Ụzọ Chineke Si Ele Ịdị Ọcha n’Omume Anya
Ụzọ Chineke Si Ele Ịdị Ọcha n’Omume Anya
“Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—AỊSAỊA 48:17.
1, 2. (a) Olee otú ndị mmadụ n’ozuzu si ele ụkpụrụ omume mmekọahụ anya? (b) Echiche dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere banyere ụkpụrụ omume mmekọahụ?
TAA, n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, a na-ewerezi omume dị ka okwu dịịrị onwe onye. Ndị mmadụ na-ele mmekọahụ anya dị ka ngosipụta mmetụta ịhụnanya dị otú o kwesịrị bụ́ nke ha ga na-eme mgbe ọ bụla ha chọrọ, ọ bụghị dị ka ihe e kwesịrị ime nanị n’alụmdi na nwunye. Ha na-eche na ọ bụrụhaala na ọ dịghị onye e merụrụ ahụ, ọ dịghị ihe dị njọ ná mmadụ ikpebiri onwe ya otú ọ ga-esi na-akpa àgwà. N’echiche ha, e kwesịghị ikpe ndị mmadụ ikpe n’okwu metụtara omume, karịsịa ma a bịa n’okwu metụtara mmekọahụ.
2 Ndị mataworo Jehova nwere echiche dị iche. Ha na-eji obi ụtọ agbaso ụkpụrụ nduzi nke Akwụkwọ Nsọ n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya ma na-achọ ime ihe na-atọ ya ụtọ. Ha na-aghọta na Jehova hụrụ ha n’anya, na-enyekwa nduzi nke bụ́ maka ọdịmma ha, nduzi nke ga-abara ha uru n’ezie ma mee ka ha na-enwe obi ụtọ. (Aịsaịa 48:17) Ebe Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ha ga-elegara ya anya maka nduzi n’ụzọ ha si eji ahụ ha eme ihe, karịsịa n’okwu a nke e jikọrọ nnọọ ya na mbufe ndụ n’ụzọ chiri anya.
Onyinye Sitere n’Aka Onye Okike Na-ahụ n’Anya
3. Gịnị ka a kụziwooro ọtụtụ ndị nọ na Krisendọm banyere mmekọahụ, oleekwa otú nke ahụ si dị iche n’ihe Bible na-akụzi?
3 N’ụzọ dị iche n’ihe ụwa taa nke na-adịghị efe Chineke na-akụzi, ụfọdụ ndị nọ na Krisendọm akụziwo na mmekọahụ bụ ihe ihere, mmehie, Jenesis 2:25) Chineke gwara ha ka ha mụọ ụmụ, na-asị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.” (Jenesis 1:28) Ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya bụ́ Chineke inye Adam na Iv iwu ịmụ ụmụ ma mesịa taa ha ahụhụ maka imezu ntụziaka ahụ.—Abụ Ọma 19:8.
nakwa na “mmehie mbụ” ahụ e mere n’ogige Iden bụ nrata Iv ratara Adam iso ya nwee mmekọahụ. Echiche dị otú ahụ na-emegide ihe Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee na-ekwu. Ihe ndekọ Bible na-ezo aka n’ebe mmadụ abụọ mbụ ahụ nọ dị ka “nwoke ahụ na nwunye ya.” (4. N’ihi gịnị ka Chineke ji nye ụmụ mmadụ ike nke inwe mmekọahụ?
4 N’iwu ahụ e nyere nne na nna anyị mbụ, bụ́kwa nke e nyeghachiri Noa na ụmụ ya ndị ikom, anyị na-ahụ nzube bụ́ isi e ji enwe mmekọahụ: ịmụ ụmụ. (Jenesis 9:1) Otú ọ dị, Okwu Chineke na-egosi na a kpaaraghị ndị ohu ya lụrụ di na nwunye ókè inwe mmekọahụ nanị n’ihi iji mụta ụmụ. Mmekọrịta dị otú ahụ pụrụ imeju mkpa mmetụta uche na nke anụ ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma bụrụ ihe na-enye di na nwunye obi ụtọ. Ọ bụ otu ụzọ ha ga-esi na-egosipụta mmetụta ịhụnanya miri emi n’ebe ibe ha nọ.—Jenesis 26:8, 9; Ilu 5:18, 19; 1 Ndị Kọrint 7:3-5.
