Bible—Akwụkwọ Ọgụgụ Maka Ịdị Ndụ
Bible—Akwụkwọ Ọgụgụ Maka Ịdị Ndụ
“OKWU Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ . . . bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Nkọwa a nke ihe Okwu Chineke pụrụ ịrụzu na-egosipụta Bible n’ezie dị ka ihe karịrị nanị ezigbo akwụkwọ.
“Ozi o bu dị ndụ anyị oké mkpa dị nnọọ ka ume ọzọ anyị na-aga iku dị ya,” ka otu onye edemede banyere okpukpe kwuru ná nkenke. Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Mgbe ị tụlere ihe banyere ọchịchọ anyị siri ike na mkpa anyị nwere taa maka ọgwụgwọ ma jiri echiche ahụ na-agụ Bible, ọ na-arụpụta ihe ndị dị ịtụnanya.” Dị ka oriọna nke na-enwu gbaa, Bible na-eme ka a ghọta ọtụtụ ihe ndị dị mgbagwoju anya na nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ a na-adị n’oge a.—Abụ Ọma 119:105.
N’ezie, amamihe e kwupụtara na Bible nwere ikike nke ịkpụzi echiche anyị, inyere anyị aka idozi nsogbu dị iche iche, ime ka ndụ anyị ka mma, na ime ka anyị nwee nkà iji nagide ọnọdụ ndị anyị na-enweghị ike ịgbanwe. Nke kasị mkpa, Bible na-enyere anyị aka ịbịa mara Chineke ma hụ ya n’anya.
Akwụkwọ Na-eme Ka E Nwee Nzube
Onye chepụtara Bible, bụ́ Jehova Chineke, ‘maara ụzọ anyị nile nke ọma.’ Ọ maara ihe dị ukwuu banyere mkpa anụ ahụ, nke mmetụta uche, na nke ime mmụọ anyị karịa ka ọbụna anyị onwe anyị maara. (Abụ Ọma 139:1-3) N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ na-akpa ókè ndị doro anya maka akparamàgwà ụmụ mmadụ. (Maịka 6:8) Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịchọ ịghọta ókè na ntụzi ndị ahụ ma mụta ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha. Obi ụtọ na-adịrị mmadụ ahụ nke “[ọ bụ] n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị,” ka ọbụ abụ ahụ na-ekwu. “Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:1-3) N’ezie, anyị kwesịrị inyocha atụmanya dị otú ahụ.
Maurice, bụ́ onye nkụzi lara ezumike nká, anọwo na-ekwere na Bible bara uru ụfọdụ n’akụkọ ihe mere eme nakwa dị ka akwụkwọ ọgụgụ. Ma, o nwere obi abụọ ma è dekwara ya n’ike mmụọ nsọ. Mgbe o gesịrị ntị ná nkọwa e nyere banyere ihe mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ Okwu ya e dere ede, Maurice nyochara amụma dị iche iche nke Bible. Dị ka nwa okorobịa, ọ mụwo akụkọ ihe mere eme nke oge ochie, nkà edemede, sayensị, na
nkà mmụta ọdịdị mbara ala. O kwetara na ya bụ onye dị akọ n’anya ya onwe ya nke na ya ahụghị ọtụtụ ihe atụ ndị na-akwado ịbụ eziokwu nke Bible. “Emikpuru m onwe m ná nchụso na-enweghị isi nke inweta ahụ efe, akụ̀ na ụba, na ihe ụtọ nke ndụ. N’ụzọ dị mwute, anọgidere m na-abụ onye na-amaghị nke a na-akọ na onye na-amataghị banyere ịdị mma na ịbụ eziokwu nke akwụkwọ kasị ukwuu e detụrụla.”Ugbu a, ka ọ dị afọ 70 na ụma, Maurice, n’izo aka n’ihe ndekọ banyere mpụta Jisọs pụtara n’ihu Tọmas onyeozi, ji obi ekele na-ekwu, sị: “E duziwo aka m gaa ‘n’ọnya ahụ na-agba ọbara’ bụ́ nke ga-ewepụ ruo mgbe ebighị ebi obi abụọ nile m nwere ma Bible ọ̀ bụkwa eziokwu.” (Jọn 20:24-29) Dị ka Pọl onyeozi kwuru n’ụzọ ziri ezi, Bible na-ekpughe izu nile nke obi, ọ na-emekwa ka ndụ nwee nzube. N’ezie, ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ maka ịdị ndụ.
