“O, Okwukwe nke Na-agaghị Ada Ada”!
Akụkọ Ndụ
“O, Okwukwe nke Na-agaghị Ada Ada”!
DỊ KA HERBERT MÜLLER SI KỌỌ
Ọnwa ole na ole mgbe ndị agha Hitler wakposịrị Netherlands, a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu. N’oge na-adịghị anya, aha m sonyere na nke ndị ndị Nazi kasị achọ ịnwụchi, a nọkwa na-achụgharị m dị ka anụmanụ.
N’OTU oge, ike gwụsịrị m nnọọ n’ihi izogharị na ịgbagharị ọsọ nke na m gwara nwunye m na ọ pụrụ ọbụna ịkara m mma ịbụ onye ndị agha jidere. Mgbe ahụ ka m chetara okwu ndị dị n’otu abụ: “O, okwukwe nke na-agaghị ada ada, n’agbanyeghị ịbụ onye ndị iro nile wakporo.” * Ịtụgharị uche n’abụ ahụ nyere m ume ọhụrụ ma mee ka m cheta ndị mụrụ m nọ na Germany na ụbọchị ahụ ndị enyi m bụrụ abụ a iji sị m gaa nke ọma. Àpụrụ m ịkọrọ gị ụfọdụ n’ime ihe ndị a m chetara?
Ihe Nlereanya nke Ndị Mụrụ M
Ndị mụrụ m na-ekpe Chọọchị Evangelical mgbe a mụrụ m na 1913 n’obodo Copitz nke dị na Germany. * Mgbe afọ asaa gasịrị, na 1920, nna m si na chọọchị ahụ pụọ. N’April 6, ọ rịọrọ ka e nye ya fọm bụ́ Kirchenaustrittsbescheinigung (Nkwupụta Banyere Isepụ Aka na Chọọchị). Ọfịsa na-ahụ maka ndebanye aha n’obodo ahụ dejupụtara otu fọm ahụ. Otú ọ dị, ka otu izu gasịrị, nna m gaghachiri n’ọfịs ahụ na-akọwa na e debaghị aha nwa ya nwanyị ná nkwupụta ahụ. Ọfịsa ahụ dejupụtara fọm nke abụọ bụ́ nke na-ekwu na nsepụ aka na chọọchị ahụ gụnyekwara Martha Margaretha Müller. N’oge ahụ, Margaretha, bụ́ nwanne m nwanyị, di otu afọ na ọkara. A bịa n’ijere Jehova ozi, nna m adịghị enwe afọ ojuju n’ofufe na-ezuchaghị ezu!
N’otu afọ ahụ, Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, mere ndị mụrụ m baptism. Nna m zụlitere anyị bụ́ ụmụ ya n’ụzọ ekweghị anyị megharịa ahụ, ma iguzosi ike n’ihe ya nye Jehova mere ka ọ kara anyị mfe ịnara nduzi ya. Iguzosi ike n’ihe kwalikwara ndị mụrụ m ime mgbanwe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọ dị mgbe a na-adịghị ekwe ka anyị gwurie egwu n’èzí n’ụbọchị Sunday. Otú ọ dị, n’otu Sunday na 1925, ndị mụrụ anyị gwara anyị na anyị ga-eje mkpagharị. Anyị ji ụfọdụ mgbadume jee ma kporie ndụ—lee ka o si dị iche n’ịbụ ndị a na-ekweghị pụọ èzí n’ogologo ụbọchị! Nna m kwuru na ya amụtawo isi ihe ụfọdụ ná mgbakọ e nwere mgbe na-adịbeghị anya bụ́ ndị gbaziri echiche ya banyere ihe ndị a ga na-eme n’ụbọchị Sunday. N’oge ndị ọzọ, o gosikwara otu ịdị njikere ime mgbanwe dị otú ahụ.
