“Na-agbanụ Otú A”
“Na-agbanụ Otú A”
WERE ya na ị nọ n’ámá egwuregwu ndị mmadụ nwere mkpali jupụtara. Ndị na-eme egwuregwu azọrọ ije na-abata n’ọgbọ egwuregwu. Ìgwè mmadụ ana-eme mkpọtụ ka ndị dike ha na-apụta. Ndị ọkàikpe anọrọla anọrọ iji hụ na e debere iwu na-achịkwa ya. Ka a na-eme ihe omume ahụ, a na-anụ mkpu mmeri na ákwá mmechu ihu. E jiri ịkụ aka na-ada oké ụda na-eto ndị na-emerinụ!
Ị na-ekiri, ọ bụghị asọmpi egwuregwu nke oge a, kama nke a na-eme n’Isthmus nke Kọrint n’ihe dị ka afọ 2000 gara aga. N’ebe a, n’afọ abụọ ọ bụla malite na narị afọ nke isii T.O.A. ruo narị afọ nke anọ O.A., ka e mere Egwuregwu Isthmus ahụ wuru ewu. Ihe omume ahụ na-adọrọ mmasị ndị Gris nile ruo ọtụtụ ụbọchị. Egwuregwu ndị ahụ karịrị asọmpi egwuregwu nkịtị. Ndị na-eme egwuregwu bụ ihe nnọchianya nke ịdị njikere ije agha. Ndị meriri—ndị a sọpụụrụ nke ukwuu dị ka ndị dike—natara okpu ndị e ji ahịhịa mee. A na-enye ha onyinye dị ukwuu, obodo na-akwụkwa ha nnukwu ụgwọ ezumike nká n’oge ndụ ha nile.
Pọl onyeozi maara Egwuregwu Isthmus ahụ a na-eme n’ebe dị nso na Kọrint nke ọma ma jiri ụzọ ndụ onye Kraịst tụnyere asọmpi egwuregwu. Site n’izo aka ná ndị na-agba ọsọ, ndị na-agba mgba, na ndị na-eti ọkpọ, o mere ihe atụ dabara adaba nke ụgwọ ọrụ nke ọzụzụ dị mma, mgbalị ndị e leziri anya mee, na ntachi obi. N’ezie, ndị Kraịst o degaara akwụkwọ ahụ makwaara banyere egwuregwu ahụ. Obi abụọ adịghị ya na ụfọdụ n’ime ha esowo n’ìgwè mmadụ na-eti mkpu n’ámá egwuregwu ahụ. Ya mere ha ga-aghọta ihe atụ Pọl ozugbo. Gịnị banyere anyị taa? Anyị nọkwa n’ọsọ—maka ndụ ebighị ebi. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’aka Pọl zoro n’asọmpi ndị ahụ?
‘Ịgba Otú Ọ Dị n’Iwu’
Ihe ndị a chọrọ iji sonye n’egwuregwu oge ochie ahụ siri nnọọ ike. Onye na-ama ọkwa na-akpọpụta onye nke ọ bụla na-eme egwuregwu n’ihu ndị nkiri ma tie mkpu, sị: ‘Ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ ibo nwoke a ebubo mpụ ọ bụla? Ọ̀ bụ onye omekome ma ọ bụ onye ọjọọ na onye rụrụ arụ ná ndụ ya nakwa n’àgwà ya?’ Dị ka akwụkwọ bụ́ Archaeologia Graeca si kwuo, “ọ dịghị onye bụ́ n’onwe ya onye omempụ a ma ama, ma ọ bụ onye ya na onye dị otú ahụ nwere njikọ [chiri anya], e kwere ka ọ sọọ mpi.” A na-enyekwa oké ntaramahụhụ maka ịda iwu na-achị egwuregwu ahụ site n’ịmachibido ndị dara iwu isonye n’asọmpi ahụ.
Eziokwu a na-enyere anyị aka ịghọta okwu Pọl bụ́: “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla na-agba mgba, e kpughị ya okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị 2 Timoti 2:5) N’otu aka ahụ, iji gbaa ọsọ ndụ ahụ, anyị aghaghị iru ihe ndị Jehova na-achọ, na-ekwekọ n’ụkpụrụ omume ya ndị dị elu dị ka e depụtara ha n’ime Bible. Otú ọ dị, Bible na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) N’ihi ya, ọbụna mgbe anyị banyesịrị n’ọsọ ahụ, anyị aghaghị ịkpachara anya ịnọgide na-agba otú ọ dị n’iwu iji nọgide na-enwe nnwapụta Jehova ma nweta ndụ ebighị ebi.
mgba otú ọ dị n’iwu.” (Ihe ga-akasị enye aka n’ime otú a bụ inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ. (Mak 12:29-31) Ịhụnanya dị otú ahụ ga-eme ka ọ gụsie anyị agụụ ike ime ihe na-atọ Jehova ụtọ nakwa dị ka uche ya si dị.—1 Jọn 5:3.
