Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ị Na-ewere Dị Ka Inwe Ihe Ịga nke Ọma?

Gịnị Ka Ị Na-ewere Dị Ka Inwe Ihe Ịga nke Ọma?

Gịnị Ka Ị Na-ewere Dị Ka Inwe Ihe Ịga nke Ọma?

OTU akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa inwe ihe ịga nke ọma dị ka “inweta akụ̀ na ụba, ihu ọma, ma ọ bụ ọkwá dị elu.” Nke ahụ ọ̀ bụ nkọwa zuru ezu? Akụ̀ na ụba, ihu ọma, ma ọ bụ ọkwá dị elu hà bụ nanị ihe e ji amata ihe ịga nke ọma? Tupu ị zaa, tụlee nke a: Jisọs Kraịst akpakọbaghị akụ̀ na ụba nkịtị n’oge ndụ ya. Ọtụtụ ndị enweghị mmasị n’ebe ọ nọ; mmadụ ndị a na-elegara anya n’oge ya ejighịkwa ya kpọrọ ihe. Ma, Jisọs nwere ihe ịga nke ọma. N’ihi gịnị?

Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ọ bụ “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” (Luk 12:21) Mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Chineke kwụrụ ya ụgwọ ọrụ site n’ikpuwe ya “ebube na nsọpụrụ” n’isi dị ka okpueze. Jehova weliri Ọkpara ya “elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu.” (Ndị Hibru 2:9; Ndị Filipaị 2:9) Ụzọ Jisọs si bie ndụ mere ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ndụ ya n’elu ala nwere ihe ịga nke ọma n’ihi na o mezuru nzube o ji bie ya. Jisọs mere uche Chineke ma mee ka aha Ya dị ebube. N’aka nke ya, Chineke ji ụdị akụ̀ na ụba, ihu ọma, na ọkwá dị elu nke onye ọ bụla bụ́ ọkà n’agụmakwụkwọ, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ n’egwuregwu na-agaghị enweta ma ọlị, mee ka Jizọs dị ebube. Jisọs bụ n’eziokwu onye kasị nwee ihe ịga nke ọma bitụworo ndụ n’elu ala.

Ndị Kraịst bụ́ nne na nna maara na ọ bụrụ na ụmụ ha na-eto eto agbasoo nzọụkwụ Kraịst, bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ n’echiche ahụ Jisọs bụ, ha ga-enweta ngọzi bara ụba ugbu a ma nata ụgwọ ọrụ a na-apụghị ichetụdị n’echiche n’usoro ihe na-abịa abịa. Ọ dịghị ụzọ ka mma onye na-eto eto ga-esi gbasoo nzọụkwụ Kraịst karịa ịrụ ọrụ Jisọs rụrụ—site n’ikere òkè n’ozi oge nile ma nke ahụ kwe mee.

Otú ọ dị, n’ebe ụfọdụ, ihe a na-ahụkebe bụ na ndị na-eto eto adịghị ewere ozi oge nile. Mgbe nwa okorobịa gụsịrị akwụkwọ, a pụrụ ịtụ anya n’aka ya ka o nweta ọrụ ọ ga-etinye oge ya dum na ya, lụọ nwanyị, wee kwụụrụ onwe ya. Mgbe ụfọdụ, ndị na-eto eto a zụlitere n’ebe dị otú ahụ na-ehie ụzọ site n’ila azụ ịbanye n’ozi oge nile. (Ilu 3:27) N’ihi gịnị? N’ihi nrụgide, ha na-agbaso ụkpụrụ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-agbaso. Nke ahụ bụ ihe mere Robert. *

Mgbe Ihe A Na-emekebe Megidere Akọ na Uche

A zụlitere Robert dị ka otu n’ime Ndịàma Jehova. Mgbe ọ nọ n’afọ iri na ụma ya, omume ya nakwa ndị ya na ha na-akpakọrịta adịchaghị mma. Nne ya malitere ichegbu onwe ya banyere ya. Ya mere, ọ rịọrọ otu ọsụ ụzọ, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, ka ọ gbaa ya ume. Robert na-akọwa ihe mesịrị mee.

“Enwere m nnọọ obi ụtọ ná mmasị nwanna nwoke ahụ bụ́ onye ọsụ ụzọ gosiri n’ebe m nọ. Ezi ihe nlereanya ya mere ka m chọọ iwere ịsụ ụzọ dị ka ọrụ m ga-arụ ozugbo m gụsịrị akwụkwọ. Mgbe ahụ ka mama m chegbuwere onwe ya ọzọ—ma ọ bụ n’ihi ihe dị iche. Ee, dị ka a na-emekebe n’ebe anyị bi, ọ dịghị ihe o mere nwa agbọghọbịa ịmalite ịsụ ụzọ ozugbo ọ gụsịrị akwụkwọ, ma a na-atụ anya ka nwoke burugodị ụzọ kpata ego, mgbe e mesịziri o nwere ike ichewe echiche ịsụ ụzọ.