N’agbanyeghị na ahụ esighị ndị mụrụ m ike, ha alaghị azụ n’ọrụ nkwusa. Dị ka ihe atụ, iji kesaa traktị bụ́ Ecclesiastics Indicted, anyị so ndị nile fọdụrụnụ n’ọgbakọ anyị banye n’ụgbọ okporo ígwè n’otu uhuruchi ma jee obodo Regensburg, nke dị ihe dị ka kilomita 300 site na Dresden. N’echi ya, anyị kesara traktị ahụ n’obodo ahụ nile, mgbe anyị mesịkwara, anyị so ụgbọ okporo ígwè ahụ laghachi. Ka ọ na-erule mgbe anyị lọrutere ụlọ, ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ awa 24 agafeelarị.
Ịhapụ Ụlọ
Mkpakọrịta mụ na Jugendgruppe (Òtù Ndị Ntorobịa) nọ n’ọgbakọ anyị nyekwaara m aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ. N’izu ọ bụla, ndị na-eto eto dị ihe karịrị afọ 14 na-eso ụfọdụ ụmụnna ndị ka ha okenye n’ọgbakọ ezukọta. Anyị na-egwuri egwu, na-akpọkwa ngwá egwú dị iche iche, na-amụ Bible, na-ekwurịtakwa ihe banyere okike na sayensị. Otú ọ dị, na 1932, mgbe m dị afọ 19, mkpakọrịta mụ na ìgwè ahụ bịara ná njedebe.
N’April nke afọ ahụ, nna m natara akwụkwọ ozi si n’ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Magdeburg. Society nọ na-achọ onye pụrụ ịnya ụgbọala, chọọkwa ịsụ ụzọ. Amatara m na ọ bụ ọchịchọ ndị mụrụ m ka m sụọ ụzọ, ma echere m na m gaghị emeli ya. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m dara ogbenye, amalitela m rịị ịrụzi ịnyịnya ígwè na ígwè ịkwa ákwà, tinyere typewriter na ngwá ọrụ ndị ọzọ, mgbe m dị afọ 14. Olee otú m pụrụ isi hapụ ezinụlọ anyị? Enyemaka m dị ha mkpa. Ọzọkwa, e mebeghịdị m baptism. Nna m so m nọdụ ala ma jụọ m ajụjụ ụfọdụ iji mara ma m ghọtara ihe baptism gụnyere. Mgbe azịza m mere ka o kwenye na enweela m ọganihu ime mmụọ zuru ezu iji bụrụ onye a ga-eme baptism, ọ sịrị: “I kwesịrị iwepụta onwe gị maka ọrụ a.” Emere m otú ahụ.
Otu izu mgbe e mesịrị, a kpọrọ m òkù ịbịa Magdeburg. Mgbe m gwara ndị enyi m nọ n’Òtù Ndị Ntorobịa ahụ, ha chọrọ iji abụ obi ụtọ sị m gaa nke ọma. Abụ m họọrọ juru ha anya n’ihi na ha weere ya dị ka nke na-akpali ichesi echiche ike. N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ welitere violin, mandolins, na ụbọ akwara ha, mmadụ nile bụkwara ya: “O, okwukwe nke na-agaghị ada ada, n’agbanyeghị ịbụ onye ndị iro nile wakporo; nke
na-agaghị ama jijiji n’ihu ọdachi ọ bụla e nwere n’ụwa.” N’ụbọchị ahụ, aghọtaghị m otú okwu ndị ahụ gaje isi ewusi m ike ọtụtụ ugboro n’afọ ndị dị n’ihu.Mmalite Tara Akpụ
Mgbe ụmụnna nọ na Magdeburg nwalesịrị nkà m n’ịkwọ ụgbọala, ha bunyere mụ na ndị ọsụ ụzọ anọ ndị ọzọ otu obere ụgbọala, anyị wee tinye isi na Schneifel, otu ógbè dịdewere Belgium. N’oge na-adịghị anya, anyị matara na ụgbọala anyị bụ ihe dị oké mkpa. Ọnụnọ anyị were ndị Chọọchị Katọlik nọ n’ógbè ahụ iwe, n’ịbụkwa ndị ndị ụkọchukwu kpaliri, ọtụtụ mgbe ndị bi n’obodo nta ahụ na-echere iji chụpụ anyị. Ọtụtụ mgbe, obere ụgbọala ahụ nyeere anyị aka ijisi ike gbapụ tupu ha ejiri ọgụ na ihe e ji akpakọta ahịhịa wakpo anyị.