Ihe Nchịkwa Ndị Sitere n’Aka Chineke
5. Mmachibido iwu ndị dị aṅaa ka Chineke nyeworo banyere inwe mmekọahụ nke mmadụ?
5 Ọ bụ ezie na mmekọahụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke, e kwesịghị inwe ya n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa. Ụkpụrụ a dị irè ọbụna n’ime ndokwa alụmdi na nwunye. (Ndị Efesọs 5:28-30; 1 Pita 3:1, 7) A machibidoro ndị na-abụghị di ma ọ bụ nwunye iwu inwe mmekọahụ. Bible kapịrị nnọọ okwu ọnụ n’akụkụ a. N’Iwu ahụ Chineke nyere mba Israel, e kwuru, sị: “Gị akwala iko.” (Ọpụpụ 20:14) Mgbe e mesịrị, Jisọs gụnyere “ịkwa iko nile” n’ime “echiche nile jọrọ njọ” bụ́ ndị na-esi n’obi apụta ma merụọ mmadụ. (Mak 7:21, 22) E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ịgba ndị Kraịst nọ na Kọrint ume, sị: “Gbanahụnụ ịkwa iko.” (1 Ndị Kọrint 6:18) Pọl dekwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.”—Ndị Hibru 13:4.
6. N’ime Bible, gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịkwa iko” pụtagasịrị?
6 Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịkwa iko” pụtara? E si n’okwu Grik bụ́ por·neiʹa nweta ya, bụ́ nke e ji eme ihe mgbe ụfọdụ iji zoo aka ná mmekọahụ nke ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. (1 Ndị Kọrint 6:9) N’ebe ndị ọzọ, dị ka na Matiu 5:32 nakwa na Matiu 19:9, ihe okwu ahụ pụtara sakwuru mbara ma na-ezokwa aka n’ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, idina onye ikwu, na idina anụmanụ. A pụkwara ịkọwa omume mmekọahụ ndị ọzọ ndị ndị na-abụghị di na nwunye na-enwe dị ka por·neiʹa, dị ka iji ọnụ amị akụkụ ahụ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị nakwa mmekọahụ n’otule na imetụgharị aka n’akụkụ ahụ onye ọzọ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị n’ụzọ imeju agụụ mmekọahụ. A katọrọ omume nile dị otú ahụ—ma ọ́ bụghị n’ụzọ a kapịrị ọnụ ọ bụrụ n’ụzọ na-enye echiche ya—n’Okwu Chineke.—Levitikọs 20:10, 13, 15, 16; Ndị Rom 1:24, 26, 27, 32. *
Irite Uru n’Iwu Chineke Ndị Metụtara Omume
7. Olee otú anyị si erite uru site n’ịnọgide na-adị ọcha n’omume?
7 Irube isi ná ntụziaka Jehova nyere banyere omume mmekọahụ pụrụ ịbụ ihe ịma aka nye ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Onye Juu bụ́ ọkà ihe ọmụma a ma ama na narị afọ nke 12 bụ́ Maimonides dere, sị: “Ọ dịghị iwu e nyere n’ime Tora nile [Iwu Mosis] nke ka sie ike ndebe karịa nke nkekọ ndị a machibidoro iwu na mmekọahụ rụrụ arụ.” Ma, ọ bụrụ na anyị erube isi ná ntụziaka Chineke, anyị ga-erite uru dị ukwuu. (Aịsaịa 48:18) Dị ka ihe atụ, irube isi n’okwu a na-enye aka echebe anyị pụọ n’ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha enweghị ngwọta ma na-egbu mmadụ. * A na-echebe anyị pụọ n’ịtụrụ ime ọkwà. Itinye amamihe Chineke n’ọrụ na-emekwa ka e nwee akọ na uche dị ọcha. Ime otú ahụ na-akwalite ùgwù onwe onye ma na-eme ka ndị ọzọ na-akwanyere anyị ùgwù, gụnyere ndị ikwu anyị, di ma ọ bụ nwunye anyị, ụmụ anyị, na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst. N’otu aka ahụ, ọ na-eme ka anyị nwee àgwà dị mma, na nke ziri ezi n’ebe mmekọahụ dị bụ́ nke ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ n’alụmdi na nwunye. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst dere, sị: “Eziokwu nke Okwu Chineke bụ ihe nchebe kasị mma e nwere. Ana m eche ka m lụọ di, mgbe ọ bụla m lụkwara di, obi ga-adị m ụtọ ịgwa nwoke bụ́ onye Kraịst m ga-alụ na anọgidewo m na-adị ọcha.”
8. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka omume anyị dị ọcha pụrụ isi kwalite ofufe dị ọcha?
8 Site n’ịnọgide na-eme omume dị ọcha, anyị pụkwara ime ihe dị ukwuu iji mee ka echiche na-ezighị ezi ndị a na-enwe banyere ezi ofufe belata ma dọta ndị mmadụ n’ebe Chineke anyị na-efe nọ. Pita onyeozi dere, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.” (1 Pita 2:12) Ọ bụrụgodị na ndị na-adịghị ejere Jehova ozi ajụ ịhụ ma ọ bụ ịnabata omume anyị dị ọcha, anyị pụrụ ijide n’aka na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ, na-anakwere, ọbụnadị na-aṅụrị ọṅụ ná mgbalị ndị anyị na-eme iji gbasoo nduzi ya.—Ilu 27:11; Ndị Hibru 4:13.
9. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ike ná nduzi Chineke n’agbanyeghị na anyị nwere ike ghara ịghọtazu ihe ndị mere o ji nye ya? Nye ihe atụ.
9 Inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ na-agunye inwe obi ike na ọ maara ihe kasị baara anyị uru, ọbụna ma a sị na anyị aghọtazughị ihe nile mere o ji eduzi anyị otú o si na-eduzi anyị. Tụlee otu ihe atụ sitere n’Iwu Mosis. Otu iwu nchịkwa e nyere banyere ọmụma ụlọikwuu nke ndị agha chọrọ ka a na-eli nsị́ ná mpụga ọmụma ụlọikwuu. (Deuterọnọmi 23:13, 14) Ikekwe ụmụ Israel chere echiche banyere ihe mere e ji nye ntụziaka dị otú ahụ; ụfọdụ pụrụ ichewo na ọ dịghị mkpa. Otú ọ dị, kemgbe ahụ, sayensị ọgwụ na ahụ ike abịawo chọpụta na iwu a nyere aka mee ka ebe ndị e si enweta mmiri dị ọcha ma nye nchebe pụọ n’ọrịa ndị e si n’ụmụ ahụhụ ebute. N’otu aka ahụ, e nwere ihe ndị metụtara ọnọdụ ime mmụọ, ọha na eze, mmetụta uche, anụ ahụ, na uche bụ́ ndị mere Chineke ji sị ka nanị ndị lụrụ di na nwunye na-enwe mmekọahụ. Ka anyị tụlezie ihe atụ ole na ole sitere na Bible banyere ndị nọgidere na-adị ọcha n’omume.
Josef—Onye A Gọziri Maka Omume Ọma Ya
10. Ònye nwara ịrata Josef, ò sikwa aṅaa zaghachi?
10 Ma eleghị anya, ị maara ihe atụ Bible banyere Josef, bụ́ nwa Jekọb. Mgbe ọ dị afọ 17, ọ ghọrọ ohu Pọtịfa, bụ́ onyeisi ndị ogbu nke Fero nke Ijipt. Jehova gọziri Josef, ka oge na-agakwa, a họpụtara ya ịbụ onyeisi n’ụlọ Pọtịfa nile. Ka ọ na-erule oge ọ nọ n’afọ ndị 20 ya, Josef ‘amaala mma n’ahụ, maakwa mma ile anya.’ Ọ dọọrọ mmasị nwunye Pọtịfa, bụ́ onye nwara ịrata ya. Josef mere ka ebe ọ kwụ doo anya, na-akọwa na ikweta agaghị abụ nanị imegide nna ya ukwu kamakwa ọ ga-abụ ‘imehie megide Chineke.’ Gịnị mere Josef ji chee echiche otú o si chee?—Jenesis 39:1-9.
11, 12. Ọ bụ ezie na e nweghị iwu e dere ede sitere n’aka Chineke nke machibidoro ịkwa iko nile, n’ihi gịnị ka Josef na-aghaghị ijiwo chee echiche otú ahụ o si chee?
Jenesis 39:11) Ma, Josef maara na a pụghị izonahụ Chineke omume dị otú ahụ.
