Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”

“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”

“Debe Ihe Nile M Nyere N’iwu, Wee Dị Ndụ”

Ọ BỤ onye na-eto eto, maara ihe, onye “[mara] mma n’ahụ, maakwa mma ile anya.” Nwunye nna ya ukwu bụ onye na-achọ ihe ụtọ ma nwee anyaike. N’ịbụ onye nwa okorobịa ahụ dọọrọ mmasị ya n’ụzọ na-ekweghị ya nnagide, kwa ụbọchị ọ gbalịrị ịrata ya. “O ruo, dị ka ụbọchị ahụ, na ọ bara n’ụlọ ije ozi ya; ma ọ dịghị onye n’etiti ndị ikom nke ụlọ ahụ nọ n’ebe ahụ n’ụlọ. Nwanyị ahụ wee jide ya n’uwe ya, sị, Ka mụ na gị dinaa.” Ma Josef, bụ́ nwa nwoke nke nna ochie ahụ bụ́ Jekọb, hapụrụ uwe ya wee si n’ebe nwunye Pọtịfa nọ gbapụ.—Jenesis 39:1-12.

N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile na-esi n’ọnọdụ na-akpata ọnwụnwa agbapụ. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere otu nwa okorobịa bụ́ onye Eze Solomọn nke Israel oge ochie hụrụ n’okporo ámá n’abalị. N’ịbụ onye otu nwanyị na-eme omume rụrụ arụ ratara, “o sooro ya ozugbo dị ka oké ehi a na-aga igbu egbu.”—Ilu 7:21, 22, New International Version.

A na-adụ ndị Kraịst ọdụ ‘ịgbanahụ ịkwa iko.’ (1 Ndị Kọrint 6:18) Pọl onyeozi degaara Timoti, bụ́ nwa okorobịa na-eso ụzọ Kraịst, akwụkwọ, sị: “Na-agbanahụ agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa.” (2 Timoti 2:22) Mgbe anyị zutere ọnọdụ ndị na-akpata ụdị ịkwa iko ọ bụla, ma ọ bụ omume ndị ọzọ na-ezighị ezi, anyị aghaghịkwa iji mkpebi siri ike gbapụ dị ka Josef mere n’ebe nwunye Pọtịfa nọ. Gịnị ga-enyere anyị aka ikpebisi ike ime nke ahụ? N’isi nke 7 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, Solomọn na-enye anyị ụfọdụ ndụmọdụ bara oké uru. Ọ naghị ekwu nanị banyere ozizi ndị na-echebe anyị pụọ n’aghụghọ nke ndị na-eme omume rụrụ arụ kama ọ na-ekpughe usoro ịrụ ọrụ ha site n’ịkọwa n’ụzọ doro anya otu ihe omume ebe otu nwanyị na-eme omume rụrụ arụ ratara otu nwa okorobịa.

‘Kee Ihe Nile M Nyere n’Iwu na Mkpịsị Aka Gị Nile’

Eze ahụ ji ndụmọdụ nna malite, sị: “Nwa m, debe okwu ọnụ m nile, zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ. Debe ihe nile m nyere n’iwu, wee dị ndụ; debekwa iwu m dị ka nwa anya nke anya gị.” Ilu 7:1, 2.

Ndị mụrụ ụmụ, karịsịa ndị nna, nwere ibu ọrụ Chineke nyere ha ịkụziri ụmụ ha ụkpụrụ Chineke banyere ezi ihe na ihe ọjọọ. Mosis gbara ndị nna ume, sị: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Deuterọnọmi 6:6, 7) Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) N’ihi ya, ntụziaka nna ma ọ bụ nne bụ́ nke a ga-ezobe ma ọ bụ jiri kpọrọ ihe nke ukwuu gụnyere n’ezie ihe ncheta, ihe ndị e nyere n’iwu, na iwu ndị a na-achọta n’Okwu Chineke bụ́ Bible.

