Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Ga-ekwerịrị na Ya?

Ị̀ Ga-ekwerịrị na Ya?

Ị̀ Ga-ekwerịrị na Ya?

NWA akwụkwọ ahụ dị afọ 12 nọ na-agbalị ịghọta usoro ndị bụ́ isi nke ụdị mgbakọ na mwepụ bụ́ algebra. Onye nkụzi ha kụziiri ndị klas ya mgbakọ algebra yiri nke ezi uche dị na ya.

“Ka e were ya na x=y nakwa na ha abụọ hàcha ka 1,” ka ọ malitere ikwu.

‘Nke ahụ ka yiri ihe ezi uche dị na ya ma e were ya otú ahụ,’ ka nwa akwụkwọ ahụ chere.

Otú ọ dị, mgbe ahịrị anọ nke ihe yiri mgbakọ ezi uche dị na ya gasịrị, onye nkụzi ahụ rụpụtara ihe na-eju anya: “Ya mere, 2=1!”

“Gbaghaa ya,” ka ọ mara ụmụ akwụkwọ ya nwere ihe ijuanya aka.

N’ịbụ onye nwere ihe ọmụma a kpaara ókè banyere ụdị mgbakọ na mwepụ bụ́ algebra, nwata akwụkwọ ahụ ahụghị otú ọ ga-esi gbaghaa ya. Usoro ọ bụla nke mgbakọ ahụ yiri nke ziri nnọọ ezi. Mgbe ahụ, ò kwesịrị ikwere nkwubi okwu a dị ịtụnanya? E kwuwerị, onye nkụzi ya maara nnọọ mgbakọ na mwepụ karịa ya. N’ezie, o kwesịghị! ‘Ọ dịghị m mkpa ịgbagha ihe a,’ ka o chere n’obi ya. ‘Ọgụgụ isi nkịtị na-agwa m na nke a ezighị ezi.’ (Ilu 14:15, 18) Ọ maara na ma onye nkụzi ya ma ụmụ klas ya adịghị nke ga-eji dollar abụọ gbanwere otu dollar!

Ka oge na-aga, nwa akwụkwọ ahụ na-amụ algebra chọpụtara ntụpọ dị ná mgbakọ ahụ. Ka ọ dịgodị, ahụmahụ ahụ kụziiri ya otu ihe bara uru. Ọbụna mgbe onye ka nnọọ mmadụ nwee ihe ọmụma kwuru ihe o ji nnọọ nlezianya chepụta bụ́ nke yikwara nke a na-apụghị ịgbagha agbagha, ọ dịghị onye na-ege ntị mkpa ikwere ná nkwubi okwu ezi uche na-adịghị na ya nanị n’ihi na ọ pụghị ịgbagha ya mgbe ahụ. N’ezie, nwa akwụkwọ ahụ nọ na-agbaso otu ụkpụrụ Bible dị nnọọ irè bụ́ nke a na-achọta na 1 Jọn 4:1—ịbụ onye na-adịghị ekwere nnọọ ngwa ngwa ihe nile ọ nụrụ, ọbụna mgbe o yiri ka o sitere n’ọnụ ndị maara nke a na-akọ.

Nke a apụtaghị na i kwesịrị iji ịkpọ ekwo nkụ na-arapara n’echiche ndị ị dị mbụ nwee. Ọ bụ ihie ụzọ bụ́ ileghara ihe ọmụma pụrụ ịgbanwe echiche ndị hiere ụzọ, anya. Ma i kwesịghịkwanụ ‘ime mkpọtụ pụọ n’uche gị ọsọ ọsọ’ mgbe ị na-enwe nrụgide site n’aka onye na-azọrọ na o nwere amamihe ma ọ bụ ikike dị ukwuu. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:2) N’ezie, ọ bụ egwuregwu ka onye nkụzi ahụ nọ na-egwusa ụmụ akwụkwọ ya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ọ naghị abụcha nke a na-ebughị ihe ọjọọ n’obi eme. Ndị mmadụ pụrụ nnọọ ịdị na-aghọ “aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.”—Ndị Efesọs 4:14; 2 Timoti 2:14, 23, 24.

