Imezi Ihe Ọjọọ Ndị Agha Kpatara
Imezi Ihe Ọjọọ Ndị Agha Kpatara
ABRAHAM so n’usuu ndị agha nzuzo ruo afọ 20. * Ma ọ kwụsịwo ịlụ agha, ọ gaghị agakwa agha ọzọ ma ọlị. N’ezie, ụfọdụ n’ime ndị bụbu ndị iro ya bụzi ezi ndị enyi ya. Gịnị mere ka ọ gbanwee? Ọ bụ Bible. O mere ka Abraham nwee olileanya na nghọta, na-enyere ya aka ile ihe omume mmadụ anya n’ụzọ Chineke si ele ya. Bible wepụrụ ọchịchọ ya nke ịlụ ọgụ, ya amalitekwa iwepụ iru újú, ịkpọasị, na iwe n’obi ya. Ọ chọpụtara na Bible nwere ọgwụ dị ire maka obi.
Olee otú Bible si enyere mmadụ aka imezi mmetụta uche e bibiri ebibi? Ọ pụghị ịgbanwe ihe meworo Abraham. Ma, ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke mere ka echiche ya kwekọọ na nke Onye Okike. O nweziri olileanya maka ọdịnihu, o nwekwara ihe ọhụrụ ndị ọ na-ebute ụzọ. Ihe ndị dị Chineke mkpa aghọwo ihe ndị dị ya mkpa. Ozugbo nke a malitere ime, ihe ọjọọ ndị dị ya n’obi malitere ịpụsị. Ọ bụ otú ahụ ka e si nyere Abraham aka ịgbanwe.
E Mere Ka O Tinye Isi n’Agha Obodo
A mụrụ Abraham n’afọ ndị 1930 n’Africa. Mgbe agha ụwa nke abụọ gasịrị, otu mba dị ike ha na ha gbara chịrị mba ya, ma ọtụtụ ndị nọ ná mba Abraham chọrọ nnwere onwe. Na 1961, Abraham sonyere òtù na-alụ ọgụ maka nnwere onwe bụ́ nke lụrụ agha okpuru megide mba ahụ dị ike ha na ha gbara.
“Ha bụ ndị iro anyị. Ha mere atụmatụ igbu anyị, ya mere anyị gara igbu ha,” ka Abraham na-akọwa.
Ndụ Abraham na-anọkarị n’ihe ize ndụ, ya mere na 1982, mgbe afọ 20 nke ịlụ agha gasịrị, ọ gbagara Europe. Ka ọ dị ugbu a, ọ nọ n’afọ ndụ ndị 40 ya, n’ịbụ onye nwere ohere, ọ tụlere ndụ ya. Gịnị meworo ihe mgbaru ọsọ ya dị iche iche? Gịnị ka ọdịnihu ga-abụ? Abraham zutere ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova ma malite ịga nzukọ ha. O chetara na n’afọ ụfọdụ ndị gara aga n’Africa, ọ gụwo otu traktị otu Onyeàmà nyere ya. Traktị ahụ kọrọ banyere paradaịs na-abịanụ n’elu ala na ọchịchị eluigwe nke ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ. Hà pụrụ n’ezie ịbụ eziokwu?
Abraham na-ekwu, sị: “Site na Bible, amụtara m na afọ nile ahụ e ji lụọ agha lara n’iyi. Ọchịchị nke nanị ya ga-emeso onye ọ bụla ihe n’ụzọ ziri ezi bụ Alaeze Chineke.”
N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị Abraham baptism dị ka Onyeàmà Jehova, otu nwoke aha ya bụ Robert si Africa gbaga n’obodo Europe ahụ Abraham bi. Robert na Abraham alụwo ọgụ n’otu agha ahụ kama ha anọghị n’otu akụkụ. Mgbe mgbe, Robert echewo banyere ihe bụ́ nzube nke ndụ n’ezie. Ọ bụ nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe, n’ịbụkwa onye gụworo akụkụ ụfọdụ nke Bible, ọ maara na aha Chineke bụ Jehova. Mgbe Ndịàmà si n’ọgbakọ Abraham kwuru ka ha nyere Robert aka ịghọta Bible n’ụzọ ka mma, o kweere ozugbo.
