Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Hụrụ Ihe Ncheta Jehova n’Anya nke Ukwuu?

Ị̀ Hụrụ Ihe Ncheta Jehova n’Anya nke Ukwuu?

Ị̀ Hụrụ Ihe Ncheta Jehova n’Anya nke Ukwuu?

“Mkpụrụ obi m edebewo ihe [ncheta] Gị nile; ana m ahụkwa ha n’anya nke ukwuu.”—ABỤ ỌMA 119:167.

1. N’ebee karịsịa ka anyị na-ahụ ka e zoro aka n’ihe ncheta Jehova ugboro ugboro?

JEHOVA chọrọ ka ndị ya na-enwe obi ụtọ. N’ezie, iji na-enwe ezi obi ụtọ, anyị aghaghị ije ije n’iwu Chineke ma na-edebe ha. Iji mee nke ahụ, ọ na-enye anyị ihe ncheta. A kpọtụrụ ha aha ugboro ugboro n’Akwụkwọ Nsọ, karịsịa n’Abụ Ọma nke 119, ikekwe ọ bụ Nwa Eze bụ́ Hezekaịa na-eto eto nke Juda dere ya. Ọmarịcha abụ a ji okwu ndị a malite: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị zuru okè n’ụzọ Jehova bụ, ndị na-ejegharị n’iwu Jehova. Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-echebe ihe [ncheta] Ya nile bụ, ndị na-ewere obi ha nile chọọ Ya.”—Abụ Ọma 119:1, 2.

2. Njikọ dị aṅaa ka ihe ncheta Chineke na obi ụtọ nwere?

2 Anyị “na-ejegharị n’iwu Jehova” site n’inweta ezi ihe ọmụma banyere Okwu ya nakwa site n’itinye ya n’ọrụ ná ndụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ihe ncheta dị anyị mkpa. Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ihe ncheta” na-egosi na Chineke na-echetara anyị iwu, iwu nchịkwa, na ntụziaka ya dị iche iche. (Matiu 10:18-20) Anyị ga-anọgide na-enwe obi ụtọ nanị ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-edebe ihe ncheta ndị dị otú ahụ, n’ihi na ha na-enyere anyị aka izere ịdaba n’ọnyà ime mmụọ bụ́ ndị na-akpata ọdachi na iru újú.

Rapara n’Ihe Ncheta Jehova

3. N’ịdabere n’Abụ Ọma 119:60, 61, obi ike dị aṅaa ka anyị nwere?

3 Ihe ncheta Chineke dị oké ọnụ ahịa nye ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Abịara m ọsọ ọsọ, ọ gbagwojughịkwa m anya, idebe ihe nile I nyere n’iwu. Ụdọ nile nke ndị na-emebi iwu ehikọwo m gburugburu; ma echezọghị m iwu Gị.” (Abụ Ọma 119:60, 61) Ihe ncheta Jehova na-enyere anyị aka ịtachi obi ná mkpagbu n’ihi na anyị na-enwe obi ike na Nna anyị nke eluigwe pụrụ igbubi ụdọ nke ihe mgbochi ndị ndị iro kere anyị gburugburu. Mgbe oge ya ruru, ọ na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ihe mgbochi ndị dị otú ahụ ka anyị wee nwee ike ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ.—Mak 13:10.

4. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeghachi omume n’ebe ihe ncheta Chineke dị?

