Ụkpụrụ Omume Ọma nke Bible Ọ̀ Bụ Ya Kasị Mma?
Ụkpụrụ Omume Ọma nke Bible Ọ̀ Bụ Ya Kasị Mma?
“OBODO chọrọ ụkpụrụ omume ọma ndị bụ́ isi bụ́ ndị na-enye ndị bi na ya nchebe na nduzi.” Otú ahụ ka onye Germany bụ́ onye edemede na onye mgbasa ozi telivishọn maara ọrụ, kwuru. N’ezie, ezi uche dị na ya. Ka obodo wee bụrụ nke kwụsiri ike na nke na-enwe ihe ịga nke ọma, ndị mmadụ aghaghị inwe ihe ndabere siri ike nke ụkpụrụ ndị a na-anakwerekarị bụ́ ndị na-egosi ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi, ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ajụjụ bụ: Olee ụkpụrụ ndị kasị mma, nye ma obodo ma ndị bi na ya?
Ọ bụrụ na ụkpụrụ omume ọma ndị dị na Bible bụ ụkpụrụ ndị a nakweere, ha kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ibi ndụ kwụsiri ike, na nke obi ụtọ. Nke ahụ, ọ bụrụ na a gbatịkwuo ya, ga-eme ka ọha mmadụ ndị na-agbaso ụkpụrụ omume ndị ahụ nwee obi ụtọ karị ma kwụsie ike karị. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị? Ka anyị nyochaa ihe Bible nwere ikwu n’isi ihe abụọ dị mkpa: ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye na ịkwụwa aka ọtọ ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị.
Rapara n’Ahụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị
Onye Okike anyị kere Adam ma kezie Iv ka ọ bụrụ nwunye ya. Njikọ ha bụ alụmdi na nwunye mbụ e Jenesis 1:27, 28; 2:24; Matiu 5:27-30; 19:5.
nwere n’akụkọ ihe mere eme, ọ gajekwa ịbụ mmekọrịta na-adịgide adịgide. Chineke kwuru, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya.” Ihe dị ka afọ 4,000 mgbe e mesịrị, Jisọs Kraịst gwaghachiri ụmụazụ ya nile ụkpụrụ alụmdi na nwunye a. Ọzọkwa, ọ katọrọ mmekọahụ na-abụghị n’alụmdi na nwunye.—Dị ka Bible si kwuo, isi ihe abụọ dị mkpa na-eduga n’alụmdi na nwunye obi ụtọ bụ ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’akụkụ di na nwunye. Di, bụ́ onyeisi ezinụlọ, kwesịrị igosi ịhụnanya nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị site n’ịchọ ọdịmma kasịnụ nke nwunye ya. Ọ ga-eso ya bikọọ “n’ụzọ ihe ọmụma,” o kwesịghịkwa inwe “obi ilu” n’ebe ọ nọ. Nwunye ga na-eji “nkwanye ùgwù miri emi” emeso di ya ihe. Ọ bụrụ na di na nwunye agbasoo ụkpụrụ ndị a, a pụrụ izere ma ọ bụ imeri ihe ka ọtụtụ n’ihe isi ike a na-enwe n’alụmdi na nwunye. Di ga-achọ ịrapara n’ahụ nwunye ya, nwunye kwa n’ahụ di ya.—1 Pita 3:1-7; Ndị Kọlọsi 3:18, 19; Ndị Efesọs 5:22-33, NW.
Ụkpụrụ Bible nke mmadụ ịrapara n’ahụ di ma ọ bụ nwunye ya ọ̀ na-atụnye ụtụ n’inwe alụmdi na nwunye obi ụtọ? Tụlee ihe si ná nnyocha e mere na Germany pụta. A jụrụ ndị mmadụ isi ihe ndị dị mkpa maka ezi alụmdi na nwunye. Ihe nwetara ọnọdụ mbụ bụ ntụkwasịrịta obi. Ọ̀ bụ na ị gaghị ekweta na ndị di na nwunye na-aka enwe obi ụtọ mgbe ha maara na di ma ọ bụ nwunye ha kwesịrị ntụkwasị obi?
Gịnị Ma Nsogbu Bilite?