Robert na-akọwa, sị: “Kpọmkwem site ná mmalite, ụzọ Ndịàmà ahụ si jiri aha Jehova na Jisọs na-eme ihe, na-ekweta na ha abụọ abụghị otu onye, masịrị m. Nke ahụ kwekọrọ n’ihe m maaralarịị site na Bible. Ndịàmà ahụ na-ejikwa ejiji n’ụzọ dị mma n’anya, na-emesokwa ndị ọzọ ihe n’ụzọ obiọma n’agbanyeghị mba ha si na ya. Ihe ndị dị otú ahụ nwere mmetụta miri emi n’ebe m nọ.”
Ndị Iro Aghọọ Ndị Enyi
Robert na Abraham, ndị bụbu ndị iro, bụzi ezi ndị enyi. Ha na-eje ozi dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. “N’oge agha ahụ, ana m echekarị otú o si kwe omume ndị si ná mba ndị gbara agbata obi—ndị ọtụtụ n’ime ha nọ n’otu okpukpe—ịkpọ ibe ha asị,” ka Abraham na-akọ. “Mụ na Robert nọbu n’otu chọọchị, ma anyị lụrụ agha megide ibe anyị. Ugbu a anyị abụọ bụ Ndịàmà Jehova, okwukwe anyị emewokwa ka anyị dị n’otu.”
“Nke ahụ bụ ọdịiche dị na ya,” ka Robert na-agbakwụnye. “Anyị nọzi n’okpukpe nke na-eme ka anyị bụrụ akụkụ nke òtù ụmụnna bụ́ ezigbo ya. Anyị agaghị eje agha ọzọ ma ọlị.” Bible enwewo mmetụta dị ike n’obi ndị a bụbu ndị iro. Ịkpọasị na obi ilu ejiriwo nke nta nke nta nyere ntụkwasị obi na ọbụbụenyi ohere.
N’otu oge ahụ Abraham na Robert nọ n’agha, ọ dị ụmụ okorobịa abụọ ọzọ nọ n’akụkụ dịgasị iche nke ọgụ ọzọ dị n’etiti mba abụọ gbara agbata obi. N’oge na-adịghị anya, Bible rụrụ ọrụ dị ka ọgwụ dị nnọọ irè iji gwọọkwa obi ha. N’ụzọ dị aṅaa?
Gbuo—Nwụzie n’Ihi Okwukwe Gị
A kụziiri Gabriel, bụ́ onye a zụlitere n’ezinụlọ ji okpukpe kpọrọ ihe, na ala nna ya nọ n’ihe mgbu nke agha dị nsọ. N’ihi ya, mgbe ọ gbara afọ 19, o wepụtara onwe ya maka ije ozi agha ma rịọ ka e ziga ya n’ihu agha. Ọ nọ n’ebe ọgụ kasị kpụrụ ọkụ n’ọnụ ruo ọnwa 13, mgbe ụfọdụ ọ na-anọ nanị otu kilomita na ọkara site n’ebe ndị iro nọ. “Ana m echeta otu oge kpọmkwem,” ka ọ na-ekwu. “Ọchịagha anyị gwara anyị na ndị iro ga-eme mwakpo n’abalị ahụ. A kpaliri anyị nke ukwuu nke na anyị gbara ogbunigwe anyị n’abalị ahụ nile.” Ọ na-ewere ndị si ná mba ha na ha gbara agbata obi dị ka ndị iro ya, ndị kwesịrị ọnwụ. “Echiche m na-abụ igbu mmadụ ole ọ bụla o kwere m mee. N’oge ahụ, dị ka ọtụtụ n’ime ndị enyi m, achọrọ m ịnwụ n’ihi okwukwe m.”
Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5.