Mgbe Ememe Ncheta nke 1933 gasịrị, onye nlekọta ógbè, bụ́ Paul Grossmann, gwara anyị na a machibidowo ọrụ Society iwu na Germany. Oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, alaka ụlọ ọrụ ahụ gwara m ka m jiri obere ụgbọala ahụ bịa Magdeburg, buru akwụkwọ n’ebe ahụ, ma buga ya n’ógbè Saxony, bụ́ nke dị ihe dị ka 100 kilomita site na Magdeburg. Otú ọ dị, mgbe m na-erule Magdeburg, ndị Gestapo (ndị uwe ojii nzuzo nke Nazi) emechielarị ọfịs Society. M hapụụrụ otu nwanna nwoke obere ụgbọala ahụ na Leipzig wee laghachi n’ụlọ—ma ọ bụghị ruo ogologo oge.
Ọfịs Society nke dị na Switzerland kpọrọ m òkù ịmalite ịsụ ụzọ na Netherlands. Emere m atụmatụ ịga n’ime otu izu ma ọ bụ abụọ. Otú ọ dị, nna m dụrụ m ọdụ ịgawa ozugbo. M naara ndụmọdụ ya, n’ime awa ole na ole kwa, ahapụrụ m ụlọ. N’echi ya, ndị uwe ojii bịara n’ebe obibi nna m ịnwụchi m n’ihi ebubo e boro na m bụ onye soja gbara ọsọ. Ha abịaghị nnọọ n’oge.
Ịmalite Ije Ozi na Netherlands
N’August 15, 1933, erutere m n’ebe obibi ndị ọsụ ụzọ dị na Heemstede, bụ́ obodo dị kilomita 25 site n’Amsterdam. N’echi ya, ejere m ime nkwusa n’amaghị otu okwu n’asụsụ Dutch. N’iji kaadị ịgba àmà, bụ́ nke bu okwu e biri ebi, amalitere m. Lee ihe agbamume ọ bụ mgbe otu nwanyị onye Katọlik natara akwụkwọ bụ́ Reconciliaton! N’otu ụbọchị ahụ, etinyekwara m akwụkwọ nta 27. Ná ngwụsị ụbọchị mbụ ahụ, ọṅụ juru m obi n’ihi inwere onwe m ọzọ ime nkwusa.
N’oge ahụ, ndị ọsụ ụzọ enweghị ụzọ ọzọ ha si enweta ego ma e wezụga ụtụ ndị ha natara mgbe ha tinyere akwụkwọ. Ha na-eji ego ahụ azụta nri na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. E nwee obere ego fọrọ ná ngwụsị ọnwa, a na-ekere ya ndị ọsụ ụzọ maka mmefu onwe onye ha. Anyị nwere ntakịrị ihe onwunwe, ma Jehova gboro mkpa anyị nke ọma nke na m jere otu mgbakọ e mere na Switzerland na 1934.
Onye Ibe Kwesịrị Ntụkwasị Obi
Ná mgbakọ ahụ, ahụrụ m Erika Finke dị afọ 18. Amatara m ya mgbe m nọ n’ụlọ. Ọ bụ enyi nwanne m nwanyị, bụ́ Margaretha, nguzosi ike Erika maka eziokwu ahụ anọwokwa na-amasị m mgbe nile. N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị ya baptism na 1932, otu onye gwara ndị Gestapo na Erika ajụwo ịsị “Heil Hitler!” Ndị Gestapo gara jide ya ma chọọ ka ha mara ihe mere o jiri jụ. Erika gụụrụ ọfịsa nọ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ahụ Ọrụ Ndị Ozi 17:3 ma kọwaa na Chineke ahọpụtawo nanị otu onye dị ka Onye Nzọpụta, bụ́ Jisọs Kraịst. “È nwere ndị ọzọ kweere ihe i kweere?” ka onye ọfịsa ahụ chọrọ ịmara. Erika jụrụ ịkpọ aha ọ bụla. Mgbe onye uwe ojii ahụ yiri ya egwu ịkpọchi ya, Erika gwara ya na ọ ka mma ka ya nwụọ kama ịgwa ya aha ndị ahụ. Nwoke ahụ chagidere ya anya wee tie, sị: “Si n’ebe a pụọ. Laa. Heil Hitler!”
Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, alaghachiri m Netherlands ebe Erika nọgidere na Switzerland. Otú ọ dị, anyị abụọ nwere mmetụta na ọbụbụenyi anyị etoola. Mgbe Erika ka nọ na Switzerland, ọ nụrụ na ndị Gestapo nọ n’obodo ya na-achọgharị ya. O kpebiri ịnọgide ma na-asụ ụzọ na Switzerland. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, Society gwara ya ka o jee Spain. Ọ sụrụ ụzọ na Madrid, nakwa na Bilbao, e mesịakwa, na San Sebastián, bụ́ ebe mkpagbu nke ndị ụkọchukwu kpaliri mere ka a tụọ ya na onye ya na ya na-asụkọ ụzọ mkpọrọ. Na 1935, e nyere ha iwu isi Spain pụọ. Erika bịara na Netherlands, anyị lụkwara n’otu afọ ahụ.
Agha Na-aga Ịmalite
Mgbe anyị gbasịrị akwụkwọ, anyị sụrụ ụzọ na Heemstede, e mesịakwa, anyị kwafere n’obodo ukwu bụ́ Rotterdam. N’ebe ahụ ka a mụrụ ọkpara anyị, bụ́ Wolfgang, na 1937. Mgbe otu afọ gasịrị, anyị kwagara n’obodo ukwu bụ́ Groningen, n’ebe ugwu Netherlands, bụ́ ebe anyị so ndị ọsụ ụzọ bụ́ ndị Germany bụ́ Ferdinand na Helga Holtorf nakwa nwa ha nwanyị biri n’otu ụlọ. Na July 1938, Society gwara anyị na gọọmenti Netherlands enyewo ịdọ aka ná ntị na a machibidola Ndịàmà bụ́ ụmụ amaala Germany iwu ime nkwusa. N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, a họpụtara m ịbụ ohu zoonu (onye nlekọta sekit), ezinụlọ anyị kwagakwara na Lightbearer, bụ́ ụgbọ mmiri Society nke ndị ọsụ ụzọ nọ na-eme nkwusa n’akụkụ ebe ugwu Netherlands jiri mere ebe obibi ha. N’oge ka ukwuu, ana m ahapụ ezinụlọ m, jiri ịnyịnya ígwè na-aga site n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ iji na-agba ụmụnna ume ka ha nọgide na-eme nkwusa. Ụmụnna ndị ahụ mekwara nke ahụ kpọmkwem. Ọbụna ụfọdụ mụbara ozi ha. Wim Kettelarij bụ otu ezigbo ihe atụ.
Mgbe m zutere Wim, ọ bụ nwa okorobịa nke ghọtara eziokwu ahụ ma jiri ọrụ n’aka nke ukwuu dị ka onye na-arụrụ ndị ọzọ ọrụ n’ugbo ha. “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka i nwee oge iji jeere Jehova ozi,” ka m dụrụ ya ọdụ, “i kwesịrị ịchọta ọrụ ọzọ.” O mere otú ahụ. E mesịa, mgbe anyị zutere ọzọ, agbara m ya ume ịsụ ụzọ. “Ma aghaghị m ịrụ ọrụ iji kpata ihe m ga-eri,” ka ọ zaghachiri. “Ị ga na-eri nri,” ka m mesiri ya obi ike. “Jehova ga-elekọta gị.” Wim malitere ịsụ ụzọ. E mesịa, ọbụna n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, o jere ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Taa, n’afọ 80 na ụma ya, Wim ka bụ Onyeàmà na-anụ ọkụ n’obi. N’ezie, Jehova lekọtara ya.
