Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ịhụnanya Gị Sara Mbara?

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ịhụnanya Gị Sara Mbara?

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ịhụnanya Gị Sara Mbara?

“Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—MATIU 22:39.

1. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, gịnị mere anyị aghaghịkwa ịhụ onye agbata obi anyị n’anya?

MGBE a jụrụ Jisọs iwu kasịnụ, ọ zara, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.” Mgbe ahụ, o hotara iwu nke abụọ yiri nke mbụ ahụ: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:37, 39) Ee, ịhụ onye agbata obi n’anya bụ ihe e ji amata onye Kraịst. N’ezie, ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị aghaghị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-egosipụta na anyị hụrụ Chineke n’anya site n’irube isi n’Okwu ya, Okwu ya nyekwara anyị iwu ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị adịghị ahụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị n’anya, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ apụghị ịbụ nke ezigbo ya.—Ndị Rom 13:8; 1 Jọn 2:5; 4:20, 21.

2. Olee ụdị ịhụnanya anyị kwesịrị inwe n’ebe onye agbata obi anyị nọ?

2 Mgbe Jisọs kwuru na anyị kwesịrị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya, ọ nọ na-ekwu banyere ihe karịrị ọbụbụenyi. Ọ nọkwa na-ezo aka n’ịhụnanya dị iche n’ịhụnanya ebumpụta ụwa nke na-adị n’ezinụlọ ma ọ bụ n’etiti nwoke na nwanyị. Ọ nọ na-ekwu banyere ụdị ịhụnanya ahụ Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya raara onwe ha nye nọ nakwa nke ha nwere n’ebe ọ nọ. (Jọn 17:26; 1 Jọn 4:11, 19) Otu odeakwụkwọ bụ́ onye Juu—bụ́ onye, dị ka Jisọs ghọtara, nọ na-ekwu dị ka onye nwere uche—kwenyeere Jisọs na mmadụ kwesịrị ịhụ Chineke n’anya ‘site n’obi ya dum, sitekwa ná nghọta ya dum, sitekwa n’ike ya dum.’ (Mak 12:28-34) O kwutere ya. Ịhụnanya onye Kraịst na-azụlite ma n’ebe Chineke nọ ma n’ebe onye agbata obi ya nọ na-agụnye mmetụta uche na ọgụgụ isi anyị. A na-enwe ya n’obi, ọ bụkwa uche na-eduzi ya.

3. (a) Olee otú Jisọs si kụziere “otu onye iwu” na o kwesịrị inwe echiche sara mbara banyere onye bụ́ onye agbata obi ya? (b) Olee otú ihe atụ Jisọs si gbasa ndị Kraịst taa?

3 Dị ka Luk si kọọ, mgbe Jisọs kwuru na anyị kwesịrị ịhụ onye agbata obi anyị n’anya, “otu onye iwu” jụrụ ya, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?” Jisọs ji ilu zaa ya. E tiri otu nwoke ihe, zuo ya ohi, ma hapụ ya ọ̀ dị ndụ ọnwụ ka mma n’akụkụ ụzọ. Onye nchụàjà bu ụzọ jere gafee, e mesịakwa, onye Livaị agafee. Ha abụọ leghaara ya anya. N’ikpeazụ, onye Sameria gafetara, hụ nwoke ahụ e merụrụ ahụ, ma jiri obiọma hiri nne mesoo ya ihe. Ònye n’ime mmadụ atọ ahụ bụ onye agbata obi nye nwoke ahụ e merụrụ ahụ? Azịza ya doro anya. (Luk 10:25-37) Ọ pụrụ ịwụwo nwoke ahụ maara Iwu ahụ nke ọma akpata oyi n’ahụ ịnụ ka Jisọs kwuru na onye Sameria pụrụ ịbụ ezi onye agbata obi karịa onye nchụàjà na onye Livaị. N’ụzọ doro anya, Jisọs nọ na-enyere nwoke ahụ aka ịhụ onye agbata obi ya n’anya n’ụzọ sakwuru mbara. Ndị Kraịst n’onwe ha kwa na-ahụ n’anya n’ụzọ dị otú ahụ. Tụlee ndị nile ịhụnanya ha na-eruru.