11 Ihe àmà na-egosi na mkpebi Josef adabereghị n’egwu nke ịbụ onye ndị mmadụ ga-ahụ. Ezinụlọ Josef bi n’ebe dị anya, nna ya chekwara na ọ nwụọla. Ọ bụrụ na Josef enwee mmekọahụ rụrụ arụ, ezinụlọ ya agaghị ama banyere ya ma ọlị. Ihe àmà na-egosi na a pụkwara izonahụ Pọtịfa na ndị ohu ya ndị ikom mmehie dị otú ahụ, ebe ọ bụ na e nwere oge ndị ha na-anọghị n’ụlọ. (12 Josef aghaghị ịtụgharịwo uche n’ihe ọ maara banyere Jehova. Obi abụọ adịghị ya na ọ maara ihe Jehova kwupụtaworo n’ogige Iden: “N’ihi nke a ka nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.” (Jenesis 2:24) Ọzọkwa, o yiri ka Josef ọ̀ maara banyere ihe Jehova gwara otu eze Filistia bụ́ onye chọrọ ịrata nne ochie Josef bụ́ Sera iso ya nwee mmekọahụ. Jehova gwara eze ahụ, sị: “Lee, gị bụ onye nwụrụ anwụ, n’ihi nwanyị ahụ nke i kuruwooro; n’ihi na nwanyị ahụ bụ nwunye di lụrụ. . . . Mụ onwe m wee gbochiekwa gị ka ị ghara imehie megide m: n’ihi ya ekweghị m gị metụ ya aka.” (Jenesis 20:3, 6, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ya mere, ọ bụ ezie na Jehova enyebeghị iwu e dere ede n’oge ahụ, echiche ya banyere alụmdi na nwunye doro anya. Echiche Josef nwere banyere omume ọma, tinyere ọchịchọ ya ime Jehova obi ụtọ, mere ka ọ jụ omume rụrụ arụ.
13. Gịnị ka o yiri ka ọ bụ ya mere Josef apụghị izere nwunye Pọtịfa?
13 Otú ọ dị, nwunye Pọtịfa nọgidesiri ike, na-arịọ ya “kwa ụbọchị” ka ya na ya dịnaa. N’ihi gịnị ka Josef na-ejighị zere ya nnọọ? Dị ka ohu, o nwere ọrụ ndị ọ na-arụ, ọ pụghịkwa ịgbanwe ọnọdụ ya. Ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-enye echiche na ọdịdị nke ụlọ ndị Ijipt mere ka ọ dị mkpa na a ghaghị isi n’ebe bụ́ isi n’ụlọ gafee tupu a na-eru n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ngwongwo. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụwo ihe na-ekweghị omume bụ́ Josef izere nwunye Pọtịfa.—Jenesis 39:10.
14. (a) Gịnị mere Josef mgbe o sisịrị n’ebe nwunye Pọtịfa nọ gbapụ? (b) Olee otú Jehova si gọzie Josef maka ikwesị ntụkwasị obi ya?
14 O ruru ụbọchị nanị ha abụọ nọ n’ụlọ. Nwunye Pọtịfa jidere Josef ma tie, sị: “Ka mụ na gị dinaa.” Josef gbapụrụ. N’ịbụ onye ọjụjụ Josef jụrụ wutere, nwunye Pọtịfa boro Josef ebubo na ọ nwara idina ya n’ike. Olee ihe ndị si na ya pụta? Jehova ọ̀ kwụghachiri ya ụgwọ ozugbo maka iguzosi ike n’ezi ihe ya? Ee e. A tụbara Josef n’ụlọ mkpọrọ ma kee ya agbụ. (Jenesis 39:12-20; Abụ Ọma 105:18) Jehova hụrụ ikpe na-ezighị ezi ahụ ma mesịa bulie Josef elu site n’ụlọ mkpọrọ gaa n’obí eze. Ọ ghọrọ onye nke abụọ kasị ike n’Ijipt, e jikwa nwunye na ụmụ gọzie ya. (Jenesis 41:14, 15, 39-45, 50-52) Ọzọkwa, e dekọrọ akụkọ banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke Josef afọ 3,500 gara aga ka ndị ohu Chineke eri oge ahụ wee na-atụle ya. Lee ngọzi ndị dị ebube o nwetara maka ịgbaso iwu ezi omume nke Chineke! N’otu aka ahụ, anyị onwe anyị taa nwere ike ghara ịhụ ozugbo abamuru ndị dị n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe, ma anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na-ahụ anyị nakwa na ọ ga-agọzi anyị mgbe oge ya ruru.—2 Ihe E Mere 16:9.
