Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Na-enweta Obi Ụtọ N’ije Ozi

Ndị Kraịst Na-enweta Obi Ụtọ N’ije Ozi

Ndị Kraịst Na-enweta Obi Ụtọ N’ije Ozi

“Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—ỌRỤ 20:35.

1. Omume na-ezighị ezi dị aṅaa jupụtara ebe nile taa, n’ihi gịnịkwa ka o ji emebi ihe?

N’IME iri afọ ndị ikpeazụ nke afọ ndị 1900, a nọ na-anụkarị okwu ahụ bụ́ “nke m-godị.” “Nke m-godị” na-egosi àgwà nke na-agwakọta ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na anyaukwu na enweghị nchegbu maka ndị ọzọ. Anyị pụrụ ijide n’aka na n’afọ 2000, àgwà nke m-godị akwụsịbeghị ma ọlị. Ugboro ole ka ị na-anụ ajụjụ bụ́, “Olee uru ọ ga-abara m?” ma ọ bụ, “Gịnị ka m ga-enweta na ya?” Omume ịchọ ọdịmma onwe onye nanị dị otú ahụ adịghị akwalite obi ụtọ. O megidere nnọọ ụkpụrụ ahụ Jisọs tụpụtara, bụ́: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

2. Olee otú o si apụta ìhè na inye ihe na-eweta obi ụtọ?

2 Ọ̀ bụ eziokwu na inye ihe na-eweta obi ụtọ ka ukwuu karịa ịnara ihe? Ee. Chee banyere Jehova Chineke. N’ebe ọ nọ ka “isi iyi ndụ” dị. (Abụ Ọma 36:9) Ọ na-enye anyị ihe nile dị anyị mkpa iji mee ka anyị nwee obi ụtọ ma na-arụpụta ihe. N’ezie, ọ bụ Isi Iyi nke “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” (Jemes 1:17) Jehova, bụ́ “Chineke [obi ụtọ, NW],” na-enye ihe mgbe nile. (1 Timoti 1:11) Ọ hụrụ ụmụ mmadụ o kere eke bụ́ ndị ọ na-enye ihe dị nnọọ ukwuu, n’anya. (Jọn 3:16) Cheekwa banyere ezinụlọ mmadụ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị maara ókè ị na-achụru àjà ma na-enyeru ihe, iji zụlite nwatakịrị. Ruokwa ọtụtụ afọ, nwata ahụ adịghị ama banyere àjà ndị ị na-achụ. Ọ naghị ewere ha dị ka oké ihe. Ma, ọ na-enye gị obi ụtọ ịhụ nwa gị ka ọ na-eto nke ọma n’ihi ihe ndị ị na-enye ya n’achọghị ọdịmma onwe gị nanị. N’ihi gịnị? N’ihi na ị hụrụ ya n’anya.

3. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-enye obi ụtọ ijere Jehova na ndị kwere ekwe ibe anyị ozi?

3 N’ụzọ yiri nke ahụ, a na-eji inye ihe nke dabeere n’ịhụnanya amata ezi ofufe. Ebe ọ bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma hụ ndị kwere ekwe ibe anyị n’anya, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ijere ha ozi, iwepụtara ha onwe anyị. (Matiu 22:37-39) Onye ọ bụla nke na-eji ebumnobi nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị efe ofufe na-enweta ọṅụ dị nnọọ obere. Ma ndị na-adịghị eji ịchọ ọdịmma onwe onye nanị eje ozi, n’ịbụ ndị na-etinye uche karị n’ihe ha pụrụ inye karịa n’ihe ha nwere olileanya inweta, na-enweta obi ụtọ n’ezie. A na-aghọta eziokwu a site n’ịtụle otú e si jiri okwu Bible ụfọdụ metụtara ofufe anyị mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ. Anyị ga-atụle atọ n’ime okwu ndị a n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya.

Ozi Jisọs Jeere Ọha Mmadụ

4. Olee otú e si ‘ejere ọha mmadụ ozi’ na Krisendọm?

4 Na Grik mbụ, otu okwu dị mkpa nke e jikọrọ ya na ofufe bụ lei·tour·giʹa, bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “ijere ọha mmadụ ozi” na New World Translation. Na Krisendọm, e siwo na lei·tour·giʹa nweta okwu bụ́ “liturgy” * (ememe okpukpe). Otú ọ dị, ememe okpukpe ndị Krisendọm na-eme iji mezuo iwu abụghị n’ezie ozi bara uru a na-ejere ọha mmadụ.