Ịhụnanya n’Ime Ezinụlọ

4. Olee ebe mbụ onye Kraịst na-egosipụta ịhụnanya?

4 Ndị Kraịst na-ahụ ndị òtù ezinụlọ ha n’anya—ndị bụ́ nwunye na-ahụ di ha n’anya, ndị bụ́ di na-ahụ nwunye ha n’anya, ndị nne na nna na-ahụ ụmụ ha n’anya. (Eklisiastis 9:9; Ndị Efesọs 5:33; Taịtọs 2:4) N’eziokwu, nkekọ nke ịhụnanya ebumpụta ụwa dị n’ihe ka ukwuu n’ezinụlọ ndị e nwere. Otú ọ dị, akụkọ banyere alụmdi na nwunye tisasịrị etisasị, iti di ma ọ bụ nwunye ihe, na ụmụaka e leghaara anya ma ọ bụ ndị e metọrọ emetọ na-egosi na ezinụlọ nọ ná nrụgide taa, mmetụta ebumpụta ụwa nke a na-enwe n’ezinụlọ ezughịkwa ezu iji jikọta ya ọnụ. (2 Timoti 3:1-3) Iji mee ka ndụ ezinụlọ ha nwee ezi ihe ịga nke ọma, ọ dị ndị Kraịst mkpa igosipụta ụdị ịhụnanya ahụ Jehova na Jisọs nwere.—Ndị Efesọs 5:21-27.

5. Ònye ka ndị nne na nna na-elegara anya maka enyemaka n’ịzụlite ụmụ ha, gịnịkwa ka ọ rụpụtawooro ọtụtụ ndị?

5 Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna na-ele ụmụ ha anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa nke Jehova nyefere ha n’aka, ha na-elegakwara ya anya maka enyemaka n’ịzụlite ha. (Abụ Ọma 127:3-5; Ilu 22:6) N’ụzọ dị otú a, ha na-azụlite ịhụnanya ndị Kraịst, bụ́ nke na-enyere ha aka ichebe ụmụ ha pụọ ná mmetụta ndị na-emerụ emerụ bụ́ ndị ndị na-eto eto pụrụ ịdaba n’ime ha. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna enwewo ọṅụ yiri nke otu nne nọ na Netherlands nwere. Mgbe o kirisịrị baptism nwa ya nwoke—otu n’ime mmadụ 575 e mere baptism na Netherlands n’afọ gara aga—o dere ihe na-esonụ: “Ugbu a, eritela m uru n’ihe m mefuru n’ime afọ 20 gara aga. Echefuziela m oge na ume ọrụ nile—nakwa iwe ndị a kpasuru m, mgbalị ndị m tinyere, na iru újú ndị m nwere.” Lee obi ụtọ o nwere na nwa ya nwoke ji ọchịchọ obi ya họrọ ijere Jehova ozi. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa dị 31,089 bụ́ ndị nyere akụkọ ozi na Netherlands n’afọ gara aga gụnyere ọtụtụ ndị bụ́ ndị mụtara ịhụ Jehova n’anya site n’aka nne na nna ha.

