Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Meta Ndị Enyi

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Meta Ndị Enyi

Ụzọ Ị Pụrụ Isi Meta Ndị Enyi

“MMADỤ INWE OTU ENYI NÁ NDỤ YA NILE BỤ IHE DỊ UKWUU; ABỤỌ DỊ ỌTỤTỤ; O SIRI IKE KA INWE ATỌ KWE OMUME.”—Henry Brooks Adams.

OKWU dị otú ahụ na-egosi na ezi ndị enyi dị ụkọ. Mgbe mgbe, a na-anụ okwu ndị dị ka “Enweghị m onye m ga-echigharịkwuru,” “Apụghị m ịtụkwasị onye ọ bụla obi,” ma ọ bụ “Nkịta m bụ ezi enyi m” n’ọnụ ndị owu na-amasi ike bụ́ ndị na-achọ ndị enyi.

Imeta na ịnọgide na-enwe enyi na-adịgide adịgide bụ ihe ịma aka. Otu nnyocha e mere ndị ahịa kpughere na “na United States, pasent 25 nke ndị toworo eto na-enwe ‘owu ọmụma na-adịghị ala ala,’ . . . ọkara nke ndị mmadụ na France kwa, enwetụdịghị ndị enyi.” Mmụba nke òtù ndị nwoke na nwanyị na-eme mkpapụ na ebe ndị a na-ezirịta ozi na kọmputa nakwa oké mkpọsa nke ndị na-achọ ndị enyi na-eme n’akwụkwọ akụkọ, na-egosi na ndị mmadụ na-achọsi ike ka ha na ibe ha na-akpakọrịta.

Ọ bụghị nanị ọnọdụ uche mmadụ ka owu ọmụma na-emetụta kamakwa ahụ ike ya, ka Dr. David Weeks, bụ́ ọkà n’ihe banyere akparamàgwà, uche, ụbụrụ, na akwara, na-azọrọ. “Enwere m ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọrịa nwere oké ụjọ nke nchegbu kpatara nakwa ịda mbà n’obi bụ́ ndị a pụrụ ịkọwa dị ka ndị owu na-ama. E nwere ihe ndị jikọrọ isi ike nke ịda mbà n’obi na isi ike nke owu ọmụma.”

Ịgba alụkwaghịm na ndakpọ nke ndụ ezinụlọ na-akpatakwuru ọtụtụ mmadụ ibi ndụ nanị ha. Otu nnyocha e mere na Britain kwubiri na ka ọ na-erule ná mmalite nke narị afọ nke 21, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ga-eru pasent 30 nke ndị bi ná mba ahụ ga-anọ n’ezinụlọ nanị otu onye nọ.

Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ buru amụma na àgwà nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ga-ejupụta ebe nile na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) O yiri ka ọtụtụ ndị hà ka enwe mmasị n’ihe onwunwe, dị ka ụlọ ma ọ bụ ụgbọala, ma ọ bụ n’ọrụ ha karịa n’iso ụmụ mmadụ ndị ọzọ na-akpakọrịta. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Anthony Storr na-ekwu, sị: “Kama ndụ ha ihiwe isi n’ebe di ma ọ bụ nwunye na ụmụ ha nọ, ọ na-adabere n’ebe ọrụ ha.”

EZI NDỊ ENYI DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA

Otú ndụ gị ga-adị na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ụdị ndị enyi i nwere. Mgbe mgbe, ndị na-adị ndụ maka ọdịmma onwe ha nanị adịghị enwe obi ụtọ n’ihi na ha enweghị enyi ha ga-eso na-ekerịta ihe ha ma ọ bụ echiche ha. Okwu Jisọs Kraịst bụ eziokwu: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) N’ikwughachi eziokwu a, onye England na-ede uri, bụ́ George Byron dere, sị: “Ndị nile na-aghaghị inweta ọṅụ, aghaghị isoro ndị ọzọ kerịta ya.”

Ònye bụ enyi? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa enyi dị ka “onye ya na onye ọzọ na-akpachi anya site ná mmetụta ịhụnanya ma ọ bụ nkwanye ùgwù.” Ezi enyi pụrụ inye aka iduzi echiche gị gaa n’ihe ọma. Ọ pụrụ ịgba gị ume na iwuli gị elu n’oge mkpa. Ọbụna ọ pụrụ isonyere gị n’iru újú gị. Eze Solomọn kwuru, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” (Ilu 17:17) Ọ bụ ezie na mgbe mgbe ihe onwunwe adịghịzi aba uru ka oge na-aga, ezi ọbụbụenyi na-eto ma na-enwe ọganihu ka oge na-aga.

