Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
“Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.”—MATIU 22:37.
1. (a) Olee ihe ụfọdụ onye Kraịst na-azụlite? (b) Olee àgwà ndị Kraịst nke kasị mkpa, n’ihi gịnịkwa?
ONYE Kraịst na-azụlite ọtụtụ ihe iji bụrụ onye ozi dị irè. Akwụkwọ Ilu na-eme ka uru ihe ọmụma, nghọta, na amamihe bara pụta ìhè. (Ilu 2:1-10) Pọl onyeozi tụlere mkpa okwukwe na olileanya siri ike dị. (Ndị Rom 1:16, 17; Ndị Kọlọsi 1:5; Ndị Hibru 10:39) Ntachi obi na njide onwe onye dịkwa oké mkpa. (Ọrụ 24:25; Ndị Hibru 10:36) Otú ọ dị, e nwere otu àgwà nke ọ ga-abụ, ọ bụrụ na ọ dịghị, ọ ga-ewepụ ihe n’àgwà ndị nke ọzọ nile, ọ pụkwara ọbụna ime ka ha ghara ịba uru. Àgwà ahụ bụ ịhụnanya.—1 Ndị Kọrint 13:1-3, 13.
2. Olee otú Jisọs si gosi mkpa ịhụnanya dị, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka nke a na-ewelite?
2 Jisọs gosipụtara mkpa ịhụnanya dị mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Ebe ọ bụ na ịhụnanya bụ akara e ji amata ezi onye Kraịst, ọ dị anyị mkpa ịjụ ajụjụ ndị dị ka, Gịnị bụ ịhụnanya? N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ oké mkpa nke na Jisọs kwuru na, karịa ihe ndị ọzọ nile, ọ bụ ihe e ji amata ndị na-eso ụzọ ya? Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ịhụnanya? Ole ndị ka anyị kwesịrị igosi ịhụnanya? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a.
Gịnị Bụ Ịhụnanya?
3. Olee otú a pụrụ isi kọwaa ịhụnanya, n’ihi gịnịkwa ka o ji agụnye ma uche ma obi?
3 Otú ụzọ e si kọwaa ịhụnanya bụ ‘mmetụta nke inwe nkekọ chiri anya ma ọ bụ mmetụta miri emi, inwe ezi mmasị n’ebe onye ọzọ nọ.’ Ọ bụ àgwà nke na-akpali ndị mmadụ ịrụ ọrụ maka ọdịmma ndị ọzọ, mgbe ụfọdụ, na-achụ ihe dị ukwuu n’àjà n’onwe ha. Ịhụnanya, dị ka e si kọwaa ya na Bible, na-agụnye ma uche ma obi. Uche, ma ọ bụ ọgụgụ isi, na-ekere òkè n’ihi na onye na-ahụ n’anya na-ama mgbe ọ na-egosi ya, na-aghọta na ya na ụmụ mmadụ ndị ọzọ ọ hụrụ n’anya nwechara adịghị ike nakwa àgwà ndị na-adọrọ adọrọ. Ọgụgụ isi na-ekere òkè ọzọ ebe ọ bụ na e nwere ndị onye Kraịst na-ahụ n’anya—mgbe ụfọdụ, ikekwe, ọ bụghị ọchịchọ ya—n’ihi na ọ maara site n’ọgụgụ ọ na-agụ Bible na Chineke chọrọ ka o mee otú ahụ. (Matiu 5:44; 1 Ndị Kọrint 16:14) Ma, ịhụnanya na-esite n’obi n’ụzọ bụ́ isi. Ezi ịhụnanya dị ka e si kpughee ya na Bible adịtụghị adabere nanị n’ọgụgụ isi. Ọ na-agụnye inwe ezi obi n’ụzọ miri emi na inwe mkpali mmetụta uche zuru ezu.—1 Pita 1:22.
