Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikpe Ekpere Ọ̀ Na-arụpụta Ezi Ihe Ọ Bụla?

Ikpe Ekpere Ọ̀ Na-arụpụta Ezi Ihe Ọ Bụla?

Ikpe Ekpere Ọ̀ Na-arụpụta Ezi Ihe Ọ Bụla?

N’OGE ụfọdụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-enwe mkpa ikpe ekpere. N’ezie, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nọ n’òtù okpukpe nile na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekpe ekpere. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ puku ugboro n’ụbọchị, onye Buddha pụrụ ikpeghachi ekpere bụ́ “Enwere m okwukwe n’Amida Buddha.”

N’iburu nsogbu ndị a nọgidere na-enwe gburugburu ụwa n’uche, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịjụ, sị: Gịnị ka ndị mmadụ na-atụ anya inweta site n’ikpe ekpere? Ekpere a nile hà na-arụpụta ezi ihe ọ bụla?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ekpe Ekpere?

Ọtụtụ ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-ekpeku ndị nna nna ha nakwa chi dị iche iche nke Shinto ma ọ bụ Tao ekpere. Ha na-eme nke ahụ n’olileanya nke ịgafe ule n’ụlọ akwụkwọ, inwe ezi owuwe ihe ubi, ma ọ bụ igbochi ọrịa. Site ná mgbalị ha, ndị Buddha na-enwe olileanya inweta ihe ọmụma. Ndị Hindu na-eji ịdị uchu ekpeku chi nwoke na chi nwanyị ndị ha kasị nwee mmasị na ha, ekpere iji nweta ihe ọmụma, akụ̀ na ụba, na nchebe.

Ụfọdụ ndị Katọlik na-enwe olileanya ime ihe ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ uru site n’ịrara ndụ ha nye dị ka ndị mọnk ma ọ bụ ndị nọn n’ebe obibi a gbara ogige nke ndị mọnk ma ọ bụ nke ndị nọn, na-ekpe ekpere mgbe nile. Ọtụtụ nde ndị Katọlik na-achọ ihu ọma site n’aka Meri site n’ikpe ekpere ndị ha bu n’isi, ikekwe na-eji chaplet. N’ala ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ọtụtụ mmadụ na-eji wheel ekpere eme ihe. Ndị Protestant na-ekpeghachi Ekpere Onyenwe Anyị, ọ bụ ezie na ha pụkwara ikwupụtara Chineke mmetụta ha mgbe ọ bụla obi ha kwaliri ha. Ọtụtụ ndị Juu na-eme njem dị anya iji gaa ná Mgbidi Ebe Ọdịda Anyanwụ dị na Jerusalem ikpe ekpere, na-atụ anya mweghachi nke ụlọ nsọ ahụ na ọgbọ ọhụrụ nke ọganihu na udo.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ nde mmadụ na-ekpesi ekpere ike, nsogbu nke ịda ogbenye, ihe iri mmadụ ahụ, ntisa ezinụlọ, mpụ, na agha na-etiwanye ọha mmadụ ihe otiti. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ndị a nile adịghị ekpe ekpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị? N’ihi nke ahụ, ọ̀ dị onye na-anụ ekpere n’ezie?

Ọ̀ Dị Onye Na-anụ Ekpere?

Ekpere apụghị ịrụpụta ezi ihe ọ bụla ọ gwụlakwa ma a nụrụ ya. Mgbe mmadụ na-ekpe ekpere, o doro anya na o kweere na ọ dị onye nọ n’ógbè ndị bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya na-anụ ya. Otú ọ dị, ekpere adịghị esi n’ikuku nkịtị aga. Ọtụtụ mmadụ kweere na ọ dị onye pụrụ ọbụna ịmata ihe onye ahụ na-ekpe ekpere bu n’obi. Ònye ka ọ pụrụ ịbụ?

