Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè Ndị Kwezuworo Ihe Nile

Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè Ndị Kwezuworo Ihe Nile

Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè Ndị Kwezuworo Ihe Nile

“[Ọ] na-agbasi mgba ike n’ihi unu n’ekpere ya nile mgbe nile, ka unu wee guzo dị ka ndị zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.”—NDỊ KỌLỌSI 4:12.

1, 2. (a) Ndị nọ n’èzí kwuru gịnị banyere ndị Kraịst oge mbụ? (b) Olee otú akwụkwọ Ndị Kọlọsi si egosipụta mmasị ịhụnanya?

ỤMỤAZỤ Jisọs nwere mmasị miri emi n’ebe ndị ofufe ibe ha nọ. Tertullian (onye edemede nke narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A.) kọrọ banyere obiọma ha gosiri ụmụ mgbei, ndị ogbenye, na ndị agadi. Ihe àmà ndị ahụ nke ịhụnanya nọ n’ọrụ masịrị nnọọ ndị na-ekweghị ekwe nke na ụfọdụ kwuru banyere ndị Kraịst, sị, ‘Lee otú ha si hụ ibe ha n’anya.’

2 Akwụkwọ Ndị Kọlọsi na-egosipụta mmasị ịhụnanya dị otú ahụ nke Pọl onyeozi na enyi ya bụ́ Epafras nwere n’ebe ụmụnna nwoke na ndị nwanyị nọ na Kọlọsi nọ. Pọl degaara ha akwụkwọ, sị: Epafras “na-agbasi mgba ike n’ihi unu n’ekpere ya nile mgbe nile, ka unu wee guzo dị ka ndị zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.” N’afọ 2001, Ndịàmà Jehova ga-enwe dị ka isiokwu ha dịịrị afọ, okwu ndị a dị ná Ndị Kọlọsi 4:12: ‘Guzonụ dị ka ndị zuru okè ndị kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.’

3. Ihe abụọ dị aṅaa ka Epafras kpere ekpere maka ha?

3 Ị pụrụ ịhụ na ekpere Epafras kpere maka ndị ọ hụrụ n’anya nwere akụkụ abụọ: (1) ka ha “guzo dị ka ndị zuru okè” nakwa (2) ka ha ‘kwezuo ihe nile Chineke na-achọ.’ E denyere ihe ọmụma a n’Akwụkwọ Nsọ maka ọdịmma anyị. Ya mere jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka ọ dị m mkpa ime n’onwe m iji guzo dị ka onye zuru okè nke kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ? Ka m na-eme otú ahụ, mmetụta dị aṅaa ka ọ ga-enwe?’ Ka anyị lee.

Gbalịsie Ike ‘Iguzo Dị Ka Onye Zuru Okè’

4. N’echiche dị aṅaa ka ọ dị ndị Kọlọsi mkpa ịbụ ndị “zuru okè”?

4 Epafras chọsiri ike ka ụmụnna ime mmụọ ya ndị ikom na ndị inyom nọ na Kọlọsi “guzo dị ka ndị zuru okè.” Okwu Pọl ji mee ihe ebe a, bụ́ nke a sụgharịrị ịbụ “zuru okè,” pụrụ inye echiche nke itozu okè. (Matiu 19:21; Ndị Hibru 5:14; Jemes 1:4, 25) Ikekwe ị maara na mmadụ ịbụ Onyeàmà Jehova e mere baptism apụtaghị n’onwe ya na ọ bụ onye Kraịst tozuru okè. Pọl degaara ndị Efesọs, bụ́ ndị bi n’ebe ndịda Kọlọsi akwụkwọ, na-agwa ha na ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi na-agbalị inyere ‘mmadụ nile aka iru ịdị n’otu nke okwukwe na nke mmazu nke Ọkpara Chineke, ruo ịbụ nwoke tozuru okè, ruo ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo nke ozuzu nke Kraịst.’ N’ebe ọzọ, Pọl gbara ndị Kraịst ume ịbụ ‘ndị tozuru okè n’uche ha.’—Ndị Efesọs 4:8-13; 1 Ndị Kọrint 14:20.

5. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka izu okè bụrụ ihe mgbaru ọsọ anyị bụ́ isi?

5 Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nọ na Kọlọsi aka-etozughị okè n’ụzọ ime mmụọ mgbe ahụ, ọ dị mkpa ka nke ahụ bụrụ ihe mgbaru ọsọ ha. Ọ̀ bụ na o kwesịghị ịdị otú ahụ taa? Ma è mere anyị baptism ọtụtụ iri afọ gara aga ma ọ bụ na nso nso a, ànyị pụrụ ịhụ na n’ezie anyị enwewo ọganihu n’ikike iche echiche anyị na otú anyị si ele ihe anya? Ànyị na-atụle ụkpụrụ Bible tupu anyị emee mkpebi? Ihe ndị metụtara Chineke na ọdịmma ọgbakọ hà na-ewerewanye ọnọdụ ka ukwuu ná ndụ anyị, kama ịbụ ihe ndị anyị na-eme ná ndaba? Anyị apụghị igosicha n’ebe a ụzọ nile anyị pụrụ isi gosipụta uto dị otú ahụ gaa n’izu okè, ma tụlee ihe atụ abụọ.

6. Olee otu ụzọ mmadụ pụrụ isi nwee ọganihu ruo n’izu okè, dị ka Jehova zuru okè?

6 Ihe atụ nke mbụ: Were ya na anyị tolitere n’ebe e ji igosipụta ajọ mbunobi ma ọ bụ enweghị omume enyi n’ebe ndị si n’agbụrụ, mba, na ógbè ọzọ nọ, mara. Anyị maara ugbu a na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu nakwa na anyị ekwesịghị ịdị na-ele mmadụ anya n’ihu. (Ọrụ 10:14, 15, 34, 35) N’ọgbakọ ma ọ bụ na sekit anyị, e nwere ndị si n’ebe ọzọ, ya mere anyị na ha nọ nso. Ma, ruo n’ókè hà aṅaa ka anyị na-enwe mmetụta ụfọdụ na-ezighị ezi n’ime onwe anyị n’ebe ndị ahụ si n’ebe ọzọ nọ ma ọ bụ na-enyo ha enyo? Ànyị na-enwe ‘omume nke ịma mmadụ aka,’ na-adị ngwa icheta ihe dị njọ ma ọ bụrụ na onye ebe ọzọ ahụ ejiri obere ihe mejọọ anyị? Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ dị m mkpa inwekwu ọganihu n’inwe echiche Chineke nke eleghị mmadụ anya n’ihu?’

7. Izu okè dị ka onye Kraịst ọ̀ pụrụ ịchọ ka anyị si aṅaa na-ele ndị ọzọ anya?

7 Ihe atụ nke abụọ: Dị ka Ndị Filipaị 2:3 si kwuo, anyị ekwesịghị ime “ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.” Olee otú anyị si enwe ọganihu n’akụkụ a? Onye ọ bụla nwere ebe ndị ọ na-adịghị ike na ebe ndị ọ dị ike. Ọ bụrụ na n’oge gara aga anyị na-adị ngwa ịchọpụta ebe ndị ọzọ na-adịghị emezi emezi, ànyị enwewo ọganihu, n’adịghịzi atụ anya ka ọ fọdụ ntakịrị ka ha ‘zuo okè’? (Jemes 3:2) Ugbu a, karịa mgbe mbụ, ànyị pụrụ ịhụ—ọbụna na-achọ—ụzọ ndị ọzọ si ka anyị mma? ‘Aghaghị m ikweta na nwanna nwanyị a ka m inwe ndidi.’ ‘Onye ahụ na-egosipụta okwukwe siri ike karị.’ ‘N’ikwu eziokwu, ọ bụ onye nkụzi ka mma karịa m.’ ‘Ọ ka m mma n’ịchịkwa mmụọ ya.’ Ikekwe, ọ dị ụfọdụ ndị Kọlọsi mkpa inwe ọganihu n’akụkụ a. Ọ̀ dị anyị?