5, 6. (a) Ozi dị aṅaa ka e jeere ọha mmadụ n’Israel, uru ndị dịkwa aṅaa ka ọ bara? (b) Ozi dị aṅaa ka nnọọ mma e jeere ọha mmadụ ka e ji dochie anya nke ahụ e jere n’Israel, n’ihi gịnịkwa?

5 Pọl onyeozi ji okwu Grik e jikọrọ ya na lei·tour·giʹa mee ihe mgbe ọ na-ezo aka n’ebe ndị nchụàjà Israel nọ. O kwuru, sị: “Onye nchụàjà ọ bụla na-eguzokwa kwa ụbọchị [ijere ọha mmadụ ozi, NW] [ụdị nke lei·tour·giʹa] na-echekwa otu àjà ndị a n’ihu Chineke ọtụtụ mgbe.” (Ndị Hibru 10:11) Ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà jeere ọha mmadụ ozi bara uru n’Israel. Ha kụziri Iwu Chineke ma chụọ àjà ndị kpuchiri mmehie ndị mmadụ. (2 Ihe E Mere 15:3; Malakaị 2:7) Mgbe ndị nchụàjà na ndị mmadụ gbasoro Iwu Jehova, mba ahụ na-enwe ihe ndị mere ha ga-eji nwee ọṅụ.—Deuterọnọmi 16:15.

6 Ijere ọha mmadụ ozi n’okpuru Iwu ahụ bụ́ n’ezie ihe ùgwù nye ndị Israel bụ́ ndị nchụàjà, ma ozi ha kwụsịrị ịba uru ọ bụla mgbe a jụrụ Israel n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi. (Matiu 21:43) Jehova mere ndokwa maka ihe ka nnọọ mma—ozi Jisọs, Onyeisi Nchụàjà ukwu ahụ, jeere ọha mmadụ. Anyị na-agụ banyere ya, sị: “Ya onwe ya, n’ihi na Ọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi, O nwere ọnọdụ onye nchụàjà Ya na-adịghị agabiga onye ọzọ. O sitekwara na nke a pụ ịzọpụtachasị ndị na-esite n’aka Ya abịakwute Chineke, ebe Ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ n’ihi ha.”—Ndị Hibru 7:24, 25.

7. N’ihi gịnị ka ozi Jisọs na-ejere ọha mmadụ ji eweta abamuru na-enweghị oyiri?

7 Jisọs na-anọgide na-abụ onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi n’enweghị ndị ga-anọchi ya. N’ihi ya, ọ bụ nanị ya pụrụ ịzọpụta ndị mmadụ n’ụzọ zuru ezu. O jeere ọha mmadụ ozi ahụ na-enweghị oyiri, ọ bụghị n’ụlọ nsọ e ji aka wuo, kama n’ụlọ nsọ ihe atụ ahụ, bụ́ ndokwa ukwu Jehova mere maka ofufe bụ́ nke malitere ọrụ na 29 O.A. Jisọs na-eje ozi ugbu a n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọ nsọ ahụ, n’eluigwe. Ọ bụ “onye na-ejere ọha mmadụ ozi [lei·tour·gosʹ] n’ebe nsọ ahụ na n’èzí ụlọikwuu ahụ, bụ́ nke Jehova wuru, ọ bụghị mmadụ.” (Ndị Hibru 8:2; 9:11, 12, NW) Ọ bụ ezie na ọnọdụ Jisọs dị elu, ọ ka bụkwarịị “onye na-ejere ọha mmadụ ozi.” Ọ na-eji ikike ya dị elu enye ihe, ọ bụghị ịnara anara. Onyinye ihe dị otú ahụ na-enye ya ọṅụ. Ọ bụ akụkụ nke “ọṅụ e debere n’ihu Ya,” nke ahụ wusikwara ya ike ịtachi obi n’oge ndụ ya nile n’ụwa.—Ndị Hibru 12:2.