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na di na nwunye enwee nghọtahie siri ike? Gịnị ma ọ bụrụ na ịhụnanya ha ebelata? Ọ̀ bụ na ọ kaghị mma ịkwụsị alụmdi na nwunye ahụ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Ka ịgbaso ụkpụrụ Bible bụ́ mmadụ iji ikwesị ntụkwasị obi rapara n’ahụ di ma ọ bụ nwunye ya ọ̀ ka ga-abụ ihe ezi uche dị na ya?
Ndị dere Bible ghọtara na di na nwunye nile ga-enwe nsogbu n’ihi ezughị okè. (1 Ndị Kọrint 7:28) Ma, ndị di na nwunye bụ́ ndị na-agbaso ụkpụrụ omume ọma Bible na-agbalị ịgbaghara na ịgbakọ aka dozie ihe isi ike ha. N’ezie, e nwere ọnọdụ ndị—dị ka ịkwa iko ma ọ bụ ntirụ ahụ—onye Kraịst pụrụ izi ezi ịtụle nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm na ha. (Matiu 5:32; 19:9) Ma ịtọsa alụmdi na nwunye ọkụ ọkụ n’enweghị nnọọ oké ihe kpatara ya ma ọ bụ iji lụọ onye ọzọ, na-egosipụta ileghara ndị ọzọ anya n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. N’ezie, ọ dịghị eweta nkwụsi ike ma ọ bụ obi ụtọ ná ndụ mmadụ. Ka anyị tụlee otu ihe atụ.
Peter chọpụtara na alụmdi na nwunye ya anaghịzi akpali akpali dị ka ọ na-akpalibu. * N’ihi ya, ọ hapụrụ nwunye ya ma lakwuru Monika, bụ́ onye gbahapụworo di ya. Olee otú ihe si gaa? N’ime ọnwa ole na ole, Peter kwetara na iso Monika biri “adịghị nnọọ mfe dị ka m chere ọ ga-adị.” N’ihi gịnị? Erughị eru mmadụ pụtara nnọọ ìhè ná mmekọrịta ọhụrụ a dị ka ọ pụtara na nke ochie ahụ. Iji mee ka ihe ka njọ, mkpebi o mere ọkụ ọkụ na site n’ịchọ ọdịmma onwe onye nanị dubara ya ná nsogbu ego dị ukwuu. Ọzọkwa, ụmụ Monika nwere oké ihe mgbu n’ụzọ mmetụta uche n’ihi oké mgbanwe e mere ná ndụ ezinụlọ ha.
Dị ka ahụmahụ a na-egosi, mgbe e nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye, ịtọsa alụmdi na nwunye ahụ abụtụghị ihe ngwọta ya. N’aka nke ọzọ, mgbe nsogbu tara akpụ bilitere, ịdị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ọma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, pụrụ ime ka alụmdi na nwunye na-aga n’ihu ma mee ka nsogbu ahụ belata. Ọ bụ otú a ka ọ dịịrị n’ebe Thomas na Doris nọ.
Thomas na Doris abụwo di na nwunye ruo ihe karịrị afọ 30 mgbe Thomas malitere aṅụrụma. Doris bịara nwee ịda mbà n’obi, ha abụọ kwurịtara banyere ịgba alụkwaghịm. Doris kọọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova izu nzuzo ya. Onyeàmà ahụ gosiri Doris ihe Bible na-ekwu banyere alụmdi na nwunye, na-agba ya ume ka ọ ghara iji ọkụ ọkụ kewara kama ka o buru ụzọ soro di ya rụọ ọrụ iji gbalịa ịchọta ihe ngwọta. Nke ahụ bụ ihe Doris mere. N’ime ọnwa ole na ole, ha atụleghịzi ịgba alụkwaghịm. Thomas na Doris jikọrọ aka na-arụ ọrụ iji dozie nsogbu ha. Ịgbaso ndụmọdụ Bible wusiri alụmdi na nwunye ha ike ma nye ha oge idozi ihe.