‘Tụpụ Ibu Nile Ọ Bụla’
N’egwuregwu oge ochie ahụ, a dịghị eji uwe ma ọ bụ ngwá ọrụ ebogbu ndị na-agba ọsọ. “N’ọsọ ụkwụ, . . . ndị na-asọ mpi na-agba nnọọ ọtọ,” ka akwụkwọ bụ́ The Life of the Greeks and Romans na-ekwu. Eyighị uwe mere ka ndị na-eme egwuregwu dịrị gara gara, nwee ahụ efe n’ịgba ọsọ, ma jiri nkà na-agba ya. Ọ dịghị ike ha na-ala n’iyi n’ihi ibu na-adịghị mkpa. O yiri ka Pọl ò bu nke a n’uche mgbe o degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru akwụkwọ, sị: “Ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla . . . , ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—Ndị Hibru 12:1.
Ibu dị aṅaa pụrụ ịdọla anyị azụ n’ọsọ ndụ ahụ? Otu bụ ọchịchọ ịkpakọwa ihe onwunwe na-adịghị mkpa ma ọ bụ ịnọgide na-ebi ndụ okomoko. Ụfọdụ pụrụ ilegara akụ̀ na ụba anya maka nchebe, ma ọ bụ na-ele ya anya dị ka ihe na-eweta obi ụtọ. Oké “ibu” dị otú ahụ pụrụ ime ka onye na-agba ọsọ kwụsịlatatụ ruo n’ókè nke na, n’ikpeazụ, o nwere ike ghara ijizi Chineke kpọrọ oké ihe n’ezie. (Luk 12:16-21) Ndụ ebighị ebi pụrụ ịbịa yie olileanya dị anya. ‘Ụwa ọhụrụ ga-abịa otu ụbọchị,’ ka mmadụ pụrụ ịtụgharị n’uche, ‘ma ka ọ dịgodị, anyị nwekwara ike irite uru site n’ihe ụwa a na-enye.’ (1 Timoti 6:17-19) Echiche ịhụ ihe onwunwe n’anya dị otú ahụ pụrụ ịdọpụ uche mmadụ n’ọsọ ndụ ahụ n’ụzọ dị mfe ma ọ bụ gbochie mmadụ ịmalitedị ya amalite.
N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ: n’ihi na ọ ga-akpọ otu onye n’ime ha asị, hụ ibe ya n’anya; ma ọ́ bụghị otú a ọ ga-ejide otu, lelịa ibe ya anya. Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ̀.” Mgbe ọ kọsịziri banyere nlekọta Jehova na-elekọta ụmụ anụmanụ na ihe ọkụkụ ma na-ekwu na ụmụ mmadụ dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ndị ahụ, ọ dụrụ ọdụ, sị: “Ya mere, unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? N’ihi na ihe ndị a nile ka ndị mba ọzọ na-achọ; n’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:24-33.
‘Were Ntachi Obi Gbaa Ọsọ’
Ọ bụghị ọsọ nile a gbara n’oge ochie ka a na-agbadebe n’ebe dị nso. Otu ọsọ, bụ́ nke a kpọrọ doʹli·khos, na-eru kilomita anọ. Ọ bụ ule na-achọ ume na ntachi obi dị ukwuu. Dị ka ọdịnala si kwuo, na 328 T.O.A., otu onye na-eme egwuregwu aha ya bụ Ageas, mgbe o merisịrị n’ọsọ a, ji ọsọ ruo obodo ya bụ́ Argos, iji kpọsaa mmeri ya. N’ụbọchị ahụ, ọ gbara ọsọ ruo ihe dị ka kilomita 110!
Ọsọ ndị Kraịst bụkwa nke a na-agbaru n’ebe dị anya bụ́ nke na-ele ntachi obi anyị ule. Ịtachi obi n’ọsọ a ruo ọgwụgwụ dị mkpa iji nweta 2 Timoti 4:7, 8) Dị ka Pọl, anyị aghaghị ‘ịgbasị ọsọ ahụ.’ Ọ bụrụ na ntachi obi anyị na-ebelata nanị n’ihi na ọsọ ahụ dịtụ ogologo karịa otú anyị tụrụ anya ya na mbụ, anyị agaghị enweta ụgwọ ọrụ anyị. (Ndị Hibru 11:6) Lee ọdachi nke ahụ ga-abụ, ebe anyị hụrụ na anyị nọ nnọọ nso n’ebe mgbaru ọsọ!
