Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ozi Ọma nke Udo Erute n’Ala Ugwu Ugwu nke Chiapas

Ozi Ọma nke Udo Erute n’Ala Ugwu Ugwu nke Chiapas

Ozi Ọma nke Udo Erute n’Ala Ugwu Ugwu nke Chiapas

“Ná mgbuchapụ kasị njọ nke onye ọ bụla nọ na steeti Chiapas pụrụ icheta, otu ìgwè ndị ikom . . . ndị bu ngwá ọgụ gburu ndị nkịtị 45 bụ́ ndị na-enweghị nchebe, gụnyere ụmụ ọhụrụ 13.” Otú ahụ ka akwụkwọ akụkọ bụ́ “El Universal” si kọọ ihe mere n’obodo Acteal, Chiapas State, na December 22, 1997.

CHIAPAS bụ steeti kasị dịmie adịmie n’ebe ndịda Mexico, n’ókè ya na Guatemala. N’ihi ogologo oge nke ịda ogbenye na ịnọ n’ụkọ, otu ìgwè nke ụmụ amaala Maya Indian haziri agha nnupụisi na January 1994 n’aha bụ́ Ejército Zapatista de Liberación Nacional (EZLN, Ndị Agha Zapatista Maka Ntọhapụ nke Mba). Mkparịta ụka ndị e nwere maka idozi nsogbu ahụ n’ụzọ udo egbuwo oge. Mwakpo dị iche iche sitere n’aka ma ndị agha nnupụisi ma ndị agha gọọmenti, akpatawo nkwafu ọbara na ọnwụ. Oké ọgba aghara ahụ mere ka ọtụtụ ndị nkịtị nọ n’ógbè ahụ gbapụ maka nchebe.

N’ime ọnọdụ ndị a na-ejighị n’aka dị otú ahụ, e nwere otu ìgwè ndị hụrụ udo n’anya, bụ́ ndị nọgideworo na-anọpụ iche n’ọgụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ. N’ịnụ ọkụ n’obi, ha na-adọrọ uche mmadụ aga n’ebe Alaeze Chineke dị dị ka nanị olileanya e nwere maka idozi nsogbu ndị na-eche ndị mmadụ ihu, ma n’ógbè ha ma n’ụwa nile. (Daniel 2:44) Hà bụ ole ndị? Ha bụ Ndịàmà Jehova. N’irubere iwu Jisọs isi, ha na-agbalịsi ike iji ozi ọma Alaeze Chineke garuo n’akụkụ ndị kasị dịpụ adịpụ n’ala ugwu ugwu nke Chiapas. (Matiu 24:14) Olee ihe ọ dị ka ya ime nkwusa n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, gịnịkwa si na ya pụta?

“Abụ M Otu n’Ime Ndịàmà Jehova”

Adolfo, bụ́ nwa okorobịa ghọrọ onye nkwusa Alaeze n’oge na-adịbeghị anya, nọ na-arụ ọrụ n’otu ụbọchị n’ụlọ ọrụ redio dị n’Ocosingo. Na mberede, a kụrụ aka dara oké ụda n’ọnụ ụzọ. Otu ìgwè ndị ikom kpuchiri ihe n’ihu wabatara ma tụdochaa ya égbè n’isi. Ha wabanyere n’ebe a na anọ agbasa ozi n’ikuku, jichie ngwá ọrụ ahụ, ma maa ọkwa na redio na ha na-ebuso gọọmenti agha.

N’ichigharịkwuru Adolfo, ndị ikom ahụ bu ngwá ọgụ nyere ya iwu isonye n’òtù ha. “Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova,” ka Adolfo zaghachiri, ọ bụ ezie na e mebeghị ya baptism. Ọ kọwara na nanị olileanya e nwere maka udo bụ Alaeze Chineke, ọ jụwapụrụ isi ịnara yunifọm na égbè ha nyere ya. N’ịhụ nguzo ya siri ike, ha hapụrụ ya. Mgbe o chetara ihe ahụ merenụ, Adolfo kwuru, sị: “Ihe omume ahụ wusiri okwukwe m ike n’ezie.”

N’ikpeazụ, ọnọdụ bịara dị otú o kwesịrị, ma ógbè ahụ ka dịkwa n’aka ndị agha. N’agbanyeghị nke ahụ, Adolfo ji ọṅụ nakwere ọkpụkpọ òkù ndị okenye ọgbakọ ya kpọrọ ya ịga soro otu ìgwè nọpụrụ anọpụ nke ndị Kraịst n’ógbè ahụ na-eje ozi. N’ebe ndị a na-enyocha ndị mmadụ bụ́ ebe ndị ọ na-aghaghị isi gafee, ndị soja kwanyeere ya ùgwù mgbe ọ kọwara onwe ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. E mesịrị mee ya baptism, o nwewokwa afọ ojuju nke inyere ìgwè ahụ nọpụrụ anọpụ aka ịghọ ọgbakọ Ndịàmà Jehova. “Ugbu a e meworo m baptism,” ka Adolfo kwupụtara, “apụrụ m iji nkwenye zuru ezu kwuo na abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova!”

