Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Kwaliri Ije Ozi

Ndị A Kwaliri Ije Ozi

Ndị A Kwaliri Ije Ozi

GỊNỊ ga-akpali di na nwunye 24 nọ n’uju ndụ ha ịhapụ ezinụlọ ha, ndị enyi ha, na ebe ndị ha maara nke ọma iji malite ọrụ ozi ala ọzọ n’ala na-abụghị nke ha? Gịnị mere obi ga-eji dị ha ụtọ ịga ebe ndị dị ka Papua New Guinea na Taiwan, tinyere mba ndị dị n’Africa nakwa na Latin America? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ha nwere mmasị n’inweta ahụmahụ na-akpali akpali? Ee e. Kama nke ahụ, ihe kwaliri ha bụ ezi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke na onye agbata obi ha nọ.—Matiu 22:37-39.

Olee ndị bụ́ ndị a? Ha bụ ndị gụsịrị akwụkwọ na klas nke 109 nke Watchtower Bible School of Gilead. Na Saturday, September 9, 2000, ngụkọta nke mmadụ 5,198 gbakọtara n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower—nke dị na Patterson, New York—nakwa n’ebe ndị e tinyere ígwè nzite ozi satellite, iji gee ntị na ndụmọdụ ịhụnanya nke pụrụ inyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka ịbụ ndị ozi ala ọzọ na-enwe ihe ịga nke ọma.

Onyeisi oche nke usoro ihe omume ahụ bụ Stephen Lett, onye so na Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Okwu mmeghe ya hiwere isi na Matiu 5:13, “Unu onwe unu bụ nnu nke uwa.” Nwanna Lett kọwara na okwu Jisọs n’ezie metụtara ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, nnu na-eme ka ihe dị ụtọ. N’otu aka ahụ kwa, site n’ọrụ nkwusa ha dị irè, ndị ozi ala ọzọ dị ka nnu n’ụzọ ihe atụ.

Agbamume E Ji Sị Ha Gaa nke Ọma

Nwanna Lett kpọpụtaziri ụfọdụ ndị jewooro Jehova ozi ruo ogologo oge bụ́ ndị kwuru okwu dị mkpirikpi dabeere n’Akwụkwọ Nso ma bụrụ ịgba. Onye mbụ bụ John Wischuk, nke na-eje ozi ná Ngalaba Ide Ihe. Isiokwu ya, bụ́ “Abụ Ọma nke Kasị Mkpirikpi Na-akwalite Mmụọ Ozi Ala Ọzọ,” dabeere n’Abụ Ọma nke 117. Taa, e nwere mkpa zuru ụwa ọnụ maka ịgbara “mba nile” na “ndị nile” àmà banyere Jehova na Alaeze ya. A gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume imezu ihe Abụ Ọma nke 117 na-ekwu site n’ịgba ndị ọzọ ume ‘ito Jaa.’

Mgbe nke ahụ gasịrị, onyeisi oche kpọpụtara Guy Pierce nke so n’Òtù Na-achị Isi. O kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Na-eme Mgbanwe, Ma Na-eguzosi Ike.” Okwu Chineke siri ike. A kpọrọ Jehova Chineke Oké Nkume na Deuterọnọmi 32:4, ma Okwu ya na-enye ohere maka ime mgbanwe ebe ọ bụ na e dere ya maka asụsụ na ọdịbendị nile—ee, maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. A dụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ ikwusa Okwu Chineke, na-ekwe ka ozi ya na-emetụ ndị mmadụ n’obi nakwa n’akọ na uche. (2 Ndị Kọrint 4:2) “Na-eguzosinụ ike maka ụkpụrụ ziri ezi, ma na-emenụ mgbanwe. Unu eledala ndị nọ n’ebe e kenyere unu ọrụ anya n’ihi na ọdịbendị ha dị iche,” ka Nwanna Pierce dụrụ n’ọdụ.