Otú echiche si esi nnọọ n’ọtụtụ ijeri akwara ozi ndị mejupụtara akụkụ a na-akpọ cerebral cortex n’ụbụrụ anyị amalite, bụ nnọọ ihe dị mgbagwoju anya nye ndị nchọpụta. Otú ọ dị, n’ụzọ ezi uche dị na ya, Onye mere ụbụrụ pụrụ ịmata echiche ndị dị otú ahụ. Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma e wezụga Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke. (Abụ Ọma 83:18; Mkpughe 4:11) Ọ bụ ya ka e kwesịrị ikpegara ekpere. Ma Jehova ọ na-aṅa ntị n’ekpere nile dị otú ahụ?

À Na-anụ Ekpere Nile?

Eze Devid nke Israel oge ochie bụ nwoke na-ekpe ekpere. Dị ka ọbụ abụ Chineke nyere ike mmụọ nsọ, ọ bụrụ, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, Gị ka anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.” (Abụ Ọma 65:2) Jehova na-aghọta ekpere ndị e ji nke ọ bụla n’ime ọtụtụ puku asụsụ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-asụ, kpee. Eziokwu ahụ bụ́ na ọ dịghị mmadụ nke uche ya ga-ebuli ihe ọmụma dị nnọọ ukwuu apụtaghị na Chineke apụghị ịṅa ndị nile na-ekpeku ya ekpere n’ụzọ ọ na-anara nke ọma ntị.

Ma, Jisọs Kraịst—nwoke na-ekpekwa ekpere—kpughere na ọ bụghị ekpere nile na-atọ Chineke ụtọ. Rịba ama ihe Jisọs kwuru banyere ikpe ekpere e bu n’isi bụ́ nke a na-emekarị n’oge ahụ. Dị ka Jerusalem Bible nke ndị Katọlik si kwuo, o kwuru, sị: “N’ekpere unu, unu atagherila ọnụ dị ka ndị ọgọ mmụọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na ha ga-eme ka a nụ olu ha site n’ikwu ọtụtụ okwu.” (Matiu 6:7) Anyị apụghị ịtụ anya ka Jehova ṅaa ntị n’ekpere ndị na-adịghị egosipụta ezi mmetụta anyị.

N’igosipụta ihe mere ụfọdụ ekpere adịghị atọ Chineke ụtọ, otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Onye na-ewezụga ntị ya n’ịnụ iwu, ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.” (Ilu 28:9) Ilu ọzọ na-ekwu, sị: “Jehova dị anya n’ebe ndị na-emebi iwu nọ: ma ekpere ndị ezi omume ka Ọ na-anụ.” (Ilu 15:29) N’otu oge mgbe ikpe mara ndị ndú nke Juda oge ochie nke ukwuu, Jehova kwupụtara, sị: “Mgbe unu na-agbasa ọbụ aka unu abụọ, M ga-ezonahụ unu anya m abụọ: ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, M gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.”—Aịsaịa 1:1, 15.

Pita onyeozi kwuru ihe ọzọ pụrụ ime ka ekpere bụrụ nke Chineke na-agaghị anakwere. Pita dere, sị: “Ndị bụ́ di, otú ahụ, sonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ́ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ́ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Ekpere nke nwoke leghaara ndụmọdụ dị otú ahụ anya apụghị ịgafe elu ụlọ ya!

N’ụzọ doro anya, anyị aghaghị ime ihe ụfọdụ a chọrọ n’aka anyị ma ọ bụrụ na a ga-anụ ekpere anyị. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere adịghị echebachara ime ihe Chineke na-achọ n’aka anyị echiche. Ọ bụ ya mere oké iji ịnụ ọkụ n’obi ekpe ekpere na-ejibeghị mee ka e nwee ụwa ka mma.

Oleezinụ ihe Chineke na-achọ n’aka anyị ka o wee nụ ekpere anyị? Azịza ya dabeere kpọmkwem n’ihe mere anyị ji ekpe ekpere. N’ezie, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịma ma ekpere ọ̀ na-arụpụta ezi ihe ọ bụla, anyị aghaghị ịghọta nzube ya. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo mee ka o kwe anyị omume ịgwa ya okwu?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

G.P.O., Jerusalem