“Jehova Wusiri Anyị Ike”

N’oge na-adịghị anya mgbe òtù EZLN masịrị ọkwa na redio ibuso gọọmenti agha, ndị obodo ahụ gbapụrụ. Francisco, bụ́ onye ozi oge nile, ma ọ bụ ọsụ ụzọ, kọwara otú Jehova si wusie ya na nwunye ya ike n’ihe ha na-aghaghị ịnagide.

“Anyị kpebiri ịgbaba n’otu ógbè nke na-ewe njem ụkwụ awa atọ. Ọgbakọ dị n’ebe ahụ, n’ihi ya anyị na ụmụnna ga-anọ. N’oge na-adịghị anya, mgbakọ sekit anyị a ga-enwe na Palenque ruru. Mụ na nwunye m achọghị ka nzukọ pụrụ iche maka ndị ọsụ ụzọ kwaa anyị, ma anyị nụrụ na ndị òtù EZLN nọchiri ụzọ e si aga mgbakọ ahụ. Anyị kpebiri isi ụzọ oké ọhịa, bụ́ nke were anyị awa itoolu. Anyị ruru n’oge iji gaa nzukọ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ nke tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu, tinyere usoro ihe omume mgbakọ ahụ dum.

“Mgbe anyị lọtara, anyị hụrụ na a gbawo ụlọ anyị ọkụ, zurukwa anụ ụlọ anyị nile. Nanị ihe fọrọnụ bụ obere akpa uwe. Mfu anyị wutere anyị, ma ụmụnna ndị nọ n’Ocosingo ji obi ọma kpọbata anyị n’ebe obibi ha. Ha gosikwara anyị otú e si arụ ihe ndị anyị na-arụtụbeghị dị ka ndị ọrụ ubi. Otu nwanna nwoke kụziiri m ise foto, onye ọzọ kụziiri m ịrụzi akpụkpọ ụkwụ. Otú ahụ ka mụ na nwunye m siworo nwee ike ịkwado onwe anyị ruo ugbu a, n’akwụsịghị ozi ịsụ ụzọ. N’ịtụgharị uche n’ihe meworonụ, anyị pụrụ ịhụ na n’agbanyeghị na ọ dịghịrị anyị mfe ịtachi obi, Jehova wusiri anyị ike.”

Mkpụrụ nke Ọrụ Nkwusa Ahụ

Ndịàmà nọ na Chiapas State ekweghị ka ihe isi ike na ihe ize ndụ gbochie ha ikere òkè n’ime mgbalị pụrụ iche iji wegara ndị nọ n’ógbè ahụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, laa azụ n’April na May 1995, ha sonyeere ndị Kraịst ibe ha n’ụwa nile ná mkpọsa e ji kesaa Akụkọ Alaeze nke 34, nke nwere isiokwu kasị kwesị ekwesị bụ́ N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Jupụta Nnọọ ná Nsogbu?

N’oge mkpọsa ahụ—n’otu ebe a na-akpọ Pueblo Nuevo—otu onye ọsụ ụzọ oge nile, bụ́ Ciro, chọtara otu ezinụlọ gosiri mmasị. Ka ọ gaghachiri mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ maliteere ha ọmụmụ Bible. Ma mgbe Ciro na onye ibe ya gaghachiri iji soro ezinụlọ ahụ gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ, nwoke nwe ụlọ anọghị n’ụlọ. Kama, otu ìgwè ndị ikom kpuchiri ihe n’ihu nọ na-eche ya iji merụọ ya ahụ. Ha jụrụ Ciro na onye ibe ya ihe ha na-achọ ma yie ha egwu igbu ha. Mgbe ha kpegasịịrị Jehova ekpere n’ime obi ha, ndị Kraịst abụọ ahụ ji obi ike kọwaa na ha bịara ịkụziri ezinụlọ ahụ Bible. N’ihi nke ahụ, ndị ikom ahụ kpuchiri ihe n’ihu hapụrụ ha. N’ihi ihe ụfọdụ, nwoke nwe ụlọ alọtaghị n’ụbọchị ahụ.

Otu ụbọchị mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ gasịrị, o juru Ciro anya ịhụ nwoke ahụ n’ọnụ ụzọ ya. Lee ka Ciro si nwee obi ụtọ ịnụ na e meela ezinụlọ ahụ dum baptism nakwa na ha nọzi n’otu ọgbakọ dị na Guatemala! Ọbụna otu n’ime ụmụ ha ndị inyom na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile.

