Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ole Ndị Bụ Ndị Ozi Chineke Taa?

Ole Ndị Bụ Ndị Ozi Chineke Taa?

Ole Ndị Bụ Ndị Ozi Chineke Taa?

“Iru eru anyị sitere na Chineke; Onye mekwara anyị ka anyị ruo ịbụ ndị na-eje ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ.”—2 NDỊ KỌRINT 3:5, 6.

1, 2. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst nile nke narị afọ mbụ keere òkè na ya, ma olee otú ihe si gbanwee?

NA NARỊ afọ mbụ nke Oge Anyị, ndị Kraịst nile keere òkè n’otu ibu ọrụ dị mkpa—ọrụ nke ikwusa ozi ọma. Ha nile bụ ndị e tere mmanụ, bụrụkwa ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ụfọdụ nwere ibu ọrụ ndị ọzọ, dị ka izi ihe n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 12:27-29; Ndị Efesọs 4:11) Ndị nne na nna nwere ibu ọrụ dị ukwuu n’ime ezinụlọ. (Ndị Kọlọsi 3:18-21) Ma ha nile keere òkè n’ọrụ ahụ bụ́ isi ma dị mkpa bụ́ ime nkwusa. N’asụsụ Grik mbụ nke Akwụkwọ Nsọ ndị Kraịst, ibu ọrụ a bụ di·a·ko·niʹa—ije ozi, ma ọ bụ ozi.—Ndị Kọlọsi 4:17.

2 Ka oge na-aga, ihe gbanwere. Otu òtù bilitere, nke a maara dị ka ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị debeere nanị onwe ha ihe ùgwù nke ime nkwusa. (Ọrụ 20:30) Ndị ụkọchukwu bụ ìgwè dị nta nke ndị na-akpọ onwe ha ndị Kraịst. Ndị ka n’ọnụ ọgụgụ bịara bụrụ ndị a maara dị ka ndị nkịtị. Ebe ọ bụ na a kụziworo ndị nkịtị na ha nwere ibu ọrụ ụfọdụ, gụnyere inye onyinye maka ilekọta ndị ụkọchukwu, ọnụ ọgụgụ ka ukwuu aghọwo ndị ngere nkịtị n’ihe banyere ime nkwusa.

3, 4. (a) Olee otú ndị nọ na Krisendọm si aghọ ndị ozi? (b) Ònye ka a na-ewere dị ka onye ozi na Krisendọm, n’ihi gịnịkwa ka ihe ji dị iche n’etiti Ndịàmà Jehova?

3 Ndị ụkọchukwu na-azọrọ na ha bụ ndị ozi (site n’onye ozi, bụ́ nsụgharị Latin maka di·aʹko·nos, “onye na-eje ozi”). * Iji ghọọ ndị ozi, ha na-agụsị akwụkwọ na kọleji ma ọ bụ seminarị, e wee chie ha ụkọchukwu. Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia na-ekwu, sị: “‘Nhọpụta’ na ‘ime nhọpụta’ na-ezokarị aka n’ọkwá pụrụ iche a na-enye ndị ụkọchukwu ma ọ bụ ndị nchụàjà site n’ememe ndị chọọchị kwadoro, ya na mmesi ike ya nke inwe ikike nke ịkpọsa Okwu ahụ ma ọ bụ izi sakramenti, ma ọ bụ ha abụọ.” Ònye na-ahọpụta ndị ozi? The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Na chọọchị ndị nọgideworo na-enwe òtù ndị bishọp, ụkọchukwu nke na-ahọpụta ndị ozi na-abụkarị onye bishọp. Na chọọchị Presbyterian, ọ bụ ndị ụkọchukwu so n’òtù ndị isi na-ahọpụta ndị ozi.”

4 N’ihi ya, na chọọchị Krisendọm, a kpaworo ihe ùgwù nke ịbụ onye ozi ókè nke ukwuu. Ma, ọ bụghị otú a ka ọ dị n’etiti Ndịàmà Jehova. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dịghị otú ahụ n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ.

Ole Ndị n’Ezie Bụ Ndị Ozi Chineke?

