Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ịdabere n’iwu ndị Bible nyere banyere ụzọ kwesịrị ekwesị isi jiri ọbara na-eme ihe, olee otú Ndịàmà Jehova si ele usoro ịgwọ ọrịa nke mmadụ ji ọbara ya eme, anya?

Kama ịdabere nanị ná nhọrọ onwe onye ma ọ bụ n’aro ụfọdụ ndị dọkịta tụrụ wee na-eme mkpebi, onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịtụle ihe Bible na-ekwu nke ọma. Ọ bụ okwu dịịrị ya na Jehova.

Jehova, bụ́ onye ndụ anyị dị n’aka ya, nyere iwu na e kwesịghị iri ọbara. (Jenesis 9:3, 4) N’Iwu ahụ Chineke nyere Israel oge ochie, ọ kpara ókè n’otú a ga-esi na-eji ọbara eme ihe n’ihi na ọ na-anọchi anya ndụ. O nyere iwu, sị: “Ndụ nke anụ ahụ, n’ọbara ka ọ dị: Mụ onwe m enyewokwa unu ya n’elu ebe ịchụàjà ikpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie ha.” Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ egbuo anụmanụ maka oriri? Chineke kwuru, sị: “Ọ ga-awụsịkwa ọbara ya, were ájá kpuchie ya.” * (Levitikọs 17:11, 13) Jehova nyeghachiri iwu a ugboro ugboro. (Deuterọnọmi 12:16, 24; 15:2) Akwụkwọ bụ́ Soncino Chumash nke ndị Juu na-ekwu, sị: “E kwesịghị ichekwa ọbara echekwa ma ọlị kama a ga-eme ka a ghara iri ya site n’ịwụsị ya n’ala.” Ọ dịghị onye Israel ga-edebe, chekwaa, ma jiri ọbara nke ihe ọzọ e kere eke, bụ́ nke Chineke nwe ndụ ya, mee ihe.

Ibu ọrụ nke idebe Iwu Mosis jedebere mgbe Mesaịa ahụ nwụrụ. Ma, echiche Chineke banyere ịdị nsọ nke ọbara ka dị otú ọ dị. N’ịbụ ndị mmụọ nsọ Chineke kpaliri, ndị ozi nyere ndị Kraịst ntụziaka ‘ịhapụ ọbara.’ A gaghị eji iwu ahụ gwurie egwu. Ọ dị mkpa n’ụzọ omume otú ịhapụ ịkwa iko ma ọ bụ ikpere arụsị si dị. (Ọrụ 15:28, 29; 21:25) Mgbe inye onyinye ọbara na ịmịnye ọbara ghọrọ ihe zuru ebe nile na narị afọ nke 20, Ndịàmà Jehova ghọtara na omume a ekwekọghị n’Okwu Chineke. *

Mgbe ụfọdụ, onye dọkịta na-agba onye ọrịa ume iweta ọbara nke ya ọtụtụ izu tupu a waa ya ahụ (onye a na-aga ịwa ahụ ibu ụzọ nye ọbara a ga-amịnyeghachi ya, ma ọ bụ PAD) ka ọ ga-abụ ọ dị mkpa, o nwee ike ịmịnye onye ọrịa ahụ ọbara ya ahụ e chekwara echekwa. Otú ọ dị, mweta, nchekwa, na mmịnye ọbara dị otú ahụ megidere kpọmkwem ihe e kwuru na Levitikọs na Deuterọnọmi. Ọbara abụghị ihe a ga-echekwa echekwa; ọ bụ ihe a ga-awụsị—ihe a ga-eweghachiri Chineke, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. N’ezie, Iwu Mosis adịghị irè ugbu a. Otú o sina dị, Ndịàmà Jehova na-akwanyere ụkpụrụ ndị Chineke nyere n’ime ya ùgwù, ha na-ekpebisikwa ike ‘ịhapụ ọbara.’ N’ihi ya, anyị adịghị enye onyinye ọbara, anyị adịghịkwa echekwa ọbara anyị maka mmịnye, bụ́ nke e kwesịrị ‘ịwụsị awụsị.’ Omume ahụ ekwekọghị n’iwu Chineke.

Usoro ma ọ bụ nnyocha ndị ọzọ metụtara ọbara onwe onye adịchaghị emegide ụkpụrụ Chineke ndị a kapịrị ọnụ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị Kraịst ekwewo ka a mịrị ụfọdụ n’ime ọbara ha maka ịtụle ma ọ bụ inyocha ya, mgbe e mesịrị, a na-awụfu ya. A pụkwara ịtụ aro maka usoro ndị ọzọ dị mgbagwoju anya karị bụ́ ndị metụtara ọbara onwe onye.