4 Mgbe ụfọdụ, ihe ncheta Jehova na-agbazi anyị. Ka anyị na-enwe ekele mgbe nile maka mgbazi dị otú ahụ, ọbụna dị ka ọbụ abụ ahụ nwere. O ji ekpere gwa Chineke, sị: “Ihe [ncheta] Gị nile bụ ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu . . . [Ahụwo m ihe ncheta] Gị nile n’anya.” (Abụ Ọma 119:24, 119) Anyị nwere ihe ncheta Chineke karịa otú ọbụ abụ ahụ nwere. Ọtụtụ narị okwu ndị e si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru hota n’Akwụkwọ Nsọ Grik na-echetara anyị ọ bụghị nanị ntụziaka Jehova nyere ndị ya n’okpuru Iwu ahụ kamakwa nzube ya dị iche iche n’ebe ọgbakọ ndị Kraịst dị. Mgbe Chineke hụtara ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị bụ́ ichetara anyị ihe ndị metụtara iwu ya, anyị na-enwe ekele maka ntụziaka dị otú ahụ. Sitekwa ‘n’ịrapara n’ahụ ihe ncheta nile nke Jehova,’ anyị na-ezere ihe ụrà nke mmehie bụ́ ndị na-adịghị atọ Onye Okike anyị ụtọ ma na-anapụ anyị obi ụtọ.—Abụ Ọma 119:31.

5. Olee otú anyị pụrụ isi bịa hụ ihe ncheta Jehova n’anya nke ukwuu?

5 Ruo ókè ha aṅaa ka anyị kwesịrị ịhụ ihe ncheta Jehova n’anya? “Mkpụrụ obi m edebewo ihe [ncheta] Gị nile; ana m ahụkwa ha n’anya nke ukwuu,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Abụ Ọma 119:167, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Anyị ga-abịa hụ ihe ncheta Jehova n’anya nke ukwuu ma ọ bụrụ na anyị elee ha anya ma nakwere ha dị ka ndụmọdụ sitere n’aka Nna nke na-eche banyere anyị n’ezie. (1 Pita 5:6, 7) Ihe ncheta ya dị anyị mkpa, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha dị ga-amụbakwa ka anyị na-ahụ otú ha si abara anyị uru.

Ihe Mere Ihe Ncheta Chineke Ji Dị Anyị Mkpa

6. Gịnị bụ otu ihe mere ihe ncheta Jehova ji dị anyị mkpa, gịnịkwa ga-enyere anyị aka icheta ha?

6 Otu ihe mere ihe ncheta Jehova ji dị anyị mkpa bụ na anyị na-echezọ ihe. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “N’ozuzu, ndị mmadụ na-echezọkwu ihe ka oge na-aga. . . . Ikekwe i nwewo ahụmahụ nke echetalighị aha ma ọ bụ ihe ọmụma ọzọ ọ fọrọ nke nta ka i kwuo. . . . A na-akpọ nchezọ ihe dị otú ahụ nke na-adịru nwa oge, bụ́ nke na-eme ugboro ugboro, ihe ịgbapụ mmadụ n’uche. Ndị ọkà mmụta sayensị ji ya atụnyere ịnwa ịchọta ihe a na-amaghị ebe e dewere ya n’ime ụlọ a kwasasịrị ngwongwo. . . . Ụzọ dị mma isi jide n’aka na ị ga-echeta otu ihe ọmụma bụ ịmụ ya ogologo oge mgbe i chesịrị na ị marawo ya nnọọ nke ọma.” Iji ịdị uchu na-amụ ihe na ikwughachi ihe ugboro ugboro ga-enyere anyị aka ịdị na-echeta ihe ncheta Chineke ma na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ na ha maka ọdịmma anyị.

7. N’ihi gịnị ka ihe ncheta Chineke ji dị mkpa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ?

7 Ihe ncheta Jehova dị anyị mkpa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’ihi na ihe ọjọọ eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’ihe ncheta Chineke, anyị ga-enweta ihe ọmụma a chọrọ iji zere ịbụ ndị a rabara n’ụzọ ọjọọ dị iche iche nke ụwa. “Karịa ndị nile na-ezi m ihe ka m nwere uche,” ka ọbụ abụ ahụ kwuru, “n’ihi na ihe [ncheta] Gị nile bụ ihe m na-atụgharị n’uche. Ana m aghọta ihe karịa ndị okenye, n’ihi na ihe [ncheta] Gị nile ka m chebeworo. Egbochiwo m ụkwụ m abụọ ka ha ghara ịba n’ụzọ ọjọọ ọ bụla, ka m wee debe okwu Gị.” (Abụ Ọma 119:99-101) Site n’idebe ihe ncheta Chineke, anyị ga-ezere ‘ụzọ ọjọọ ọ bụla,’ anyị ga-ezerekwa ịdị ka ìgwè nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ ndị “[e mere] ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha, e meekwa ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị.”—Ndị Efesọs 4:17-19.