Akwụkwọ Nsọ na-agba ndị Kraịst ume ‘ime ka obi ha dị obodobo’ n’ịhụnanya ha. (2 Ndị Kọrint 6:13) Amamihe dị n’ịkpakwuru ndị ọzọ. N’Eklisiastis 11:1, 2, anyị na-agụ, sị: “Zipụ nri gị n’elu mmiri: n’ihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-ahụ ya. Nye asaa òkè, ee, nyekwa asatọ; n’ihi na ị maghị ihe ọjọọ dị aṅaa ga-adị n’ụwa.” Olee otú ụkpụrụ a si emetụta ọbụbụenyi? Ọ bụrụ na i sorowo ọtụtụ ndị mee enyi, ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịgbatara gị ọsọ enyemaka mgbe i nwere ihe isi ike.

Ezi ndị enyi bụ ihe nchebe nye gị n’ụzọ ọzọ. “Ihe kwesịrị ntụkwasị obi ka ogbugbu mma nile nke onye na-ahụ gị n’anya bụ,” ka Ilu 27:6 na-ekwu. Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ pụrụ inye gị otuto, nanị ezi ndị enyi ga-echebara gị echiche ruo n’ókè nke ịgwa gị ebe ị na-emezighị nnọọ emezi ma nye gị ndụmọdụ ezi uche dị na ya n’ụzọ ịhụnanya.—Ilu 28:23.

Ezigbo ndị enyi so n’ime onyinye ndị dị ụkọ bụ́ ndị pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ebe ị nọ. N’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 10, anyị na-agụ banyere otu ihe mere ná ndụ otu onye ọchịagha Rom bụ́ Kọniliọs, bụ́ onye mmụọ ozi gwara na a nụwo ekpere ya. N’ịtụ anya nleta Pita onyeozi, Kọniliọs “kpọkọkwararịị ndị ikwu ya na ndị enyi ya ọ hụrụ n’anya.” Ezi ndị enyi Kọniliọs ahụ so n’ime ndị Jentaịl mbụ a na-ebighị ugwu nabatara ozi ọma ahụ ma bụrụ ndị e jiri mmụọ nsọ tee mmanụ, na-enwe atụmanya nke iso Kraịst chịa achịa n’Alaeze Chineke. Lee ngọzi nke a bụụrụ ndị enyi Kọniliọs ọ hụrụ n’anya!—Ọrụ 10:24, 44.

Otú ọ dị, olee otú ị pụrụ isi malite imeta ndị enyi? Bible, bụ́ akwụkwọ nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere ọbụbụenyi, ji ndụmọdụ ndị dị irè na-aza ajụjụ ahụ. (Lee igbe dị n’okpuru.)

EBE Ị PỤRỤ IMETA EZI NDỊ ENYI

Ebe kasị mma isi meta ezi ndị enyi bụ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Nke mbụ, ị pụrụ iji ohere dịnụ mee ihe iji soro Jehova, bụ́ Onye Okike gị na Nna gị nke eluigwe, nakwa Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Mgbapụta gị, mee enyi. “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karị[rị] nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya,” ka Jisọs, bụ́ onye na-akpọ gị òkù ịbụ enyi ya, kwuru. (Jọn 15:13, 15) Site n’iso Jehova na Jisọs Kraịst mee enyi, ị pụrụ ijide n’aka na ha ‘ga-akpọbata gị n’ụlọikwuu ebighị ebi.’ Ee, iso Jehova na Jisọs mee enyi na-eweta ndụ ebighị ebi.—Luk 16:9; Jọn 17:3.

Olee otú ị pụru isi nweta ọbụbụenyi ịhụnanya ha? E depụtara ihe ndị a chọrọ n’aka gị iji bụrụ onye ọbịa n’ụlọikwuu Jehova dị ka otu n’ime ndị enyi ya n’Abụ Ọma isi nke 15. Sapeta ya na Bible, gụọkwa amaokwu ise nke abụ ọma ahụ. Tụkwasị na nke a, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu emee ihe Mụ onwe m na-enye unu n’iwu.”—Jọn 15:14.