8. Olee otú Jisọs si jeere ọha mmadụ ozi nke nọchiri ọgbụgba ndụ Iwu ahụ?

8 E nwere akụkụ ọzọ nke ozi Jisọs jeere ọha mmadụ. Pọl dere, sị: “[Jisọs enwetawo ozi dị mma nke ukwuu karị ijere ọha mmadụ, NW] n’ụzọ hà otú Ọ bụkwa onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ka mma, bụ́ ọgbụgba ndụ nke e nyeworo n’iwu n’elu nkwa ụfọdụ ka mma.” (Ndị Hibru 8:6) Mosis bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ nke bụ́ ebe mmekọrịta Israel na Jehova hiwere isi. (Ọpụpụ 19:4, 5) Jisọs bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bụ́ nke mere ka o kwe omume ịmụta mba ọhụrụ, “Israel nke Chineke,” bụ́ nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ́ ndị si n’ọtụtụ mba, mejupụtara. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Hibru 8:8, 13; Mkpughe 5:9, 10) Lee ozi magburu onwe ya e jeere ọha mmadụ nke ahụ bụ! Lee obi ụtọ anyị nwere ịmara Jisọs, bụ́ onye na-ejere ọha mmadụ ozi nke anyị pụrụ isite n’aka ya fee Jehova ofufe ọ na-anara nke ọma!—Jọn 14:6.

Ndị Kraịst Na-ejekwara Ọha Mmadụ Ozi

9, 10. Ụdị ozi dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst na-ejere ọha mmadụ?

9 Ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-ejere ọha mmadụ ozi n’ụzọ dị elu dị ka nke Jisọs. Otú ọ dị, mgbe ndị Kraịst e tere mmanụ nwetara ụgwọ ọrụ eluigwe ha, ha na-ewere ọnọdụ n’akụkụ Jisọs ma na-ekere òkè n’ozi ọ na-ejere ọha mmadụ dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpughe 20:6; 22:1-5) Ma, ndị Kraịst nọ n’ụwa na-ejere ọha mmadụ ozi, ha na-enwetakwa ọṅụ dị ukwuu n’ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe e nwere ụkọ nri na Palestine, Pọl onyeozi buuru onyinye nke ụmụnna ndị nọ na Europe nyere iji nye aka n’ibelata ahụhụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst nọ na Judia na-ata. Nke ahụ bụ ijere ọha mmadụ ozi. (Ndị Rom 15:27; 2 Ndị Kọrint 9:12) Taa, ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ ije ozi yiri nke ahụ, na-enye aka ozugbo ụmụnna ha nwetara ihe otiti, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ.—Ilu 14:21.

10 Pọl zoro aka n’ozi ọzọ a na-ejere ọha mmadụ mgbe o dere, sị: “Ọ bụrụkwa na a na-awụsị m dị ka àjà ihe ọṅụṅụ n’elu àjà na ife ofufe nke okwukwe unu, ana m aṅụrị ọṅụ, sookwa unu nile na-aṅụrị ọṅụ.” (Ndị Filipaị 2:17) Ọrụ Pọl rụsiri ike maka ọdịmma ndị Filipaị abụwo ozi e ji ịhụnanya na ịdị uchu jeere ọha mmadụ. A na-ejekwara ọha mmadụ ozi yiri nke ahụ taa, karịsịa ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-enye nri ime mmụọ n’oge ya. (Matiu 24:45-47) Ọzọkwa, dị ka otu ìgwè, ndị a bụ “òtù ndị nchụàjà dị nsọ,” bụ́ ndị e nyere ọrụ “ịchụ àjà nke dị ka Mmụọ Nsọ si chọọ, nke dị Chineke ezi mma site na Jisọs Kraịst” nakwa “[ikwusa] ịdị mma nile nke Onye ahụ Onye kpọpụtara [ha] n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè Ya dị ebube.” (1 Pita 2:5, 9) Dị ka Pọl, ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihe ùgwù ndị dị otú ahụ ọbụna ka ha ‘na-awụsị onwe ha’ n’ịrụzu ibu ọrụ ha. Ndị enyi ha kwa, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, na-esonyere ha, na-akwadokwa ha n’ọrụ nke ịgwa ihe a kpọrọ mmadụ banyere Jehova na nzube ya. * (Jọn 10:16; Matiu 24:14) Lee ozi dị ukwuu ma na-enye obi ụtọ e jeere ọha mmadụ nke a bụ!—Abụ Ọma 107:21, 22.