Ịkwụwa Aka Ọtọ n’Ihe Nile
Mmadụ ịraparagidesi ike n’ahụ di ma ọ bụ nwunye ya n’ikwesị ntụkwasị obi chọrọ ịdị ike n’akparamàgwà na inwe mmasị n’ịgbaso ụkpụrụ. A chọkwara otu àgwà ahụ iji nọgide na-akwụwa aka ọtọ n’ụwa nke na-adịghị akwụwa aka ọtọ. Bible nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere ịkwụwa aka ọtọ. Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Judia akwụkwọ, sị: “Anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18, NW) Gịnị ka nke ahụ pụtara?
Onye na-akwụwa aka ọtọ na-eme ihe n’eziokwu, ọ dịghịkwa egwu wayo. Ọ na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị mma—ọ na-eme ihe n’ụzọ kwụ ọtọ, dị ùgwù, ọ bụghị n’ụzọ aghụghọ ma ọ bụ nduhie. Ọzọkwa, onye na-akwụwa aka ọtọ bụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe nke na-adịghị aghọgbu mmadụ ibe ya. Ndị na-akwụwa aka ọtọ na-enye aka ime ka e nwee ọnọdụ nke ntụkwasị obi na obi ike, bụ́ ndị na-eduga n’àgwà ndị dị mma ma na-akwalite mmekọrịta siri ike nke mmadụ na ibe ya.
Ndị na-akwụwa aka ọtọ hà na-enwe obi ụtọ? E nwere ihe mere ha ga-eji enwe obi ụtọ. N’agbanyeghị nrụrụ aka na aghụghọ zuru ebe nile—ma ọ bụ ma eleghị anya n’ihi ya—ndị ọzọ na-enwekarị mmasị n’ebe ndị na-akwụwa aka ọtọ nọ. Dị ka otu nnyocha e mere n’etiti ndị na-eto eto si gosi, ịkwụwa aka ọtọ bụ àgwà ọma nke pasent 70 nke ndị zaghachirinụ weere n’ihe dị oké mkpa. Ọzọkwa, afọ ole ọ sọrọ anyị dịrị, ịkwụwa aka ọtọ bụ isi ihe anyị na-achọ n’aka ndị anyị na-ewere dị ka ndị enyi anyị.
A kụziiri Christine izu ohi site n’oge ọ dị afọ 12. N’afọ ndị gafeworonụ, ọ ghọrọ onye aka n’akpa a zụrụ azụ. “E nwere ụbọchị ndị m na-eji ego ruru DM 5,000 [$2,200, U.S.] alọta,” ka ọ na-akọwa. Ma e jidere Christine ọtụtụ ugboro, ọ dịkwara ndụ mgbe nile n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a ga-atụ mkpọrọ. Mgbe Ndịàmà Jehova kọwaara ya ihe Bible na-ekwu banyere ịkwụwa aka ọtọ, ụkpụrụ omume ọma ndị dị na Bible dọọrọ mmasị Christine. Ọ mụtara irube isi na ndụmọdụ bụ́: “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ.”—Ndị Efesọs 4:28.
Ka ọ na-erule n’oge e mere Christine baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ bụghịzi onye ohi. Ọ nọ na-agbalị ịkwụwa aka ọtọ n’ihe nile, ebe ọ bụ na Ndịàmà na-ekwusi okwu ike banyere ịkwụwa aka ọtọ na àgwà ndị ọzọ nke ndị Kraịst. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Lausitzer Rundschau na-akọ, sị: “Okwu ndị metụtara omume ọma dị otú ahụ, dị ka ịkwụwa aka ọtọ, imeru ihe n’ókè, na ịhụ onye agbata obi n’anya na-anọ n’ọnọdụ dị nnọọ elu n’okwukwe Ndịàmà.” Olee mmetụta Christine na-enwe banyere mgbanwe o mere ná ndụ ya? “Enwere m obi ụtọ ka ukwuu ugbu a m kwụsịrị izu ohi. Enwere m mmetụta na m bụ nwa amaala nwere ùgwù.”