Ime Ka Ndụ Nwere Nsogbu Kwụsie Ike
Bible na-enyekwa ndụmọdụ na-enyere ndị mmadụ aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị ha na-akpa. Daniel meriri àgwà na-adịghị ọcha nke ise siga, kwụsịkwa àgwà nke ịga oriri oké mkpọtụ na aṅụrụma. (Ndị Rom 13:13; 2 Ndị Kọrint 7:1; Ndị Galetia 5:19-21) N’ezie, ịkwụsị àgwà ndị dị otú ahụ na iyikwasị “mmadụ ọhụrụ ahụ” na-ewe mgbalị siri ike. (Ndị Efesọs 4:22-24) “Ọ bụ ihe ịma aka,” ka Daniel na-ekwu, “n’ihi na anyị ezughị nnọọ okè.” Ka o sina dị, o nwere ihe ịga nke ọma. Ugbu a Daniel na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, ọ na-emekwa ka ọ nọrọ Jehova nso.
Ka ọ nọ na-etolite, Daniel nwere nkwanye ùgwù miri emi maka Bible mgbe nile—n’agbanyeghị na ọ gụtụbeghị ya—o kpekukwara Chineke ekpere kwa abalị. Ma, ọ dị ihe kọrọ ya. O nwetaghị obi ụtọ. Oge oké mgbanwe bịara mgbe ọ hụrụ aha Chineke n’ime Bible na nke mbụ ya. (Ọpụpụ 6:3; Abụ Ọma 83:18) Mgbe nke ahụ gasịrị, o ji aha ahụ bụ́ Jehova kpee ekpere, ekpere ya ghọkwuru nke nwere onye a na-ekpegara ya. “Jehova ghọrọ onye kasị nọrọ m nso, ọ ka bụkwa enyi m kasị nọrọ m nso.”
Tupu Daniel amụta banyere Bible, echiche o nwere banyere ọdịnihu edoghị anya. “Ọ dịghị ewe oké ọgụgụ isi iji hụ ihe na-eme n’ụwa,” ka ọ na-ekwu. “Ọ tụrụ m ụjọ, agbalịkwara m iji ọrụ n’aka iji wepụ ya n’obi m.” Mgbe ahụ, ọ mụtara na Chineke ga-ewetara mmadụ nile ikpe ziri ezi n’ụwa e mere ka ọ dị ọcha, bụ́ ebe ụmụ mmadụ na-erube isi pụrụ inwe udo na obi ụtọ na-adịru mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:10, 11; Daniel 2:44; Mkpughe 21:3, 4) Daniel nwere olileanya e ji n’aka ugbu a. Mmetụta a na-eme ka mmadụ kwụsie ike bụ́ nke sitere na Bible na-eme ka o nwee ike ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere ndụ.
Enyemaka n’Imeri Nsogbu Mmetụta Uche
George dị afọ asaa mgbe nne ya nwụrụ. Ọ tụrụ oké egwu ihi ụra n’abalị, n’amaghị ma ọ̀ ga-eteta n’echi ya. E mesịa, ọ gụrụ ihe Jisọs kwuru banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” Okwu Jisọs bụ́: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ,” metụkwara ya n’ahụ. (Jọn 5:28, 29; 11:25) Echiche ndị dị otú ahụ yiri ndị ezi uche dị na ha, ndị na-akasikwa obi. “Eziokwu a,” ka George na-ekwu, “abụghị nanị na ọ na-amasị uche kamakwa ọ na-emetụ n’obi.”
Daniel, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, tụkwara egwu. Nne ya apụghị ịzụlite ya n’onwe ya, ya mere e zigara ya ibi n’ọtụtụ ebe obibi nkuchi. Ọ na-enwekarị mmetụta nke ịbụ onye na-esoghị biri ma nwee ọchịchọ maka nchebe nke ịbụ akụkụ nke ezinụlọ na-ahụ n’anya. N’ikpeazụ, ọ chọtara ihe ọ nọ na-achọ site n’ọmụmụ Bible ya. Daniel malitere iso ọgbakọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta ma ghọọ akụkụ nke ezinụlọ
ime mmụọ, bụ́ ebe o nwetara mmetụta nke ịbụ onye a nabatara na onye ndị ọzọ hụrụ n’anya. N’ezie, Bible bara uru n’ụzọ dị irè nakwa n’ụzọ na-eme ka e nwee mmetụta uche dị mma.Cheta na Jehova na-ahụ ihe dị n’obi anyị ma mara ihe anyị na-achọ. Chineke “na-atụzi obi nile,” ọ na-enyekwa “onye ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị.”—Ilu 21:2; Jeremaịa 17:10.