8. Olee otú anyị pụrụ isi kwadebe nke ọma karị imeri ule nke okwukwe n’ụzọ na-aga nke ọma?

8 Ihe ncheta Chineke dịkwa anyị mkpa n’ihi na ha na-ewusikwu anyị ike ịtachi obi n’ọtụtụ ule ndị anyị na-enweta na “mgbe ọgwụgwụ” a. (Daniel 12:4) E wezụga ihe ncheta ndị dị otú ahụ, anyị ga-aghọ ‘ndị na-anụ na-echezọ.’ (Jemes 1:25) Ma iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ n’onwe anyị nakwa n’ọgbakọ site n’enyemaka nke mbipụta ndị sitere n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ga-enyere anyị aka iche ule nke okwukwe ihu n’ụzọ na-aga nke ọma. (Matiu 24:45-47) Ndokwa ime mmụọ ndị dị otú ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịhụ ihe anyị na-aghaghị ime iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ mgbe anyị hụtara onwe anyị n’ọnọdụ ndị na-ele ule.

Ọrụ Dị Oké Mkpa nke Nzukọ Anyị

9. Ole ndị bụ “onyinye n’ụdị mmadụ,” oleekwa otú ha si enyere ndị kwere ekwe ibe ha aka?

9 A na-egbo mkpa anyị maka ihe ncheta Chineke n’otu akụkụ ná nzukọ ndị Kraịst, bụ́ ebe ụmụnna nwoke a họpụtara ahọpụta na-enye ntụziaka. Pọl onyeozi dere na mgbe Jisọs “rịgooro n’elu, Ọ dọtara usuuu ndị a dọtara n’agha n’agha, nyekwa [onyinye n’ụdị mmadụ, NW].” Pọl gbakwụnyere, sị: [Kraịst] nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi, iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ.” (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12) Lee ekele anyị pụrụ inwe na “onyinye n’ụdị mmadụ” ndị a—ndị okenye a họpụtara ahọpụta—na-adọrọ uche anyị aga n’ihe ncheta Jehova mgbe anyị zukọtara maka ofufe!

10. Gịnị bụ isi ihe dị ná Ndị Hibru 10:24, 25?

10 Inwe ekele maka ndokwa ndị Chineke na-eme ga-akpali anyị ịnọ ya ná nzukọ ọgbakọ ise anyị na-enwe kwa izu. Pọl mesiri ike mkpa ọ dị izukọta mgbe nile. O dere, sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karịakwa otú a, n’ụzọ hà otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

11. Olee otú nke ọ bụla n’ime nzukọ ndị anyị na-enwe kwa izu si abara anyị uru?

11 Ị̀ na-aghọta ihe nzukọ anyị na-emere anyị? Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche anyị na-enwe kwa izu na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, na-enyere anyị aka ime ihe kwekọrọ n’ihe ncheta Jehova, na-ewusikwa anyị ike megide “mmụọ nke ụwa.” (1 Ndị Kọrint 2:12; Ọrụ 15:31) Ná Nzukọ Ihu Ọha, ndị ọkà okwu na-enye ntụziaka sitere n’Okwu Chineke, gụnyere ihe ncheta Jehova na “okwu nke ndụ ebighị” ndị dị ebube Jisọs kwuru. (Jọn 6:68; 7:46; Matiu 5:1–7:29) A na-emekwu ka nkà izi ihe anyị ka mma n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Nzukọ Ije Ozi bara nnọọ uru n’inyere anyị aka imeziwanye ụzọ anyị si eche ozi ọma ahụ n’ihu ndị mmadụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ná nletaghachi, n’ọmụmụ Bible ebe obibi, nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ozi anyị. Ìgwè ka nta n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-enye anyị ohere ka ukwuu ikwu okwu ndị na-agụnyekarị ihe ncheta Chineke.