nnwapụta Jehova nakwa ihe mgbata n’ọsọ bụ́ ndụ ebighị ebi. Otú ahụ ka Pọl si gbaa ọsọ ahụ. Ka ọnwụ ya na-eru nso, ọ pụrụ ikwu, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ: nke fọdụrụ bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ.” (Ihe Mgbata n’Ọsọ
A na-enye ndị meriri n’asọmpi egwuregwu nke Gris oge ochie okpu a na-ejikarị ahịhịa akpa ma jiri okooko osisi chọọ ya mma. N’Egwuregwu Pythia, ndị meriri na-anata okpu mmeri e ji ahịhịa laurel mee. N’Egwuregwu Olympia ha na-enweta okpu mmeri nke e ji akwụkwọ osisi olive ọhịa mee, ebe a na-enye ndị meriri n’Egwuregwu Isthmus okpu mmeri e ji ahịhịa pine mee. “Iji kpalie oké mmasị nke ndị na-asọ mpi,” ka otu ọkà mmụta Bible kwuru, “okpu mmeri, ụgwọ ọrụ nke mmeri, na igu nkwụ, na-adị n’ebe ha na-ahụ ha nke ọma n’oge asọmpi ahụ, n’elu ihe nwere ụkwụ atọ, ma ọ bụ n’elu tebụl e debere n’ámá egwuregwu ahụ.” Nye onye meririnụ, ikpuru okpu mmeri ahụ bụ ihe na-enye oké nsọpụrụ. Mgbe ọ laruru, ọ na-eji ọṅụ mmeri nyara ụgbọ ịnyịnya banye n’obodo.
N’iburu nke a n’uche, Pọl jụrụ ndị Kọrint na-agụ akwụkwọ ya, sị: “Ùnu amataghị na ndị na-agba ọsọ n’ebe ọsọ, ha nile na-agba ọsọ, ma ọ bụ otu onye na-agbata ihe ọsọ? Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata. . . . Ya mere, ndị ahụ na-eme ya ịnata okpu mmeri nke pụrụ ire ure; ma anyị onwe anyị na-eme ya ịnata okpu mmeri nke na-apụghị ire ure.” (1 Ndị Kọrint 9:24, 25; 1 Pita 1:3, 4) Lee ka ha si dị iche! N’adịghị ka okpu mmeri na-aṅacha aṅacha nke egwuregwu oge ochie ahụ, ihe mgbata n’ọsọ nke na-echere ndị gbaruru ọsọ ndụ ahụ n’isi agaghị emebi mgbe ọ bụla.
Banyere okpu mmeri nke a ka mma, Pita onyeozi dere, sị: “Mgbe a ga-emekwa ka Onyeisi ọzụzụ atụrụ pụta ìhè, unu ga-anata okpueze nke ebube ahụ, nke na-adịghị atalata.” (1 Pita 5:4) À pụrụ iji ihe mgbata n’ọsọ ọ bụla ụwa a na-enye tụnyere anwụghị anwụ, ihe mgbata n’ọsọ nke ibi ndụ ereghị ure n’ebube bụ́ nke a ga-eso Kraịst bie n’eluigwe?
Taa, ihe ka ukwuu ná ndị Kraịst na-agba ọsọ abụghị ndị Chineke tere mmanụ ịbụ ụmụ ime mmụọ ya, ha enweghịkwa olileanya eluigwe. Ha anaghị agba ọsọ iji nweta ihe mgbata n’ọsọ bụ́ anwụghị anwụ. Otú ọ dị, Chineke debekwara n’ihu ha ihe mgbata n’ọsọ na-enweghị atụ. Ọ bụ ndụ ebighị ebi n’izu okè n’ụwa paradaịs n’okpuru Alaeze eluigwe. N’agbanyeghị ihe mgbata n’ọsọ nke onye Kraịst na-agba ọsọ lekwasịrị anya, o kwesịrị iji mkpebi na ike ka ukwuu na-agba ọsọ karịa onye ọ bụla na-agba ọsọ n’asọmpi egwuregwu. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe mgbata n’ọsọ ahụ agatụghị aṅacha aṅacha: “Nke a bụkwa nkwa ahụ nke Ya onwe ya kwere anyị, bụ́ ndụ ahụ, nke bụ́ ndụ ebighị ebi.”—1 Jọn 2:25.