“Enwetara m ihe m ga na-arụ, m wee malite ọrụ achụmnta ego nke m. N’oge na-adịghị anya, m mikpuru onwe m n’ọrụ achụmta ego ahụ wee na-aga nzukọ, na-emekwa nkwusa nanị iji mezuo iwu. Akọ na uche m mara m ikpe—amaara m na m pụrụ ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị. Ka o sina dị, ọ bụ mgba siri ike ịtọhapụ onwe m n’ihe ndị ọzọ tụrụ anya ka m mee, ma obi dị m ụtọ na m mere otú ahụ. Alụwo m nwanyị ugbu a, mụ na nwunye m anọwo na-asụ ụzọ eri afọ abụọ gara aga. N’oge na-adịbeghị anya, a họpụtara m dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Apụrụ m ikwu n’eziokwu na m nwere ezi afọ ojuju ugbu a iji obi m nile na-ejere Jehova ozi, ruo n’ókè m pụrụ ije.”

Magazin a agbawo ndị na-eto eto ume ugboro ugboro ịmụta aka ọrụ ma ọ bụ ịzụlite nkà ụfọdụ bara uru—mgbe ha ka nọ n’ụlọ akwụkwọ ma o kwe mee. Iji mee gịnị? Ọ̀ bụ iji baa ọgaranya? Ee e. Nzube bụ́ isi bụ ka ha wee nwee ike ịkwado onwe ha nke ọma mgbe ha toruworo ogo mmadụ wee jeere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu ruo ka ha nwere ike, karịsịa n’ozi oge nile. Ma, o mewo mgbe mgbe na ndị ikom na ndị inyom na-eto eto emikpuwo onwe ha n’ịchụso ọrụ ego nke na ozi ha na-ebelata n’ịdị mkpa. Ụfọdụ adịghị eche echiche banyere iwere ozi oge nile. N’ihi gịnị?

Ihe Robert kwuru na-enye aka ịghọta nke a. Ozugbo Robert mụtaworo aka ọrụ ya, ọ malitere achụmnta ego. N’oge na-adịghị anya, ọ banyere n’ihe na-adịghị eduga ya n’ebe ọ bụla. Ihe mgbaru ọsọ ya bụ ịkpata ego ga-ezuru ya. Ma ọ̀ dị onye ọ bụla n’ọgbakọ ndị Kraịst ma ọ bụ n’èzí rutụworo ihe mgbaru ọsọ ahụ n’ụzọ zuru ezu? Ndị Kraịst kwesịrị ịgbalisi ike ibuli ibu ego ha nwere, na-agbasi mbọ ike ịhụ maka ibu ego ndị dịịrị ha; ma ha kwesịkwara ịghọta na n’oge a a na-ejighị n’aka, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-eru n’ogo ha pụrụ ịgụ onwe ha ná ndị nwere ego ga-ezuru ha n’ezie. Ọ bụ nke ahụ mere nkwa Jisọs kwere, bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 6:33 ji akasi nnọọ ndị Kraịst obi.

Robert nwere obi ụtọ na ya kpebiri ịgbaso ọchịchọ obi ya kama ịgbaso ihe a na-emekebe n’ebe o bi. Taa, ọ nọ n’ozi oge nile. Ee, ozi oge nile bụ ọrụ dị ùgwù. Obi ruru Robert ala n’ihi na ọ na-ejere Jehova ozi ‘ruo n’ókè ọ pụrụ ije,’ dị ka o kwuru.

Jiri Nkà I Nwere Mee Ihe Kasị Mma

E nwere ọtụtụ ndị nwere onyinye n’etiti Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ nwere ọgụgụ isi pụrụ iche; ndị ọzọ nwere nkà n’ọrụ ọkpụkpụ aka. Onyinye ndị a nile na-esi n’aka Jehova abịa, bụ́ onye na-enye “mmadụ nile ndụ, na ume, na ihe nile.” (Ọrụ 17:25) Ọ bụrụ na ndụ adịghị, onyinye ndị a agaghị aba uru ọ bụla.