Jee Ozi Dị Nsọ

11. Olee otú onye amụma nwanyị bụ́ Ana si setipụrụ ndị Kraịst nile ezi ihe nlereanya?

11 Okwu Grik ọzọ e jikọrọ ya na ofufe anyị bụ la·treiʹa, bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “ozi dị nsọ” na New World Translation. Ozi dị nsọ bụ ife ofufe. Dị ka ihe atụ, a na-akọwa onye amụma nwanyị ahụ dị afọ 84 nke di ya nwụrụ bụ́ Ana dị ka onye “na-apụghị n’ụlọ Chineke, ma o weere obubu ọnụ na arịrịọ [na-eje ozi dị nsọ, NW] [okwu Grik e jikọrọ ya na la·treiʹa] ehihie na abalị.” (Luk 2:36, 37) Ana ji nnọgidesi ike fee Jehova. Ọ bụ ezi onye nlereanya nye anyị nile—ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị ikom na ndị inyom. Ọbụna dị ka Ana ji ịdị uchu na-ekpeku Jehova ekpere ma na-efe ya mgbe nile n’ụlọ nsọ ahụ, ozi dị nsọ anyị gụnyere ekpere na ịga nzukọ.—Ndị Rom 12:12; Ndị Hibru 10:24, 25.

12. Gịnị bụ akụkụ bụ́ isi nke ozi dị nsọ anyị, oleekwa otú nke a si bụrụ ozi a na-ejere ọha mmadụ?

12 Pọl onyeozi kpọtụrụ uche otu akụkụ bụ́ isi nke ozi dị nsọ anyị mgbe o dere, sị: “Chineke, Onye m na-ekpere n’ime mmụọ m n’ozi ọma nke Ọkpara Ya, bụ Onye àmà m, otú m na-ahapụghị aka n’ihota unu.” (Ndị Rom 1:9) Ee, nkwusa nke ozi ọma ahụ abụghị nanị ozi a na-ejere ọha mmadụ ndị na-anụ ya kamakwa ọ bụ ife Jehova Chineke ofufe. Ma ànyị nwetara mmeghachi omume dị mma ma ọ bụ na anyị enwetaghị, ọrụ nkwusa ahụ bụ ozi dị nsọ a na-ejere Jehova. Anyị ịgbalịsi ike ịgwa ndị ọzọ banyere àgwà ọma na nzube ndị bara uru nke Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ga-ewetara anyị oké ọṅụ n’ezie.—Abụ Ọma 71:23.

Olee Ebe Anyị Na-eje Ozi Dị Nsọ?

13. Gịnị bụ olileanya nke ndị ahụ na-eje ozi dị nsọ n’ogige ahụ dị n’ime nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, ole ndị sokwa ha aṅụrị ọṅụ?

13 Pọl degaara ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ, sị: “Ebe anyị na-anata alaeze nke a na-apụghị ime ka o mee mkpatụ, ka anyị nwee amara, ka anyị wee site na ya were egwu Chineke na ụjọ kpee ekpere n’ụzọ nke ga-atọ Chineke ụtọ.” (Ndị Hibru 12:28) N’ịbụ ndị ji obi ike na-atụ anya inweta Alaeze ahụ, ndị e tere mmanụ nwere okwukwe siri ike ka ha na-efe Onye Kasị Ihe Nile Elu. Nanị ha pụrụ ijere ya ozi dị nsọ n’Ebe Nsọ ahụ nakwa n’ogige ahụ dị n’ime nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, ha jikwa oké mmasị atụ anya iso Jisọs jee ozi n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, bụ́ eluigwe n’onwe ya. Ndị enyi ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ na-esokwa ha aṅụrị ọṅụ maka olileanya ha dị ebube.—Ndị Hibru 6:19, 20; 10:19-22.

14. Olee otú oké ìgwè mmadụ ahụ si erite uru site n’ozi Jisọs jeere ọha mmadụ?

14 Otú ọ dị, gịnị banyere ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ? Dị ka Jọn onyeozi bu ụzọ hụ, oké ìgwè mmadụ n’ime ha apụtawo na mgbe ikpeazụ a, ha “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:14) Nke a pụtara na, dị ka ndị ofufe ibe ha e tere mmanụ, ha na-egosipụta okwukwe n’ozi Jisọs jeere ọha mmadụ, onyinye o nyere ndụ ya zuru okè dị ka mmadụ maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ. Atụrụ ọzọ ahụ na-eritekwa uru site n’ozi Jisọs jeere ọha mmadụ n’ihi na ha ‘na-ejidesi ọgbụgba ndụ Jehova ike.’ (Aịsaịa 56:6) Ee e, ha esoghị n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, kama ha na-ejigide ya n’ihi na ha na-erubere iwu ndị metụtara ya isi ma na-akwado ndokwa ndị e mere site na ya. Ha na-eso Israel nke Chineke na-akpakọrịta, na-eri nri n’otu tebụl ime mmụọ, sorokwa ndị òtù ya na-arụkọ ọrụ, na-eto Chineke n’ihu ọha, na-achụkwa àjà ime mmụọ ndị na-atọ ya ụtọ.—Ndị Hibru 13:15.