8, 9. (a) N’echiche dị aṅaa ka Epafras kpere ekpere ka ndị Kọlọsi “guzo” dị ka ndị zuru okè? (b) ‘Iguzo dị ka ndị zuru okè’ na-enye echiche dị aṅaa banyere ọdịnihu?

8 Epafras kpere ekpere ka ndị Kọlọsi “guzo dị ka ndị zuru okè.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’ụzọ doro anya, Epafras nọ na-ekpeku Chineke ekpere na ruo n’ókè ndị Kọlọsi bụruru ndị Kraịst zuru okè, tozuo okè, ka ha “guzo,” ma ọ bụ nọgide na-adị otú ahụ.

9 Anyị apụghị iwere ya na onye ọ bụla ghọrọ onye Kraịst, ọbụnadị onye tozuworo okè, ga-anọgide na-adị otú ahụ. Jisọs kwuru na otu nwa Chineke bụ́ mmụọ ozi ‘eguzoghị n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) Pọl chetakwaara ndị Kọrint banyere ụfọdụ n’oge gara aga bụ́ ndị jewooro Jehova ozi ruo oge ụfọdụ ma daa. Ọ dọrọ ụmụnna e ji mmụọ nsọ tee mmanụ aka ná ntị, sị: “Onye na-eche na ọ na-guzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.” (1 Ndị Kọrint 10:12) Nke a tinyekwuru ihe n’ekpere ahụ bụ́ ka ndị Kọlọsi “guzo dị ka ndị zuru okè.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ozugbo ha zuru okè, tozuo okè, ọ dị ha mkpa ịnọgidesi ike, ọ bụghị ịla azụ, inwe ike ọgwụgwụ, ma ọ bụ ịkpafu. (Ndị Hibru 2:1; 3:12; 6:6; 10:39; 12:25) N’ihi ya ha ‘ga-ezu okè’ n’ụbọchị nleta na nnakwere ikpeazụ ha.—2 Ndị Kọrint 5:10; 1 Pita 2:12.

10, 11. (a) Ụkpụrụ dị aṅaa ka Epafras setịpụụrụ anyị n’ihe banyere ekpere? (b) N’ụzọ kwekọrọ n’ihe Epafras mere, mkpebi dị aṅaa ka ị ga-achọ ime?

10 Anyị atụleworị abamuru dị n’ịkpọ ndị ọzọ aha n’ekpere anyị, na-akapị okwu ọnụ mgbe anyị na-arịọ ka Jehova nyere ha aka, kasie ha obi, gọzie ha, ma nye ha mmụọ nsọ. Ọ bụ ụdị ekpere ahụ ka Epafras kpere maka ndị Kọlọsi. Anyị pụkwara—n’ezie anyị kwesịrị—ịchọta n’okwu ndị ahụ aro bara uru banyere ihe anyị na-ekpeku Jehova n’ekpere banyere anyị onwe anyị. N’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya, anyị kwesịrị ịrịọ maka enyemaka Jehova ka anyị onwe anyị n’otu n’otu nwee ike ‘iguzo dị ka ndị zuru okè.’ Ị̀ na-eme otú ahụ?

11 Gịnị ma i kwuo ọnọdụ gị n’ekpere? Gwa Chineke ókè i nweworo ọganihu gaa ‘n’izu okè,’ n’itozu okè. Rịọ ya ka o nyere gị aka ịmata ebe ndị ọ ka dị gị mkpa ito eto n’ụzọ ime mmụọ. (Abụ Ọma 17:3; 139:23, 24) Obi abụọ adịghị ya na i nwere ụfọdụ ebe ndị dị otú ahụ. Mgbe ahụ, kama inwe nkụda mmụọ maka nke a, rịọ Chineke n’ụzọ doro anya nakwa n’ụzọ a kapịrị ọnụ maka enyemaka iji nwee ọganihu. Mee nke a ihe karịrị otu ugbo. N’ezie, gịnị ma i kpebie na n’izu a na-abịanụ, ị ga-ekpe ekpere ruo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ka i wee ‘guzo dị ka onye zuru okè.’ Meekwa atụmatụ imekwu ya ka ị na-atụle isiokwu dịịrị afọ. N’ekpere gị, lekwasị anya n’àgwà ndị ị pụrụ inwe bụ́ ndị pụrụ ime ka ị dalaa azụ, nwee ike ọgwụgwụ, ma ọ bụ kpafuo site n’ozi Chineke nakwa otú ị pụrụ isi zere ime nke ahụ.—Ndị Efesọs 6:11, 13, 14, 18.