Ná Mmachibido Iwu Ma Bụrụ Onye A Na-achọ Achọ
Na May 1940, n’ihe dị ka afọ abụọ mgbe a mụsịrị nwa anyị nke abụọ, bụ́ Reina, usuu ndị agha Netherlands chịliri aka elu, ndị Nazi weghakwaara Netherlands. Na July, ndị Gestapo jichiri ọfịs na ebe obibi akwụkwọ nke Society. N’afọ sochirinụ, a nwụchiri ọtụtụ Ndịàmà, e jidekwara m. N’ịbụ Onyeàmà na onye Germany toruru ije agha, o sighị ike iche n’echiche ihe ndị Gestapo gaje ime m. Agbalịrị m iwere ya nnọọ na m gaghị ahụkwa ezinụlọ m anya ọzọ.
E mesịa, na May 1941, ndị Gestapo kwere ka m si n’ụlọ mkpọrọ pụta ma nye m iwu ije banye n’ozi agha. O siiri m ike ikweta. Otu ụbọchị ahụ, ezofunyụrụ m anya, n’otu ọnwa ahụkwa alaghachiri m n’ọrụ sekit. Ndị Gestapo gụnyere m ná ndị ha kasị na-achọ ịnwụchi.
Otú Ezinụlọ M Si Nagide
Nwunye m na ụmụ m akwagawori n’obodo nta bụ́ Vorden n’ebe ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ. Otú ọ dị, iji belatara ha ihe ize ndụ, aghaghị m ibelata nke ukwuu ugboro ole m na-aga nleta n’ụlọ. (Matiu 10:16) Iji chebe m, ụmụnna ejighị ezigbo aha m mee ihe, nanị utu aha m bụ́ Duitse Jan (John onye Germany) ka ha na-akpọ m. E kweghị ka ọbụna nwa m nwoke dị afọ anọ, bụ́ Wolfgang, kwuo banyere “Papa” ma ọ́ bụghị nanị banyere “Ome Jan” (Deede John). Nke a siiri ya nnọọ ike n’ụzọ mmetụta uche.
Ka m nọ na-ezogharị, Erika lekọtara ụmụ anyị ma nọgide na-eme nkwusa. Mgbe Reina dị afọ abụọ, Erika na-ekukwasị ya n’elu ebe e ji ebu ibu n’ịnyịnya ígwè, burukwa ya na-aga ime nkwusa n’ime ime obodo. N’agbanyeghị na inweta ihe oriri adịghị mfe, ọ dịghị mgbe Erika nwere oké ụkọ nke ihe ezinụlọ ga-eri. (Matiu 6:33) Otu onye Katọlik bụ́ onye ọrụ ubi, onye m doziiri ígwè ịkwa ákwà n’otu mgbe, na-enye ya poteto. Ọ na-ezikwa Erika ozi ndị m ziri. N’otu mgbe, Erika kwụrụ otu gulden maka ihe ọ zụrụ n’otu ebe a na-ere ọgwụ. N’ịmata na Erika na-ezo ezo, na o nweghịkwa ike ịnata kaadị e ji eketa ihe oriri, onye nwe ebe ahụ a na-ere ọgwụ nyere ya ihe ahụ ọ zụrụ nakwa gulden abụọ. Ngosipụta ọmịiko ndị dị otú ahụ nyeere ya aka ịnọgide na-adị ndụ.—Ndị Hibru 13:5.
Iso Ụmụnna Ndị Nwere Obi Ike Na-arụkọ Ọrụ
Ka ọ dị mgbe ahụ, anọgidere m na-eletagasị ọgbakọ—ọ bụ ezie na m na-akpọtụrụ nanị ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ. Apụghị m ịnọgide n’otu ebe ruo ihe karịrị awa ole na ole n’ihi na ndị Gestapo ka nọ na-achụgharị m. A dịghị ekwe ka ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụnna nwoke na nwanyị zute m. Ha maara nanị Ndịàmà ndị ahụ so n’obere ígwè ọmụmụ Bible ha. N’ihi nke ahụ ka ụmụ nwanyị abụọ otu nne ji, bụ́ ndị bi n’akụkụ dị iche iche nke otu obodo ukwu ahụ, na-ejighị chọpụta na ha abụọ aghọọla Ndịàmà ruo mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị.