12, 13. Olee otú ndị Chineke nọ n’otu ala dị n’Esia siworo gosipụta ekele maka nzukọ ndị Kraịst?

12 Ịgachi nzukọ ọgbakọ anya na-echetara anyị ihe ndị Chineke nyere n’iwu, na-enyekwa aka eme ka anyị gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ n’agbanyeghị agha, ndakpọ akụ̀ na ụba, na ule ndị ọzọ nke okwukwe anyị. Ihe dị ka ndị Kraịst 70 nọ n’otu ala dị n’Esia bụ́ ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha ma manye ibi n’oké ọhịa, chọpụtara ngwa ngwa mkpa nzukọ dị. N’ịbụ ndị kpebisiri ike ịnọgide na-ezukọta mgbe nile, ha laghachiri n’obodo ha agha kpaworo aka ọjọọ, kụpụtasịa ihe ndị fọdụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, ma wughachi ya n’oké ọhịa ahụ.

13 Mgbe ndị Jehova tachiworo obi ruo ọtụtụ afọ nke ịlụ agha n’akụkụ ọzọ nke otu mba ahụ, ha ka na-eji ịnụ ọkụ n’obi eje ozi. A jụrụ otu n’ime ndị okenye nọ n’ógbè ahụ, sị: “Gịnị bụworo ihe enyemaka kasịnụ n’ijikọta ụmụnna ahụ ọnụ?” Gịnị ka ọ zara? “Ruo afọ 19, anyị ahapụtụbeghị otu nzukọ. Mgbe ụfọdụ, n’ihi ịtụ bọmbụ ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ, ụfọdụ n’ime ụmụnna ahụ apụghị ịbịa n’ebe ahụ a na-enwe nzukọ, ma anyị akagbutụbeghị nzukọ.” Ezigbo ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a ghọtara n’ezie ịdị mkpa nke ‘ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe ha.’

14. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’omume e ji mara Ana meworo agadi?

14 Ana bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke dị afọ 84 ‘apụghị n’ụlọ Chineke.’ N’ihi ya, ọ nọ ya mgbe e kutere nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs n’ebe ahụ n’oge na-adịghị anya mgbe a mụsịrị ya. (Luk 2:36-38) Ị̀ na-ekpebisi ike ịghara ịhapụ nzukọ? Ị̀ na-agbalị ike gị nile iji nọrọ ya ná nnọkọ nile nke mgbakọ anyị dị iche iche? Ntụziaka ime mmụọ bara uru a na-enweta ná mgbakọ ndị a na-enye anyị ihe àmà doro anya na Nna anyị nke eluigwe na-elekọta ndị ya. (Aịsaịa 40:11) Oge ndị dị otú ahụ na-akwalitekwa ọṅụ, ọnụnọ anyị nọ ya na-egosipụtakwa ekele anyị nwere maka ihe ncheta Jehova.—Nehemaịa 8:5-8, 12.

Ndị Ihe Ncheta Jehova Mere Ka Ha Pụọ Iche

15, 16. Olee otú idebe ihe ncheta Jehova si emetụta àgwà anyị?

15 Idebe ihe ncheta Chineke na-enye aka ime ka anyị pụọ iche n’ajọ ụwa a. Dị ka ihe atụ, ige ntị n’ihe ncheta Chineke na-egbochi anyị itinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ. (Deuterọnọmi 5:18; Ilu 6:29-35; Ndị Hibru 13:4) A pụrụ ịbịada ọnwụnwa nke ịgha ụgha, emeghị ihe n’eziokwu, ma ọ bụ izu ohi n’ụzọ na-aga nke ọma site n’ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ncheta Chineke. (Ọpụpụ 20:15, 16; Levitikọs 19:11; Ilu 30:7-9; Ndị Efesọs 4:25, 28; Ndị Hibru 13:18) Idebe ihe ncheta Jehova na-egbochikwa anyị ịbọ ọ́bọ̀, ibu iwe n’obi, ma ọ bụ ikwutọ mmadụ ọ bụla.—Levitikọs 19:16, 18; Abụ Ọma 15:1, 3.