Izi ihe nke ndị mụrụ ụmụ pụkwara ịgụnye iwu nchịkwa ndị ọzọ—ụkpụrụ nduzi nke ezinụlọ. Ndị a bụ maka ọdịmma nke ndị òtù ezinụlọ. N’eziokwu, ụkpụrụ nduzi ndị ahụ pụrụ ịdị iche site n’otu ezinụlọ gaa n’ọzọ, na-adabere ná mkpa e nwere. Otú ọ dị, ndị mụrụ ụmụ nwere ọrụ ikpebi ihe kasị mma maka ezinụlọ nke ha. Ụkpụrụ nduzi ha na-enyekwa na-abụkarị ngosipụta nke ezi ịhụnanya na nchegbu ha. Ndụmọdụ a na-enye ndị na-eto eto bụ ka ha na-agbaso ụkpụrụ nduzi ndị a tinyere ozizi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ndị ha na-anata site n’aka ndị mụrụ ha. Ee, ọ dị mkpa iwere ntụziaka ndị dị otú ahụ “dị ka nwa anya nke anya gị”—jiri nlezianya dị ukwuu na-echebe ha. Nke ahụ bụ ụzọ e si ezere mmetụta na-akpata ọnwụ nke ileghara ụkpụrụ Jehova anya si otú ahụ “wee dị ndụ.”

“Kee ha [ihe nile m nyere n’iwu] ná mkpịsị aka gị nile,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “dee ha n’elu mbadamba nkume, bụ́ obi gị.” (Ilu 7:3) Dị ka mkpịsị aka si bụrụ nke anya anyị na-ahụ mgbe nile ma dị oké mkpa n’ịrụzu ihe ndị anyị zubere, ihe ndị a mụtara site n’ọzụzụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ site n’inweta ihe ọmụma Bible ga-anọgide na-abụ ihe ncheta na nduzi n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Anyị aghaghị idekwasị ha n’elu mbadamba nkume, bụ́ obi anyị, na-eme ha akụkụ nke àgwà anyị.

N’echefughị ịdị mkpa nke amamihe na nghọta, eze ahụ na-agba ume, sị: “Sị amamihe, Nwanne m nwanyị ka ị bụ; kpọọkwa nghọta nwanyị ị maara nke ọma.” (Ilu 7:4) Amamihe bụ ikike nke itinye ihe ọmụma Chineke na-enye n’ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Anyị kwesịrị inwe mmetụta ịhụnanya n’ebe amamihe dị, dị ka anyị na-enwe n’ebe nwanne nwanyị anyị hụrụ n’anya nke ukwuu nọ. Gịnị bụ nghọta? Ọ bụ ikike ileba anya n’ihe ma ghọta ya nke ọma site n’ịghọta njikọ ndị e nwere n’akụkụ ya nile n’ihe ahụ n’ozuzu ya. Nghọta aghaghị ịdị anyị nso dị ka ezi enyi.

N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-arapagidesi ike n’ọzụzụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ma na-eme ka amamihe na nghọta dịrị anyị nso? Ọ bụ iji “debe [onwe anyị] pụọ n’aka nwanyị na-abụghị nwunye gị [nwanyị ala ọzọ, NW], n’aka nwanyị na-abụghị nwunye gị [nwanyị mba ọzọ, NW] nke na-ekwu okwu ire ụtọ.” (Ilu 7:5) Ee, ime otú ahụ ga-echebe anyị pụọ n’ụzọ ire ụtọ na nke na-arụgide arụgide nke onye ala ọzọ ma ọ bụ onye mba ọzọ—onye na-eme omume rụrụ arụ. *

Nwa Okorobịa ahụ Ezute ‘Nwanyị Dị Aghụghọ’

Eze Israel ahụ kọwaziri otu ihe weere ọnọdụ nke ya onwe ya hụworo, sị: “Na windo nke ụlọ m, n’oghere ịnara ifufe m ka m lepụrụ anya; m wee hụ n’etiti ndị na-enweghị uche, m mata n’etiti ụmụ ndị ikom, otu nwa okorobịa nke obi amamihe kọrọ, ka ọ na-agabiga n’ámá na nso nkuku nwanyị ahụ, ọ bụkwa n’ụzọ ụlọ ya ka ọ na-azọ ije; na chi ojiji, n’anyasị nke ụbọchị, n’ime mgbachi nke abalị na ọchịchịrị.”Ilu 7:6-9.

Windo ahụ Solomọn si lepụ anya nwere oghere ịnara ifufe—ọ pụrụ ịbụ nke e ji osisi rụọ, ikekwe, nweekwa nnukwu ihe ndị a tụrụ atụ. Ka chi na-eji, ọchịchịrị nọ na-agbachi n’okporo ámá. Ọ hụrụ otu nwa okorobịa bụ nnọọ anụ oriri. N’ịbụ onye na-enweghị nghọta ma ọ bụ ezi uche, obi amamihe kọrọ ya. O yiri ka ọ matara ụdị ógbè ọ banyeworo nakwa ihe pụrụ ime ya n’ebe ahụ. Nwa okorobịa ahụ bịaruru nso na “nkuku nwanyị ahụ,” bụ́ nke dị n’ụzọ ụlọ nwanyị ahụ. Ònye ka nwanyị a bụ? Gịnị ka ọ na-eme?