Ọrụ ọzọ siri ike m nwere bụ ịchọta ebe ndị a ga na-ezo akwụkwọ Society. Anyị zokwara akwụkwọ, stencil, na typewriter ndị a ga-eji na-emepụta ọtụtụ Ụlọ Nche, a dịghị ama ama ha dị mkpa. Mgbe
ụfọdụ, anyị aghaghị isi n’otu ebe e zoro akwụkwọ ndị Society bipụtara buga ha n’ebe ọzọ. Ana m echeta otu mgbe m bupụrụ katọn 30 ndị a fọjuru akwụkwọ na ha ka m nọ na-agbalị ime ka a ghara ịhụ ya—ọrụ na-ekowe obi n’elu!Ọzọkwa, anyị haziri isi n’ugbo ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Netherlands buga nri n’obodo ukwu ndị dịgasị n’ebe ọdịda anyanwụ, n’agbanyeghị na a machibidoro nke a iwu. Anyị na-eji otu ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ buru ihe oriri tinye isi n’ebe ọdịda anyanwụ. Mgbe anyị rutere n’osimiri, anyị apụghị isi n’àkwà mmiri nke ọ bụla gafee n’ihi na ndị soja na-eche ha nche. Kama nke ahụ, anyị na-esi n’ụgbọala ahụ ịnyịnya na-adọkpụ na-ebuba ibu ndị ahụ n’ọtụtụ obere ụgbọ mmiri, jisie ike bufee ihe oriri ahụ n’osimiri ahụ, ma bubaghachi ha n’ụgbọala ọzọ ịnyịnya na-adọkpụ. Mgbe anyị rutere n’obodo ukwu anyị na-eje, anyị na-echere ruo mgbe chi jiri, anyị na-eyinye ịnyịnya ahụ sọks n’ụkwụ, ma jiri nwayọọ garuo n’ebe nzuzo ọgbakọ na-ebusa ihe oriri. Site n’ebe ahụ, a na-ekesara ụmụnna ndị nọ ná mkpa ihe oriri ahụ.
Ọ bụrụ na ndị agha Germany chọpụtara ụdị ebe mbusa ihe oriri dị otú ahụ, ha gaara egbu mmadụ. Ka o sina dị, ọtụtụ ụmụnna wepụtara onwe ha n’afọ ofufo iji nye aka. Dị ka ihe atụ, ndị ezinụlọ Bloemink bụ́ ndị bi n’obodo Amersfoort kwere ka e jiri palọ ha mere ụlọ nkwakọba ihe oriri, n’agbanyeghị na ụlọ ha dị nnọọ nso n’ogige ndị agha Germany! Ndịàmà nwere obi ike dị ka ndị a tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi ụmụnna ha.
Jehova nyeere mụ na nwunye m aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’afọ nile nke mmachibido iwu ahụ. Na May 1945, e meriri ndị agha Germany, ọsọ m na-agbagharị n’ihi ndụ m bịakwara ná njedebe n’ikpeazụ. Society gwara m ka m nọgide na-eje ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ruo mgbe e nwere ụmụnna ndị ọzọ. Na 1947, Bertus van der Bijl weghaara ọrụ m. * Ka ọ na-erule mgbe ahụ, a mụrụ nwa nke atọ anyị, anyị wee biri n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke mba ahụ.
Mwute na Ọṅụ
Mgbe agha ahụ gasịrị, anụrụ m na a tụrụ nna m mkpọrọ n’ihe dị ka otu afọ mgbe m hapụsịrị ebe obibi anyị iji gaa Netherlands. A tọhapụrụ ya ugboro abụọ n’ihi ọrịa, ma na nke ọ bụla, a tụrụ ya mkpọrọ ọzọ. Na February 1938, e zijere ya n’ogige ịta ahụhụ Buchenwald, e mesịakwa ziga ya na Dachau. N’ebe ahụ, na May 14, 1942, ka nna m nwụrụ. Ọ nọgidere kwụrụ chịm ma na-eguzosi ike n’ihe ruo ọgwụgwụ.
