Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Mkpụrụ Obi Dum Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọnwụnwa

Iji Mkpụrụ Obi Dum Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọnwụnwa

Akụkọ Ndụ

Iji Mkpụrụ Obi Dum Na-eje Ozi n’Agbanyeghị Ọnwụnwa

DỊ KA RODOLFO LOZANO SI KỌỌ

A mụrụ m na Mexico, n’obodo Gómez Palacio, Durango State, na September 17, 1917. Mgbanwe Ọchịchị Mexico nọ na-aga n’ihu. Ọ bụ ezie na mgbanwe ọchịchị ahụ jedebere na 1920, a ka nọgidere na-enwe nsogbu n’ógbè ebe anyị bi ruo ọtụtụ afọ sochirinụ, na-eme ka ndụ sie nnọọ ike.

N’OTU oge, mgbe nne m nụrụ na ndị agha nnupụisi na usuu ndị agha gaje ịwakpo ibe ha, o dotere mụ na ụmụnne m ndị nwoke atọ na ndị nwanyị abụọ n’ime ụlọ ruo ọtụtụ ụbọchị. Anyị nwere ntakịrị ihe oriri, ana m echetakwa mgbe mụ na nwanne m nwanyị nke m tọrọ zoro n’okpuru ihe ndina. Mgbe nke ahụ gasịrị, nne m kpebiri ịkpọrọ anyị bụ́ ụmụaka gaa United States, bụ́ ebe nna m ga-abịakwute anyị mgbe e mesịrị.

Anyị rutere California na 1926, nwa obere oge tupu Oké Ndakpọ Akụ̀ na Ụba amalite na United States. Anyị gagharịrị n’ebe ọ bụla anyị pụrụ inweta ọrụ, n’ebe ndị dị ka Ndagwurugwu San Joaquin, Santa Clara, Salinas, na King City. Anyị mụtara ịrụ ọrụ n’ugbo na iwe ụdị mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri nile n’ubi. Ọ bụ ezie na m rụrụ ọrụ ike n’oge ntorobịa m, ọ bụ nnọọ oge obi ụtọ ná ndụ m.

Eziokwu Bible Erute M

Na March 1928, otu Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, letara anyị. Ọ bụ nwoke meworo agadi nke na-asụ asụsụ Spanish nke aha ya bụ Esteban Rivera. Aha akwụkwọ nta ọ hapụụrụ anyị bụ́, “Where Are the Dead?” (“Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?”), kpaliri mmasị m, dịkwa ka ihe ndị e kwuru n’ime ya mere. N’agbanyeghị na m dị obere, anọgidere m na-eso Ndị Mmụta Bible na-amụ Bible ma sorokwa ha na-akpakọrịta. Ka oge na-aga, nne m na nwanne m nwanyị bụ́ Aurora ghọkwara ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eto Jehova.

N’etiti afọ ndị nke 1930, e wuru otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na San Jose maka ọgbakọ na-asụ Bekee. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị si Spain na-arụ ọrụ n’ugbo ndị dị n’ógbè ahụ, anyị malitere ikwusara ha ozi ọma na inwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Anyị mere nke a site n’enyemaka nke Ndịàmà bụ́ ndị Spain si San Francisco, ihe ji ihe dị ka kilomita 80 dịpụ adịpụ. Ka oge na-aga, anyị nwere ihe dị ka mmadụ 60 na-abịa nzukọ ndị e ji asụsụ Spanish eduzi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị na San Jose.

N’ikpeazụ, na February 28, 1940, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site na baptism ime mmiri ná mgbakọ e nwere na San Jose. N’afọ sochirinụ, a họpụtara m dị ka onye ọsụ ụzọ, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. E mesịa, n’April 1943, a kpọrọ m ịkwaga na Stockton, bụ́ obodo ji ihe dị ka kilomita 130 dịpụ adịpụ, iji guzobe ọgbakọ na-asụ Spanish. N’oge ahụ, anọ m na-eje ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ Bekee dị na San Jose, anọkwa m na-elekọta Ndịàmà na-asụ asụsụ Spanish n’ebe ahụ. Mgbe m mesịrị ndokwa ka ndị ọzọ buru ibu ọrụ ndị a, akwagara m Stockton.