Ndị Ọkachamara Hà Na-ezi Ezi Mgbe Nile?

Otú ọ sọrọ ha ha nweruo ihe ọmụma, ndị ọkachamara n’ihe ọmụmụ ọ bụla pụrụ inwe echiche na-emegiderịta ibe ha na ndị na-agbanwe agbanwe. Were dị ka ihe atụ, arụmụka na-aga n’ihu na sayensị ọgwụ na ahụ ike, banyere ihe dị nnọọ mkpa dị ka ihe ndị na-akpata nrịanrịa. “Mkpa àgwà ndị e ketara eketa na ihe ndị mejupụtara gburugburu ebe obibi dịtụ n’ebe nrịanrịa dị bụ isi ihe na-akpata arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ n’etiti ndị ọkà mmụta sayensị,” ka otu onye prọfesọ maka ọgwụ na Mahadum Harvard na-ede. Ndị nọ n’ihe a kpọworo òtù ndị kweere na mmadụ apụghị ịchịkwa ihe ọ na-eme kwesiri ike na mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị na-ekere òkè bụ́ isi n’anyị inweta ọrịa dị iche iche. Otú ọ dị, ndị ọzọ na-azọrọ na gburugburu ebe obibi na ụzọ ndụ bụ isi ihe ndị na-eme ka mmadụ daa ọrịa. Òtù abụọ ahụ na-adị ngwa ihota ihe ọmụmụ na ihe ndekọ dị iche iche iji kwado ihe ha na-ekwu. Ka o sina dị, arụmụka ahụ ka na-aga n’ihu.

Ugboro ugboro, e gosipụtawo na ndị na-eche echiche bụ́ ndị a kasị mara amara ezighị ezi n’ihe ha kwuru, n’agbanyeghị na ihe ha kụziri yiri ndị a na-apụghị ịgbagha agbagha n’oge ahụ. Onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Bertrand Russell kọwara Aristotle dị ka otu n’ime “ndị ọkà ihe ọmụma kasị nwee ikike.” Ma, Russell mekwara ka ọ pụta ìhè na ọtụtụ ihe ndị Aristotle ziri bụ “ụgha n’ozuzu ha.” “N’oge ọgbara ọhụrụ nile,” ka o dere, “ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọganihu ọ bụla e nwere na sayensị, na nkà iche echiche, ma ọ bụ na nkà ihe ọmụma abụrụwo nke a na-aghaghị ime n’etiti mmegide sitere n’aka ndị na-eso ụzọ Aristotle.”—History of Western Philosophy.

“Ihe ahụ A Na-akpọ Ihe Ọmụma n’Ụzọ Ụgha”

O yiri ka ndị Kraịst oge mbụ hà zutere ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-eso ụzọ ndị ọkà ihe ọmụma a ma ama nke Gris, dị ka Socrates, Plato, na Aristotle. Ndị gụrụ akwụkwọ n’oge ahụ lere onwe ha anya dị ka ndị nwere ọgụgụ isi karịa ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst. Ọ bụghị ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs ka e lere anya dị ka “ndị maara ihe dị ka anụ ahụ si mara ihe.” (1 Ndị Kọrint 1:26) N’ezie, ndị a kụziiri nkà ihe ọmụma nke oge ahụ chere na ihe ndị Kraịst kweere bụ nnọọ “ihe nzuzu” ma ọ bụ “ihe iberibe.”—1 Ndị Kọrint 1:23; Phillips.