5. Dị ka Bible si kwuo, ndị na-eje ozi dị ka ndị ozi gụnyere ole ndị?

5 Dị ka Bible si kwuo, ndị nile na-efe Jehova—n’eluigwe nakwa n’ụwa—bụ ndị ozi. Ndị mmụọ ozi jeere Jisọs ozi. (Matiu 4:11; 26:53; Luk 22:43) Ndị mmụọ ozi ‘na-ejekwa ozi n’ihi ndị gaje iketa nzọpụta.’ (Ndị Hibru 1:14; Matiu 18:10) Jisọs bụ onye ozi. O kwuru, sị: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi.” (Matiu 20:28; Ndị Rom 15:8) Ya mere, ebe ọ bụ na ụmụazụ Jisọs ‘ga-eso ijeụkwụ Ya nile,’ ọ bụghị ihe ijuanya na ha onwe ha aghaghị ịbụ ndị ozi.—1 Pita 2:21.

6. Olee otú Jisọs si gosi na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịbụ ndị ozi?

6 N’oge na-adịghị anya tupu Jisọs arịgoro eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-abụ ndị na-eme ndị na-eso ụzọ—ndị ozi. Ndị na-eso ụzọ ọhụrụ ha metere ga-amụta idebe ihe nile Jisọs nyere n’iwu, gụnyere iwu ahụ bụ́ ịga mee ndị na-eso ụzọ. Nwoke ma ọ bụ nwanyị, okenye ma ọ bụ nwatakịrị, ezi onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst ga-abụ onye ozi.—Joel 2:28, 29.

7, 8. (a) Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na ezi ndị Kraịst nile bụ ndị ozi? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-ajụ banyere ịhọpụta mmadụ ịbụ onye ozi?

7 N’ikwekọ na nke a, n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., ndị na-eso ụzọ Jisọs nile bụ́ ndị nọ ya, ndị ikom na ndị inyom, sonyere n’ikwupụta “oké ọrụ nile nke Chineke.” (Ọrụ 2:1-11) Ọzọkwa, Pọl onyeozi dere, sị: “A na-eji obi kwere ruo ezi omume; a na-ejikwa ọnụ kwupụta ruo nzọpụta.” (Ndị Rom 10:10) Pọl ‘gwara ndị nile nọ na Rom bụ́ ndị Chineke hụrụ n’anya’ okwu ndị ahụ, ọ bụghị òtù ndị ụkọchukwu e wepụtara iche. (Ndị Rom 1:1, 7) N’ụzọ yiri nke ahụ, ‘ndị nsọ nile nọ n’Efesọs na ndị kwere na Kraịst Jisọs’ ga-abụ ndị weere “nkwadebe nke bụ́ ozi ọma nke udo yikwasị n’ụkwụ” ha. (Ndị Efesọs 1:1; 6:15) Ndị nile nụkwara akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Hibru ‘ga-ejidesi nkwupụta nke olileanya ha ike ka ọ ghara iruda n’ala.’—Ndị Hibru 10:23.

8 Otú ọ dị, olee mgbe mmadụ na-aghọ onye ozi? N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, olee mgbe a na-ahọpụta ya ịbụ onye ozi? Ònye na-ahọpụtakwa ya?

Nhọpụta Dị Ka Onye Ozi—Ole Mgbe?

9. Olee mgbe a họpụtara Jisọs, ònye họpụtakwara ya?

9 Banyere mgbe a ga-ahọpụta mmadụ na onye ga-ahọpụta ya, tụlee ihe atụ Jisọs Kraịst. O nweghị asambodo ma ọ bụ akara ugo nhọpụta o nwetara na seminarị iji gosi na ọ bụ onye ozi, ọ bụghịkwa mmadụ họpụtara ya. N’ihi gịnịzi ka anyị pụrụ iji kwuo na ọ bụ onye ozi? Ọ bụ n’ihi na okwu Aịsaịa kwuru n’ike mmụọ nsọ mezuru n’ebe ọ nọ: “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị n’ahụ m, n’ihi na O tere m mmanụ izi . . . ozi ọma.” (Luk 4:17-19; Aịsaịa 61:1) Okwu ndị ahụ na-egosi n’ụzọ doro anya na e nyere Jisọs ọrụ ikwusa ozi ọma. Ònye nyere ya? Ebe ọ bụ mmụọ Jehova tere Jisọs mmanụ maka ọrụ ahụ, o doro anya na ọ bụ Jehova Chineke họpụtara ya. Olee mgbe nke a mere? N’ezie, mmụọ Jehova bịakwasịrị Jisọs mgbe e mere ya baptism. (Luk 3:21, 22) Ya mere, ọ bụ n’oge e mere ya baptism ka a họpụtara ya.

10. Ònye na-eme ka onye Kraịst bụ́ onye ozi ‘ruo eru’?