4. N’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya si bụrụ ihe nkekọ dị ike?
4 Ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị adịghị enwekebe ezi mmekọrịta ịhụnanya n’ihi na onye na-ahụ n’anya na-adị njikere ibute ọdịmma nke onye ọzọ ụzọ. (Ndị Filipaị 2:2-4) Okwu Jisọs bụ́ na “ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe” bụ eziokwu karịsịa mgbe ọ bụ ịhụnanya kpaliri inye ihe ahụ. (Ọrụ 20:35) Ịhụnanya bụ ihe nkekọ dị ike. (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ na-agụnyekarị ọbụbụenyi, ma ihe nkekọ nke ịhụnanya na-esi ike karịa nke ọbụbụenyi. Mgbe ụfọdụ, a na-akọwa mmekọrịta ndọrọ mmekọahụ nke di na nwunye na-enwe dị ka ịhụnanya; otú ọ dị, ụdị ịhụnanya Bible na-agba anyị ume ịzụlite na-adịte aka karịa ndọrọ elu ahụ. Mgbe di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya n’ezie, ha na-anọgide na-anọkọ ọnụ ọbụna ma a sị na mmekọrịta anụ ahụ ekweghịzi omume n’ihi esighị ike nke ịka nká na-akpata ma ọ bụ n’ihi na otu n’ime ha nwere nkwarụ.
Ịhụnanya—Àgwà Dị Oké Mkpa
5. N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ àgwà dị oké mkpa nye onye Kraịst?
5 N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ àgwà dị oké mkpa nye onye Kraịst? Nke mbụ, ọ bụ n’ihi na Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu ịhụ ibe ha n’anya. O kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu emee ihe Mụ onwe m na-enye unu n’iwu. Ihe ndị a ka M na-enye unu n’iwu, ka unu wee hụrịta ibe unu n’anya.” (Jọn 15:14, 17) Nke abụọ, n’ihi na Jehova bụ ịhụnanya n’onwe ya, dị ka ndị na-efe ya ofufe, anyị kwesịkwara iṅomi ya. (Ndị Efesọs 5:1; 1 Jọn 4:16) Bible na-ekwu na ịmara Jehova na Jisọs bụ ndụ ebighị ebi. Ànyị pụrụ isi aṅaa kwuo na anyị maara Chineke ma ọ bụrụ na anyị adịghị agbalị ịdị ka ya? Jọn onyeozi chere echiche, sị: “Onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke; n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.
6. Olee otú ịhụnanya pụrụ isi mee ka akụkụ dị iche iche nke ndụ anyị guzozie?
6 O nwere ihe nke atọ mere ịhụnanya ji dị mkpa: Ọ na-enyere anyị aka ime ka akụkụ dị iche iche nke ndụ anyị dịzie adịzie, na-emekwa ka anyị jiri ezi ebumnobi na-eme ihe ndị anyị na-eme. Dị ka ihe atụ, ọ dị oké mkpa ịnọgide na-enweta ihe ọmụma nke Okwu Chineke n’esepụghị aka. Ihe ọmụma dị otú ahụ dị ka nri nye onye Kraịst. Ọ na-enyere ya aka itozu okè na ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke. (Abụ Ọma 119:105; Matiu 4:4; 2 Timoti 3:15, 16) Otú ọ dị, Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọmụma ihe na-afụli elu, ma ịhụnanya na-ewuli elu dị ka ụlọ.” (1 Ndị Kọrint 8:1) Ee e, ezi ihe ọmụma adịghị njọ. Ọ bụ anyị ka nsogbu si n’aka—anyị nwere ọchịchọ mmehie. (Jenesis 8:21) Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ịhụnanya bụ́ nke na-eme ka ihe guzozie, ihe ọmụma pụrụ ime ka ọ fụlie onwe ya elu, na-eche na ọ ka ndị ọzọ mma. Ọ gaghị adị otú ahụ ma ọ bụrụ na ọ bụ ịhụnanya na-akwali ya n’ụzọ bụ́ isi. “Ịhụnanya adịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” (1 Ndị Kọrint 13:4) Onye Kraịst nke ịhụnanya na-akwali anaghị adị mpako, ọbụna ma a sị na o nwere ihe ọmụma miri emi. Ịhụnanya na-eme ka ọ dị umeala n’obi, na-egbochikwa ya ịghara ịchọ imere onwe ya aha.—Abụ Ọma 138:6; Jemes 4:6.
7, 8. Olee otú ịhụnanya si enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa?
