Ihe Ọjọọ Ndị Agha Kpatara
Ihe Ọjọọ Ndị Agha Kpatara
“N’AGHA, a dịghị enwe ndị mmeri,” ka otu onye bụbu soja nke so lụọ Agha Ụwa nke Abụọ kwuru. “A na-enwe nanị ndị e meriri emeri.” Ọtụtụ ndị ga-ekwenyere ya. Ihe agha na-efu dị egwu; ọ na-efu ma ndị meriri emeri ma ndị e meriri emeri ihe dị egwu. Ọbụna mgbe agha bisịrị, ọtụtụ nde mmadụ na-anọgide na-ata ahụhụ n’ihi ihe ọjọọ dị egwu ndị agha kpatara.
Ihe ọjọọ ndị dị aṅaa? Agha pụrụ ibibi ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ, na-eme ka ọnụ ọgụgụ buru ibu ghọọ ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ. Ọtụtụ ndị na-anwụghị na-ebu ọnyá ndị dị egwu n’ahụ, tinyere àpà nke uche. A pụrụ ịhapụ ọtụtụ nde mmadụ n’ụkọ ma ọ bụ ha pụrụ ịbụ ndị a manyere ịgba ọsọ ndụ. Ànyị pụrụ ichetụ n’echiche ịkpọasị na iru újú ndị na-aghaghị ịdịgide n’obi ndị lanarịrị agha dị otú ahụ?
Ihe Ọjọọ Ndị Na-akawanye Njọ
Obi mgbawa ndị agha na-akpatara ndị mmadụ na-anọgide ruo ogologo oge mgbe a chịsachara ngwá agha, ụda égbè akwụsị, ndị agha alaakwa n’ebe obibi ha. Ọgbọ ndị ga-abịa pụrụ ibu iwe gbamiri mkpọrọgwụ n’obi n’ebe ibe ha nọ. N’ụzọ dị otú a, ihe ọjọọ ndị otu agha kpatara pụrụ ịbụ isi ihe ga-akpata agha ọzọ.
Dị ka ihe atụ, Nkwekọrịta nke Versailles, bụ́ nke a bịanyere aka na ya na 1919 iji weta Agha Ụwa Mbụ ná njedebe n’ụzọ iwu kwadoro, kwuru ihe ụfọdụ Germany na-aghaghị ime bụ́ nke ụmụ amaala ya lere anya dị ka nke aka ike na nke ịchọ mmegwara. Dị ka The Encyclopædia Britannica si kwuo, ihe ndị e kwuru ná nkwekọrịta ahụ “kpasuru ndị Germany iwe ma nye aka ịkpalite ọchịchọ nke mmegwara.” Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, “iwe nkwekọrịta udo ahụ kpasuru nyere Hitler ebe mgbakwasị ụkwụ,” ọ bụkwa otu n’ime isi ihe ndị dugara n’Agha Ụwa nke Abụọ.
Agha Ụwa nke Abụọ malitere na Poland ma gbasaruo ógbè ndị Balkan. Ihe ọjọọ ndị si n’agbụrụ dị iche iche n’ógbè ahụ kpataara ibe ha n’afọ ndị 1940 nyere aka idozi ụzọ maka agha a lụrụ n’ógbè ndị Balkan n’afọ ndị 1990. “Ajọ ịkpọasị na mmegwara ahụ a nọgidere na-enwe aghọwo nke na-agawanye n’ihu, na-erute n’oge anyị a,” ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Die Zeit kwuru.
Ọ bụrụ na ihe a kpọrọ mmadụ ga-ebi n’udo, a ghaghị n’ezie imezi ihe ọjọọ ndị agha kpatara. Olee otú a pụrụ isi mezuo nke ahụ? Gịnị ka a pụrụ ime iji wepụ ịkpọasị na iru újú ahụ? Ònye pụrụ imezi ihe ọjọọ ndị agha kpatara?
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 2]
IHU AKWỤKWỌ: Fatmir Boshnjaku
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 3]
Foto U.S. Coast Guard
UN PHOTO 158297/J. Isaac