Eze ahụ anya na-eru ala gara n’ihu ikwu, sị: “Lee, otu nwanyị zutere ya, yiri uwe nke nwanyị na-akwa iko, ọ bụkwa onye [nwere obi aghụghọ, NW]. Onye na-eme mkpọtụ ka ọ bụ, bụrụkwa onye na-ewezụga onwe ya; ọ bụghị n’ụlọ ya ka ụkwụ ya na-anọ; ugbu a n’ezi ka ọ nọ, ugbu a ọ bụ n’ámá nile, ọ bụkwa na nso nkuku nile ọ bụla ka ọ na-eche anwụ.”Ilu 7:10-12.

Ụdị uwe nwanyị a na-eyi na-akọwa ihe dị ukwuu banyere otú o si ere onwe ya. (Jenesis 38:14, 15) O yi uwe na-adịghị mma n’anya, dị ka nwanyị akwụna. Ọzọkwa, o nwere obi aghụghọ—uche ya dị “aghụghọ,” nzube ya bụ “nke aghụghọ.” (An American Translation; New International Version) Ọ na-eme mkpọtụ ma na-enupụ isi, na-ekwu ọtụtụ okwu ma dị isi ike, na-eme ụ̀zụ̀ ma na-agbaso echiche aka ya, n’enweghị ihere ma na-egosi nlelị. Kama ịnọrọ n’ụlọ ya, ọ na-ahọrọ ịgachi ámá nile anya, na-ezo n’akụkụ okporo ámá iji nwụde anụ oriri ya. Ọ na-echere onye dị ka nwa okorobịa ahụ.

“Ọtụtụ Ụrà”

Otu nwa okorobịa si otú ahụ zute nwanyị na-eme omume rụrụ arụ ma nwee atụmatụ aghụghọ. Lee ka nke a na-aghaghị isiworị dọrọ uche Solomọn! Ọ na-akọ, sị: “Nwanyị ahụ wee jide ya aka, sutụkwa ya ọnụ, were ihu ihere na-adịghị sị ya: Ihe àjà nile nke àjà udo dị n’aka m; taa ka m kwụghachiworo ihe nile m kwere ná nkwa. N’ihi nke a ka m pụtara izute gị, ịchọsi ihu gị ike, m wee chọpụta gị.”Ilu 7:13-15.

Egbugbere ọnụ nwanyị a na-ekwu okwu ire ụtọ. N’iji ihu ihere na-adịghị, ọ na-ekwu okwu ya n’obi ike. O ji nlezianya chepụta ihe ọ bụla ọ na-ekwu iji rata nwa okorobịa ahụ. Site n’ikwu na ya achụwo àjà udo kpọmkwem n’ụbọchị ahụ ma kwụghachi ihe nile ya kwere ná nkwa, ọ na-eme ngosi nke ezi omume, na-egosi na ọ dịghị ihe kọrọ ọnọdụ ime mmụọ ya. Àjà udo ndị a chụrụ n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem gụnyere anụ, ntụ ọka, mmanụ, na mmanya. (Levitikọs 19:5, 6; 22:21; Ọnụ Ọgụgụ 15:8-10) Ebe ọ bụ na onye nyere ya pụrụ iwere akụkụ ụfọdụ nke àjà udo ahụ maka ya na ezinụlọ ya, o si otú ahụ na-enye echiche na ihe oriri na ihe ọṅụṅụ juru eju n’ụlọ ya. Ihe ọ pụtara doro anya: Nwa okorobịa ahụ ga-ekpori ndụ n’ebe ahụ. Nwanyị ahụ esiwo n’ụlọ ya pụta kpọmkwem iji chọọ ya. Lee ka o si emetụ n’ahụ—ma ọ bụrụ na ọ dị onye ga-ekwere akụkọ dị otú ahụ. “Ọ bụ eziokwu na ọ nọ na-achọ nwoke,” ka otu ọkà mmụta Bible kwuru, “ma ọ̀ bụ onye a kpọmkwem ka ọ bịara ịchọ n’ezie? Ọ bụ nanị onye nzuzu—ikekwe ụdị onye a—ga-ekwenyere ya.”