7 Pọl degaara ndị Filipaị akwụkwọ, sị: “Nke a ka m na-ekpekwa ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-ababigakwa ókè karị nke ukwuu n’ime mmazu na nghọta nile; ka unu wee [jide ihe ndị ka mkpa n’aka, NW].” (Ndị Filipaị 1:9, 10) Ịhụnanya ndị Kraịst ga-enyere anyị aka ịgbaso agbamume a bụ́ ijide ihe ndị ka mkpa n’aka. Iji maa atụ, tụlee okwu Pọl gwara Timoti: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya, agụụ ọrụ ọma na-agụ ya.” (1 Timoti 3:1) N’ime afọ ije ozi 2000, ọnụ ọgụgụ ọgbakọ e nwere n’ụwa nile ji 1,502 rịa elu, na-eme ka e nwee ngụkọta ọhụrụ bụ́ 91,487. N’ihi ya, e nwekwuru mkpa dị ukwuu maka ndị okenye, e kwesịkwara ịja ndị na-arụ ọrụ iji ruo eruo maka ihe ùgwù ahụ, mma.
8 Otú ọ dị, ndị na-arụ ọrụ iji ruo eruo maka ihe ùgwù nke ịbụ ndị nlekọta ga-anọgide na-enwe nguzo dị mma ma ọ bụrụ na ha eburu n’uche ihe bụ́ nzube nke ihe ùgwù dị otú ahụ. Nanị inwe ikike ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama abụghị ihe dị mkpa. Ọ bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova na ụmụnna ha nọ na-akwali ndị okenye bụ́ ndị na-eme Jehova obi ụtọ. Ha adịghị achọ ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ndị nwere ikike. Mgbe Pita onyeozi dụsịrị ndị okenye ọgbakọ ọdụ ịnọgide na-enwe ezi àgwà, o mesiri ike mkpa “obi dị umeala” dị. Ọ dụrụ ndị nile nọ n’ọgbakọ ọdụ, sị: “Wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke.” (1 Pita 5:1-6) Onye ọ bụla nke na-arụ ọrụ iji ruo eruo ga-eme nke ọma ịtụle ihe nlereanya nke imerime ndị okenye nọ gburugburu ụwa bụ́ ndị na-arụsi ọrụ ike, ndị dị obi umeala, ma si otú a bụrụ ngọzi nye ọgbakọ ha.—Ndị Hibru 13:7.
Ezi Ebumnobi Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi
9. Gịnị mere ndị Kraịst ji eburu ngọzi ndị Jehova kwere ná nkwa n’uche?
9 E nwere ụzọ ọzọ e si ahụ mkpa ịbụ ndị 1 Timoti 4:8) A na-enyere onye Kraịst nke kwenyesiri ike ná nkwa ndị a, nke e mekwara ka o kwere na Jehova “na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ,” aka ịnọgide na-esi ike n’okwukwe. (Ndị Hibru 11:6) Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-atụ anya mmezu nke nkwa Chineke ma na-ekwughachi ihe ahụ Jọn onyeozi kwuru: “Amen: bịa, Onyenwe anyị Jisọs.” (Mkpughe 22:20) Ee, ịtụgharị uche ná ngọzi ndị anyị ga-enweta n’isi nso ma ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi na-ewusikwu anyị ike ịtachi obi, dị nnọọ ka iburu n’uche “ọṅụ e debere n’ihu Ya” si nyere Jisọs aka ịtachi obi.—Ndị Hibru 12:1, 2.
ịhụnanya na-akwali dị. Bible na-ekwe nkwa na ndị ji ịhụnanya na-agbaso nsọpụrụ Chineke ga-enweta ngọzi ndị bara ụba ugbu a nakwa n’ọdịnihu, ngọzi ndị dị ebube n’ụzọ a na-apụghị ichetụ n’echiche. (10, 11. Olee otú ịbụ ndị ịhụnanya na-akwali si enyere anyị aka ịtachi obi?
10 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ọchịchọ anyị ibi n’ime ụwa ọhụrụ ahụ bụ nzube bụ́ isi anyị ji ejere Jehova ozi? Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịdị mfe anyị ịghara inwe ndidi ma ọ bụ afọ ojuju mgbe ihe tara akpụ ma ọ bụ ihe ụfọdụ aghara ime otú ma ọ bụ mgbe anyị tụrụ anya ha. Anyị pụrụ ịnọ n’oké ihe ize ndụ nke ịkpafu akpafu. (Ndị Hibru 2:1; 3:12) Pọl kwuru banyere onye bụbu enyi ya nke aha ya bụ Dimas, bụ́ onye hapụrụ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na “ọ hụrụ oge dị ugbu a n’anya.” (2 Timoti 4:10) Onye ọ bụla nke na-eje ozi nanị n’ihi ọdịmma onwe ya nanị nọ n’ihe ize ndụ nke ime otu ihe ahụ. Ha pụrụ ịbụ ndị ohere ndị e nwere ugbu a n’ụwa dọtara ma ghọọ ndị na-adịghị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà ugbu a maka olileanya nke ngọzi ndị ga-abịanụ.