Dị ka ihe atụ, n’oge usoro ịwa ahụ ụfọdụ, a pụrụ iji usoro a na-akpọ hemodilution mee ka ọbara ụfọdụ si n’ahụ mmadụ pụọ. A na-agwa ihe n’ọbara fọdụrụ n’ahụ onye ọrịa ahụ. Mgbe e mesịrị, a na-eme ka ọbara ahụ pụrụ n’ahụ ya banyeghachi n’ahụ ya, si otú a na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ya dịtụ otú kwesịrị ekwesị. N’ụzọ yiri nke ahụ, a pụrụ iwepụta ọbara banyere n’ọnyá, ma zaa ya azaa ka e wee nwee ike itinyeghachi mkpụrụ ndụ uhie n’ahụ onye ọrịa ahụ; nke a ka a na-akpọ mweghachi mkpụrụ ndụ. N’usoro dị iche, a pụrụ ime ka ọbara banye n’ígwè ọrụ nke na-arụ ọrụ akụkụ ahụ mmadụ (dị ka ihe atụ, obi, akpa ume, ma ọ bụ akụrụ) na-arụ, ruo nwa oge. E mesịa, a na-eme ka ọbara ahụ dị n’ígwè ọrụ ahụ banyeghachi n’ahụ onye ọrịa ahụ. N’usoro ndị ọzọ, a na-eme ka ọbara banye na nzà (ígwè ọrụ centrifuge) iji nwee ike iwepụ akụkụ ya ndị na-emebi ihe ma ọ bụ ndị na-adịghị mma. Ma ọ bụ nzube ya pụrụ ịbụ iwepụta ihe ụfọdụ ndị mejupụtara ọbara ma jiri ha mee ihe n’ebe ọzọ n’ahụ mmadụ. E nwekwara nnyocha ndị a na-ewepụta ọbara iji gwaa ya ọgwụ, e mesịa e tinyeghachi ya n’ahụ onye ọrịa ahụ.

Otú e si eme ha pụrụ ịdịgasị iche, n’ezie, a ga-emepụtakwa usoro, ọgwụgwọ, na nnyocha ndị ọhụrụ. Ọ dịghị anyị n’aka ịtụle ọdịiche nke ọ bụla ma mee mkpebi. Onye Kraịst aghaghị ikpebiri onwe ya otú a ga-esi jiri ọbara ya mee ihe n’oge ịwa ahụ, ile ahụ, ma ọ bụ ọgwụgwọ. Tupu oge eruo, o kwesịrị isi n’aka dọkịta ma ọ bụ ọkachamara ahụ chọpụta ihe ndị bụ́ eziokwu banyere ihe a pụrụ iji ọbara ya mee n’oge a na-agwọ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-eme mkpebi dị ka akọ na uche ya si tụziere ya. (Lee igbe.)

Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche nrara ha raara onwe ha nye Chineke na ibu ọrụ ha nwere ‘ịhụ ya n’anya site n’obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum, ike ha dum, na uche ha dum.’ (Luk 10:27) N’adịghị ka ọtụtụ ndị nọ n’ụwa, Ndịàmà Jehova ji ezi mmekọrịta ha na Chineke kpọrọ ihe nke ukwuu. Onye Na-enye Ndụ na-agba mmadụ nile ume ịtụkwasị obi n’ọbara Jisọs wụsịrị. Anyị na-agụ, sị: “Onye anyị sitere n’ọbara Ya [Jisọs Kraịst] nwee mgbapụta anyị n’ime Ya, bụ́ mgbaghara nke ndahie nile anyị.”—Ndị Efesọs 1:7.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Prọfesọ Frank H. Gorman na-ede, sị: “A na-aghọta mwụsị ọbara ahụ n’ụzọ kasị mma dị ka nsọpụrụ ofufe bụ́ nke na-egosipụta nkwanye ùgwù n’ebe ndụ nke anụmanụ ahụ dị, nakwa nkwanye ùgwù n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye kere ma nọgide na-elekọta ndụ ahụ.”

^ par. 5 Ụlọ Nche nke July 1, 1951, zara ajụjụ ndị bụ́ isi banyere isiokwu a, na-egosi ihe mere mmịnye nke ọbara e nyere n’onyinye ji bụrụ ihe na-ekwesịghị ekwesị.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 31]

AJỤJỤ NDỊ Ị GA-AJỤ ONWE GỊ

Ọ bụrụ na a ga-eme ka ụfọdụ n’ime ọbara m si n’ahụ m pụọ, ọ bụrụkwa na a pụrụ ọbụna ime ka ọ kwụsị irugharị ruo oge ụfọdụ, akọ na uche m ọ̀ ga-ekwe ka m lee ọbara ahụ anya dị ka ihe ka bụ akụkụ ahụ m, si otú a na-eme ka ọ ghara ịdị mkpa ‘ịwụsị ya n’ala’?

Akọ na uche m e ji Bible zụọ ọ̀ ga-enye m nsogbu ma ọ bụrụ na n’oge a na-achọpụta ọrịa ma ọ bụ na-enye ọgwụgwọ, na e weere ụfọdụ ọbara m, dozie ya, ma tinyeghachi ya n’ahụ m?