15. Ole ebe ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-eje ozi dị nsọ, oleekwa otú ngọzi a si emetụta ha?

15 Ya mere, a na-ahụ oké ìgwè mmadụ ahụ ka ha “na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ, e gbokwasịworo ha uwe mwụda dị ọcha.” Ọzọkwa, “ha nọ n’ihu ocheeze Chineke; ha na-efekwa Ya ofufe ehihie na abalị n’ụlọ nsọ Ya: Onye ahụ Nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ ga-agbasakwa ụlọikwuu Ya n’isi ha.” (Mkpughe 7:9, 15) N’Israel, ndị na-eso ụzọ ndị Juu fere ofufe n’ogige dị n’èzí nke ụlọ nsọ Solomọn. N’ụzọ yiri nke ahụ, oké ìgwè mmadụ ahụ na-efe Jehova n’ogige dị n’èzí nke ụlọ nsọ ime mmụọ ya. Ije ozi n’ebe ahụ na-eme ka ha na-aṅụrị ọṅụ. (Abụ Ọma 122:1) Ọbụna mgbe onye ikpeazụ n’ime ndị enyi ha e tere mmanụ ga-enweta ụgwọ ọrụ ya n’eluigwe, ha ga-anọgide na-ejere Jehova ozi dị nsọ dị ka ndị ya.—Mkpughe 7:9, 15.

Ozi Dị Nsọ nke A Na-adịghị Anakwere

16. Ịdọ aka ná ntị ndị dị aṅaa ka e nyere banyere ozi dị nsọ?

16 N’ụbọchị Israel oge ochie, a ghaghị ije ozi dị nsọ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Jehova. (Ọpụpụ 30:9; Levitikọs 10:1, 2) N’otu aka ahụ taa, e nwere ihe ndị anyị na-aghaghị imezu ma ọ bụrụ na Jehova ga-anakwere ozi dị nsọ anyị. Ọ bụ ya mere Pọl ji degara ndị Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Anyị ewepụghị aka n’ikpe ekpere na ịrịọ arịrịọ n’ihi unu, ka e wee mee ka unu jupụta ná mmazu nke ihe Ọ na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ, ka unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla, na-abakwa ụba n’ime mmazụ nke Chineke.” (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ọ dịghịrị anyị ikpebi ụzọ kwesịrị ekwesị isi na-efe Chineke ofufe. Ezi ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ, nghọta ime mmụọ, na amamihe Chineke dịcha mkpa. Ma ọ bụghị ya, ọ pụrụ ịkpata nnọọ ọdachi.

17. (a) Olee otú e si merụọ ozi dị nsọ n’oge Mosis? (b) Olee otú a pụrụ isi jee ozi dị nsọ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị taa?

17 Cheta ụmụ Israel n’oge Mosis. Anyị na-agụ, sị: ‘Chineke chigharịrị, wee rara ha nye ijere usuu ihe dị n’eluigwe ozi dị nsọ.’ (Ọrụ 7:42) Ụmụ Israel ahụ ahụwo ọrụ dị ike ndị Jehova rụrụ maka ọdịmma ha. Ma, ha chigharịkwuuru chi ndị ọzọ mgbe ha chere na ọ ga-abara ha uru. Ha eguzosighị ike n’ihe, anyị aghaghịkwa iguzosi ike n’ihe ma ọ bụrụ na ozi dị nsọ anyị ga-abụ nke na-atọ Chineke ụtọ. (Abụ Ọma 18:25) N’eziokwu, ọ bụ mmadụ ole na ole taa ga-agbakụta Jehova azụ iji fee kpakpando ma ọ bụ nwa ehi ọlaedo, ma e nwere ụdị ndị ọzọ nke ikpere arụsị. Jisọs dọrọ aka ná ntị megide ijere “akụ̀” ozi, Pọl kpọkwara anyaukwu ikpere arụsị. (Matiu 6:24; Ndị Kọlọsi 3:5) Setan na-ebuli onwe ya dị ka chi. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ụdị ikpere arụsị ndị ahụ jupụtara ebe nile, ha bụkwa ọnyà. Dị ka ihe atụ, cheedị banyere onye na-azọrọ na ọ na-agbaso Jisọs ma bụrụ onye ihe mgbaru ọsọ ya n’ezie ná ndụ bụ ịba ọgaranya ma ọ bụ onye ntụkwasị obi ya dị n’ebe onwe ya na echiche ya dị. Ònye n’ezie ka ọ na-ejere ozi? Olee ọdịiche dị n’etiti ya na ndị Juu nke oge Aịsaịa bụ́ ndị ṅụrụ iyi n’aha Jehova ma kwuo na ọ bụ arụsị ndị rụrụ arụ rụrụ ọrụ ndị dị ike ọ rụrụ?—Aịsaịa 48:1, 5.