Mgbe o mesịrị onwe ya ka ọ na-adọrọ mmasị site n’otú ejiji ya dị n’ile anya, site n’ụda nke okwu ire ụtọ ya, site ná mmetụ ahụ nke mmakụ ya, na site n’otú egbugbere ọnụ ya si dị ná nsutụ ọnụ, nwanyị nrafu a tinyere ike nke ịnụ ísì n’ọrụ. Ọ na-asị: “Ákwà mgbaba mara mma ka m gbabaworo n’ihe m ji edina, bụ́ ákwà tụrụ àgwà nke ogho Ijipt. Ewerewo m myrrh na aloes na cinnamon fesa ihe ndina m.” (Ilu 7:16, 17) O jiwo ákwà tụrụ àgwà nke ogho sitere n’Ijipt chọọ ihe ndina ya oké mma, fesakwa ya ihe ndị na-esi ísì ụtọ a na-achọsi ike bụ́ myrrh, aloes, na cinnamon.

Ọ gara n’ihu, sị: “Bịa, ka afọ jubiga anyị ókè n’ịkwa iko ruo ụtụtụ; ka anyị mee ka obi tọọ anyị ụtọ n’ịhụnanya nile.” Òkù a bụ maka ihe karịrị nnọọ oriri obi ụtọ maka mmadụ abụọ. Nkwa ya bụ nke inwe mmekọahụ. Nye nwa okorobịa ahụ, òkù ahụ na-akpali akpali ma na-enye obi ụtọ! Dị ka ihe mkpali ọzọ, ọ gbakwụnyere, sị: “N’ihi na di m anọghị n’ụlọ, o jewo ije dị anya: o werewo akpa ego n’aka ya; n’ụbọchị ọnwa ndọzu ka ọ ga-alọta.” (Ilu 7:18-20) Ọ na-emesi ya obi ike na ha ga-enwe nchebe zuru ezu, n’ihi na di ya mere njem achụmnta ego, a naghịkwa atụ anya nlọta ya ruo oge ụfọdụ. Lee ka o si bụrụ ọkà n’ịghọgbu nwa okorobịa! “O weere ọtụtụ ụrà ya wezụga nwa okorobịa ahụ ka ọ baa n’ụlọ ya, o weere okwu ire ụtọ nke egbugbere ọnụ ya nufuo ya.” (Ilu 7:21) A ga-achọ nwoke nwere àgwà yiri nke Josef iji guzogide òkù a na-ara ụrà. (Jenesis 39:9, 12) Nwa okorobịa a ò ruru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ?

‘Dị Ka Ehi A Na-aga Igbu Egbu’

Solomọn na-akọ, sị: “Nwa okorobịa ahụ na-ejeso ya na mberede. Dị ka ehi si abịa n’ogbugbu ya, ma ọ bụ dị ka mkpọrọ ukwu si abịa n’ịdọ aka ná ntị nke onye gbagọrọ agbagọ n’uche ya; ruo mgbe akụ́ ga-eji gbapuo imeju ya; dị ka nnụnụ si eme ngwa ịba n’igbudu, ma ọ maghị na imegide ndụ ya ka ọ bụ.”Ilu 7:22, 23.

Òkù ahụ ghọọrọ nwa okorobịa ahụ ihe a na-apụghị iguzogide eguzogide. N’ileghara ezi uche anya, ọ na-ejeso ya ‘dị ka ehi a na-aga igbu egbu.’ Dị ka onye a tụrụ mkpọrọ na-apụghị ịgbanahụ ntaramahụhụ ya, otú ahụ ka a rabara nwa okorobịa ahụ ná mmehie. Ọ dịghị ahụ ihe ize ndụ dị n’ihe ahụ nile ruo mgbe “akụ̀ ga-eji gbapuo imeju ya,” ya bụ, ruo mgbe o nwetara ọnyá nke pụrụ ịkpatara ya ọnwụ. Ọnwụ ahụ pụrụ ịbụ nke anụ ahụ n’echiche bụ́ na ọ na-ekpughe onwe ya nye ọrịa ndị na-eweta ọnwụ bụ́ ndị a na-ebute site ná mmekọahụ. * Ọnyá ahụ pụkwara ime ka ọ nwụọ n’ụzọ ime mmụọ; “imegide ndụ ya ka ọ bụ.” Ọ na-emetụta ịdị adị ya dum nakwa ndụ ya n’ụzọ siri ike, o mewokwa oké mmehie megide Chineke. O si otú ahụ na-agbaga n’ọnwụ dị ka nnụnụ si ama n’ọnyà!