16 Site n’ịṅa ntị n’ihe ncheta Chineke, anyị na-anọgide na-abụ ndị e doro nsọ, ma ọ bụ ndị e mere ka ha pụọ iche, maka ozi ya. Leekwa ka o si dị mkpa ịbụ ndị nọpụrụ iche n’ụwa a! N’ekpere Jisọs kpekuru Jehova n’anyasị ikpeazụ nke ndụ elu ala ya, ọ rịọrọ arịrịọ a n’isi ụmụazụ ya: “Mụ onwe m enyewo ha okwu Gị; ụwa kpọkwara ha asị, n’ihi na ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa. Ekpeghị m ekpere ka I wepụ ha n’ụwa, kama ka I debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ. Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa. Were eziokwu doo ha nsọ: okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:14-17) Ka anyị nọgide na-eji Okwu Chineke akpọrọ ihe, bụ́ nke na-eme ka anyị pụọ iche maka ozi ya dị nsọ.

17. Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị eleghara ihe ncheta Chineke anya, ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

17 Dị ka ndị ohu Jehova, anyị chọrọ ịnọgide na-abụ ndị a na-anakwere maka ozi ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị eleghara ihe ncheta Chineke anya, mmụọ nke ụwa a, bụ́ nke a na-akwalite n’ihe ka ọtụtụ n’okwu ya, akwụkwọ ọgụgụ ya, ntụrụndụ ya, nakwa n’omume ya, pụrụ irikpu anyị. N’ezie anyị adịghịkwa achọ ịghọ ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya—n’ịkpọtụ nanị ole na ole n’ime àgwà nke ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, aha. (2 Timoti 3:1-5) Ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’ime ime mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a, ka anyị nọgide na-ekpe ekpere maka enyemaka Chineke ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-edebe ihe ncheta Jehova ma si otú a ‘na-elezi anya dị ka okwu ya si dị.’—Abụ Ọma 119:9.

18. Idebe ihe ncheta Chineke ga-eme ka anyị were nzọụkwụ ndị dị aṅaa ziri ezi?

18 Ihe ncheta Jehova na-eme ihe karịrị ime ka anyị mara ihe ndị anyị na-agaghị eme. Idebe ihe ncheta ya ga-eme ka anyị na-eme omume ziri ezi, na-akpali anyị ịtụkwasị Jehova obi kpam kpam na iji obi, mkpụrụ obi, uche, na ike anyị dum hụ ya n’anya. (Deuterọnọmi 6:5; Abụ Ọma 4:5; Ilu 3:5, 6; Matiu 22:37; Mak 12:30) Ihe ncheta Chineke na-akwalikwa anyị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. (Levitikọs 19:18; Matiu 22:39) Karịsịa, anyị na-egosipụta na anyị hụrụ Chineke na onye agbata obi anyị n’anya site n’ime uche Chineke na iso ndị ọzọ na-ekerịta “ihe ọmụma Chineke” bụ́ nke na-enye ndụ.—Ilu 2:1-5.

Idebe Ihe Ncheta Jehova Bụ Ndụ!

19. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ndị ọzọ na idebe ihe ncheta Jehova bụ ihe kwere omume ma baa uru?

19 Ọ bụrụ na anyị edebe ihe ncheta Jehova ma nyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ, anyị ga-azọpụta onwe anyị, zọpụtakwa ndị na-anụ olu anyị. (1 Timoti 4:16) Olee otú anyị pụrụ isi gosi ndị ọzọ na ịṅa ntị n’ihe ncheta Jehova bụ n’ezie ihe kwere omume ma baa uru? Ọ bụ site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ anyị. Ndị “e doro ịnata ndụ ebighị ebi” ga-esi otú ahụ nwee ihe akaebe na-egosi na ụzọ e setịpụrụ n’Okwu Chineke bụ n’ezie nke kasị mma ịgbaso. (Ọrụ 13:48) Ha ga-ahụkwa na ‘Chineke nọ n’etiti anyị,’ a ga-akpalikwa ha isonyere anyị n’ife Eze Onyenwe anyị Jehova.—1 Ndị Kọrint 14:24, 25.