6. Olee otú ịhụnanya ndị Kraịst pụrụ isi nye aka n’ime ka nkekọ alụmdi na nwunye sikwuo ike?

6 Pọl kpọrọ ịhụnanya “ihe nkekọ nke izu okè,” ọ pụkwara ichebe nkekọ alụmdi na nwunye ọbụna n’oge e nwere ihe isi ike. (Ndị Kọlọsi 3:14, 18, 19; 1 Pita 3:1-7) Mgbe otu nwoke nọ na Rurutu, bụ́ obere àgwàetiti nke dị ihe dị ka kilomita 700 site na Tahiti, malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, nwunye ya megidere ya n’ụzọ siri ike. E mesịa, nwunye ya kpọọrọ ụmụ ha gbapụ, ma jee biri na Tahiti. Ma, nwoke ahụ gosipụtara ịhụnanya ya site n’ịdị na-ezigara ya ego mgbe nile na ịdị na-akpọ ya na fon ịjụ ya ma ò nwere ihe dị ya ma ọ bụ ụmụaka ahụ mkpa. N’ụzọ dị otú a, o mere ike ya nile iji rụzuo ịbụ ọrụ ya dị ka onye Kraịst. (1 Timoti 5:8) O kpere ekpere mgbe nile ka ezinụlọ ya dịghachi n’otu, n’ikpeazụkwa, nwunye ya lọghachiri. Mgbe o mere otú ahụ, nwoke ahụ ji “ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ” na-emeso ya ihe. (1 Timoti 6:11) Na 1998, e mere ya baptism, o nwekwara oké ọṅụ n’ikpeazụ mgbe nwunye ya kweere ịmụ Bible. Ọmụmụ ihe ahụ bụ otu n’ime 1,351 e duziri n’ógbè ahụ dị n’okpuru nlekọta nke alaka Tahiti n’afọ gara aga.

7. Dị ka otu nwoke nọ na Germany si kọọ, gịnị mere ka alụmdi na nwunye ya sikwuo ike?

7 Na Germany, otu nwoke megidere mmasị nwunye ya nwere n’eziokwu Bible ma kwenyesie ike na Ndịàmà Jehova chọrọ iduhie nwunye ya. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, o degaara Onyeàmà mbụ ahụ kpọtụụrụ nwunye ya akwụkwọ, sị: “I meela maka ime ka nwunye m sowe Ndịàmà Jehova. Na mbụ, enwere m nchegbu n’ihi na anụwo m ọtụtụ akụkọ ọjọọ banyere ha. Ma ugbu a, mgbe m so nwunye m gaa nzukọ, achọpụtara m otú m si bụrụ onye na-ezighị ezi. Amaara m na ihe m na-anụ bụ eziokwu ahụ, o mewokwa ka alụmdi na nwunye anyị sikwuo nnọọ ike.” Ndịàmà Jehova dị 162,932 bụ́ ndị nọ na Germany—nakwa 1,773 nọ n’àgwàetiti ndị dị n’okpuru nlekọta nke alaka Tahiti—na-agụnye ọtụtụ ezinụlọ bụ́ ndị dị n’otu n’ịhụnanya Chineke.

Ịhụnanya Maka Ụmụnna Anyị Bụ́ Ndị Kraịst

8, 9. (a) Ònye na-ezi anyị ịhụ ụmụnna anyị n’anya, gịnịkwa ka ịhụnanya na-akpali anyị ime? (b) Nye ihe atụ nke otú ịhụnanya pụrụ isi nyere ụmụnna aka ịkwadorịta onwe ha.

8 Pọl gwara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka, sị: “Unu onwe unu bụ ndị Chineke ziworo ịhụrịta ibe unu n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:9) Ee, ndị “mmụta Jehova” na-ahụrịta ibe ha n’anya. (Aịsaịa 54:13) Ha na-egosipụta ịhụnanya ha n’omume, dị ka Pọl gosipụtara mgbe o kwuru, sị: “Werenụ ịhụnanya bụrịta ohu ibe unu.” (Ndị Galetia 5:13; 1 Jọn 3:18) Dị ka ihe atụ, ha na-eme nke a mgbe ha na-eleta ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-arịa ọrịa, na-agba ndị dara mbà n’obi ume, ma na-akwado ndị na-adịghị ike. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ezi ịhụnanya ndị Kraịst anyị na-atụnye ụtụ n’uto nke paradaịs ime mmụọ anyị.

9 N’Ọgbakọ Ancón—otu n’ime ọgbakọ 544 dị n’Ecuador—ụmụnna gosipụtara ịhụnanya ha n’ụzọ dị irè. Nsogbu akụ̀ na ụba mere ka ha ghara inwe ọrụ ma ọ bụ ego, n’ihi ya, ndị nkwusa ahụ kpebiri ịkpata ego site n’iresi ndị na-akụ azụ̀ n’ógbè ahụ nri mgbe ha si ịkụ azụ̀ abalị lọta. Onye ọ bụla tinyere aka, gụnyere ụmụaka. Ha aghaghị ịmalite n’elekere 1:00 nke ụtụtụ iji sichaa nri ahụ ka ọ na-erule elekere 4:00 nke ụtụtụ bụ́ mgbe ndị ọkụ azụ̀ ji alọta. Ụmụnna ahụ kesara ego ahụ ha kpatara n’etiti onwe ha dị ka mkpa ha si dị. Nnyerịta aka dị otú ahụ na-egosipụta ezi ịhụnanya ndị Kraịst.