10 Gịnị banyere ụmụazụ Jisọs nke narị afọ mbụ? Ọnọdụ ha dị ka ndị ozi sitekwara n’aka Jehova. Pọl kwuru, sị: “Iru eru anyị sitere na Chineke; Onye mekwara anyị ka anyị ruo ịbụ ndị na-eje ozi ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” (2 Ndị Kọrint 3:5, 6) Olee otú Jehova si eme ka ndị na-efe ya ruo eru ịbụ ndị ozi? Tụlee ihe atụ Timoti, bụ́ onye Pọl kpọrọ “onye na-ejere Chineke ozi n’ozi ọma nke Kraịst.”—1 Ndị Tesalọnaịka 3:2.

11, 12. Olee otú Timoti si nwee ọganihu ruo n’ịghọ onye ozi?

11 Okwu ndị a na-esonụ a gwara Timoti na-enyere anyị aka ịghọta otú o si ghọọ onye ozi: “Ma gị onwe gị, nọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha, ebe ị matara mmadụ ndị ị mụtara ha n’ọnụ ha; ebe ị makwaara na i sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta site n’okwukwe nke i kwere na Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 3:14, 15) Ntọala nke okwukwe Timoti, bụ́ nke ga-akwali ya ime nkwupụta ihu ọha, bụ ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ. Ọgụgụ ihe onwe onye ọ̀ bụ nanị ihe a chọrọ maka nke a? Ee e. Enyemaka dị Timoti mkpa iji nweta ezi ihe ọmụma na nghọta ime mmụọ nke ihe ọ gụrụ. (Ndị Kọlọsi 1:9) N’ihi ya, ‘e mere ka Timoti kwere.’ Ebe ọ bụ na ọ marawo Akwụkwọ Nsọ “site n’oge [ọ] dị na nwa ọhụrụ,” ndị nkụzi mbụ ya aghaghị ịbụwo nne ya na nne ya ochie, ebe ihe àmà na-egosi na nna ya abụghị onye kwere ekwe.—2 Timoti 1:5.

12 Otú ọ dị, e nwekwuru ihe ndị ọzọ mere ka Timoti ghọọ onye ozi. Otu ihe bụ na, mkpakọrịta nke ya na ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ ndị dị nso wusiri okwukwe ya ike. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ n’ihi na mgbe Pọl zutere Timoti na nke mbụ ya, “ụmụnna n’ime Kraịst ndị bi na Listra na Aikọniọm gbara . . . ezi àmà” banyere nwa okorobịa ahụ. (Ọrụ 16:2) Tụkwasị na nke a, n’oge ndị ahụ, ụmụnna ụfọdụ na-edegara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ozi iji wusie ha ike. Ndị nlekọta na-eletakwa ha iji gbaa ha ume. Ndokwa ndị dị otú ahụ nyeere ndị Kraịst dị ka Timoti aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.—Ọrụ 15:22-32; 1 Pita 1:1.

13. Olee mgbe a họpụtara Timoti ịbụ onye ozi, n’ihi gịnịkwa ka ị ga-eji ekwu na ọganihu ya n’ụzọ ime mmụọ ejedebeghị n’ebe ahụ?

13 N’ihi iwu Jisọs nyere bụ́ nke e dekọrọ na Matiu 28:19, 20, anyị pụrụ ijide n’aka na n’otu oge, okwukwe Timoti kwaliri ya iṅomi Jisọs ma bụrụ onye e mere baptism. (Matiu 3:15-17; Ndị Hibru 10:5-9) Nke a bụ ngosipụta nke nrara Timoti ji obi ya dum rara onwe ya nye Chineke. Mgbe Timoti mesịrị baptism, ọ ghọrọ onye ozi. Site n’oge ahụ gawa, ndụ ya, ume ya, na ihe nile o nwere bụ nke Chineke. Nke a bụ akụkụ bụ́ isi nke ofufe ya, “ozi dị nsọ.” Otú ọ dị, afọ ejughị Timoti n’ihi ihe ùgwù ahụ. Ọ nọgidere na-eto n’ụzọ ime mmụọ, ghọọ onye Kraịst bụ́ onye ozi tozuru okè. Nke a weere ọnọdụ n’ihi mkpakọrịta chiri anya Timoti na ndị Kraịst tozuru okè dị ka Pọl nwere, ọmụmụ ihe onwe onye ya, na ọrụ nkwusa o ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ.—1 Timoti 4:14; 2 Timoti 2:2; Ndị Hibru 6:1.