E Lee Iguzosi Ike n’Ezi Ihe M Ule

Malite na 1940, a kpọrọ m ugboro ugboro n’ihu òtù na-ahụ maka ịkpọba mmadụ n’usuu ndị agha, ma n’oge nke ọ bụla, a kwanyeere ọjụjụ m ji akọ na uche jụ ùgwù. N’oge na-adịghị anya mgbe United States banyesịrị n’agha ụwa nke abụọ na December 1941, nrụgide nke òtù ahụ na-ahụ maka ịkpọba mmadụ n’usuu ndị agha rịrị elu. N’ikpeazụ, na 1944, a tụrụ m nga. Ka m na-echere ka a maa m ikpe, e tinyekọtara mụ na ndị omekome n’ụlọ nke dị n’okpukpu ime ala. Mgbe ha nụrụ na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọtụtụ n’ime ha jụrụ ajụjụ banyere otú mpụ ndị ha meworo pụrụ isi metụta ọnọdụ ha n’ebe Chineke nọ.

Ụmụnna ndị nọ na San Jose kwụrụ ụgwọ mgbapụta m ka e wee hapụ m, ruo mgbe a ga-ekpe m ikpe. Otu ọkàiwu nọ na Los Angeles bụ́ onye na-ekwuchitere ndị na-azara ọnụ ha n’okwu ndị metụtara ihe ndị ruuru mmadụ nakweere okwu m n’anaghị ego. Ọkàiwu ahụ kpebiri ime ka m nwere onwe m nanị ma m kwụsị ịsụ ụzọ, nara ọrụ ego, ma na-aga egosi onwe m n’ihu ndị ọchịchị mba ahụ kwa ọnwa. Anabataghị m mkpebi ahụ, ya mere a tụrụ m mkpọrọ afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ McNeil Island nke dị na Washington State. N’ebe ahụ eji m oge m duzie ọmụmụ Bible kpụ ọkụ n’ọnụ. Amụtakwara m iji ígwè typewriter ede ihe. N’ihe na-erughị afọ abụọ, a tọhapụrụ m n’ihi ezi àgwà m. Emere m ndokwa ozugbo ịga n’ihu n’ozi ịsụ ụzọ.

Ọrụ E Mere Ka Ọ Sakwuo Mbara

N’oge oyi nke 1947, e kenyere mụ na otu onye ọsụ ụzọ ibe m ịrụ ọrụ n’etiti ndị na-asụ Spanish bi na Colorado City, Texas. Ma oyi na-atụ n’ebe ahụ nke ukwuu nke na anyị gara San Antonio iji nwetatụ okpomọkụ. Otú ọ dị, mmiri zoro nke ukwuu n’ebe ahụ nke na ọ kwụsịrị ozi ụlọ n’ụlọ anyị. N’oge na-adịghị anya, ego anyị gwụrụ. Ruo ọtụtụ izu anyị tara bred e tinyere akwụkwọ nri na tii alfalfa. Onye mụ na ya na-asụkọ ụzọ lara, ma anọgidere m. Mgbe Ndịàmà ahụ na-asụ Bekee matara banyere mkpa anụ ahụ ndị m nwere, ha malitere inyere m aka.

N’oge opupu ihe ubi sochirinụ, alaghachiri m n’ọrụ m na Colorado City, n’ikpeazụkwa, e guzobere otu obere ọgbakọ na-asụ Spanish. E mesịa, akwagara m Sweetwater, Texas, bụ́ ebe m nyere aka guzobe ọgbakọ ọzọ na-asụ Spanish. Mgbe m nọ na Sweetwater, enwetara m akwụkwọ ozi nke e ji kpọọ m ịga klas nke 15 nke Watchtower Bible School of Gilead maka ọzụzụ ozi ala ọzọ nke malitere na February 22, 1950. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’oge okpomọkụ ahụ ná mgbakọ mba nile nke e nwere n’Ámá Egwuregwu Yankee dị na New York City, anọrọ m n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn ruo ọnwa atọ. N’ebe ahụ, enwetara m ọzụzụ maka ọrụ m na-aga ịrụ n’alaka ụlọ ọrụ Mexico.

