Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụkpụrụ Omume Ọma Na-ebelata Ebelata

Ụkpụrụ Omume Ọma Na-ebelata Ebelata

Ụkpụrụ Omume Ọma Na-ebelata Ebelata

“IHE dị otú ahụ anaghị emebu,” ka Helmut Schmidt, onye bụbu onyeisi ọchịchị nke Germany, kwuru. Ọ na-akwa arịrị banyere akwụwaghị aka ọtọ dị egwu nke ndị ọrụ ọha na eze bụ́ ndị gbara n’isi akụkọ. “Anyaukwu emeela ka ụkpụrụ omume ọma fuo,” ka o kwuru.

Ọtụtụ ndị ga-ekwenyere ya. A na-ewerezi ụkpụrụ omume ọma ndị hiwere isi n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ́kwa ndị a nabataworo n’ọtụtụ ebe eri oge dị ka ihe nduzi maka ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, dị ka ihe na-adịghị mkpa. Otú ahụ ka ọ dị ọbụna n’ala ndị e ji Iso Ụzọ Kraịst elu ọnụ mara.

Ụkpụrụ Omume nke Bible Ọ̀ Dị Mkpa?

Ụkpụrụ omume dabeere n’ozizi Bible na-agụnye ịkwụwa aka ọtọ na iguzosi ike n’ezi ihe. Ma, aghụghọ, nrụrụ aka, na wayo jupụtara ebe nile. Akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Times na-akọ na ‘a zọọrọ na ụfọdụ ndị ọrụ nchọpụta mpụ anarawo ihe ruru £100,000 n’otu mgbe iji were ọgwụ ọjọọ ndị uwe ojii jichiri ejichi nye ndị omempụ ka ha regharịa ma ọ bụ iji mebie ihe akaebe e nwere megide ndị omempụ.” A sịrị na a na-egwukarị ndị ọrụ inshọransị wayo n’Austria. Na Germany kwa, ọ wụrụ ndị ọkà mmụta sayensị akpata oyi n’ahụ mgbe ndị nchọpụta chọpụtara “otu n’ime wayo ndị kasị njọ na nkà mmụta sayensị nke Germany,” n’oge na-adịbeghị anya. E boro otu onye prọfesọ, bụ́ “onye na-ede ude n’etiti ndị Germany bụ́ ọkà mmụta usoro ndụ” ebubo iji ụgha degharịa ma ọ bụ chepụta ihe ndekọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu.

Ụkpụrụ omume ọma nke dabeere na Bible na-agụnyekwa ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye, bụ́ nke e mere ka ọ bụrụ mmekọrịta na-adịgide adịgide. Ma ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị di na nwunye na-ejedebe n’ụlọikpe ịgba alụkwaghịm. Akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik bụ́ Christ in der Gegenwart (Onye Kraịst nke Oge A) na-akọ na “ọbụna na Switzerland bụ́ ‘ebe a na-ejigidesi omenala ike,’ ọtụtụ alụmdi na nwunye na-etisasị.” Na Netherlands, pasent 33 nke alụmdi na nwunye nile na-ejedebe n’ịgba alụkwaghịm. Otu nwanyị nke rịbara mgbanwe ndị a na-enwe n’etiti ọha mmadụ nọ na Germany n’afọ ole na ole ndị gafeworonụ ama, deturu nchegbu ya, sị: “A na-elezi alụmdi na nwunye anya dị ka ihe mgbe ochie na ihe oge ya gafeworo. Ndị mmadụ adịghịzi alụ di ma ọ bụ nwunye iji soro ya biri ná ndụ ha nile.”

N’aka nke ọzọ, ọtụtụ nde ndị mmadụ na-ewere ụkpụrụ omume ọma ndị a na-akụzi na Bible dị ka ndị kwesịrị ka a tụkwasị ha obi na ndị dị mkpa nye ndụ n’ụwa nke oge anyị a. Otu di na nwunye bi n’ókè Switzerland na Germany chọpụtara na ịmụta ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ndị Bible setịpụrụ mere ka ha nwee obi ụtọ karị. Nye ha, “e nwere nanị otu ụkpụrụ nduzi maka akụkụ nile nke ndụ. Ụkpụrụ nduzi ahụ bụ Bible.”

Gịnị ka i chere? Bible ọ̀ pụrụ ịbụ ụkpụrụ nduzi bara uru? Ụkpụrụ omume ọma dabeere na Bible hà dị irè taa?