20, 21. Ihe ncheta Chineke na mmụọ ya ga-eme ka anyị nwee ike ime gịnị?

20 Site n’ịnọgide na-amụ Akwụkwọ Nsọ, na-etinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ, ma na-erite uru zuru ezu ná ndokwa ime mmụọ ndị Jehova na-eme, anyị ga-abịa hụ ihe ncheta ya n’anya nke ukwuu. Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’ihe ncheta ndị a, ha ga-enyere anyị aka iyikwasị “mmadụ ọhụrụ [anyị], nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.” (Ndị Efesọs 4:20-24) Ihe ncheta Jehova na mmụọ nsọ ya ga-eme ka anyị nwee ike ịgosipụta ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè—àgwà ndị na-eyitụghị àgwà ndị e ji mara ụwa nke na-atọgbọ n’aka Setan! (Ndị Galetia 5:22, 23; 1 Jọn 5:19) Ya mere, anyị pụrụ inwe ekele mgbe e chetaara anyị ihe ndị Jehova na-achọ n’aka anyị site n’ọmụmụ Bible onwe onye anyị, site n’aka ndị okenye a họpụtara ahọpụta, site ná nzukọ, nakwa ná mgbakọ anyị dị iche iche.

21 Ebe ọ bụ na anyị na-edebe ihe ncheta Jehova, anyị na-aṅụrị ọṅụ ọbụna mgbe anyị na-ata ahụhụ n’ihi ezi omume. (Luk 6:22, 23) Anyị na-elegara Chineke anya ịzọpụta anyị n’ọnọdụ ndị kasị eyi egwu. Nke ahụ dị mkpa ugbu a karịsịa bụ́ mgbe a na achịkọta mba nile maka “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile” na Ha-Magedọn.—Mkpughe 16:14-16.

22. Gịnị kwesịri ịbụ mkpebi anyị banyere ihe ncheta Jehova?

22 Ọ bụrụ na anyị ga-anata onyinye ahụ na-erughịrị anyị bụ́ ndụ ebighị ebi, anyị aghaghị ịhụ ihe ncheta Jehova n’anya nke ukwuu ma jiri obi anyị dum na-etinye ha n’ọrụ. Ya mere, ka anyị nwee mmụọ nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Ihe [ncheta] Gị nile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi: mee ka m ghọta ihe, m ga-adịkwa ndụ.” (Abụ Ọma 119:144) Ka anyị na-egosipụtakwa mkpebi ahụ siri ike a na-ahụ n’okwu ndị a ọbụ abụ ahụ kwuru: “Akpọkuwo m [Gị Jehova]; zọpụta m, m ga-edebekwa ihe [ncheta] Gị nile.” (Abụ Ọma 119:146) Ee, site n’okwu na omume, ka anyị na-egosipụta na anyị hụrụ ihe ncheta Jehova n’anya nke ukwuu n’ezie.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú ọbụ abụ ahụ si lee ihe ncheta Jehova anya?

• N’ihi gịnị ka ihe ncheta Chineke ji dị anyị mkpa?

• Òkè dị aṅaa ka nzukọ anyị dị iche iche na-ekere n’ihe banyere ihe ncheta Chineke?

• Olee otú ihe ncheta Jehova si eme ka anyị pụọ iche n’ụwa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọbụ ọbụ ahụ hụrụ ihe ncheta Jehova n’anya nke ukwuu

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

N’ịgbaso ihe nlereanya Ana, ị̀ na-ekpebisi ike ịghara ịhapụ nzukọ?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ịṅa ntị n’ihe ncheta Jehova na-eme ka anyị pụọ iche dị ka ndị dị ọcha na ndị a na-anakwere maka ozi ya