‘Ọgbụgba Ndụ Job na Anya Ya Gbara’
15. Gịnị bụ ‘ọgbụgba ndụ Job na anya ya’ gbara?
15 Onye ọzọ guzosiri ike n’ezi ihe bụ Job. N’oge ọnwụnwa ndị ahụ Ekwensu nwara ya, Job tụleghachiri Job 31:1) Site n’ikwu nke a, Job bu n’uche na ná mkpebi ya ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke, na ya ekpebiwo izere ọbụna ilegide nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya. N’ezie, ọ ga-ahụworị ụmụ nwanyị kwa ụbọchị, ikekwe ọ ga-enyewokwara ha aka ma ọ bụrụ na enyemaka adị ha mkpa. Ma, a bịa n’ilegide ha anya n’echiche nke ibu omume mmekọahụ n’obi, aka ya adịghị ya. Tupu ọnwụnwa ya amalite, ọ bụwo nwoke bara ọgaranya nke ukwuu, onye “dị ukwuu karịa ụmụ Ihu anyanwụ nile.” (Job 1:3) Otú ọ dị, o jighị akụ̀ na ụba rata ọtụtụ ndị inyom. N’ụzọ doro anya, ọ dịghị mgbe o nwetụrụ atụmanya nke iso ụmụ agbọghọ nwee mmekọahụ rụrụ arụ.
ndụ ya ma kwuo na ya dị njikere ịnara ntaramahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụrụ na, tinyere ihe ndị ọzọ, ya emebiwo ụkpụrụ Jehova banyere omume mmekọahụ. Job kwuru, sị: “Mụ na anya m abụọ gbara ndụ; m̀ ga-esikwa aṅaa lekwasị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke anya?” (16. (a) Gịnị mere Job ji bụrụ ezi onye nlereanya nye ndị Kraịst lụrụ di na nwunye? (b) Olee otú akparamàgwà nke ndị ikom n’oge Malakaị si dị nnọọ iche na nke Job, gịnịkwa banyere taa?
16 N’ihi ya, n’oge ihe dị mma nakwa n’oge ihe siri ike, Job gosipụtara omume nguzosi ike n’ezi ihe. Jehova hụrụ nke a ma gọzie ya n’ụba. (Job 1:10; 42:12) Lee ezi ihe nlereanya Job bụụrụ ndị Kraịst lụrụ di na nwunye, ma ndị ikom ma ndị inyom! Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji hụ ya n’anya otú ahụ! N’ụzọ dị iche, akparamàgwà nke ọtụtụ ndị taa yiri nnọọ ihe mere n’oge Malakaị. Onye amụma ahụ kwara arịrị banyere otú ọtụtụ ndị bụ́ di si gbahapụ nwunye ha, mgbe mgbe, iji lụrụ ụmụ agbọghọ. Anya mmiri nke ndị nwunye a gbahapụrụ agbahapụ kpuchiri ebe ịchụàjà Jehova, Chineke makwara ndị ‘ghọgburu’ nwunye ha n’ụzọ dị otú ahụ ikpe.—Malakaị 2:13-16.