Otú ọ dị, ka oge na-aga Gabriel bịara nwee nkụda mmụọ. Ọ gbagara n’ugwu, zoro gafee ókè mba ahụ ma banye ná mba na-anọghị n’agha, ma mee njem gaa Europe. Ọ nọgidere na-ajụ Chineke ihe mere ndụ ji taa nnọọ akpụ, ma nsogbu ọ̀ bụ ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke. O zutere Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị ji Bible gosi ya ihe mere ndụ ji jupụta nnọọ ná nsogbu taa.—Ka Gabriel na-amụtakwu ihe na Bible, otú ahụ ka ọ na-aghọtakwu na o nwere eziokwu. “Amụtara m na anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. N’ụzọ na-eju nnọọ anya, nke ahụ bụ ihe m tụsiri anya ya ike mgbe m bụ nwatakịrị.” Bible kasiri Gabriel obi ma mee ka obi ya nọ ná nchegbu dajụọ. Mmetụta uche ọjọọ ya ndị kasị mie emie malitere ịkwụsị. Ya mere, ka ọ na-erule oge o zutere Daniel, onye bụbu onye iro ya, Gabriel akpọghịzi ya asị. Ma gịnị dutere Daniel na Europe?
“Ọ Bụrụ na Ị Dị Adị n’Ezie, Biko Nyere M Aka!”
A zụlitere Daniel dị ka onye Katọlik, mgbe ọ gbakwara afọ 18, a kpọrọ ya maka ozi agha. E zigara ya ịlụ ọgụ n’otu agha ahụ e zigara Gabriel ịlụ ọgụ na ya kama ọ bụ n’akụkụ nke ọzọ. Daniel nọ na-akwọ ụgbọ agha na nso ihu agha mgbe mgbọ tụtara ụgbọ agha ahụ. Ndị enyi ya nwụrụ, ya onwe ya merụkwara ahụ nke ukwuu, e jidekwara ya dị ka onye mkpọrọ. Ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ na ogige ndị e ji eji ruo ọtụtụ ọnwa tupu a kpọga ya ná mba na-anọghị n’agha. N’ịbụ onye nọ nanị ya nakwa n’ụkọ, o chere echiche igbu onwe ya. Daniel kpekuru Chineke ekpere, sị: “Ọ bụrụ na ị dị adị n’ezie, biko nyere m aka!” Kpọmkwem n’echi ya, Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya ma nwee ike ịza ọtụtụ n’ime ajụjụ ndị ọ jụrụ. N’ikpeazụ, o mere njem gaa Europe dị ka onye gbara ọsọ ndụ. Ọzọkwa, Daniel sooro Ndịàmà na-akpakọ ma na-amụ Bible. Ihe ọ mụtara wepụrụ nchegbu na obi ilu ya.
Gabriel na Daniel bụzi ezi ndị enyi, ndị dị n’otu n’òtù ụmụnna ime mmụọ dị ka Ndịàmà Jehova e mere baptism. “Ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ na ihe ọmụma m nwere na Bible enyeworo m aka ịhụ ihe dị ka o si ahụ ha. Daniel abụghịzi onye iro m. Ọtụtụ afọ gara aga, agaara m enwewo obi ụtọ igbu ya. Bible akụziworo m ihe dị nnọọ iche—ịdị njikere ịnwụ n’ihi ya,” ka Gabriel na-ekwu.
“Ahụrụ m ndị mmadụ sitere n’okpukpe na mba dịgasị iche ka ha na-egburịta onwe ha,” ka Daniel na-ekwu. “E nwekwara ndị mmadụ na-ekpe otu okpukpe bụ́ ndị nọ n’akụkụ dị iche iche nke agha ahụ na-egburịta onwe ha. Mgbe m hụrụ nke a, echere m na ụta dịịrị Chineke. Ugbu a amaara m na ọ bụ Setan na-akpata agha nile. Mụ na Gabriel bụzi ndị kwere ekwe. Anyị agaghị alụ agha ọzọ ma ọlị!”