Karl Adams, otu n’ime ndị nkụzi Gilead, bụ́ onye nọworo na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 53, kwuru okwu n’isiokwu ahụ na-akpali iche echiche bụ́ “Ebee Ka Unu Ga-aga Ma Unu Si Ebe A Pụọ?” N’eziokwu, e kenyere di na nwunye 24 ahụ ọrụ ozi ala ọzọ ná mba 20 dị iche iche gburugburu ụwa, ma e welitere ajụjụ bụ́, Ozugbo unu ruru ebe ahụ ma hụ ya, gịnịzi ka unu ga-eme? Anyị bi n’ụwa nke àgwà ahụ erughị ala jupụtara. Ndị mmadụ na-achọ ịga ebe ndị ha na-agatụbeghị na ime ihe ndị ha na-emetụbeghị ná mgbalị iji mee onwe ha obi ụtọ. N’aka nke ọzọ, Jehova nyere ụmụ akwụkwọ ahụ ọrụ n’ebe ọ chọrọ ka ha nọrọ iji jiri achọghị ọdịmma onwe ha nanị na-elekọta “atụrụ” ya. Ha ekwesịghị ịdị ka ndị ahụ nọ n’Israel oge ochie bụ́ ndị ohere nke ịbụ ndị Jehova ji mee ihe n’ịgọzi ihe nile a kpọrọ mmadụ funahụrụ n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ha nanị. Kama nke ahụ, ha kwesịrị iṅomi Jisọs Kraịst, bụ́ onye ji achọghị ọdịmma onwe ya nanị mee uche Nna ya mgbe nile, onye rubekwara isi n’ọnọdụ nile o chere ihu.—Jọn 8:29; 10:16.

“Were Ihe Ndị Dị Omimi nke Chineke Dị Ka Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa” bụ isiokwu Wallace Liverance, bụ́ onye na-edeba aha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Ugboro ugboro, Akwụkwọ Nsọ na-eji Okwu Chineke atụnyere akụ̀ na ụba, akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa, ọla ndị dị oké ọnụ ahịa, na ihe ndị e ji kpọrọ ihe ma na-achọsi ike. Ilu 2:1-5 na-egosi na iji chọta “ihe ọmụma Chineke,” anyị aghaghị ịchọ ya dị ka “akụ̀ zoro ezo.” Ọkà okwu ahụ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha nọgide na-egwubami n’ime ihe ndị dị omimi nke Chineke ka ha na-eje ozi n’ebe ndị ọhụrụ e kenyere ha ọrụ. Nwanna Liverance chere echiche, sị: “Nke a dị irè, n’ihi na ọ na-ewulite okwukwe na obi ike n’ebe Jehova nọ, ọ ga-emekwa ka mkpebi unu mere ịnọgidesi ike n’ọrụ e nyere unu sikwuo ike. Ọ ga-enyere unu aka iji nkwenye siri ike na-ekwu okwu na ịbụ ndị ozizi dịkwu irè ka unu na-akọwara ndị ọzọ nzube Chineke.”

N’ịnọ ka a ga-asị na ha nọ n’ọnụ ụlọ klas, onye nkụzi ọzọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilead tụleghachiri otú Jehova si gọzie ozi ubi ụmụ akwụkwọ ahụ jere n’ime ihe karịrị ọnwa ise gara aga. Lawrence Bowen rụtụrụ aka n’ihe Pọl onyeozi kwuru n’Ọrụ 20:20 banyere ozi o jere maka ọha n’Efesọs, na-eme ka ọ pụta ìhè na Pọl ji ohere nile gbaa àmà. Ahụmahụ ụmụ akwụkwọ ahụ nwere na-egosi na, dị ka Pọl onyeozi, ndị ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke na onye agbata obi ha nọ na-akwali n’oge anyị adịghị ala azụ ma ọlị n’ikwu eziokwu ahụ na ikwe ka ike nke Okwu Chineke na-arụ ọrụ n’ebe ndị ọzọ nọ. Nke a na-eweta ngọzi bara ụba nke Jehova.

Ndị Nwere Ahụmahụ Ekwuo Okwu

N’oge ha na-agụ akwụkwọ, ụmụ akwụkwọ nọ na klas Gilead a ritere uru karịsịa site n’inwe ike iso ndị Kọmitii Alaka si n’ala 23, bụ́ ndị nọkwa n’Ebe Agụmakwụkwọ Patterson ahụ maka ọzụzụ pụrụ iche, kpakọrịta. Leon Weaver na Merton Campbell nke Ngalaba Ije Ozi gbara ndị dị iche iche so na Kọmitii Alaka ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha gụkwara akwụkwọ na Gilead. Ọ bụ ihe na-emesighachi obi ike nye ụmụ akwụkwọ ahụ nakwa ezinụlọ na ndị enyi ha ịnụ okwu site n’ọnụ ndị ozi ala ọzọ a nwere ahụmahụ.