10, 11. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ụmụnna ndị anyị na-amaghị n’onwe anyị ịhụnanya?

10 Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị Kraịst anyị maara ka anyị na-egosi ịhụnanya. Pita onyeozi kwuru, sị: “Hụnụ òtù ndị bụ́ ụmụnna n’anya.” (1 Pita 2:17, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Anyị na-ahụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nile n’anya n’ihi na ha nile bụ ndị anyị na ha na-efekọ Jehova Chineke ofufe. Oge nsogbu pụrụ ime ka e nwee ohere igosipụta ịhụnanya a. Dị ka ihe atụ, n’ime afọ ije ozi 2000, oké idei mmiri kpara Mozambique aka ọjọọ, agha obodo nke na-aga n’ihu n’Angola mekwara ka ọtụtụ mmadụ daa ogbenye. Ihe ndị a emetụtawo ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụnna 31,725 nọ na Mozambique nakwa 41,222 nọ n’Angola. N’ihi ya, Ndịàmà nọ na South Africa dị ha nso ezigawo ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ihe ndị dị mkpa iji belata ahụhụ ụmụnna ha ndị nọ n’ala ndị ahụ na-ata. Njikere ha dị inye ụmụnna ha nọ ná mkpa ‘ihe ha nwebigara ókè’ gosipụtara ịhụnanya ha.—2 Ndị Kọrint 8:8, 13-15, 24.

11 Ịhụnanya na-apụtakwa ìhè mgbe ụmụnna ndị nọ n’ọtụtụ mba na-enye onyinye maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ dị iche iche n’ala ndị dara ogbenye karị. Otu ihe atụ bụ ihe mere na Solomon Islands. N’agbanyeghị oké ọgba aghara, Solomon Islands nwere ịrị elu dị pasent 6 ná ndị nkwusa n’afọ gara aga, na ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 1,697. Ụlọ Mgbakọ dị ha mkpa. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti ahụ si ná mba ahụ na-agbapụ, ndị ọrụ afọ ofufo si Australia bịa iji nye aka n’ihe owuwu ahụ. N’ikpeazụ, ndị ọrụ afọ ofufo ahụ lara, ma tupu ha alaa, ha enyewo ụmụnna nọ n’ógbè ahụ ọzụzụ ịtọcha ntọala ụlọ ahụ. E si Australia jiri ụgbọ mmiri bute ígwè ndị a ga-eji arụ ụlọ nzukọ ahụ bụ́ ndị e meworo ka ha dị otú a chọrọ ka ha dịrị n’ụlọ ahụ, mwucha nke ọmarịcha ụlọ ofufe a—n’oge a gbahapụrụ ọtụtụ ụlọ a na-arụ arụ—ga-agbakwa ezi àmà nye aha Jehova nakwa nye ịhụnanya nke ụmụnna ahụ.

Dị Ka Chineke, Anyị Hụrụ Ụwa n’Anya

12. Olee otú anyị si eṅomi Jehova n’ihe banyere àgwà anyị na-akpaso ndị na-anọghị n’okpukpe anyị?

12 Ọ̀ bụ nanị ezinụlọ anyị na òtù ụmụnna anyị ka anyị na-egosi ịhụnanya? Ee e, ọ gaghị adị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị bụ “ndị na-eṅomi Chineke.” Jisọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Ndị Efesọs 5:1; Jọn 3:16, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Dị ka Jehova Chineke, anyị na-eji ịhụnanya emeso mmadụ nile ihe—gụnyere ndị na-anọghị n’okpukpe anyị. (Luk 6:35, 36; Ndị Galetia 6:10) N’akụkụ a karịsịa, anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ma na-agwa ndị ọzọ banyere omume ezi ịhụnanya nke Chineke mere n’ihi anyị. Nke a pụrụ iwetara onye ọ bụla nke na-ege ntị nzọpụta.—Mak 13:10; 1 Timoti 4:16.