Ọha na Eze Na-erite Uru
Ọ bụghị nanị na ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye ha ma bụrụ ndị na-akwụwa aka ọtọ na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’onwe ha kama ha na-abara ọha na eze uru. Ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-ahọrọ ndị ọrụ na-adịghị aghọ aghụghọ. Ọ na-amasị anyị nile inwe ndị agbata obi a pụrụ ịtụkwasị obi, anyị na-enwekwa mmasị ịzụ ihe n’ụlọ ahịa nke ndị ọchụ ntá ego na-eme ihe n’ụzọ kwụ ọtọ. Ọ̀ bụ na anyị adịghị akwanyere ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị uwe ojii, na ndị ọkàikpe na-ezere nrụrụ aka, ùgwù? Obodo na-erite uru nke ukwuu mgbe ndị bi na ya na-akpa àgwà n’ụzọ ịkwụwa aka ọtọ dị ka ụkpụrụ ha na-agbaso, ọ bụghị nanị mgbe ọ dịịrị ha mma ime otú ahụ.
Ọzọkwa, ndị di na nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi bụ ihe ndabere maka inwe ezinụlọ na-akwụsi ike. Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ga-ekwenyekwara onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ si Europe bụ́ onye kwupụtara, sị: “Ruo taa, ezinụlọ [zuru ezu] nọgidere na-abụ ebe kasị mkpa mmadụ na-enweta nchebe na nzube.” Njikọ ezinụlọ dị n’udo bụ ebe ndị toworo eto na ụmụntakịrị na-enwe ohere kasị mma nke ịnọ ná nchebe n’ụzọ mmetụta uche. Ndị na-ekwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye si otú a enye aka iwulite obodo kwụ chịm.
Cheedị banyere ókè onye ọ bụla ga-eriteru uru ma ọ bụrụ na e nweghị di ma ọ bụ nwunye a gbahapụrụ agbahapụ, ụlọikpe ịgba alụkwaghịm, ma ọ bụ okwu banyere onye ga-akpọrọ nwa. Gịnịkwa ma ọ bụrụ na e nweghịzi ndị aka n’akpa, ndị ohi ụlọ ahịa, ndị na-eri ego e nyefere ha n’aka, ndị ọrụ na-arụrụ aka, ma ọ bụ ndị ọkà mmụta sayensị na-egwu wayo? Nke ahụ ọ̀ na-ada ka nrọ nkịtị? Ọ dịghị ada otú ahụ nye ndị nwere mmasị dị ukwuu na Bible na ihe ọ na-ekwu banyere ọdịnihu anyị. Okwu Chineke na-ekwe Abụ Ọma 37:29.
nkwa na n’isi nso Alaeze Mesaịa nke Jehova ga-eweghara ọrụ nke ịchị ọha mmadụ nile nọ n’elu ala. N’okpuru Alaeze ahụ, a ga-akụziri ndị nile ọ ga-achị ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume nke Bible. N’oge ahụ, “ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Ụkpụrụ Omume Ọma nke Bible Bụ Ụkpụrụ Omume Kasị Mma
Ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị jiworo nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ abịawo ghọta na ndụmọdụ Bible dabeere n’amamihe Chineke, bụ́ nke ka nnọọ echiche mmadụ mma. Ndị dị otú ahụ na-ele Bible anya dị ka nke a pụrụ ịtụkwasị obi na nke bara uru ná ndụ a na-adị n’ụwa anyị nke oge a. Ha maara na ịṅa ntị na ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke bụ maka ọdịmma ha kasịnụ.
N’ihi ya, ndị dị otú ahụ na-aṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) N’ime otú ahụ, ha na-eme ka ndụ ha ka mma n’ụzọ dị ukwuu, ha na-abakwara ndị bi ha gburugburu uru. Ha na-ewulitekwa obi ike dị ukwuu ná “ndụ . . . nke gaje ịbịa,” bụ́ mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-agbaso ụkpụrụ omume ọma nke Bible.—1 Timoti 4:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 A gbanwewo aha ndị dị n’isiokwu a.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Mgbe nsogbu tara akpụ bilitere n’alụmdi na nwunye, ịdị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ọma nke Bible pụrụ ime ka alụmdi na nwunye na-aga n’ihu ma mee ka nsogbu ahụ belata
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
N’agbanyeghị nrụrụ aka zuru ebe nile—ma ọ bụ ma eleghị anya n’ihi ya—ndị ọzọ na-enwekarị mmasị n’ebe ndị na-akwụwa aka ọtọ nọ