Na-ekpe Ekpere Maka Ikwezu Ihe Nile

12. N’ihi gịnị karịsịa ka ‘ikwezu ihe nile’ ji dị ndị Kọlọsi mkpa?

12 Epafras kpekwara ekpere maka ihe ọzọ dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ndị Kọlọsi ga-emecha bụrụ ndị a ga-ahụta dị ka ndị na-eguzo n’ihu Chineke n’ụzọ ọ na-anakwere. Ọ bụkwa ihe anyị na-aghaghị ime. Gịnị ka ọ bụ? O kpere ekpere ka ha ‘kwezuokwa ihe nile Chineke na-achọ.’ Ozizi nduhie na nkà ihe ọmụma na-ebibi ihe gbara ha gburugburu, bụ́ ndị ụfọdụ ha yiri n’ụzọ aghụghọ ka a ga-asị na ha bụ ezi ofufe. Dị ka ihe atụ, a rụgidere ha iji ibu ọnụ ma ọ bụ oriri na nkwari na-echeta ụbọchị ndị pụrụ iche, dị ka a chọburu n’otu mgbe n’ofufe ndị Juu. Ndị ozizi ụgha lekwasịrị anya ná ndị mmụọ ozi, bụ́ mmụọ ndị dị ike bụ́ ndị e ji mee ihe n’inyefe Mosis Iwu ahụ. Cheedị echiche ịbụ onye a rụgidere n’ụzọ dị otú ahụ! E nwere echiche juru ebe nile bụ́ ndị na-emegiderịta onwe ha.—Ndị Galetia 3:19; Ndị Kọlọsi 2:8, 16-18.

13. Ọ̀ bụ ịghọta isi ihe dị aṅaa pụrụ inyere ndị Kọlọsi aka, oleekwa otú ihe dị otú ahụ pụrụ isi nyere anyị aka?

13 Pọl gbaghara nke ahụ site n’ime ka ọnọdụ Jisọs Kraịst pụta ìhè. “Dị ka unu naara Kraịst anyị, bụ́ Jisọs Onyenwe anyị, na-ejegharịnụ n’ime Ya, bụrụkwa ndị gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime Ya, ndị a na-ewulikwa elu dị ka ụlọ n’ime Ya, ndị a na-ewerekwa okwukwe unu mee ka unu guzosie ike, dị ka e ziri unu.” Ee, ọ dị (ndị Kọlọsi na anyị onwe anyị) mkpa ikwezu ihe nile banyere ọnọdụ Kraịst ná nzube Chineke nakwa ná ndụ anyị. Pọl kọwara, sị: “N’ime Ya ka ozuzu nile nke ihe Chineke bụ na-ebigide na-ewere ahụ mmadụ, n’ime Ya ka e mezuwokwara unu emezu, Onye bụ́ isi nke ịbụ onyeisi na ịchịisi nile ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 2:6-10.