13, 14. Olee ụfọdụ ahụmahụ e nwere nke ụmụnna ndị gosiri ịhụnanya n’ebe ndị na-abụghị Ndịàmà nọ, ọbụna mgbe o siiri ha nnọọ ike ime otú ahụ?

13 Tụlee ndị ozi anọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ na Nepal. E kenyere ndị a ọrụ n’otu obodo ukwu dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ mba ahụ, kemgbe afọ ise, ha egosipụtawo ịhụnanya ha site n’iji ndidi na-agba àmà n’obodo ukwu ahụ nakwa n’obodo nta ndị dị ya nso. Iji rụzuo ókèala ha, ha na-ejikarị ịnyịnya ígwè eme njem ruo ọtụtụ awa n’ebe okpomọkụ na-adị ihe karịrị 40 degrees Celsius. Ịhụnanya na “ntachi obi [ha] n’ezi ọrụ” rụpụtara ihe dị mma mgbe e guzobere otu ìgwè ọmụmụ akwụkwọ n’otu n’ime obodo nta ndị ahụ. (Ndị Rom 2:7) Na March 2000, mmadụ 32 bịara iji nụrụ okwu ihu ọha nke onye nlekọta sekit bịara nleta kwuru. Nepal nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa dị 430 n’afọ gara aga—ịrị elu nke pasent 9. O doro anya na Jehova na-agọzi ịnụ ọkụ n’obi na ịhụnanya ụmụnna nọ n’ala ahụ na-egosi.

14 Na Colombia, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge gara ime nkwusa n’etiti ndị Wayuu India. Iji mee nke a, ha aghaghị ịmụta asụsụ ọhụrụ, ma a kwụghachiri mmasị ịhụnanya ha ụgwọ mgbe, n’agbanyeghị oké mmiri ozuzo, mmadụ 27 gara nụrụ otu okwu ihu ọha. Ịnụ ọkụ n’obi ịhụnanya dị ka nke ahụ ndị ọsụ ụzọ a gosipụtara so mee ka e nwee ịrị elu dị pasent 5 na Colombia na ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa dị 107,613. Na Denmark, otu nwanna nwanyị mere agadi chọrọ isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ, ma o nwere nkwarụ. N’ịbụ onye ike na-agwụghị, ọ kpọtụụrụ ndị nwere mmasị site n’idegara ha akwụkwọ ozi. Ka ọ dị ugbu a, ya na mmadụ 42 na-ederịta akwụkwọ ozi, ọ na-eduzikwa ọmụmụ Bible 11. O so n’ime ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa 14,885 bụ́ ndị nyere akụkọ ozi na Denmark n’afọ gara aga.

Hụ Ndị Iro Gị n’Anya

15, 16. (a) Ruo ókè ha aṅaa ka Jisọs kwuru na ịhụnanya anyị kwesịrị ịsa mbara? (b) Olee otú ụmụnna nwere ibu ọrụ si jiri ịhụnanya mesoo otu onye boro Ndịàmà Jehova ebubo ụgha ihe?

15 Jisọs gwara nwoke ahụ maara Iwu ahụ nke ọma na ọ pụrụ ile onye Sameria anya dị ka onye agbata obi ya. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru ọbụna ihe karịrị nke ahụ mgbe o kwuru, sị: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Hụ mmadụ ibe gị n’anya, kpọọkwa onye iro gị asị: ma Mụ onwe m sị unu, Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu Nke bi n’elugiwe.” (Matiu 5:43-45) Ọbụna mgbe mmadụ na-emegide anyị, anyị na-agbalị ‘iwere ezi ihe merie ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:19-21) Ọ bụrụ na o kwe mee, anyị na-eso ya ekerịta ihe onwunwe anyị kasị ọnụ ahịa, bụ́ eziokwu ahụ.