Inwe Ekele Maka Nri Ime Mmụọ

N’agbanyeghị ihe isi ike na-aga n’ihu na Chiapas, otu onye nlekọta distrikti kọrọ na Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ ghọtara n’ezie ịdị mkpa nke izukọta ọnụ. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ kọrọ ihe mere n’otu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na nso nso a, bụ́ nke e mere ndokwa ịmalite n’isi n’ụtụtụ ka ndị bịara wee nwee ike ịlaru n’ìhè mgbe ebe ọ bụla ka dịtụ jụụ. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ha aghaghị iji ụkwụ gaa ije ihe karịrị awa atọ site n’oké ọhịa iji rute ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ, ka ọ na-erule elekere 7 nke ụtụtụ, onye ọ bụla anọrọla anọrọ. N’ime ndị na-ege ntị ka e nwere mmadụ isii bụ́ ndị òtù EZLN, ha nọ na-ege ntị, na-akụkwa aka, o doro anya na ihe omume ahụ na-atọ ha ụtọ. Ha onwe ha kwa gara ije awa atọ iji gaa mgbakọ ahụ. Mmadụ 20 n’ime ha bịakwara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, bụ́ nke e mere n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ahụ.

Otu nwa okorobịa ọzọ bụ́ onye so n’òtù ndị agha okpuru ahụ ka ndị isi ya kenyere ọrụ ime mkpagharị n’otu ógbè dị n’oké ọhịa. Mgbe o rutere n’ógbè ahụ, ọ hụrụ na ndị nile bi na ya, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ́ Ndịàmà Jehova, agbapụwo. Ya mere, o biiri n’otu n’ime ụlọ ndị ahụ a gbahapụrụ agbahapụ. N’ịbụ onye na-enweghị ihe dị ukwuu ime, o weere ụfọdụ akwụkwọ ọ hụgasịrị n’ụlọ ahụ ma malite ịgụ ha. Ndị a mesịrị bụrụ akwụkwọ ndị Watch Tower bipụtara bụ́ ndị Ndịàmà ahụ hapụrụ. Ebe ọ nọ nanị ya, nwa okorobịa ahụ nwere ohere iji tụgharịa uche n’ihe ọ na-agụ. O kpebiri na ya aghaghị ịgbanwe ndụ ya ma chịsa ngwá ọgụ ya. Ọ chọtara Ndịàmà ahụ ngwa ngwa otú o nwere ike ma malite ọmụmụ Bible. N’ime ọnwa isii, o ziwara ndị ọzọ ozi ọma. Ya na mmadụ atọ ndị ọzọ bụ́ ndị òtù ezinụlọ ya, bụ́kwa ndị na-akwadobu òtù ndị agha okpuru ahụ, bụzi ndị Kraịst e mere baptism.

Ịhụ Akụkụ Dị Mma

Ọ bụ ezie na o wetara oké ihe isi ike, ọgụ ahụ nwere mmetụta dị mma n’àgwà ndị mmadụ n’ebe ọrụ nkwusa ahụ dị n’ezie. Otu okenye nọ kpọmkwem n’obodo ọgụ ahụ malitere na ya, kọrọ, sị: “Ihe dị ka ụbọchị ise mgbe ọgụ ahụ tiwapụsịrị, anyị haziri ọrụ nkwusa ma n’ime obodo ahụ ma ná mpụga ya. Ndị mmadụ nwere oké mmasị ige anyị ntị. Anyị nyefere ọtụtụ akwụkwọ e ji amụ Bible ma malite ọmụmụ Bible dị iche iche. N’otu ógbè, ọtụtụ ndị anọwo na-emegide eziokwu ahụ, ma n’ihi ọgụ ahụ, ha na-ege ntị ugbu a, na-amụ Bible, na-agakwa nzukọ na mgbakọ dị iche iche.”

Ụmụnna ndị ahụ nwere obi ụtọ na ha enwewo ike ịnọgide n’ihe omume ha nke ọchịchị Chineke n’agbanyeghị ọnọdụ ndị ahụ a na-ejighị n’aka. N’ịbụ nke ma ndị agha gọọmenti ma òtù EZLN maara banyere ya, ha nọgidere na-enwe mgbakọ ha dị iche iche, bụ́ ndị na-ewusi ha ike n’ụzọ ime mmụọ. Nleta nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị abụwokwa ihe mkpali dị ike iji nọgide n’ọrụ nkwusa ahụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, agbamume na-esite n’aka ọbụna ndị ahụ na-eburịta agha, bụ́ ndị na-agbakarị Ndịàmà ume ịnọgide n’ọrụ ime nkwusa ha.

Ọ bụ ezie na ule na ihe isi ike ndị ahụ ndị nọ na Chiapas tachiworo obi na ha ebelatatụla ka oge na-aga, ha abịabeghị ná njedebe. N’agbanyeghị nke ahụ, e ji otu ihe n’aka—Ndịàmà Jehova kpebisiri ike ịnọgide ná mgbalị ha iwegara ndị mmadụ ozi ọma nke udo sitere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’esepụghị aka. (Ọrụ 10:34-36; Ndị Efesọs 6:15) Ha ghọtara, dị ka Jeremaịa onye amụma kwuru, na “ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Nanị Alaeze Chineke nke dị n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, pụrụ iweta ihe ngwọta nye ikpe na-ezighị ezi na ịda ogbenye dị n’ụwa.—Matiu 6:10.

[Map dị na peeji 9]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ọwara Oké Osimiri Mexico

CHIAPAS

GUATEMALA

Oké Osimiri Pacific

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndịàmà, ka ha na-amalite ozi n’ala ugwu ugwu nke Chiapas