14. N’ihi gịnị ka olileanya ji bụrụ ihe dị adị n’ezie nye ndị nọ na Kọlọsi?

14 Ndị Kọlọsi bụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Ha nwere olileanya pụrụ iche nke ịdị ndụ n’eluigwe, ha nwekwara ihe nile mere ha ga-eji mee ka olileanya ahụ nọgide na-egbuke egbuke. (Ndị Kọlọsi 1:5) “Ihe nile Chineke na-achọ” bụ ka ha kwezuo ihe nile banyere olileanya ha ịbụ ihe e ji n’aka. Onye ọ bụla n’ime ha ò kwesịrị inwewo obi abụọ banyere olileanya ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ò kwesịrị ịdị iche taa n’ebe ndị nile nwere atụmanya sitere n’aka Chineke nke ịdị ndụ n’ụwa paradaịs nọ? Ee e! Olileanya ahụ bụ́ ịgba bụ nnọọ akụkụ nke “ihe nile Chineke na-achọ.” Ugbu a, tụlee ajụju ndị a: Ọ bụrụ na ị na-agbalịsi ike ịbụ otu n’ime “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ́ ndị ga-alanarị ‘oké mkpagbu ahụ,’ olee ókè olileanya gị bụruru ihe e ji n’aka? (Mkpughe 7:9, 14) Ọ̀ bụ akụkụ nke ‘nkwezu i kwezuru n’ihe nile Chineke na-achọ’?

15. Olee usoro Pọl setịpụrụ bụ́ nke gụnyere olileanya?

15 Site n’ikwu “olileanya,” anyị ebughị n’uche ọchịchọ na-enweghị isi ma ọ bụ ịmụ anya arọ nrọ. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’usoro nke isi ihe ndị Pọl gosiri ndị Rom na mbụ. N’usoro ndị ahụ, ihe nke ọ bụla a kpọtụrụ aha nwere njikọ ma ọ bụ na-eduga n’ọzọ. Rịba ama n’ebe Pọl dewere “olileanya” ná ntụgharị uche ya: “Anyị na-anyakwa isi n’ime mkpagbu anyị nile: ebe anyị matara na mkpagbu na-arụta ntachi obi; ntachi obi ahụ na-arụtakwa [ọnọdụ a nwapụtara anwapụta, ọnọdụ a nwapụtara anwapụta, NW] na-arụtakwa olileanya: olileanya ahụ emeghịkwa ka ihere mee anyị; n’ihi na a wụsaworo ịhụnanya nke Chineke n’obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ.”—Ndị Rom 5:3-5.

16. Ka ị na-amụ eziokwu Bible, olileanya dị aṅaa ka ị malitere inwe?

16 Mgbe Ndịàmà Jehova ziri gị ozi Bible na nke mbụ ya, otu eziokwu pụrụ ịdọrọwo mmasị gị, dị ka ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ mbilite n’ọnwụ. Nye ọtụtụ ndị, ihe bụ́ isi ha ghọtara ọhụrụ bụ ohere ahụ dabeere na Bible nke ịdị ndụ na paradaịs elu ala. Cheta mgbe mbụ ị nụrụ ozizi ahụ. Lee olileanya magburu onwe ya ọ bụ—ọrịa na ịka nká agaghịzi adị, ị pụrụ ịdịgide ndụ iji rie ihe ị rụtara n’ọrụ, udo ga-adịkwa n’etiti ụmụ anụmanụ! (Eklisiastis 9:5, 10; Aịsaịa 65:17-25; Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:3, 4) Ị malitere inwe olileanya dị ebube!

17, 18. (a) Olee otú usoro ahụ Pọl gosiri ndị Rom si duga n’olileanya? (b) Ụdị olileanya dị aṅaa ka e bu n’uche ná Ndị Rom 5:4, 5, ì nwekwara olileanya dị otú ahụ?