Okwu ndụmọdụ a gwara klas ahụ na-agụsị akwụkwọ iji nyere ha aka ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọrụ e kenyere ha n’ala ọzọ gụnyere okwu ndị dị ka ndị a: “Na-enwenụ echiche ziri ezi. Ọ bụrụ na unu ahụ ihe bụụrụ unu nnọọ ihe ọhụrụ ma ọ bụ ihe unu na-apụghị ịghọta, unu adala mbà n’obi. Daberenụ n’ebe Jehova nọ”; “mụtanụ inweta obi ụtọ n’ihe unu nwere, ma nweenụ ntụkwasị obi na Jehova ga-enye unu ihe ndị dị unu mkpa ná ndụ.” Okwu ndị ọzọ e kwuru hiwere isi n’inyere ụmụ akwụkwọ ahụ aka ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ọrụ e kenyere ha. Okwu ụfọdụ e kwuru bụ: “Unu ejila ebe e kenyere unu ọrụ tụnyere ebe unu si bịa”; “mụtanụ asụsụ obodo ahụ ma na-asụnụ ya nke ọma ka unu wee nwee ike iso ndị mmadụ na-ekwurịta okwu”; “mụtanụ omenala na ọdịbendị nke ndị ebe ahụ, n’ihi na nke a ga-enyere unu aka ịnọgidesi ike n’ọrụ e nyere unu.” Okwu ndị a bụ ihe agbamume dị ukwuu nye ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ.

Mgbe a gbasịrị ajụjụ ọnụ ahụ, David Splane, onye bụbu onye ozi ala ọzọ na onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 42 nke Gilead ma na-eje ozi ugbu a dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, wulitere okwu ahụ bụ́ isi nke nwere isiokwu na-akpali mmasị bụ́ “Ụmụ Akwụkwọ Ka Ọ̀ Bụ Ndị Gụsịrị Akwụkwọ—Ole Nke?” Ọ jụrụ klas ahụ na-agụsị akwụkwọ, sị: “Olee otú unu ga-esi na-ele onwe unu anya ka unu na-aga n’ebe e kenyere unu ije ozi ala ọzọ? Ọ̀ bụ dị ka ndị gụsịrị akwụkwọ bụ́ ndị maara ihe nile banyere ozi ala ọzọ ka ọ̀ bụ dị ka ụmụ akwụkwọ bụ́ ndị ka nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta?” Nwanna Splane mere ka ọ pụta ìhè na onye gụsịrị akwụkwọ nke maara ihe na-ele onwe ya anya dị ka nwa akwụkwọ. Ndị ozi ala ọzọ ahụ kwesịrị inwe echiche bụ́ na onye ọ bụla ha zutere n’ozi ala ọzọ ha nwere ike ịkụziri ha ihe. (Ndị Filipaị 2:3) A gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume iso ndị ozi ala ọzọ ibe ha, alaka ụlọ ọrụ, na ọgbakọ ha na-emekọ ihe ọnụ. “Unu agafeela ule ikpeazụ unu, ma unu ka bụ ụmụ akwụkwọ. Meenụ ka o doo onye ọ bụla anya na unu bịara ka unu mụta ihe,” ka Nwanna Splane gbara ume.

Mgbe okwu a gasịrị, ụmụ akwụkwọ ahụ nwetara diplọma ha, a makwaara ndị na-ege ntị ọkwà ebe ndị e kenyere ha ọrụ. Ọ bụ oge na-emetụ n’ahụ nye ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ ka onye nnọchiteanya klas ahụ gụpụtaziri mkpebi nke ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ mere ikwe ka ihe ha mụtaworo site n’Okwu Chineke na-akpali ha ịrụ ọrụ ka ukwuu n’ozi dị nsọ.

Ndị nile bịaranụ ga-ekweta na ndụmọdụ ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ nwetara mere ka mkpebi ha mere igosipụta ịhụnanya n’ebe Chineke na onye agbata obi ha nọ sikwuo ike. O mekwara ka ha kpebisikwuo ike karịa ka ha metụworo inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ n’ebe e kenyere ha ọrụ ozi ala ọzọ.

[Igbe dị na peeji nke 25]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 10

Ọnụ ọgụgụ mba ndị e zigara ha: 20

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Nkezi afọ ndụ: 33.7

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 16.2

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12.5

[Foto dị na peeji nke 26]

Klas nke 109 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Collins, E.; Miles, L.; Alvarado, A.; Lake, J. (2) Van Dusen, L.; Biharie, A.; Heikkinen, H.; Koós, S.; Smith, H. (3) Ashford, J.; Ashford, C.; Boor, C.; Richard, L.; Wilburn, D.; Lake, J. (4) Chichii, K.; Chichii, H.; Ramirez, M.; Baumann, D.; Becker, G.; Biharie, S.; Ramirez, A. (5) Van Dusen, W.; Lemâtre, H.; Pisko, J.; Cutts, L.; Russell, H.; Johnson, R. (6) Becker, F.; Baumann, D.; Johnson, K.; Pifer, A.; Madsen, C.; Lemâtre, J.; Heikkinen, P. (7) Smith, R.; Russell, J.; Collins, A.; Pisko, D.; Wilburn, R.; Koós, G. (8) Cutts, B.; Boor, J.; Madsen, N.; Pifer, S.; Richard, E.; Miles, B.; Alvarado, R.