Ọ bụrụ na i so ná ndị Kraịst oge mbụ ahụ, arụmụka nke ndị gụrụ akwụkwọ n’oge ahụ ji eme ka mmadụ kwenye ọ̀ gaara amasịwo gị ka ụjọ ọ̀ gaara ejidewo gị maka ngosipụta nke amamihe ha? (Ndị Kọlọsi 2:4) E nweghị ihe mere ọ gaara eji adịwo otú ahụ, dị ka Pọl onyeozi si kwuo. O chetaara ndị Kraịst na Jehova na-ele “amamihe nke ndị maara ihe” na “nghọta nke ndị nwere nghọta” nke oge ya anya dị ka ihe nzuzu. (1 Ndị Kọrint 1:19) “Gịnị,” ka ọ jụrụ, “ka onye ọkà ihe ọmụma, onye edemede na onye ntụcha nke ụwa a nwere igosi maka amamihe ha nile?” (1 Ndị Kọrint 1:20, Phillips) N’agbanyeghị amamihe ọgụgụ isi nile ha, ndị ọkà ihe ọmụma, ndị edemede, na ndị ntụcha nke oge Pọl enyeghị ihe ngwọta ọ bụla maka nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ.

Ya mere ndị Kraịst mụtara izere ihe Pọl onyeozi sịrị na ha bụ “ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile.” (1 Timoti 6:20) Ihe mere Pọl ji kpọọ ihe ọmụma dị otú ahụ “ụgha” bụ na otu isi ihe dị mkpa kọrọ ya—ihe odide ma ọ bụ izo aka sitere n’aka Chineke bụ́ nke a pụrụ iji nwalee nchepụta echiche ha. (Job 28:12; Ilu 1:7) N’ịbụ ndị na-enweghị nke ahụ, n’otu oge ahụkwa n’ịbụ ndị onyeisi nduhie ahụ, bụ́ Setan, meworo ka ha kpuo ìsì, ndị na-araparagide n’ihe ọmụma dị otú ahụ apụghị inwe olileanya ịchọta eziokwu ahụ.—1 Ndị Kọrint 2:6-8, 14; 3:18-20; 2 Ndị Kọrint 4:4; 11:14; Mkpughe 12:9.

Bible—Ihe Nduzi Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ

Ọ dịghị mgbe ọ bụla ndị Kraịst oge mbụ nwere obi abụọ na Chineke ekpughewo uche ya, nzube ya, na ụkpụrụ ya n’ime Akwụkwọ Nsọ. (2 Timoti 3:16, 17) Nke a chebere ha pụọ n’ịbụ ndị ‘e weere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ndị mmadụ na-ezu n’ohi.’ (Ndị Kọlọsi 2:8) Ọnọdụ dị taa bụ otu ihe ahụ. N’ụzọ dị iche n’ebe echiche na-agbagwoju anya ma na-emegiderịta onwe ya nke ụmụ mmadụ dị, Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na-enye ntọala siri ike bụ́ ebe anyị ga-ehiwe nkwenkwe anyị isi. (Jọn 17:17; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:13; 2 Pita 1:21) E wezụga ya, anyị ga-anọ n’ọnọdụ siri oké ike nke ịdabere ná nchepụta echiche na nkà ihe ọmụma na-agbanwe agbanwe nke ụmụ mmadụ.—Matiu 7:24-27.

‘Cherekwa,’ ka mmadụ pụrụ ikwu. ‘Ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ihe ndị bụ́ eziokwu nke sayensị egosiwo na Bible ezighị ezi, n’ihi ya, bụrụkwa nke na-ekwesịghịzi ndabere karịa nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-agbanwe mgbe nile?’ Dị ka ihe atụ, Bertrand Russell zọọrọ na “Copernicus, Kepler, na Galileo aghaghị ịlụso Aristotle nakwa Bible ọgụ n’iwepụta echiche ahụ bụ́ na ụwa abụghị etiti nke eluigwe na ala.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ́ bụghịkwa eziokwu na taa, dị ka ihe atụ, ndị nkà mmụta banyere okike na-anọgide na-ekwu na Bible na-ezi na e kere ụwa n’ime ụbọchị isii nke ụbọchị nke ọ bụla nwere awa 24, ebe ihe nile bụ́ eziokwu na-egosi na ụwa n’onwe ya agbaala ọtụtụ ijeri afọ?