Ya mere, o kwesịrị nnọọ ekwesị anyị iji ndụ anyị rarawooro nye mee ihe n’ozi Jehova. Nke ahụ ka otu nwa okorobịa nwere nkà kpebiri ime. Ọ dịrị ndụ na narị afọ mbụ O.A. O sitere n’ezinụlọ a ma ama, o biri ndụ okorobịa ya n’obodo a ma nke ọma bụ́ Tasọs nke Silisia. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye Juu site n’ọmụmụ, o nwetara ikike ịbụ nwa amaala Rom site ná nna ya. Nke ahụ mere ka o nwee ọtụtụ ihe ndị ruuru ya na ọtụtụ ihe ùgwù. Mgbe o tolitere, ọ mụrụ Nkà Mmụta Iwu site n’aka otu n’ime “ndị prọfesọ” mbụ nke oge ahụ—Gameliel. O yiri ka ọ ga-enweta ‘akụ̀ na ụba, ihu ọma na ọkwá dị elu’ n’oge na-adịghị anya.—Ọrụ 21:39; 22:3, 27, 28.

Ònye ka nwa okorobịa a bụ? Aha ya bụ Sọl. Ma Sọl ghọrọ onye Kraịst, mesịakwa ghọọ Pọl onyeozi. O wezụgara ọchịchọ mbụ ya wee nyefee ndụ ya dum ije ozi Jehova dị ka onye Kraịst. A bịara mara Pọl, ọ bụghị dị ka ọkàiwu pụrụ iche, kama dị ka onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Mgbe Pọl jeworo ozi dị ka onye ozi ala ọzọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30, o degaara ndị enyi ya nọ na Filipaị akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ tụleghachiri ụfọdụ n’ihe ndị ọ rụzuworo tupu ya aghọọ onye Kraịst, o wee kwuo, sị: “M yiri iyi ihe nile nke m n’ihi [Jisọs Kraịst], ana m agụkwa ha n’ihe mkpofu, ka m wee rite Kraịst n’uru.” (Ndị Filipaị 3:8) Ee e, Pọl akwaghị ụta maka otú o siworo jiri ndụ ya mee ihe!

Gịnị banyere ọzụzụ Pọl natara n’aka Gameliel? Ò mesịrị baara ya uru? Ee! Ọtụtụ mgbe o keere òkè “n’ime ngọpụ nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.” Ma ọrụ bụ́ isi Pọl rụrụ bụ ikwusa ozi ọma—ihe ụlọ akwụkwọ o bu ụzọ gaa na-apụghị ịkụziworo ya ma ọlị.—Ndị Filipaị 1:7; Ọrụ 26:24, 25.

N’otu aka ahụ taa, ụfọdụ enwewo ike iji onyinye na nkà ha nakwa ọbụna agụmakwụkwọ ha na-eme ka ọdịmma Alaeze na-aga n’ihu. Dị ka ihe atụ, Amy nwere akara ugo mmụta n’ihe ọmụmụ azụmahịa, nweekwa ya na nkà mmụta iwu. O nweburu ọrụ na-enye ezigbo ego n’ụlọ ọrụ onye ọkàiwu, ma taa ọ na-eje ozi dị ka onye ozi afọ ofufo a na-adịghị akwụ ụgwọ n’otu n’ime ngalaba ụlọ ọrụ Watch Tower Society. Lee otú Amy si kọwaa ndụ ya ugbu a: “Ekweere m na mụ emewo nhọrọ kasị mma m pụrụ ime ná ndụ. . . . Enweghị m ọchịchọ ịnọ n’ọnọdụ ndị mụ na ha gakọrọ mahadum nọ. Enwere m obi ụtọ n’ọrụ m họrọwooro. Enwere m ihe nile dị mkpa bụ́kwa ndị m chọrọ—ndụ obi ụtọ nke na-eju afọ na ọrụ na-eweta ọṅụ ma na-enye afọ ojuju.”

Amy họọrọ ọrụ wetaara ya udo nke obi, afọ ojuju, na ngọzi Jehova. N’ezie, nke a ka ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst chọrọ ka ụmụ ha nweta!

Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ozi Ndị Kraịst

Otú ọ dị, ọ dị mkpa ile inwe ihe ịga nke ọma n’ozi ndị Kraịst n’onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọ dịghị esiri anyị ike inwe mmetụta na ihe na-aga nke ọma mgbe anyị kerewooro òkè n’ozi ubi tọrọ anyị ụtọ, tinye akwụkwọ e ji amụ Bible ma ọ bụ soro ndị nwe ụlọ nwee nkwurịta okwu Bible na-akpali akpali. Ma ọ bụrụ na anyị adịghị ahụkebe ndị na-ege ntị, anyị pụrụ ịbụ ndị a nwara ikwubi na anyị na-egbu oge anyị. Ma, cheta na otu n’ime nkọwa nke inwe ihe ịga nke ọma bụ ‘inweta ihu ọma.’ Ihu ọma ònye ka anyị chọrọ inweta? N’ezie, ọ bụ nke Jehova. Anyị pụrụ inweta nke a ma ndị mmadụ hà gere ntị n’ozi anyị ma ọ bụ na ha egeghị. Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe mmụta gbara ọkpụrụkpụ n’ihe banyere nke a.