14. Taa, olee otú onye “e doro ịnata ndụ ebighị ebi” si enwe ọganihu ruo n’ịbụ onye ozi?

14 Taa, nhọpụta maka ozi ndị Kraịst bụ otu ihe ahụ. A na-enyere onye “e doro ịnata ndụ ebighị ebi” aka ịmụta banyere Chineke na nzube ya site n’ọmụmụ Bible. (Ọrụ 13:48) Onye ahụ na-amụta itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ya nakwa ikpegara Chineke ekpere n’ụzọ nwere nzube. (Abụ Ọma 1:1-3; Ilu 2:1-9; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17, 18) Ọ na-eso ndị kwere ekwe ndị ọzọ na-akpakọrịta ma na-erite uru site n’ihe “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta na ndokwa ndị ohu ahụ na-eme. (Matiu 24:45-47; Ilu 13:20; Ndị Hibru 10:23-25) N’ihi ya, ọ na-enwe ọganihu n’usoro mmụta a haziri ahazi.

15. Gịnị na-eme mgbe e mere mmadụ baptism? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

15 N’ikpeazụ, onye ahụ a na-amụrụ Bible, n’ịbụ onye zụliteworo ịhụnanya n’ebe Jehova Chineke nọ nakwa okwukwe siri ike n’àjà mgbapụta ahụ, na-enwe ọchịchọ ịrara onwe ya kpam kpam nye Nna ya nke eluigwe. (Jọn 14:1) Ọ na-eji ekpere onwe onye arara onwe ya nye, e wee mezie ya baptism dị ka ngosipụta ihu ọha nke ihe ahụ o mere nanị ya. Baptism ya bụ ememe nhọpụta ya n’ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka a ga-amata ya dị ka onye ozi raara onwe ya nye n’ụzọ zuru ezu, di·aʹko·nos, nke Chineke. Ọ ghaghị ịnọgide na-anọpụ iche n’ụwa. (Jọn 17:16; Jemes 4:4) O chewo onwe ya kpam kpam “dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ,” n’enyeghị ọnọdụ ọ bụla. (Ndị Rom 12:1) * Ọ bụ onye ozi nke Chineke, na-eṅomi Kraịst.

Gịnị Ka Ozi Ndị Kraịst Bụ?

16. Olee ụfọdụ ibu ọrụ Timoti nwere dị ka onye ozi?

16 Gịnị ka ozi Timoti gụnyere? O nwere ọrụ ndị pụrụ iche dị ka onye ya na Pọl so na-eme njem. Mgbe Timoti ghọkwara onye okenye, ọ rụsiri ọrụ ike n’izi ndị Kraịst ibe ya ihe na iwusikwu ha ike. Ma akụkụ bụ́ isi nke ozi ya, dịkwa ka ọ dị n’ebe Jisọs na Pọl nọ, bụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 4:23; 1 Ndị Kọrint 3:5) Pọl gwara Timoti, sị: “Ma gị onwe gị, na-enwe anya udo n’ihe nile, hụjuo anya, rụọ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.)—2 Timoti 4:5.

17, 18. (a) Ozi dị aṅaa ka ndị Kraịst na-ekere òkè na ya? (b) Olee otú ọrụ nkwusa ahụ dịruru onye Kraịst bụ́ onye ozi ná mkpa?

17 Otú ahụ ka ọ dị n’ebe ndị Kraịst bụ́ ndị ozi nọ taa. Ha na-ekere òkè n’ozi ihu ọha, bụ́ ọrụ izisa ozi ọma, na-atụziri ndị ọzọ otú ha ga-esi nweta nzọpụta ná ndabere nke àjà Jisọs, na-ezikwa ndị dị umeala n’obi ịkpọkụ aha Jehova. (Ọrụ 2:21; 4:10-12; Ndị Rom 10:13) Ha na-egosi site na Bible na Alaeze ahụ bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụju anya ma na-egosi na ọbụna ugbu a, ihe na-aka mma ma ọ bụrụ na anyị ebie ndụ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị. (Abụ Ọma 15:1-5; Mak 13:10) Ma onye Kraịst bụ́ onye ozi adịghị ekwusa ozi ọma ọrụ ebere. Kama nke ahụ, ọ na-akụzi na ‘nsọpụrụ Chineke nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.’—1 Timoti 4:8.