Nwa Agbọghọ Dị Ọcha n’Omume
17. Olee otú nwa agbọghọ Shunem ahụ si dị ka “ubi a gbara ogige nke a kpachiri akpachi”?
17 Onye nke atọ guzosiri ike n’ezi ihe bụ nwa agbọghọ Shunem. N’ịbụ nwa agbọghọ mara mma, ọ bụghị nanị nwa okoro bụ́ onye ọzụzụ atụrụ nwere mmetụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ kamakwa eze Israel bara ọgaranya, bụ́ Solomọn. N’akụkọ ọma ahụ nile a kọrọ n’Abụ nke Abụ, nwa agbọghọ Shunem ahụ dịgidere ọcha, si otú a mee ka ndị gbara ya gburugburu na-akwanyere ya ùgwù. Ọ bụ ezie na ọ jụrụ Solomọn, e nyere Solomon ike mmụọ nsọ ide akụkọ banyere ya. Onye ọzụzụ atụrụ ahụ ọ hụrụ n’anya kwanyekwaara omume ya dị ọcha ùgwù. N’otu oge, o kwuru n’obi ya na nwa agbọghọ Shunem ahụ dị ka “ubi a gbara ogige nke a kpachiri akpachi.” (Abụ nke Abụ 4:12) N’Israel oge ochie, ubi ndị mara mma na-enwe akwụkwọ nri, okooko osisi ndị na-esi ísì ụtọ, na osisi ndị gbara agba, n’ụdị dịgasị iche ma maa mma. A na-ejikarị osisi ma ọ bụ mgbidi agba ubi ndị dị otú ahụ ogige, ọ bụkwa nanị n’ọnụ ụzọ ámá a na-agbachi agbachi ka a pụrụ isi banye na ya. (Aịsaịa 5:5) Nye onye ọzụzụ atụrụ ahụ, ịdị ọcha nke omume na ịma mma nke nwa agbọghọ Shunem ahụ dị ka ubi mara mma dị otú ahụ bụ́ nke dị ụkọ. Ọ dị nnọọ ọcha n’ụzọ nile. Ọ bụ nanị nwoke ga-alụ ya ka ọ ga-egosi mmetụta ịhụnanya ya.
18. Gịnị ka ihe ndekọ banyere Josef, Job, na nwa agbọghọ Shunem na-echetara anyị?
18 Ná nguzosi ike n’ezi ihe nke omume, nwa agbọghọ Shunem ahụ setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nye ndị inyom bụ́ ndị Kraịst taa. Jehova hụrụ ma nwee ekele n’omume ọma nke nwa agbọghọ Shunem ahụ ma gọzie ya dị nnọọ ka ọ gọziri Josef na Job. E dekọrọ omume iguzosi ike n’ezi ihe ha n’Okwu Chineke iji nye anyị nduzi. Ọ bụ ezie na a dịghị edekọ mgbalị ndị anyị na-eme iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe taa n’ime Bible, Jehova nwere “akwụkwọ ncheta” maka ndị na-achọ ime uche ya. Ka anyị ghara ichefu ma ọlị na Jehova ‘na-aṅa ntị’ ma na-aṅụrị ọṅụ ka anyị ji iguzosi ike n’ihe na-agbalịsi ike ịnọgide na-adị ọcha n’omume.—19. (a) Ànyị kwesịrị isi aṅaa na-ele ịdị ọcha nke omume anya? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Ọ bụ ezie na ndị na-enweghị okwukwe pụrụ ịkwa anyị emo, anyị na-aṅụrị ọṅụ ná nrubeisi anyị nye Onye Okike anyị na-ahụ n’anya. Anyị nwere ụkpụrụ omume ka elu, ụkpụrụ omume nke Chineke. Ọ bụ ihe a ga-eji nyaa isi, ihe a ga-eji akpọrọ ihe. Site n’ịnọgide na-enwe omume dị ọcha, anyị pụrụ inwe obi ụtọ ná ngọzi Chineke, anyị pụkwara ịnọgide na-enwe olileanya na-egbuke egbuke nke ngọzi ndị na-agaghị agwụ agwụ n’ọdịnihu. Otú ọ dị, gịnị ka anyị pụrụ ime n’onwe anyị iji nọgide na-adị ọcha n’omume? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ a dị mkpa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Lee Ụlọ Nche, September 15, 1983, peeji nke 29-32.
^ par. 7 N’ụzọ dị mwute, e nwere ọnọdụ ebe ndị onye Kraịst aka ya dị ọcha na-ebute ọrịa mmekọahụ site n’aka di ma ọ bụ nwunye ya na-ekweghị ekwe bụ́ onye na-agbasobeghị ntụziaka Chineke.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
• Gịnị ka Bible na-akụzi banyere mmekọahụ?
• Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ịkwa iko” pụtagasịrị n’ime Bible?
• Ànyị si aṅaa erite uru site n’ịnọgide na-adị ọcha n’omume?
• Gịnị mere Josef, Job, na nwa agbọghọ Shunem ji bụụrụ ndị Kraịst ezi ndị nlereanya taa?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 9]
Josef gbaara omume rụrụ arụ ọsọ
[Foto dị na peeji nke 10]
Nwa agbọghọ Shunem ahụ dị ka “ubi a gbara ogige nke a kpachiri akpachi”
[Foto dị na peeji nke 11]
Job ‘na anya ya gbara ndụ’