11 N’agbanyeghị na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na ihe e bu pụta ụwa bụ́ inwe ọchịchọ inweta ngọzi ndị ga-abịa n’ọdịnihu na ahụ efe pụọ n’ọnwụnwa bụ́ nke a na-atụ anya ya, ọ bụ ịhụnanya na-eme ka anyị ghọtakwuo ihe ndị anyị kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ. Ọ bụ uche Jehova dị mkpa, ọ bụghị nke anyị. (Luk 22:41, 42) Ee, ịhụnanya na-ewuli anyị elu. Ọ na-eme ka anyị nwee afọ ojuju iji ndidi na-echere Chineke anyị, na-enwe afọ ojuju ná ngọzi ọ bụla o nyere anyị, na-enwekwa obi ike na mgbe oge ya ruru, anyị ga-enweta ihe nile o kweworo ná nkwa—na ihe karịrị nke ahụ. (Abụ Ọma 145:16; 2 Ndị Kọrint 12:8, 9) Ka ọ dịgodị, ịhụnanya na-enyere anyị aka ịnọgide na-eji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-eje ozi n’ihi na “ịhụnanya . . . [adịghị] achọ ihe nke aka ya.”—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.
Ole Ndị Ka Ndị Kraịst Kwesịrị Ịhụ n’Anya?
12. Dị ka Jisọs si kwuo, ole ndị ka anyị kwesịrị ịhụ n’anya?
12 Jisọs tụpụtara ụkpụrụ sara mbara banyere ndị anyị kwesịrị ịhụ n’anya mgbe o hotara okwu abụọ site n’Iwu Mosis. O kwuru, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke Matiu 22:37-39.
gị n’anya” nakwa, “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—13. Ànyị pụrụ isi aṅaa mụta ịhụ Jehova n’anya, n’agbanyeghị na anyị apụghị ịhụ ya anya?
13 Site n’ihe Jisọs kwuru, o doro anya na Jehova bụ onye mbụ anyị kwesịrị ịhụ n’anya. Otú ọ dị, anyị ebughị ịhụnanya gbara mkpọrọgwụ n’ebe Jehova nọ pụta ụwa. Anyị aghaghị ịzụlite nke ahụ azụlite. Oge mbụ anyị nụrụ banyere Ya, ihe anyị nụrụ dọtara anyị n’ebe ọ nọ. Nke nta nke nta, anyị mụtara otú o si kwadebere ihe a kpọrọ mmadụ ụwa. (Jenesis 2:5-23) Anyị mụtara otú o siworo mesoo ihe a kpọrọ mmadụ ihe, n’agbahapụghị anyị mgbe mbụ mmehie batara n’ezinụlọ mmadụ, kama o mere ihe iji gbapụta anyị. (Jenesis 3:1-5, 15) O ji obiọma mesoo ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe, n’ikpeazụkwa, o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya iji gbaghara anyị mmehie anyị. (Jọn 3:16, 36) Ihe ọmụma a anyị nwetakwuru mere ka ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ mụbaa. (Aịsaịa 25:1) Eze Devid sịrị na ya hụrụ Jehova n’anya n’ihi nlekọta ịhụnanya Ya. (Abụ Ọma 116:1-9) Taa, Jehova na-elekọta anyị, na-eduzi anyị, na-eme ka anyị sikwuo ike, na-agbakwa anyị ume. Ka anyị na-amụtakwu banyere ya, otú ahụ ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ na-emikwu emi.—Abụ Ọma 31:23; Zefanaịa 3:17; Ndị Rom 8:28.
Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Gosipụta Ịhụnanya Anyị?
14. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ bụ nke ezigbo ya?