Ịrụ Ọrụ na Mexico

Erutere m Mexico City n’October 20, 1950. N’ihe dị ka izu abụọ mgbe e mesịrị, a họpụtara m ịbụ onye nlekọta alaka, bụ́ ọrụ m rụrụ ruo afọ anọ na ọkara. Ahụmahụ m nwetaworo n’ozi ọsụ ụzọ, n’ụlọ mkpọrọ, na Gilead, nakwa na Brooklyn bịara bụrụ ihe bara nnọọ uru. Mgbe m rutere Mexico, ahụrụ m ngwa ngwa mkpa ọ dị iwulite ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Mexico. E nwere mkpa karịsịa n’inyere ha aka ijigide ụkpụrụ omume ndị dị elu nke Okwu Chineke.

Ná mba ndị dị na Latin America, gụnyere Mexico, ọ bụ omenala bụ́ nwoke na nwanyị ibikọ ọnụ n’alụghị di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Okpukpe Krisendọm, karịsịa Chọọchị Roman Katọlik, ekwewo ka omume a Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị dịgide. (Ndị Hibru 13:4) N’ihi ya, ụfọdụ aghọwo ndị òtù nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova, n’agbanyeghị na ha alụghị di na nwunye n’ụzọ iwu kwadoro. Ugbu a e mere ndokwa inye ndị dị otú ahụ ọnwa isii iji debanye alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro. Ma ọ́ bụghị ya, a gaghịzi ewere ha dị ka Ndịàmà Jehova.

Nye ọtụtụ ndị, imezi ndụ ha dịịrị ha mfe. Nanị ihe ọ dị ha mkpa ime bụ idebanye mmekọrịta ha na-enwe n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro site n’ịlụrịta di na nwunye. Ndị ọzọ nwere ọnọdụ ndị siri ike karị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ alụwo di ma ọ bụ nwunye ugboro abụọ, ọbụnakwa ugboro atọ, n’adịbeghị mgbe ha nwetara akwụkwọ ịgba alụkwaghịm iwu kwadoro. Mgbe ọnọdụ alụmdi na nwunye nke ndị Jehova mechara kwekọọ n’ozizi nke Okwu Chineke, e nwetara ngọzi ime mmụọ magburu onwe ha n’ọgbakọ dị iche iche.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.

N’oge ahụ, ọnọdụ agụmakwụkwọ na Mexico dị ala n’ozuzu ya. Ọbụna tupu mụ erute na 1950, alaka ụlọ ọrụ ebidolarị ịhazi klas ebe ndị a na-amụ ịgụ na ide ihe n’ọgbakọ dị iche iche. Ugbu a, a hazigharịrị klas ndị a, e mekwara ndokwa idebanye ha n’akwụkwọ n’aka gọọmenti. Kemgbe 1946, bụ́ mgbe a malitere ime ihe ndekọ, a kụziworo ihe karịrị mmadụ 143,000 nọ na Mexico ịgụ na ide ihe na klas ndị Ndịàmà na-eduzi!

Iwu ndị dị na Mexico siri ike nke ukwuu n’ihe metụtara okpukpe. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwewo mgbanwe ndị dị mkpa n’akụkụ a. Na 1992, e mere iwu ọhụrụ banyere ihe omume okpukpe, ya mere na 1993, e debanyere Ndịàmà Jehova nọ na Mexico n’akwụkwọ dị ka òtù okpukpe.

Mgbanwe ndị a abụwo ihe ọṅụ dị ukwuu nye m, bụ́ ihe m pụrụ ichewo na ọ gaghị ekwe omume na mbụ. Ruo ọtụtụ afọ, agara m n’ọfịs ndị ọchịchị ugboro ugboro ma bụrụ onye e mesoro ihe n’ụzọ mere ka m ghara ịtụkwasị ndị nọ n’ebe ahụ obi. Otú ọ dị, ọ dị mma ịhụ otú Ngalaba Okwu Ikpe dị n’alaka anyị siworo hụ maka okwu ndị ahụ, nke na ugbu a ọ bụ nnọọ obere ihe mgbochi ka anyị na-enweta n’ọrụ nkwusa ahụ.

Iso Nwunye Bụ́ Onye Ozi Ala Ọzọ Na-eje Ozi

Mgbe m rutere Mexico, e nweelarị ọtụtụ ndị gụsịrị akwụkwọ na klas Gilead ndị bu ụzọ ná mba ahụ. Otu n’ime ndị a bụ Esther Vartanian, bụ́ Onyeàmà si Armenia nke malitere ịsụ ụzọ na Vallejo, California, na 1942. Anyị lụrụ na July 30, 1955, mgbe nke ahụ gasịkwara, anyị gara n’ihu n’ọrụ anyị na Mexico. Esther nọgidere n’ọrụ ozi ala ọzọ na Mexico City, anyị bikwa n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, bụ́ ebe m nọgidere na-eje ozi.