18 N’eziokwu, ihe ka ọtụtụ ná ndị ozi nwekwara ụzọ ndị ọzọ ha si eje ozi, bụ́ nke pụrụ ịdịgasị iche site n’otu onye Kraịst gaa n’ọzọ. Ọtụtụ ndị nwere ibu ọrụ ezinụlọ. (Ndị Efesọs 5:21–6:4) Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwere ọrụ ndị ha na-arụ n’ọgbakọ. (1 Timoti 3:1, 12, 13; Taịtọs 1:5; Ndị Hibru 13:7) Ọtụtụ ndị Kraịst na-enye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụfọdụ nwere ihe ùgwù magburu onwe ya nke ịrụ ọrụ dị ka ndị ozi afọ ofufo n’otu n’ime ebe obibi Betel nke Watch Tower Society. Otú ọ dị, ndị Kraịst nile bụ́ ndị ozi na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma. Ọ dịghị onye a gụpụrụ. Ọ bụ ikere òkè n’ọrụ a na-eme ka a mata mmadụ n’ihu ọha dị ka ezi onye Kraịst bụ́ onye ozi.

Àgwà Onye Kraịst Bụ́ Onye Ozi

19, 20. Àgwà dị aṅaa ka ndị Kraịst bụ́ ndị ozi na-aghaghị ịzụlite?

19 Ihe ka ọtụtụ ná ndị ụkọchukwu Krisendọm na-atụ anya ka a na-enye ha nsọpụrụ pụrụ iche, ha na-ewerekwa utu aha ndị dị ka “revren” na “fada.” Otú ọ dị, onye Kraịst bụ́ onye ozi maara na ọ bụ nanị Jehova bụ onye e kwesịrị inye nsọpụrụ pụrụ iche. (1 Timoti 2:9, 10) Ọ dịghị onye Kraịst ọ bụla bụ́ onye ozi na-azọrọ nkwanye ùgwù dị elu dị otú ahụ ma ọ bụ na-agbalị inwe utu aha ndị pụrụ iche. (Matiu 23:8-12) Ọ maara na ihe bụ́ isi di·a·ko·niʹa pụtara bụ “ije ozi.” Mgbe ụfọdụ, a na-eji ngwaa e jikọrọ ya na ya eme ihe n’ime Bible n’ihe metụtara ijere otu onye ozi, dị ka ijere mmadụ ozi mgbe ọ na-eri nri. (Luk 4:39; 17:8; Jọn 2:5) N’agbanyeghị na e ji ya eme ihe n’ụzọ ka elu n’ihe metụtara ozi ndị Kraịst, di·aʹko·nos ka bụkwa onye na-eje ozi.

20 Ya mere, ọ dịghị onye Kraịst ọ bụla bụ́ onye ozi nke nwere ihe mere ọ ga-eji were onwe ya dị ka onye dị oké mkpa. Ezi ndị Kraịst bụ́ ndị ozi—ọbụna ndị nwere ibu ọrụ ndị pụrụ iche n’ọgbakọ—ndị ohu nwere obi umeala. Jisọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onyeisi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu.” (Matiu 20:26, 27) Mgbe Jisọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya àgwà ziri ezi ha ga-azụlite, ọ sara ụkwụ ha, na-arụ ọrụ onye ohu kasị ala na-arụ. (Jọn 13:1-15) Lee ozi dị ala nke a bụ! N’ihi ya, ndị Kraịst bụ́ ndị ozi na-eji obi umeala ejere Jehova Chineke na Jisọs Kraịst ozi. (2 Ndị Kọrint 6:4; 11:23) Ha na-egosipụta ịdị umeala n’obi n’ijere ibe ha ozi. Mgbe ha na-ekwusakwa ozi ọma, ha na-eji achọghị ọdịmma onwe onye nanị ejere ndị agbata obi ha na-ekweghị ekwe ozi.—Ndị Rom 1:14, 15; Ndị Efesọs 3:1-7.

Tachie Obi n’Ozi

21. Olee otú e si kwụghachi Pọl ụgwọ maka ịtachi obi n’ozi?

21 Nye Pọl, ịbụ onye ozi chọrọ ntachi obi. Ọ gwara ndị Kọlọsi na ọ tara ahụhụ dị ukwuu iji kwusaara ha ozi ọma. (Ndị Kọlọsi 1:24, 25) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ọ tachiri obi, ọtụtụ ndị nabatara ozi ọma ahụ ma ghọọ ndị ozi. A mụrụ ha dị ka ụmụ Chineke na ụmụnna Jisọs Kraịst, na-enwe atụmanya nke iso ya ghọọ ndị e kere eke bụ́ mmụọ n’eluigwe. Lee ụgwọ ọrụ dị ebube maka ntachi obi nke a bụ!