14 N’ezie, ọtụtụ ndị gburugburu ụwa na-ekwu na ha hụrụ Chineke n’anya, ma ụzọ ha si eme omume na-emegide ihe ha na-azọrọ. Ànyị pụrụ isi aṅaa mara na anyị hụrụ Jehova n’anya n’ezie? Anyị pụrụ ịgwa ya okwu n’ekpere ma gwa ya mmetụta anyị na-enwe. Anyị pụkwara ime omume n’ụzọ na-egosipụta ịhụnanya anyị. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-edebe okwu [Chineke], ọ bụ n’ime onye ahụ ka e meworo ka ịhụnanya Chineke zuo okè n’ezie. N’ime nke a ka anyị maara na anyị nọ n’ime Ya.” (1 Jọn 2:5; 5:3) Tinyere ihe ndị ọzọ, Okwu Chineke na-agwa anyị ka anyị na-akpakọrịta ma na-ebi ndụ dị ọcha na nke omume ọma. Anyị na-ezere ihu abụọ, na-ekwu eziokwu, ma na-edebe echiche anyị ọcha. (2 Ndị Kọrint 7:1; Ndị Efesọs 4:15; 1 Timoti 1:5; Ndị Hibru 10:23-25) Anyị na-egosi ịhụnanya site n’inyere ndị nọ ná mkpa aka n’ụzọ ihe onwunwe. (1 Jọn 3:17, 18) Anyị adịghịkwa ala azụ ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova. Nke ahụ na-agụnye ikere òkè n’ọrụ nkwusa ozi ọma Alaeze ahụ zuru ụwa ọnụ. (Matiu 24:14; Ndị Rom 10:10) Irube isi n’Okwu Chineke n’ihe ndị dị otú ahụ bụ ihe àmà na-egosi na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ bụ nke ezigbo ya.
15, 16. Olee otú inwe ịhụnanya n’ebe Jehova nọ si metụta ndụ ọtụtụ mmadụ n’afọ gara aga?
15 Inwe ịhụnanya n’ebe Jehova nọ na-enyere ndị mmadụ aka ime ezi mkpebi. N’afọ gara aga, ịhụnanya dị otú ahụ kpaliri mmadụ 288,907 ịrara ndụ ha nye ya ma gosipụta mkpebi ahụ site na baptism ime mmiri. (Matiu 28:19, 20) Nraranye ha nwere nzube. Ọ kara akara mgbanwe ha mere ná ndụ ha. Dị ka ihe atụ, Gazmend so ná ndị bụ́ ọkachamara n’ịkụ basketball n’Albania. Ruo afọ ụfọdụ, ya na nwunye ya mụrụ Bible, n’agbanyeghịkwa ihe mgbochi ụfọdụ, ha mesịrị ruo eruo dị ka ndị nkwusa Alaeze. N’afọ gara aga, e mere Gazmend baptism, ọ bụ otu n’ime mmadụ 366 e mere baptism n’Albania n’afọ ije ozi 2000. Otu akwụkwọ akụkọ bipụtara otu isiokwu banyere ya ma kwuo, sị: “Ndụ ya nwere nzube, n’ihi nke a kwa, ya na ezinụlọ ya na-anụ ụtọ ụbọchị ndị kasị nye ha obi ụtọ ná ndụ. Ihe dịzi ya mkpa abụghị ịhụ ókè ọ pụrụ inwetaru ihe ná ndụ, kama nke ahụ, ọ bụ ókè ọ pụrụ inyeru ihe iji nyere ndị ọzọ aka.”
16 N’otu aka ahụ, e nyere otu nwanna nwanyị e mere baptism ọhụrụ nke na-arụrụ otu ụlọ ọrụ na-emepụta mmanụ ọkụ dị na Guam ọrụ, onyinye na-adọrọ adọrọ. Mgbe ọ nọsịrị n’ọkwá dị elu ruo ọtụtụ afọ, e nyere ya ohere n’ikpeazụ ịbụ nwanyị mbụ kemgbe ụlọ ọrụ ahụ malitere ga-abụ osote onyeisi oche n’ụlọ ọrụ ahụ. Otú ọ dị, ọ rarawo ndụ ya ugbu a nye Jehova. Ya mere, mgbe ya na di ya tụlesịrị okwu ahụ, nwanna nwanyị ọhụrụ ahụ jụrụ ịnara ọkwá ahụ, kama nke ahụ, o mere ndokwa maka ọrụ nwa oge ka o wee nwee ike inwe ọganihu ruo n’ịbụ onye ozi oge nile, ọsụ ụzọ. Ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ kpaliri ya ịchọ ijere ya ozi dị ka ọsụ ụzọ kama ịchụso akụ̀ na ụba nke ụwa a. N’ezie, n’ụwa nile, ịhụnanya dị otú ahụ kpaliri mmadụ 805,205 ikere òkè n’akụkụ dị iche iche nke ozi ọsụ ụzọ n’ime afọ ije ozi 2000. Lee ịhụnanya na okwukwe ndị ọsụ ụzọ ahụ gosipụtara!