Na 1947, Esther rutere n’ebe mbụ e kenyere ya ọrụ na Monterrey, Nuevo León, Mexico. E nwere nanị otu ọgbakọ nke Ndịàmà 40 mejupụtara na Monterrey, ma ka ọ na-erule oge e zigara ya Mexico City na 1950, e nwere ọgbakọ anọ n’ebe ahụ. N’alaka anyị dị nso na Mexico City, e nwere ugbu a mmadụ abụọ bụ́ ndị ikwu nke ezinụlọ ndị Esther mụụrụ Bible mgbe ọ nọ na-eje ozi na Monterrey.

Laa azụ na 1950, ókèala ndị ozi ala ọzọ nọ na Mexico City na-eme nkwusa na ya gụnyere akụkụ ka ukwuu nke obodo ukwu ahụ. Ha na-eji ụkwụ ma ọ bụ bọs kara nnọọ nká nke ndị mmadụ fajuru n’ime ya na-agazu ebe e kenyere ha ọrụ. Mgbe m rutere n’ebe ahụ ná ngwụsị 1950, e nwere ọgbakọ asaa. Ugbu a ha amụbawo ruo ihe dị ka 1,600, na-enwe ihe karịrị nnọọ ndị nkwusa Alaeze 90,000 na Mexico City, n’afọ gara aga kwa, ihe karịrị mmadụ 250,000 bịara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’ebe ahụ! N’afọ ndị gafeworonụ, mụ na Esther enwewo ihe ùgwù nke ije ozi n’ọtụtụ n’ime ọgbakọ ndị a.

Mgbe mụ na Esther malitere ọmụmụ Bible, anyị na-agbalịkarị ịdọta mmasị nna nke ezinụlọ ahụ ka ezinụlọ ahụ nile wee kere òkè. N’ụzọ dị otú a, anyị emewo ka ọtụtụ ezinụlọ buru ibu bịa jeere Jehova ozi. Ekweere m na otu n’ime ihe ndị mere ezi ofufe ji enwe uto dị ngwa na Mexico bụ na ezinụlọ nile na-esonyekọta ọnụ mgbe mgbe n’ezi ofufe.

Jehova Agọziwo Ọrụ Ahụ

Kemgbe 1950, ọganihu nke ọrụ ahụ na Mexico abụwo nke dị ịrịba ama, ma n’ihe banyere mmụba n’ọnụ ọgụgụ ma n’ihe banyere mgbanwe ná nhazi. Ọ bụ ihe obi ụtọ n’ezie ikerewo òkè n’ụzọ dị nta ná mmụba ahụ, soro mmadụ ndị dị otú ahụ na-emesapụ aka ma na-enwe obi ụtọ na-arụkọ ọrụ.

Karl Klein, bụ́ onye na-eje ozi dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, na nwunye ya, bụ́ Margaret, letara anyị mgbe ha nọ n’ezumike n’ụfọdụ afọ gara aga. Nwanna Klein chọrọ ịmata otú ọrụ anyị na-arụ n’ókèala Mexico si na-aga, ya mere ya na Margaret bịara n’Ọgbakọ San Juan Tezontla, nke dị nso na Mexico City, bụ́ ebe anyị nọ na-aga n’oge ahụ. Ụlọ nzukọ anyị dị obere, ihe dị ka mita 4.5 n’obosara na mita 5.5 n’ogologo. Mgbe anyị rutere, ihe dị ka mmadụ 70 anọrọlarị ebe ahụ, ọ dịghịkwa ebe mmadụ ga-eguzo ọtọ fọdụrụnụ. Ndị agadi nọ n’oche, ndị na-akatabeghị ahụ nọ na bench, ụmụntakịrị nọkwa na blọk ma ọ bụ n’ala ụlọ.