16 Na Ukraine, otu isiokwu gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Kremenchuk Herald kwuru banyere Ndịàmà Jehova dị ka ịrọ òtù dị ize ndụ. Nke a abụghị obere ihe n’ihi na na Europe, ụfọdụ na-ekwu banyere Ndịàmà Jehova n’ụzọ dị otú ahụ iji mee ka ndị mmadụ kwenye na e kwesịrị igbochi ma ọ bụ machibido ọrụ Ndịàmà iwu. N’ihi ya, a gakwuuru onye editọ ahụ ma gwa ya ka o bipụta otu isiokwu nke na-agbazi isiokwu ahụ. O kweere, ma n’isiokwu ahụ, o bipụtara okwu sịrị na isiokwu mbụ ahụ dabeere n’ihe mere eme. Ya mere, ụmụnna nwere ibu ọrụ ji ihe ọmụma hikwuru nne gakwuru ya ọzọ. N’ikpeazụ, onye editọ ahụ ghọtara na isiokwu mbụ ahụ abụghị eziokwu, o bipụtakwara otu isiokwu iji kagbuo ihe o deburu. Iji obi eziokwu na obiọma mesoo ya ihe bụ ụzọ ịhụnanya isi dozie ọnọdụ a, ọ rụpụtakwara ihe dị mma.

Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Zụlite Ịhụnanya?

17. Gịnị na-egosi na ọ pụghị ịdị mfe mgbe nile iji ịhụnanya na-emeso ndị ọzọ ihe?

17 Mgbe a mụrụ nwa ọhụrụ, nne na nna ya na-ahụ ya n’anya ngwa ngwa. Iji ịhụnanya na-emeso ndị toro eto ihe adịchaghị nnọọ abụ mgbe nile ihe ebumpụta ụwa. Ikekwe ọ bụ ya mere Bible ji agwa anyị ugboro ugboro ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya—ọ bụ ihe anyị na-aghaghị ịrụ ọrụ na ya. (1 Pita 1:22; 4:8; 1 Jọn 3:11) Jisọs maara na a ga-ele ịhụnanya anyị ule mgbe o kwuru na anyị kwesịrị ịgbaghara nwanna anyị “ruo [ugboro iri asaa na asaa].” (Matiu 18:21, 22) Pọl n’onwe ya kwa gbara anyị ume ‘ịnagiderịta ibe anyị.’ (Ndị Kọlọsi 3:12, 13) Ka a sịkwa ihe mere e ji gwa anyị, sị: “Na-agbasonụ ịhụnanya”! (1 Ndị Kọrint 14:1) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?

18. Gịnị ga-enyere anyị aka ịzụlite ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ?

18 Nke mbụ, anyị pụrụ iburu ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ n’uche mgbe nile. Ịhụnanya a bụ ihe mkpali siri ike maka ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe anyị na-eme otú ahụ, nke a na-enye Nna anyị nke eluigwe aha ọma ma na-ewetara ya otuto na nsọpụrụ. (Jọn 15:8-10; Ndị Filipaị 1:9-11) Nke abụọ, anyị pụrụ ịgbalị ịhụ ihe otú Jehova si ahụ ya. Mgbe ọ bụla anyị mere mmehie, anyị mehiere megide Jehova; ma ọ na-agbaghara anyị ugboro ugboro ma nọgide na-ahụ anyị n’anya. (Abụ Ọma 86:5; 103:2, 3; 1 Jọn 1:9; 4:18) Ọ bụrụ na anyị azụlite echiche Jehova, anyị ga-adị njikere ịhụ ndị ọzọ n’anya ma na-agbaghara ha mmejọ ha mejọrọ anyị. (Matiu 6:12) Nke atọ, anyị pụrụ imeso ndị ọzọ ihe otú anyị chọrọ ka ha si na-emeso anyị. (Matiu 7:12) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, mgbaghara na-adị anyị mkpa mgbe nile. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị kwuru ihe were ndị ọzọ iwe, anyị na-enwe olileanya na ha ga-echeta na onye ọ bụla na-emehie n’okwu ọnụ site n’oge ruo n’oge. (Jemes 3:2) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị ọzọ jiri ịhụnanya na-emeso anyị ihe, anyị kwesịrị iji ịhụnanya na-emeso ha ihe.