22, 23. (a) N’ihi gịnị ka ntachi obi ji dị ndị Kraịst bụ́ ndị ozi mkpa taa? (b) Mkpụrụ dị aṅaa magburu onwe ya ka ntachi obi ndị Kraịst na-amịpụta?

22 Ntachi obi dị mkpa nye ndị bụ́ ndị ozi Chineke n’ezie. Ọtụtụ ndị na-adọga kwa ụbọchị n’ihi ọrịa ma ọ bụ n’ihi ihe mgbu nke ịka nká. Ndị nne na nna na-arụsi ọrụ ike—ọtụtụ n’ime ha na-arụ ya n’enweghị di ma ọ bụ nwunye—iji zụlite ụmụ ha. Ụmụ akwụkwọ nọ n’ụlọ akwụkwọ na-eji obi ike eguzogide mmetụta ndị na-ezighị ezi gbara ha gburugburu. Ọtụtụ ndị Kraịst na-enwe oké ihe isi ike n’ụzọ akụ̀ na ụba. Ọtụtụ ndị na-enwekwa mkpagbu ma ọ bụ ihe isi ike n’ihi “oge dị oké egwu” a nọ na ya taa! (2 Timoti 3:1) Ee, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ndị ozi isii nke Jehova taa pụrụ iso Pọl onyeozi kwuo, sị: “N’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi, n’ime oké ntachi obi.” (2 Ndị Kọrint 6:4) Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi adịghị ada mbà. N’ezie a ga-aja ha mma maka ntachi obi ha.

23 Ọzọkwa, dị ka ọ dị n’ọnọdụ Pọl, ntachi obi na-amịpụta mkpụrụ magburu onwe ya. Site n’ịtachi obi, anyị na-echekwa mmekọrịta chiri anya nke anyị na Jehova, na-emekwa ka obi na-atọ ya ụtọ. (Ilu 27:11) Anyị na-eme ka okwukwe anyị onwe anyị sikwuo ike ma na-eme ndị na-eso ụzọ, na-etinyekwu ihe n’òtù ụmụnna ndị Kraịst. (1 Timoti 4:16) Jehova akwagidewo ndị na-ejere ya ozi ma gọzie ozi ha n’oge ikpeazụ a. N’ihi ya, a chịkọtawo ndị fọdụrụnụ n’ime 144,000 ahụ, ọtụtụ nde ndị ọzọ jikwa obi ike na-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs. (Luk 23:43; Mkpughe 14:1) N’eziokwu, ozi ndị Kraịst bụ ngosipụta nke ebere Jehova. (2 Ndị Kọrint 4:1) Ka anyị nile jiri ya kpọrọ ihe nke ukwuu ma nwee ekele na mkpụrụ ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ n’okwu Grik bụ́ di·aʹko·nos ka e si nweta okwu bụ́ “dikọn,” bụ́ onye na-eje ozi na chọọchị. Na chọọchị ebe ndị inyom pụrụ ịbụ dikọn, a pụrụ ịkpọ ha ndị dikọnes.

^ par. 15 Ọ bụ ezie na Ndị Rom 12:1 metụtara kpọmkwem ndị Kraịst e tere mmanụ, ụkpụrụ ahụ metụtakwara “atụrụ ọzọ” ahụ. (Jọn 10:16) Ndị a “na-arapara Jehova, ijere Ya ozi, na ịhụ aha Jehova n’anya, na ịbụrụ Ya ndị ohu.”—Aịsaịa 56:6.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst nile nke narị afọ mbụ nwere?

• Olee mgbe a na-ahọpụta onye Kraịst ịbụ onye ozi, ọ̀ bụkwa ònye na-ahọpụta ya?

• Àgwà dị aṅaa ka onye Kraịst bụ́ onye ozi kwesịrị ịzụlite?

• N’ihi gịnị ka onye Kraịst bụ́ onye ozi ga-eji tachie obi mgbe o nwere ihe isi ike?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

A kụziiri Timoti Okwu Chineke site na nwa ọhụrụ. Ọ ghọrọ onye ozi a họpụtara ahọpụta mgbe e mere ya baptism

[Foto dị na peeji nke 18]

Baptism na-egosipụta nrara mmadụ raara onwe ya nye Chineke, na-akakwa akara nhọpụta ya dị ka onye ozi

[Foto dị na peeji nke 20]

Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi na-enwe ọchịchọ ije ozi