A kpaliri nnọọ mmasị Nwanna Klein n’ihi na ụmụaka ahụ nile kpacha Bible ha n’aka, ha na-esokwa ọkà okwu asapeta akụkụ Bible. Mgbe okwu ihu ọha gasịrị, Nwanna Klein kwuru okwu dabeere na Matiu 13:19-23 ma kwuo na na Mexico e nwere nnọọ “ala ahụ dị mma” nke Jisọs kwuru banyere ya. Ka ọ dị ugbu a, asaa n’ime ụmụaka ndị ahụ nọ ya n’ụbọchị ahụ, na-arụ ọrụ ná nnukwu ihe owuwu a na-ewu iji gbasawanye alaka anyị nke dị nso na Mexico City. Ọzọ na-eje ozi na Betel, ọtụtụ ndị ọzọ bụkwa ndị ọsụ ụzọ!

Mgbe m bịara Mexico City, e nwere nanị mmadụ 11 n’alaka anyị. Ugbu a, anyị nwere ihe dị ka mmadụ 1,350 na-arụ ọrụ n’ebe ahụ, ndị ihe dị ka mmadụ 250 n’ime ha na-arụ ọrụ ihe owuwu nke alaka ọhụrụ. Mgbe a ga-arụcha ọrụ nile a, ikekwe na 2002, anyị ga-enwe ike ịnabatakwu ihe dị ka mmadụ 1,200 n’alaka anyị e wusawanyere ewusawanye. Leenụ, na 1950 anyị nwere ihe dị ala karịa ndị nkwusa Alaeze 7,000 ná mba a dum, ma ugbu a anyị nwere ihe karịrị nnọọ 500,000! Ọṅụ na-eju m obi ịhụ ụzọ Jehova siworo gọzie mgbalị ndị ụmụnna anyị ndị Mexico dị obi umeala tinyeworo, bụ́ ndị na-arụsi nnọọ ọrụ ike inye ya otuto.

Iche Ihe Ịma Aka Dị Ukwuu Ihu

Otu n’ime ihe ịma aka kasị ukwuu m nwere na nso nso a abụwo nrịanrịa. N’ozuzu, abụwo m onye ahụ gbasiri ike. Ma na November 1988, enwere m ọrịa strok nke metụtara ike ọkpụkpụ aka m. Ekele dịrị Jehova, site ná mmega ahụ na usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ, agbakewo m ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, ma akụkụ ụfọdụ nke ahụ m adịghị eme otú m ga-achọwo ka ha na-eme. Anọgidewo m na-anara ọgwụgwọ na nlekọta ahụ ike iji zere oké isi ọwụwa na ihe ndị ọzọ na-alabeghị.

Ọ bụ ezie na apụghịzi m ime dị ka m ga-achọwo ime, ana m enweta afọ ojuju n’ịmara na enwewo m ike inyere ọtụtụ ndị aka ịmụta banyere nzube Jehova nakwa ịghọ ndị ozi ya raara onwe ha nye. Ana m enwekwa ọṅụ isoro ọtụtụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-ekwurịta okwu mgbe ha letara alaka anyị; ana m enwe mmetụta na anyị na-agbarịta ibe anyị ume.

Ịmara na Jehova na-enwe ekele maka ozi anyị na-ejere ya nakwa na ihe anyị na-eme abụghị n’efu ewusiwo m ike nke ukwuu. (1 Ndị Kọrint 15:58) N’agbanyeghị erughị eru m na nrịanrịa m, eburuwo m n’uche okwu ahụ dị ná Ndị Kọlọsi 3:23, 24, bụ́: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ; ebe unu matara na ọ bụ n’aka Onyenwe anyị ka unu ga-anata ihe nnyeghachi unu, bụ́ ihe nketa ahụ.” N’ikwekọ na ndụmọdụ a, amụtawo m iji mkpụrụ obi dum na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ọnwụnwa.

[Foto dị na peeji nke 24]

Na 1942 mgbe m bụ ọsụ ụzọ

[Foto dị na peeji nke 24]

Nwunye m malitere ọrụ ozi ala ọzọ ya na Mexico na 1947

[Foto dị na peeji nke 24]

Mụ na Esther taa

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

N’elu aka ekpe: Ezinụlọ Betel anyị dị na Mexico na 1952, ọ bụ m nọ n’ihu

N’elu elu: Ihe karịrị mmadụ 109,000 zukọrọ n’ámá egwuregwu a dị na Mexico City maka mgbakọ distrikti na 1999

N’ala aka ekpe: Ihe owuwu alaka ọhụrụ anyị nke na-abịaru ná ngwụsị ugbu a