Ebe e debere ihe mgbata n’ọsọ dị otú ahụ na-enweghị atụ n’ihu onye Kraịst na-agba ọsọ, gịnị kwesịrị ịbụ echiche ya banyere ihe ụrà dị iche iche nke ụwa a? O kwesịrị iyi nke Pọl, bụ́ onye kwuru, sị: “Ana m agụkwa ihe nile n’ihe iyi n’ihi ọkịka nke ọmụma Kraịst Jisọs, bụ́ Onyenwe m: Onye m yiri iyi ihe nile nke m n’ihi Ya, ana m agụkwa ha n’ihe mkpofu.” N’ikwekọ na nke a, lee ka Pọl si gbasie ọsọ ike! “Ụmụnna m, mụ onwe m agụghị onwe m na ejidewo m ruo ugbu a: ma otu ihe ka m na-eme, ebe m na-echezọ ihe nile dị n’azụ, na-esetịpụkwa aka Ndị Filipaị 3:8, 13, 14) Pọl legidesiri anya ya ike n’ihe mgbata n’ọsọ wee na-agba ọsọ. Anyị kwesịrị ime otú ahụ.
n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, ana m agbakwuru ókè ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ.” (Onye Nlereanya Anyị nke Kasị Mma
N’egwuregwu oge ochie ahụ, a na-akwanyere ndị nwere mmeri ùgwù n’ebe nile. Ndị na-ede uri dere banyere ha, ndị ọkpụ ihe kpụrụ ihe oyiyi ha. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Věra Olivová na-ekwu na ha “nwere otuto ma wuo ewuo nke ukwuu.” Ha bụkwa ndị nlereanya nye ọgbọ nke ndị mmeri na-etolite etolite.
Ònye bụ “onye mmeri” na-esetịpụrụ ndị Kraịst ihe nlereanya kasị mma? Pọl na-aza, sị: “Ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị, Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’osisi ịta ahụhụ, NW] Ya, na-elelị ihere anya, O wee nọdụ n’aka nri nke ocheeze Chineke.” (Ndị Hibru 12:1, 2) Ee, ọ bụrụ na anyị ga-enwe mmeri n’ọsọ anyị na-agba maka ndụ agwụghị agwụ, ọ dị anyị mkpa ilegidesi Onye Nlereanya anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, anya ike. Nke a ka anyị pụrụ ime site n’ịgụchi ihe e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ anya ma na-atụgharị uche n’ụzọ ndị anyị pụrụ isi ṅomie ya. Ọmụmụ ihe dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịghọta na Jisọs Kraịst rubeere Chineke isi ma nwapụta ọdịdị nke okwukwe ya site ná ntachi obi ya. Dị ka ụgwọ ọrụ maka ntachi obi ya, o nwetara nnwapụta Jehova Chineke tinyere ọtụtụ ihe ùgwù dị ebube.—Ndị Filipaị 2:9-11.
N’ezie, àgwà pụtakarịsịrị ìhè nke Jisọs bụ ịhụnanya ya. “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karị[rị] nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) O nyere nghọta ka mie emie banyere okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” site n’ịgwa anyị ịhụ ọbụna ndị iro anyị n’anya. (Matiu 5:43-48) N’ihi na ọ hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya, Jisọs nwetara ọṅụ n’ime uche Nna ya. (Abụ Ọma 40:9, 10; Ilu 27:11) Anyị ilegara Jisọs anya dị ka Onye Nlereanya anyị nakwa dị ka onye na-ebutere anyị ụzọ n’ọsọ ndụ ahụ nke na-achọ oké mgbalị ga-akpalikwa anyị ịhụ Chineke na onye agbata obi anyị n’anya nakwa inweta ezigbo ọṅụ n’ozi anyị dị nsọ. (Matiu 22:37-39; Jọn 13:34; 1 Pita 2:21) Buru n’uche na Jisọs adịghị achọ ihe na-apụghị ikwe omume. Ọ na-emesi anyị obi ike, sị: “Abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.
Dị ka Jisọs, ọ dị anyị mkpa ilekwasị anya n’ihe mgbata n’ọsọ e debeere ndị nile ga-atachi obi ruo ọgwụgwụ. (Matiu 24:13) Ọ bụrụ na anyị na-agba otú ọ dị n’iwu, ọ bụrụ na anyị atụpụ ibu nile ọ bụla, ọ bụrụkwa na anyị ewere ntachi obi na-agba ọsọ, anyị pụrụ inwe obi ike na anyị ga-emeri. Ebe mgbaru ọsọ nke dịzi nso na-akpali anyị ịga n’ihu! Ọ na-enye anyị ume ọhụrụ n’ihi ọṅụ ọ na-akụnye n’ime anyị, ọṅụ nke na-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịga ije n’ụzọ ahụ gbatịpụrụ n’ihu anyị.
[Foto dị na peeji nke 29]
Ọsọ onye Kraịst bụ nke dị anya —ọ na-achọ ntachi obi
[Foto dị na peeji nke 30]
N’adịghị ka ndị na-eme egwuregwu nwetara okpu mmeri, ndị Kraịst pụrụ ilepụ anya inweta ihe mgbata n’ọsọ nke na-apụghị imebi emebi
[Foto dị na peeji nke 31]
Ihe mgbata n’ọsọ ahụ dịịrị ndị nile tachiri obi ruo ọgwụgwụ
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]
Copyright British Museum