Ndụmọdụ Dị Irè ná Ndụ Ezinụlọ
Bible na-enye ndụmọdụ dị irè ma a bịa n’ihe banyere mmekọrịta ụmụ mmadụ. George na-ekwu, sị: “Ndịrịta iche nke àgwà ma ọ bụ nghọtahie so n’ime ihe ndị kasị eweta nchekasị ná ndụ.” Olee otú o si eme ihe banyere ha? “Ọ bụrụ na mụ echee na o nwere ihe mmadụ bu n’obi megide m, ana m etinye ndụmọdụ ahụ guzo kwem dị na Matiu 5:23, 24 n’ọrụ: ‘Mee ka gị na nwanne gị dị n’udo.’ Eziokwu bụ́ na m pụrụ ikwu okwu banyere esemokwu ahụ na-arụpụta ihe. Apụrụ m inweta udo nke Chineke bụ́ nke Bible na-ekwu okwu banyere ya. Ọ na-arụ ọrụ. Ọ dị nnọọ irè.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Mgbe di na nwunye na-ekwekọrịtaghị, ọ dị ha abụọ mkpa ịbụ ndị “na-anụ ihe ọsọ ọsọ, [ndị] na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” (Jemes 1:19) Ndụmọdụ dị otú ahụ na-eme ka a na-enwe nkwurịta okwu n’ụzọ ka mma. George na-agbakwụnye, sị: “Mgbe m na-etinye ndụmọdụ nke ịhụ nwunye m n’anya na imeso ya ihe dị ka onwe m n’ọrụ, ana m ahụ ihe ndị ọ na-arụpụta ozugbo. Ọ na-akara ya mfe ịkwanyere m ùgwù.” (Ndị Efesọs 5:28-33) Ee, Bible na-akụziri anyị otú anyị ga-esi mata ma mee ihe banyere ezughị okè anyị na otú e si enwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide nke ndị ọzọ.
Ndụmọdụ Na-adịgide Adịgide
Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) Lee ka okwu ndị ahụ si ghara ịdị mgbagwoju anya ma bụrụ ndị miri emi!
Bible bụ ihe na-akpa ike dị mma. Ọ na-eme ka ndị hụrụ Chineke n’anya nwee ike ime ka ndụ ha kwekọọ n’uche ya na ịchọta obi ụtọ ‘n’ijegharị n’iwu Jehova.’ (Abụ Ọma 119:1) Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ọnọdụ anyị, Bible nwere ntụzi na ndụmọdụ ndị dị anyị mkpa. (Aịsaịa 48:17, 18) Na-agụ ya kwa ụbọchị, na-atụgharị uche n’ihe ị gụrụ, na-etinyekwa ya n’ọrụ. Ọ ga-eme ka uche gị dị jụụ ma na-adịkwasị n’ihe ndị dị ọcha ma dị mma. (Ndị Filipaị 4:8, 9) Ị ga-amụta ọ bụghị nanị otú ị ga-esi adị ndụ ma nụ ụtọ ya kamakwa otú ị ga-esi ahụ Onye Okike nke ndụ n’anya.
Site n’ịgbaso ụzọ dị otú ahụ, Bible ga-aghọrọ gị—dị ka ọ ghọwooro ọtụtụ nde ndị ọzọ—ihe karịrị nanị ezigbo akwụkwọ. N’ezie ọ ga-egosipụta onwe ya ịbụ akwụkwọ ọgụgụ maka ịdị ndụ!
[Foto dị na peeji nke 6]
Bible pụrụ ime ka mkpebi i mere imeri àgwà ndị na-emerụ ahụ sikwuo ike
[Foto dị na peeji nke 7]
Bible na-akụziri gị otú e si abịaru Chineke nso