E zigakwara nne m n’ogige ịta ahụhụ Dachau. Ọ nọgidere n’ebe ahụ ruo mgbe a tọhapụrụ ya na 1945. Ebe ọ bụ na ihe nlereanya nke iguzosi ike nke nne m na nna m tụnyere ụtụ dị ukwuu ná ngọzi ime mmụọ ndị m nweworo, ọ bụụrụ m ihe ùgwù ịkpọta mama m na 1954 ka anyị na ya biri. Nwanne m nwanyị bụ́ Margaretha—onye nọworo na-asụ ụzọ eri 1945 na East Germany nke e nwere ọchịchị Kọmụnist na ya—bịakwara. N’agbanyeghị na nne m na-arịa ọrịa, ọ dịghịkwa asụ Dutch, ọ nọgidere na-ekere òkè n’ozi ubi ruo mgbe o jesịrị ozi elu ala ya n’ikwesị ntụkwasị obi n’October 1957.
Mgbakọ ahụ e mere na 1955 na Nuremberg, Germany, pụrụ nnọọ iche. Mgbe anyị rutesịrị ebe ahụ, ụmụnna ndị si Dresden gwara Erika na nne ya nọkwa ná mgbakọ ahụ. Ebe ọ bụ na Dresden nọ mgbe ahụ n’okpuru ọchịchị East Germany, Erika ahụbeghị nne ya ruo afọ 21. E dokwara ka ha zute, nne na nwa ya nwanyị makụkwara. Lee njikọtaghachi na-enye ọṅụ nke ahụ bụ!
Ka oge na-aga, ezinụlọ anyị mụbara ruo ụmụ asatọ. N’ụzọ dị oké mwute, otu n’ime ụmụ anyị ndị ikom nwụnahụrụ anyị n’ihe mberede ụgbọala. Otú ọ dị, ịhụ ka ụmụ anyị ndị fọdụrụnụ nọ na-ejere Jehova ozi bụ isi iyi nke ọṅụ dị ukwuu. Obi dị anyị ụtọ na nwa anyị nwoke bụ́ Wolfgang na nwunye ya nọ n’ọrụ sekit, nwa ha nwoke na-ejekwa ozi dị ka onye nlekọta sekit.
Enwere m ekele ịhụ ọganihu nke ọrụ Jehova na Netherlands. Mgbe m bidoro ịsụ ụzọ n’ebe a na 1933, e nwere ihe dị ka otu narị Ndịàmà. Taa, e nwere ihe karịrị 30,000. N’agbanyeghị na ume anụ ahụ anyị na-ebelatazi, mụ na Erika ka kpebisiri ike ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ndị dị n’abụ oge ochie ahụ bụ́: “O, okwukwe nke na-agaghị ada ada.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Abụ nke 194.—Songs of Praise to Jehovah (1928).
^ par. 7 Obodo Copitz, nke a na-akpọ Pirna ugbu a, dị n’akụkụ Osimiri Elbe, bụ́ nke dị kilomita 18 site n’obodo ukwu bụ́ Dresden.
^ par. 38 Lee Ụlọ Nche, January 1, 1998, maka akụkọ ndụ Nwanna Van der Bijl, bụ́ “Ọ Dịghị Ihe Ka Eziokwu ahụ Mma.”
[Foto dị na peeji nke 23]
Ìgwè “Jugendgruppe” n’oge nkwụsịtụ mgbe a gasịrị ozi ubi
[Foto dị na peeji nke 24]
Mụ na ndị ọsụ ụzọ ibe m jezuru ókèala Schneifel. Adị m afọ 20
[Foto dị na peeji nke 25]
Mụ na Erika na Wolfgang na 1940
[Foto dị na peeji nke 26]
Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Nwa nwa m bụ́ Jonathan na nwunye ya, bụ́ Mirjam; Erika, mụ, nwa m nwoke bụ́ Wolfgang na nwunye ya, bụ́ Julia
[Foto dị na peeji nke 26]
Otu nwanna nwoke a tụkọrọ ya na nna m mkpọrọ ji aka see foto nna m a na 1941