe o mere n’ezie n’iso onye ọzọ enwe mmekọrịta. O nwere ike unu agaghị na-ahụ ibe unu, ma mmetụta ekpughị ìsì.” Ugbu a, bụ́ afọ 57 mgbe nke ahụ gasịrị, ha ka nwere ịhụnanya miri emi n’ebe ibe ha nọ. Ha na-akọwa na isi ihe ndị dugara ha n’inwe mmekọrịta dị ịtụnanya na-agụnye ụzọ ihe anọ ma ọ dịkarịa ala: (1) ịrịba àgwà onye nke ọzọ ama, (2) ichebara àgwà ndị ahụ echiche na ịbụ onye a dọtara n’ebe ha dị, (3) ịnọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu, na (4) imekọ ihe ọnụ.

Isi ihe anọ a dị mkpa n’ezi mmekọrịta ọ bụla, ma ọ̀ bụ nke dị n’etiti ndị enyi, di na nwunye ma ọ bụ, nke ka mkpa, n’etiti ụmụ mmadụ na Chineke. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ otú itinye isi ihe ndị a n’ọrụ pụrụ isi nyere anyị aka iwulite mmekọrịta chiri anya n’ebe Chineke nọ, n’agbanyeghị na anyị apụghị ịhụ ya anya. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanwewo aha ndị ahụ.

^ par. 6 N’adịghị ka mmekọrịta dị n’etiti ụmụ mmadụ, iso Chineke enwe mmekọrịta na-adabere n’inwe okwukwe n’ịdị adị ya. (Ndị Hibru 11:6) Maka ntụle zuru ezu banyere iwulite okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ, biko lee akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.