Ee, site n’iji ịdị uchu na-amụ ma na-etinye ntụziaka sitere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ọrụ, ị na-egosipụta na ị chọrọ ịbụ enyi Jehova na Jisọs. Iji mezuo nke a, ị ghaghị ịdị na-agachikwa nzukọ ndị Kraịst anya, bụ́ ebe a na-enye ihe ọmụma banyere Jehova Chineke. Jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ege Jehova ntị, ị ga-abịarukwa ya na Ọkpara ya nso.

Ná nzukọ ndị ahụ, ị pụkwara ịmara ndị mmadụ bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, na imeru ihe n’ókè—ná ndụ ha. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ọ bụrụ n’ezie na ị chọrọ imeta ndị enyi ma kwụsị inwe owu ọmụma, na-aga nzukọ ndị Kraịst kwa izu. Ime otú ahụ ga-eme ka ị nọrọ n’ebe kwesịrị ekwesị n’oge kwesịrị ekwesị iji soro ndị Chineke gọziri agọzi malite ọbụbụenyi na-adịgide adịgide.

NDỊ ENYI NA-ADỊRU MGBE EBIGHỊ EBI

Ezi ọbụbụenyi bụ onyinye dị ebube sitere n’aka Jehova Chineke. Ọ dị n’àgwà ya onwe ya. N’ihi àgwà ịhụnanya na mmesapụ aka ya, o jiriwo ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi bụ́ ndị ị pụrụ iso malite ọbụbụenyi, mejupụta ụwa. Soro ndị Kraịst ibe gị na-akpakọ. Na-agba ha ume. Soro ha na-arụ ọrụ n’ozi. Soro ha na-ekpe ekpere, na-etinyekwa ha n’ekpere mgbe nile. Mgbe ahụ ọ ga-abụ Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ka ị na-eṅomi.

Ọbụbụenyi bụ onyinye onye ọ bụla nwere ike inye na inweta. N’ọdịnihu dị nso, ị ga-enwe ohere ị ga-eji mụbaa ndị enyi gị. Ị pụrụ isoro nde ndị dị ndụ ugbu a, nakwa ndị nke ọgbọ ndị gara aga bụ́ ndị nọ n’ụra ọnwụ, na-echerekwa mbilite n’ọnwụ mgbe “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ,” mee enyi. (Mkpughe 21:4; Jọn 5:28, 29) Gbalịa ugbu a inwe omume enyi, sorokwa ndị hụrụ Jehova n’anya na-eme enyi. Gbalịa iso Jehova Chineke na Jisọs Kraịst mee enyi site n’ige ntị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Mgbe ahụ, owu agaghị ama gị ọzọ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22, 23]

NZỌỤKWỤ ISII NDỊ NA-EDUGA N’ỌBỤBỤENYI NA-ADỊGIDE ADỊGIDE

1. BỤRỤ ENYI. A kpọrọ Abraham “enyi nke Chineke” n’ihi okwukwe ya na-adịghị ada ada. (Jemes 2:23) Ma e nwekwuru ihe ọzọ kpatara ya. Bible na-ekwu na Abraham gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ. (2 Ihe E Mere 20:7) O butere ụzọ ma mee ka Jehova mara mmetụta ya. (Jenesis 18:20-33) Ee, ọ chọrọ gị ibute ụzọ iji gosipụta ọbụbụenyi gị. Jisọs kwuru, sị: “Na-enyenụ, a ga-enyekwa unu.” (Luk 6:38) Okwu agbamume ma ọ bụ enyemaka pụrụ ịbụ mkpụrụ nke ọbụbụenyi bụ́ ịgba ga-esi na ya epulite. Onye America na-ede edemede bụ́ Ralph Waldo Emerson kwuru n’otu oge sị: “Nanị ụzọ e si emeta enyi bụ ịbụ enyi.”

2. WEPỤTA OGE IJI ZỤLITE ỌBỤBỤENYI. Ọ na-agụ ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ agụụ inweta abamuru nke ọbụbụenyi. Ma, ha na-eji nnọọ ọrụ n’aka itinye oge ndị ọ chọrọ. Ndị Rom 12:15, 16 na-agba anyị ume isoro ndị ọzọ nwerịtaa obi ụtọ ha na ihe ịga nke ọma ha, iru újú ha na ndakpọ olileanya ha. Ọ na-ekwu, sị: “Na-esonụ ndị na-aṅụrị n’ịṅụrị ọṅụ; na-esonụ ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá. Na-atụkwasịnụ uche n’otu ihe ahụ n’ebe ibe unu nọ.” N’agbanyeghị na Jisọs Kraịst bụ nwoke na-eji ọrụ n’aka mgbe nile, o wepụtara oge mgbe nile iji soro ndị enyi ya nọkọọ. (Mak 6:31-34) Cheta na ọbụbụenyi, dị ka okooko osisi, chọrọ ka a na-agba ya mmiri ma na-azụlite ya ka o wee maa ifuru—nke ahụ na-ewekwa oge.