18. Olee otú e siworo jee ozi dị nsọ n’ụzọ na-ezighị ezi n’oge gara aga na n’oge a?

18 Jisọs dọkwara aka ná ntị, sị: “Oge awa na-abịa, ka ọ ga-abụ na onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ọ na-ejere Chineke ozi.” (Jọn 16:2) Obi abụọ adịghị ya na Sọl, bụ́ onye ghọrọ Pọl onyeozi, chere na ọ na-ejere Chineke ozi mgbe ọ ‘kwadoro ogbugbu Stifen’ ma ‘were ịba mba na ogbugbu kuo ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị.’ (Ọrụ 8:1; 9:1) Taa, ụfọdụ ndị na-akpalite mkpocha agbụrụ na mgbukpọ nke agbụrụ na-azọrọkwa na ha na-efe Chineke. E nwere ọtụtụ ndị na-azọrọ na ha na-efe Chineke, ma n’ezie ọ bụ chi nke ịhụ mba n’anya, ịkpa ókè agbụrụ, akụ̀ na ụba, onwe onye, ma ọ bụ arụsị ndị ọzọ, ka ha na-ekpere.

19. (a) Olee otú anyị si ele ozi dị nsọ anyị anya? (b) Olee ụdị ozi dị nsọ ga-ewetara anyị ọṅụ?

19 Jisọs kwuru, sị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:10) Ọ nọ na-agwa Setan okwu, ma lee mkpa ọ dị anyị nile ige okwu ya ntị! Ijere Eze Onyenwe eluigwe na ala ozi dị nsọ bụ ihe ùgwù dị elu ma na-emenye egwu. Gịnịkwanụ ka a pụrụ ikwu banyere ijere ọha mmadụ ozi e jikọrọ ya na ofufe anyị? Imere mmadụ ibe anyị nke a bụ ọrụ na-enye ọṅụ nke na-eweta oké obi ụtọ. (Abụ Ọma 41:1, 2; 59:16) Ma, ozi dị otú ahụ na-eweta ezi obi ụtọ nanị ma ọ bụrụ na e ji obi dum eje ya, na-ejekwa ya n’ụzọ ziri ezi. Ole ndị n’ezie na-efe Chineke n’ụzọ kwesịrị ekwesị? Ozi dị nsọ nke ole ndị ka Jehova na-anakwere? Anyị pụrụ ịza ajụjụ ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị atụlee okwu nke atọ dị na Bible bụ́ nke nwere ihe jikọrọ ya na ofufe anyị. Anyị ga-eme nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ememe okpukpe Krisendọm na-abụkarị ịka ụka ofufe ma ọ bụ ememe okpukpe ndị a kapịrị ọnụ, dị ka Oriri Nsọ a na-enwe na Chọọchị Roman Katọlik.

^ par. 10 N’Ọrụ Ndị Ozi 13:2, e kwuru na ndị amụma na ndị ozizi nọ n’Antiọk nọ ‘na-ejere Jehova ozi n’ihu ọha’ (nke e si n’okwu Grik e jikọrọ ya na lei·tour·giʹa sụgharịa). O yikarịrị ka ije ozi ihu ọha a ọ̀ gụnyere ikwusara ọha mmadụ ozi ọma.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ozi dị aṅaa dị ukwuu ka Jisọs jeere ọha mmadụ?

• Ozi dị aṅaa ka ndị Kraịst na-ejere ọha mmadụ?

• Gịnị bụ ozi dị nsọ nke ndị Kraịst, oleekwa ebe a na-eje ya?

• Gịnị ka anyị na-aghaghị inweta ma ọ bụrụ na ozi dị nsọ anyị ga-abụ nke Chineke na-anakwere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị nne na nna na-enweta oké ọṅụ site n’inye ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

Ndị Kraịst na-ejere ọha mmadụ ozi mgbe ha na-enyere ndị ọzọ aka na mgbe ha na-akpọsa ozi ọma ahụ

[Foto dị na peeji nke 14]

Ezi ihe ọmụma na nghọta dị anyị mkpa iji jide n’aka na ozi dị nsọ anyị bụ nke Chineke na-anakwere