19. Olee otú anyị pụrụ isi chọọ enyemaka nke mmụọ nsọ n’ịzụlite ịhụnanya?

19 Nke anọ, anyị pụrụ ịchọ enyemaka nke mmụọ nsọ n’ihi na ịhụnanya so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ọbụbụenyi, mmetụta nke ndị ezinụlọ, na ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ na-abụkarị ihe e bu pụta ụwa. Ma enyemaka nke mmụọ nsọ Jehova dị anyị mkpa iji zụlite ịhụnanya ahụ Jehova nwere, ịhụnanya nke bụ́ ihe nkekọ nke izu okè. Anyị pụrụ ịchọ enyemaka nke mmụọ nsọ site n’ịgụ Bible e dere n’ike mmụọ nsọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị amụọ banyere ndụ Jisọs, anyị ga-ahụ otú o si mesoo ndị mmadụ ihe, anyị pụkwara ịmụta iṅomi ya. (Jọn 13:34, 35; 15:12) Ọzọkwa, anyị pụrụ ịrịọ Jehova mmụọ nsọ ya, karịsịa n’ọnọdụ ndị na-eme ka o siere anyị ike ime ihe n’ụzọ ịhụnanya. (Luk 11:13) N’ikpeazụ, anyị pụrụ ịnọgide na-egosipụta ịhụnanya site n’ịnọ ọgbakọ ndị Kraịst nso. Anyị na ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-ahụ n’anya ịnọ na-enyere anyị aka ịzụlite ịhụnanya.—Ilu 13:20.

20, 21. Ngosipụta dị aṅaa pụtara ìhè nke ịhụnanya ka Ndịàmà Jehova mere n’afọ ije ozi 2000?

20 N’afọ gara aga, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa ozi ọma dị 6,035,564 gburugburu ụwa. Ndịàmà Jehova ji ngụkọta awa dị 1,171,270,425 chọgharịa ndị mmadụ iji gwa ha banyere ozi ọma ahụ. Ọ bụ ịhụnanya mere ka ha die okpomọkụ, mmiri ozuzo, na oyi ka ha na-arụ ọrụ a. Ọ bụ ịhụnanya kpaliri ha ịgwa ụmụ akwụkwọ ibe ha na ndị ọrụ ibe ha okwu na ịgakwuru ndị ha na-amabughị n’okporo ámá nakwa n’ebe ndị ọzọ. Ọtụtụ n’ime ndị Ndịàmà ahụ letara enweghị mmasị, ole na ole megidekwara ha. Otú ọ dị, ụfọdụ gosiri mmasị, nke mere na e mere nletaghachi dị 433,454,049, duziekwa ọmụmụ Bible dị 4,766,631. *

21 Lee ka ihe a nile si egosipụta ịhụnanya Ndịàmà Jehova nwere n’ebe Chineke ha na ndị agbata obi ha nọ! Ịhụnanya ahụ agaghị ajụ oyi ma ọlị. Obi siri anyị ike na a ga-agba ọbụna àmà ka ukwuu nye ihe a kpọrọ mmadụ n’afọ ije ozi 2001. Ka ngọzi Jehova nọgide na-adịnyere ndị ji nguzosi ike n’ihe na ịnụ ọkụ n’obi na-efe ya ofufe ka ha ‘na-eme ihe ha nile n’ịhụnanya’!—1 Ndị Kọrint 16:14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Iji nweta ihe ndekọ zuru ezu banyere Akụkọ Afọ Ije Ozi 2000, lee chaatị dị na peeji nke 18-21.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Ònye ka anyị na-eṅomi mgbe anyị na-ahụ onye agbata obi anyị n’anya?

• Ruo ókè hà aṅaa ka ịhụnanya anyị kwesịrị ịsa mbara?

• Olee ahụmahụ ụfọdụ na-egosipụta ịhụnanya ndị Kraịst?

• Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ịhụnanya ndị Kraịst?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Chaatị dị na peeji nke 18-21]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1999 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ịhụnanya ndị Kraịst pụrụ ijikọta ezinụlọ ọnụ

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ịhụnanya na-akpali anyị iso ndị ọzọ kerịta olileanya anyị