3. NA-EGE NTỊ MGBE NDỊ ỌZỌ NA-EKWU OKWU. Ọ na-adịkarịrị ndị na-ege ntị nke ọma mfe imeta enyi. “Ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu,” ka Jemes onye na-eso ụzọ na-ekwu. (Jemes 1:19) Mgbe gị na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu, gosi mmasị onwe onye ná mmetụta ha. Gbaa ha ume ikwu banyere onwe ha. Bute ụzọ n’ịkwanyere ha ùgwù. (Ndị Rom 12:10) Mgbe ahụ, ha ga-achọ ka gị na ha na-anọ. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na nanị gị ana-ekwu okwu ná mkparịta ụka ọ bụla, ma ọ bụ ị na-eme ka a hụ gị mgbe nile, ọ ga-esiri gị ike ịhụ onye ga-adị njikere ige gị ntị ma ọ bụ onye ga-achọ ịma ihe bụ́ mmetụta gị na mkpa gị.

4. NA-AGBAGHARA. Jisọs gwara Pita n’otu oge ka ọ dị njikere ịdị na-agbaghara “ruo [ugboro iri asaa na asaa].” (Matiu 18:21, 22) Ezi enyi na-adị ngwa ileghara ụmụ irighiri mmejọ anya. Iji maa atụ: Ụfọdụ ndị adịghị enwe mmasị ịra gova n’ihi obere mkpụrụ ha. Otú ọ dị, ndị na-enwe mmasị ịra mkpụrụ osisi a adịghị arịba mkpụrụ ndị ahụ ama. A na-ahụ ezi ndị enyi n’anya maka ezi àgwà ha; a na-eleghara ụmụ irighiri mmejọ ha anya. Pọl gbara anyị ume, sị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ndị mụtara ịdị na-agbaghara na-anọgide na-enwe ndị enyi ha.

5. NA-AKWANYERE OGE NDỊ ỌZỌ CHỌRỌ ỊNỌRỌ NANỊ HA ÙGWÙ. Onye ọ bụla na-achọ ịnọrọ nanị ya mgbe ụfọdụ, gụnyere ndị enyi gị. Ilu 25:17 na-ekwu n’ụzọ amamihe, sị: “Mee ka ụkwụ gị kọọ ụkọ n’ụlọ mmadụ ibe gị; ka ihe gị wee ghara iju ya afọ, o wee kpọọ gị asị.” N’ihi ya, jiri ezi uche na-eme ihe banyere ugboro ole ị na-eleta ndị enyi gị na ogologo oge ị na-anọru. Zere ime ka ha bụrụ enyi nanị gị, nke pụrụ iduga n’ekworo. Jiri ezi uche mee ihe mgbe ị na-ekwupụta ihe ndị dị gị mma na echiche gị n’okwu. Nke a na-eme ka a na-enwe ọbụbụenyi na-enye ume ọhụrụ na nke a na-anabata.

6. NA-EMESAPỤ AKA. A na-amalite ọbụbụenyi site ná mmesapụ aka. Ndụmọdụ Pọl onyeozi bụ ka ‘anyị bụrụ ndị kwadebeworo ime ka ndị ọzọ keta ihe anyị nwere, ka anyị bụrụ ndị kwere ka ndị ọzọ soro anyị nwekọọ ihe.’ (1 Timoti 6:18) Dị ka ihe atụ, na-agwa ndị ọzọ okwu agbamume. (Ilu 11:25) Na-adị ngwa n’ịja ndị ọzọ mma site n’ezi obi nakwa n’ikwu okwu na-ewuli elu. Mgbe i gosipụtara ezi mmasị n’ọdịmma ndị ọzọ, ha ga-abịa gị nso. Na-eche banyere ihe ị pụrụ imere ha kama ịdị na-elekwasị anya n’ihe ha pụrụ imere gị.