“Akpafula n’Okporo Ụzọ Ya Nile”

N’inye ihe mmụta site n’ihe ọ hụworo, eze ahụ maara ihe na-agba ume, sị: “Ma ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị, tọọkwanụ ntị n’ala n’okwu nile nke ọnụ m. Ekwela ka obi gị wezụga onwe ya baa n’ụzọ nile nke nwanyị ahụ, akpafula n’okporo ụzọ ya nile. N’ihi na ọ dị ọtụtụ ndị e merụrụ ahụ ka o meworo ka ha daa: ee, ndị nwere ume ka ndị ya nile e gburu egbu bụ. Ụzọ nile nke ala mmụọ ka ụlọ ya bụ, na-arịdaru ime ụlọ nke ọnwụ.”Ilu 7:24-27.

O doro anya na ndụmọdụ Solomọn na-enye bụ ka mmadụ wezụga onwe ya pụọ n’ụzọ nile nke onye na-eme omume rụrụ arụ bụ́ ndị na-eweta ọnwụ, “wee dị ndụ.” (Ilu 7:2) Lee ka ndụmọdụ a si kwesị oge anyị! N’ezie ọ dị mkpa ka e zere ebe dị iche iche nke ndị na-echere ịnwụde anụ oriri na-agachi anya. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kpughee onwe gị nye ụzọ aghụghọ ha site n’ịga n’ebe ndị dị otú ahụ? N’ezie, n’ihi gịnị ka ị ga-eji bụrụ onye “obi amamihe kọrọ” ma kpafuo n’okporo ụzọ nile nke “onye ala ọzọ”?

“Nwanyị ala ọzọ” ahụ eze ahụ hụrụ ji òkù ime “ka obi tọọ [ha] ụtọ n’ịhụnanya nile” rata nwa okorobịa ahụ. Ọ̀ bụ na e jibeghị ụzọ yiri nke ahụ rigbuo ọtụtụ ndị ntorobịa—karịsịa ụmụ agbọghọ? Ma chee echiche: Mgbe mmadụ na-anwa ịraba gị ná mmekọahụ na-ezighị ezi, ọ̀ bụ ezi ịhụnanya ka ọ bụ agụụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị? N’ihi gịnị ka nwoke nwere ezi ịhụnanya n’ebe nwanyị nọ ga-eji rụgide ya imebi ọzụzụ na akọ na uche ya dị ka onye Kraịst? Solomọn dụrụ ọdụ, sị: “Ekwela ka obi gị wezụga onwe ya” gaa n’ụzọ ndị dị otú ahụ.

Okwu onye nrafu na-abụkarị nke ire ụtọ na nke e leziri anya chepụta. Ime ka amamihe na nghọta dịrị anyị nso ga-enyere anyị aka ịhụ aghụghọ dị na ha. Echefughị mgbe ọ bụla ihe Jehova nyeworo anyị n’iwu ga-echebe anyị. Ya mere, ka anyị na-agbalịsi ike mgbe dum ‘idebe ihe nile Chineke nyere n’iwu wee dị ndụ,’ ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 E ji okwu ahụ bụ́ “onye ala ọzọ” mee ihe banyere ndị kewapụrụ onwe ha n’ebe Jehova nọ site n’ịgbakụta Iwu ahụ azụ. N’ihi ya, a na-ekwu na nwanyị na-eme omume rụrụ arụ, dị ka nwanyị akwụna, bụ “nwanyị ala ọzọ.”

^ par. 24 Ụfọdụ ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ na-emebi imeju. Dị ka ihe atụ, n’ihe banyere ọrịa ụfụ mamịrị nke nọteworo aka, ụmụ nje ọrịa na-eme ka imeju gharazie ịdị ike. Nje na-ebutekwa nsí nwanyị pụrụ ịkpata ọzịza nke imeju.

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Olee otú i si ele ụkpụrụ nduzi nke ndị mụrụ gị anya?

[Foto dị na peeji nke 31]

Idebe ihe nile Chineke nyere n’iwu pụtara ndụ