N’ezie, Bible adịghị ekwu na ụwa bụ etiti eluigwe na ala. Nke ahụ bụ ozizi nke ndị ndú chọọchị bụ́ ndị na-adịghị agbasosi Okwu Chineke ike n’onwe ha. Ihe ndekọ Jenesis banyere okike na-enye echiche na ụwa pụrụ ịdị ọtụtụ ijeri afọ, ọ dịghịkwa akpa ụbọchị okike ọ bụla ókè ịbụ awa 24. (Jenesis 1:1, 5, 8, 13, 19, 23, 31; 2:3, 4) Ntụle e ji obi eziokwu tụlee Bible na-egosi na n’agbanyeghị na ọ bụghị akwụkwọ sayensị, n’ezie ọ bụghị “ihe iberibe.” N’ezie, ya na sayensị e gosipụtara ịbụ eziokwu na-ekwekọ kpam kpam. *

“Ikike Iche Echiche”

N’agbanyeghị na ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ ndị ikom na ndị inyom nọ n’ọnọdụ dị ala, bụ́ ndị na-agụghị akwụkwọ hie nne ma eleghị anya, ha nwere ihe ọzọ bara uru Chineke nyere ha. N’agbanyeghị otú e si zụlite ha, e nyere ha nile ikike iche echiche. Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume iji “ikike iche echiche” (NW) ha na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu ka “[ha] wee nwapụta ihe bụ́ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:1, 2.

Site n’iji “ikike iche echiche” Chineke nyere ha mee ihe, ndị Kraịst oge mbụ hụrụ nke ọma na nkà ihe ọmụma ma ọ bụ nkụzi ọ bụla na-ekwekọghị n’Okwu Chineke e kpughere ekpughe bụ ihe na-abaghị uru. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị amamihe nke oge ha n’ezie nọ “na-egbochi eziokwu” ma na-eleghara ihe àmà ndị gbara ha gburugburu anya bụ́ ndị na-egosi na Chineke dị adị. “Mgbe ha na-ekwu na ha bụ ndị maara ihe, ha wee ghọọ ndị nzuzu,” ka Pọl onyeozi dere. Ebe ọ bụ na ha jụrụ eziokwu banyere Chineke na nzube ya, “e mere ha ihe efu n’ihe nile ha na-atụle n’obi ha, obi ha nke na-enweghị nghọta gbakwara ọchịchịrị.”—Ndị Rom 1:18-22; Jeremaịa 8:8, 9.

Ndị na-azọrọ na ha maara ihe na-erukarị ná nkwubi okwu ndị dị ka “Chineke adịghị” ma ọ bụ “E kwesịghị ịtụkwasị Bible obi” ma ọ bụ “Ugbu a abụghị ‘mgbe ikpeazụ.’” Echiche ndị dị otú ahụ bụ nke nzuzu n’anya Chineke dị nnọọ ka ikwubi na “2=1.” (1 Ndị Kọrint 3:19) Ike ọ sọrọ ndị mmadụ ha na-azọrọ na ha nwere, ọ bụghị iwu na ị ga-anabatarịrị nkwubi okwu ha ma ọ bụrụ na ha megidere Chineke, na-eleghara Okwu ya anya, ma na-emegide ọgụgụ isi nkịtị. N’ikpeazụ, ụzọ ka mma na-abụkarị “[ime] ka ọ pụta ìhè na Chineke bụ Onye eziokwu, ma mmadụ nile n’otu n’otu bụ ndị ụgha.”—Ndị Rom 3:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Iji nwetakwuo nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ ndị bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? na Is There a Creator Who Cares About You?, ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

N’ụzọ dị iche n’ebe echiche na-agbanwe agbanwe nke ụmụ mmadụ dị, Bible na-enye ihe ndabere siri ike maka ikwere na ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

N’aka ekpe, Epicurus: Foto e sere site n’ikike British Museum; n’elu n’etiti, Plato: National Archaeological Museum, Atens, Gris; n’aka nri, Socrates: Roma, Musei Capitolini