“Okwu Chineke Dị Ndụ, Na-arụsikwa Ọrụ Ike”
N’ihi gịnị ka Abraham, Robert, Gabriel, na Daniel ji mee nnọọ mgbanwe n’ụzọ dị ịrịba ama? Olee otú ha si nwee ike iwepụsị ịkpọasị na iru újú gbanyemiri mkpọrọgwụ n’obi ha?
Nke ọ bụla n’ime ndị ikom a gụrụ, tụgharịa uche, ma mụta eziokwu sitere na Bible, bụ́ nke “dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Onye dere Bible bụ Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ onye maara otú e si akpali, n’ụzọ dị mma, obi nke onye nwere ọchịchọ ige ntị na ịmụta ihe. “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” Ozugbo onye na-agụ Bible kwere ka ọ na-eduzi ya, ọ na-enwe àgwà na ụkpụrụ ndị ọhụrụ. Ọ na-amalite ịmụta otú Jehova si ele ihe anya. Usoro a na-eweta ọtụtụ abamuru, gụnyere imezi ihe ọjọọ ndị agha kpatara.—2 Timoti 3:16.
Okwu Chineke na-akọwa na ọ dịghị mba, ma ọ bụ agbụrụ ka ibe ya mma ma ọ bụ njọ. “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” A na-eji nke nta nke nta enyere onye na-agụ ya bụ́ onye na-anakwere nke a aka imeri mmetụta nke ịkpọasị agbụrụ ma ọ bụ nke mba.—Ọrụ 10:34, 35.
Amụma Bible na-egosi na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-eji Alaeze Mesaịa ya dochie anya usoro ịchịisi mmadụ nke dị ugbu a. Site n’ọchịchị a, Chineke “na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” A ga-ewepụ òtù ndị na-akwalite agha ma na-agba ụmụ mmadụ ume ịlụ agha. A ga-esi n’ọnwụ kpọlite ndị agha riri isi ha ma nye ha ohere ịdị ndụ n’ụwa paradaịs. Ọ dịghị onye ọ ga-adị mkpa ịgba ọsọ n’ihi onye mwakpo ma ọ bụ onye mmegbu.—Abụ Ọma 46:9; Daniel 2:44; Ọrụ 24:15.
Banyere ụmụ mmadụ ga-adị ndụ n’oge ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie . . . Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri.” Ọ dịghị mbibi ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla a na-agaghị emezi. Inwe okwukwe n’olileanya dị otú ahụ na-eji nke nta nke nta ewepụ iru újú na mwute n’obi mmadụ.—Aịsaịa 65:21-23.
Bible bụ n’ezie ihe na-emezi obi. Ihe ndị ọ na-ezi emezielarị ihe ọjọọ ndị agha kpatara. A na-eme ka ndị bụbu ndị iro dịrịzie n’otu n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Usoro ọgwụgwọ a ga-aga n’ihu n’usoro ihe ọhụrụ Chineke ruo mgbe ịkpọasị na obi ilu, mwute na iru újú na-agaghịzi adị n’obi ihe a kpọrọ mmadụ. Onye Okike na-ekwe nkwa na “a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịsaịa 65:17.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 A gbanwewo aha ụfọdụ n’isiokwu a.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Site na Bible, amụtara m na afọ nile ahụ e ji lụọ agha lara n’iyi”
[Blurb/Picture on peeji 5]
Bible pụrụ inwe mmetụta dị ike n’obi ndị bụbu ndị iro
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ịkpọasị na obi ilu ji nke nta nke nta nyere ntụkwasị obi na ọbụbụenyi ohere
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ozugbo onye na-agụ Bible kwere ka ọ na-eduzi ya, ọ na-enwe àgwà na ụkpụrụ ndị ọhụrụ
[Foto dị na peeji nke 7]
A na-emezi ka ndị bụbu ndị iro dịrịzie n’otu n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
Ogige ndị gbara ọsọ ndụ: UN PHOTO 186811/J. Isaac