17 Ka oge na-aga, ikekwe i nwetara mmegide ma ọ bụ mkpagbu ụfọdụ. (Matiu 10:34-39; 24:9) Ọbụna n’oge ndị na-adịbeghị anya, a kwakọrọwo ihe ndị dị n’ebe obibi nke Ndịàmà bi n’ala dị iche iche ma ọ bụ manye ha ịghọ ndị gbara ọsọ ndụ. E tiwo ụfọdụ ihe, jichie akwụkwọ ha ji amụ Bible, ma ọ bụ bụrụ ndị a ghara ụgha megide n’usoro mgbasa ozi. Ụdị mkpagbu ọ sọrọ ya bụrụ nke i cheworo ihu, dị ka Ndị Rom 5:3 na-ekwu, ị pụrụ ịnya isi n’ime mkpagbu ahụ, ọ rụpụtakwara ezi ihe. Ọbụna dị ka Pọl si dee, mkpagbu ahụ rụpụtara ntachi obi n’ime gị. Mgbe ahụ, ntachi obi dugara n’ọnọdụ a nwapụtara anwapụta. Ị maara na ị na-eme ihe ziri ezi, na-eme uche Chineke, ya mere i ji n’aka na ọ nwapụtawo gị. N’okwu Pọl, i nwere mmetụta nke ịnọ ‘n’ọnọdụ a nwapụtara anwapụta.’ N’ịga n’ihu, Pọl dere na “[ọnọdụ a nwapụtara anwapụta, NW] na-arụtakwa olileanya.” Nke ahụ pụrụ iyi ihe a na-adịghị ahụkebe. N’ihi gịnị ka Pọl ji dee “olileanya” n’ebe dịpụrụ nnọọ adịpụ n’usoro ahụ? Ọ̀ bụ na i nweghị olileanya eri oge gara aga, mgbe mbụ ị nụrụ ozi ọma ahụ?

18 N’ụzọ doro anya, Pọl anaghị ezo aka n’ebe a n’echiche mbụ anyị banyere olileanya nke ndụ zuru okè. Ihe ọ na-ezo aka na ya gabigara nnọọ nke ahụ; o mikwuru emi, na-akpalikwu akpali. Mgbe anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi ma si otú ahụ ghọta na anyị nwere nnwapụta Chineke, nke a na-enwe mmetụta dị ukwuu nke itinyekwu ihe n’olileanya mbụ anyị na ime ka o sikwuo ike. Olileanya anyị nwere na-aghọzi nke e ji n’aka karị, nke sikwuru ike, na nke anyị nabatara n’onwe anyị karị. Olileanya a mikwuru emi na-egbukepụ egbukepụ n’ụzọ ka mma. Ọ na-ejupụta n’ime anyị, n’ụmị anyị nile. “Olileanya ahụ emeghịkwa ka ihere mee anyị; n’ihi na a wụsaworo ịhụnanya nke Chineke n’obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ.”

19. Olee otú olileanya gị kwesịrị isi bụrụ akụkụ nke ekpere gị mgbe nile?

19 Ọ bụ ekpere siri ike nke Epafras ka ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Kọlọsi nọgide na-abụ ndị ihe dị n’ihu na-emetụta na ndị kwezuru na ya, ‘na-ekwezukwa ihe nile Chineke na-achọ.’ Ka onye ọ bụla n’ime anyị n’otu aka ahụ na-ejekwuru Chineke mgbe nile banyere olileanya anyị. N’ekpere onwe onye gị, tinye olileanya gị banyere ụwa ọhụrụ ahụ. Gwa Jehova otú ọ na-agụsiru gị agụụ ike ịhụ ya, na-ekwenye n’ụzọ zuru ezu na ọ ga-abịa. Rịọ ya maka enyemaka ime ka nkwenye gị mikwuo emi ma sakwuo mbara. Dị ka Epafras kpere ekpere ka ndị Kọlọsi ‘kwezuo ihe nile Chineke na-achọ,’ mee otu ihe ahụ. Na-eme ya mgbe mgbe.

20. Ọ bụrụ na mmadụ ole na ole esi n’ụzọ ndị Kraịst wezụga onwe ha, n’ihi gịnị ka nke a na-ejighị kwesị ịbụ ihe ga-akpata nkụda mmụọ?

20 I kwesịghị ịbụ onye eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụghị mmadụ nile na-eguzo dị ka ndị zuru okè na ndị kwezuworo ihe nile, na-adọpụ uche ya ma ọ bụ na-akụda mmụọ. Ụfọdụ pụrụ ịda, wezụga onwe ha, ma ọ bụ daa nnọọ mbà. Nke ahụ mere n’etiti ndị kasị nọrọ Jisọs nso, bụ́ ndị ozi ya. Ma mgbe Judas ghọrọ onye sabo, ndị ozi ndị ọzọ hà kwụsịlatara ma ọ bụ kwụsị iso ya? Ọ dịghị ma ọlị! Pita ji Abụ Ọma 109:8 mee ihe iji gosi na onye ọzọ ga-eweghara ọnọdụ Judas. A họtara onye nọchiri ya, ndị Chineke na-eguzosi ike n’ihe jikwa ịdị uchu gaa n’ihu n’ọrụ nkwusa ha. (Ọrụ 1:15-26) Ha kpebisiri ike iguzo dị ka ndị zuru okè na ndị kwezuworo ihe nile.