Ị ga-echeta na Jisọs zigara ndị nkwusa Alaeze 70 “n’obodo na ebe ọ bụla, ebe Ya onwe ya gaje ịbịa.” (Luk 10:1) Ha gaje ime nkwusa n’obodo ukwu na obodo nta dị iche iche mgbe Jisọs na-esonyereghị ha. Nke a bụ ahụmahụ ha na-enwetụbeghị. N’ihi ya, Jisọs nyere ha ntụziaka zuru ezu tupu ya ezipụ ha. Ọ bụrụ na ha ezute “onye udo,” ha ga-agbara ya àmà nke ọma banyere Alaeze ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na a jụ ha, ha ga-agawara onwe ha, n’esogbughị onwe ha. Jisọs kọwara na ndị jụrụ ige ha ntị na-ajụ Jehova n’onwe ya n’ezie.—Luk 10:4-7, 16.

Mgbe mmadụ 70 ahụ rụzuru ọrụ nkwusa e nyere ha, ha ‘ji ọṅụ weghachiri Jisọs ozi, sị, Onyenwe anyị, ọbụna ndị mmụọ ọjọọ ka a na-edo n’okpuru anyị n’aha Gị.’ (Luk 10:17) Ọ ghaghị ịbụrụ ndị ikom ahụ na-ezughị oké ihe na-akpali akpali ịchụpụ ndị mmụọ e kere eke dị ike! Otú ọ dị, Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya na-anụ ọkụ n’obi aka ná ntị, sị: “Unu aṅụrịla ọṅụ na nke a, na a na-edo ndị ajọ mmụọ n’okpuru unu; ma ṅụrịanụ ọṅụ na e dewo aha unu n’akwụkwọ n’eluigwe.” (Luk 10:20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ikekwe, mmadụ 70 ahụ agaghị anọgide na-enwe ike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ihe ndị ga-esi n’ozi ha apụta agaghịkwa anọgide na-adị mma. Ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ha ga-anọgide na-enwe nnwapụta Jehova.

Ị̀ Na-enwe Mmasị n’Ebe Ndị Ozi Oge Nile Nọ?

N’otu oge, otu nwa okorobịa gwara otu onye Kraịst bụ́ okenye, sị: “Mgbe m gụsịrị akwụkwọ na kọleji, m ga-agbalị ịchọta ọrụ. Ọ bụrụ na achọtaghị m ọrụ, m ga-atụlezi ma m̀ ga-abanye n’otu ozi oge nile.” Otú ọ dị, ọtụtụ ndị werewooro ozi ịsụ ụzọ echeghị ya otú ahụ. Ụfọdụ ndị ahapụwo ohere ndị ha nwere ịchụso ọrụ ndị na-enye ezigbo ego iji sụọ ụzọ. Ndị ọzọ ajụwo ohere ndị na-akpali akpali nke ịgụ akwụkwọ. Dị ka Pọl onyeozi, ha achụwo ihe dị iche iche n’àjà, ma dị ka Pọl, Robert, na Amy, ha adịghị akwa ụta maka nhọrọ ndị ha meworo. Obi dị ha ụtọ maka ihe ùgwù ha nwere iji onyinye ha na-eto Jehova, bụ́ onye kwesịrị ekwesị ịnara ihe kasị mma ha pụrụ inye.

N’ihi ihe dị iche iche, ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi anọghị n’ọnọdụ ga-ekwe ha ka ha sụọ ụzọ. Ikekwe ha nwere ibu ọrụ ndị Akwụkwọ Nsọ kwadoro ha bu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ha na-ejere Chineke ozi site ‘n’obi, mkpụrụ obi, na uche’ ha dum, Jehova na-enwe obi ụtọ n’ebe ha nọ. (Matiu 22:37) Ọ bụ ezie na ha onwe ha enweghị ike ịsụ ụzọ, ha matara na ndị na-asụ ụzọ ahọrọwo ọrụ dị mma.

Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a.” (Ndị Rom 12:2) N’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl, anyị agaghị ekwe ka ụkpụrụ nke ihe ndị a na-emekebe n’ebe anyị bi na nke ọrụ ego nke usoro a kpụgharịa echiche anyị. Ma ì nwere ike ịsụ ụzọ ma ọ bụ na i nweghị, mee ka ozi Jehova bụrụ ihe ị na-elekwasị anya ná ndụ gị. Ị ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụhaala na i nwere nnwapụta Jehova.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto dị na peeji nke 19]

Abụla onye ihe na-adịghị eduga mmadụ ebe ọ bụla jichiri