Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bible—E Jiri Ya Kpọrọ Ihe Ma Machibido Ya Iwu

Bible—E Jiri Ya Kpọrọ Ihe Ma Machibido Ya Iwu

Bible—E Jiri Ya Kpọrọ Ihe Ma Machibido Ya Iwu

“M ga-achọ ka a sụgharịa Akwụkwọ Nsọ gaa n’asụsụ nile,” ka Desiderius Erasmus, onye Netherlands bụ́ ọkà mmụta a maara aha ya nke narị afọ nke 16, dere.

OLILEANYA kasị eme Erasmus obi ụtọ nke ukwuu bụ na mmadụ nile ga-enwe ike ịgụ na ịghọta Akwụkwọ Nsọ. Otú ọ dị, ndị na-emegide Bible jụrụ echiche dị otú ahụ n’ụzọ siri ike. N’ezie, n’oge ahụ, Europe bụ ebe dị nnọọ ize ndụ nye onye ọ bụla nwere ọbụna obere ọchịchọ ịmata ihe dị na Bible. N’England, nzukọ ndị isi tiri iwu nke kwuru na “ndị ọ bụla ga-agụ Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Bekee, a ga-anapụ ha ala, ihe onwunwe, ngwongwo, na ndụ ha . . . nakwa na, ọ bụrụ na ha agbaa isi akwara, ma ọ bụ gụọkwa ya ọzọ mgbe a gbagharasịwooro ha, a ga-ebu ụzọ kwụgbuo ha maka ịgba Eze mgba okpuru, mgbe ahụ kpọọkwa ha ọkụ maka ozizi nduhie megide Chineke.”

N’ala ndị bụ́ isi nke Europe, Njụta Okwukwe ndị Katọlik chọgharịrị ịrọ òtù “ndị jụrụ okwukwe,” dị ka ndị òtù Waldo nke France, ma kpagbuo ha n’ụzọ pụrụ iche n’ihi omume ha nke ime nkwusa “site n’oziọma ndị ahụ na n’akwụkwọ ozi ndị ahụ nakwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ, . . . ebe ọ bụ na a machibidoro ndị nkịtị kpam kpam ime nkwusa na ịkọwa akwụkwọ nsọ.” E mekpọrọ imerime ndị ikom na ndị inyom ọnụ ma gbuo ha n’ụzọ jọgburu onwe ya n’ihi mmasị ha nwere na Bible. Ha tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ kasị ukwuu nanị iji kwughachi Ekpere Onyenwe Anyị ma ọ bụ Iwu Iri ahụ nakwa iji kụziere ha ụmụ ha.

Ụdị mmasị ahụ n’ebe Okwu Chineke dị nọgidere na-adị n’obi ọtụtụ ndị Bekee mbụ jiri ụgbọ mmiri gaa n’Ebe Ugwu America ịchị ya. N’America oge mbụ, “e jikọrọ ịgụ ihe na okpukpe n’ụzọ dị ukwuu, na-akọwa ọdịnala, dabere kpam kpam n’otú ha maruru Bible,” ka akwụkwọ bụ́ A History of Private Life—Passions of the Renaissance, na-ekwu. N’ezie, otu okwuchukwu e bipụtara na Boston na 1767 tụrụ aro, sị: “Dị uchu n’ịgụ akwụkwọ nsọ. Kwa ụtụtụ na anyasị ị ghaghị ịgụ otu isiakwụkwọ nke Bible gị.”

Dị ka Òtù Nnyocha nke Barna nọ na Ventura, California, si kwuo, ihe karịrị pasent 90 nke ndị America nwere nkezi nke Bible atọ. Otú ọ dị, nnyocha e mere na nso nso a na-egosi na ọ bụ ezie na a ka ji Bible kpọrọ ihe n’ụzọ dị ukwuu n’ebe ahụ, “iwepụta oge ịgụ ya, ịmụ ya na itinye ya n’ọrụ . . . bụ ihe a na-adịghịzi eme.” Ihe ka ọtụtụ maara ihe ndị dị na ya nanị elu elu. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ kwuru, sị: “E nwechaghịzi echiche bụ́ na [Bible] ka nwere ike inwe mmetụta dị mkpa n’ebe nsogbu na nchegbu ndị a na-enwe n’oge a dị.”

Njupụta nke Echiche Ụwa

Otu ihe e kweere n’ebe nile bụ na anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ site nanị n’iche echiche nke ọma na ụmụ mmadụ ịgbakọ aka eme ihe. A na-ewere Bible dị ka nanị otu n’ime ọtụtụ akwụkwọ ndị e nwere bụ́ ndị na-ekwu echiche okpukpe na ahụmahụ onwe onye, ọ bụghị dị ka akwụkwọ nke ihe mere eme na eziokwu.

Ya mere, olee otú ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ si eme ihe banyere isiokwu ndị na-agbagwoju anya ma na-enye nsogbu ná ndụ n’ụzọ na-arịwanye elu? Ha na-eme ihe n’enweghị ọnọdụ ime mmụọ, n’enweghị ụkpụrụ nduzi na ntụzi ndị bụ́ ịgba n’ụzọ omume na okpukpe. Ha dị ka ụgbọ mmiri ndị na-enweghị amara, “bụ́ nke okuku ume ọ bụla nke ozizi mmadụ na-enugharị ihu na azụ, . . . site n’aghụghọ na ịdị akọ nke ụmụ mmadụ.”—Ndị Efesọs 4:14, The Twentieth Century New Testament.

Mgbe ahụ, anyị aghaghị ịjụ, sị, Bible ọ̀ bụ nanị otu n’ime akwụkwọ okpukpe ndị e nwere? Ka ọ̀ bụ n’ezie Okwu Chineke, nke bu ihe ọmụma dị irè ma dị oké mkpa? (2 Timoti 3:16, 17) Bible ò ruru eru ka anyị tụlee ya? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Foto dị na peeji nke 3]

Desiderius Erasmus

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ Deutsche Kulturgeschichte

[Foto dị na peeji nke 4]

A kpagburu ndị òtù Waldo n’ụzọ pụrụ iche n’ihi nkwusa ha na-eme site n’Akwụkwọ Nsọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Stichting Atlas van Stolk, Rotterdam