21, 22. N’echiche dị aṅaa ka a ga-ahụ nguzo i ji nkwezu n’ihe nile guzoro?

21 Ị pụrụ ijide n’aka kpam kpam na gị iguzo dị ka onye zuru okè na onye kwezuworo ihe nile Chineke na-achọ agaghị abụ nke a na-agaghị ahụ. A ga-ahụ ya ma na-enwe mmasị na ya. Ọ̀ bụ ole ndị ga-ahụ nke ahụ?

22 Ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ́ ndị maara gị ma hụ gị n’anya, ga-ahụ ya. Ọbụna ma ọ bụrụ na ihe ka ọtụtụ ekwughị ya ekwu, mmetụta ya ga-eyi ihe anyị na-agụ ná 1 Ndị Tesalọnaịka 1:2-6: “Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe nile banyere unu nile, na-ehota unu mgbe anyị na-ekpe ekpere; ebe anyị na-echeta n’ewepụghị aka ọrụ nke okwukwe unu na ndọgbu n’ọrụ nke ịhụnanya unu na ntachi obi nke olileanya unu ji ele anya Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị; . . . ọ bụghị nanị n’okwu ọnụ ka ozi ọma anyị bịaruru unu, kama ọ bịakwara n’ike, na n’ime Mmụọ Nsọ na ọtụtụ nkwezu . . . Unu onwe unu ghọkwara ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị.” Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe bụ́ ndị nọ gị gburugburu ga-enwe mmetụta yiri nke ahụ ka ha na-ahụ na ị ‘na-eguzo dị ka onye zuru okè nke kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.’—Ndị Kọlọsi 1:23.

23. N’afọ na-abịanụ, gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi gị?

23 N’ezie kwa, Nna gị nke eluigwe ga-ahụ ya ma nwee obi ụtọ. Nwee obi ike na nke ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ị na-eguzo dị ka onye zuru okè nke kwezuworo “ihe nile Chineke na-achọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ndị ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Pọl degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ n’ụzọ agbamume banyere njegharị ha na-ejegharị “n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile.” (Ndị Kọlọsi 1:10) Ee, ọ bụ ihe pụrụ ikwe ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume ime ihe na-atọ ya ụtọ n’ụzọ zuru ezu. Ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kọlọsi mere otú ahụ. Ndị Kraịst nọ gị gburugburu na-eme otú ahụ ugbu a kpọmkwem. Gị onwe gị kwa pụrụ ime otú ahụ! N’ihi ya, n’afọ a na-abịanụ, ka ekpere ị na-ekpe kwa ụbọchị na omume ị na-eme mgbe nile na-egosipụta na i kpebisiwo ike ‘iguzo dị ka onye zuru okè nke kwezuwokwara ihe nile Chineke na-achọ.’

Ị̀ Pụrụ Icheta?

• Gịnị ka gị ‘iguzo dị ka onye zuru okè’ gụnyere?

• Ihe ndị dị aṅaa banyere onwe gị ka i kwesịrị itinye n’ekpere?

• Dị ka a tụrụ n’aro ná Ndị Rom 5:4, 5, ụdị olileanya dị aṅaa ka ị chọrọ inwe?

• Ọmụmụ ihe anyị ọ̀ kpaliwo gị inwe ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa n’afọ na-abịanụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 20]

Epafras kpere ekpere ka ụmụnna ya guzo dị ka ndị zuru okè, na-ekwezu ihe nile banyere Kraịst na olileanya ha

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọtụtụ nde ndị ọzọ so enwe olileanya na nkwenye siri ike i nwere