Ndị A Kpaliri Ịhụ Jisọs n’Anya
17. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa nke ịhụnanya ka anyị na-ahụ n’ebe Jisọs nọ?
17 Jisọs bụ ihe atụ magburu onwe ya nke onye ịhụnanya kwaliri. N’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, ọ hụrụ Nna ya n’anya, ọ hụkwara ihe a kpọrọ mmadụ n’anya. Dị ka onye bụ́ amamihe n’onwe ya, o kwuru, sị: “Anọkwa m n’akụkụ [Jehova], dị ka onye ọkà: M wee bụrụ ihe na-atọ Ya ụtọ kwa ụbọchị, na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile; na-egwuri egwú n’elu ụwa dum mmadụ bi n’ụwa Ya; ihe na-atọ m ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Ilu 8:30, 31) Ịhụnanya Jisọs kpaliri ya ịhapụ ebe obibi ya n’eluigwe ma bụrụ onye a mụrụ dị ka nwa ọhụrụ na-apụghị ichebe onwe ya. O ji ndidi na obiọma mesoo ndị dị nwayọọ n’obi na ndị e wedara n’ala ihe ma hụsie anya n’aka ndị iro Jehova. N’ikpeazụ, ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Jọn 3:35; 14:30, 31; 15:12, 13; Ndị Filipaị 2:5-11) Lee ezi ihe nlereanya nke ezi nkwali nke ahụ bụ!
18. (a) Olee otú anyị si azụlite ịhụnanya n’ebe Jisọs nọ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka anyị si egosi na anyị hụrụ Jisọs n’anya?
18 Mgbe ndị nwere ọnọdụ obi dị mma gụrụ ihe ndekọ nke ndụ Jisọs n’Oziọma ndị ahụ ma tụgharịa uche n’ókè ngọzi ụzọ ikwesị ntụkwasị obi ya 1 Pita 1:8) Anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị mgbe anyị na-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ ma na-eṅomi ụzọ ndụ ya nke ịchụ onwe onye n’àjà. (1 Ndị Kọrint 11:1; 1 Ndị Tesalọnaịka 1:6; 1 Pita 2:21-25) N’April 19, 2000, e chetaara ngụkọta nke mmadụ 14,872,086 ihe ndị mere anyị ga-eji na-ahụ Jisọs n’anya mgbe ha gara Ememe Ncheta ọnwụ ya bụ́ nke a na-eme kwa afọ. Lee ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ahụ bụ! Leekwa ihe na-ewusikwu ike ọ bụ ịmara na ọtụtụ mmadụ nwere mmasị ná nzọpụta site n’àjà Jisọs! N’ezie, anyị bụ ndị ịhụnanya Jehova na Jisọs nwere n’ebe ha nọ na nke anyị nwere n’ebe ha nọ na-ewuli elu.
wetaara ha haruru, nke a na-eme ka ha nwee ịhụnanya miri emi n’ebe ọ nọ. Anyị onwe anyị taa dị ka ndị Pita gwara okwu mgbe o kwuru, sị: “[Jisọs bụ] Onye unu hụrụ n’anya, ọ bụ ezie na unu ahụghị Ya anya.” (19. Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ịhụnanya ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Jisọs kwuru na anyị kwesịrị iji obi, mkpụrụ obi, uche, na ike anyị dum hụ Jehova n’anya. Ma o kwukwara na anyị kwesịrị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị. (Mak 12:29-31) Ole ndị ka nke ahụ na-agụnye? Oleekwa otú ịhụ onye agbata obi anyị n’anya si enyere anyị aka ịnọgide na-enwe ezi nguzo na ebumnobi kwesịrị ekwesị? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
Ị̀ Na-echeta?
• N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ àgwà dị oké mkpa?
• Ànyị pụrụ isi aṅaa mụta ịhụ Jehova n’anya?
• Olee otú omume anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya?
• Olee otú anyị si egosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jisọs nọ?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]
Ịhụnanya na-enyere anyị aka iji ndidi na-echere maka ahụ efe
[Foto dị na peeji nke 12]
Oké àjà Jisọs chụrụ na-akpali anyị ịhụ ya n’anya