Udo Ọ̀ Ga-adị na Narị Afọ Iri Ọhụrụ?
Udo Ọ̀ Ga-adị na Narị Afọ Iri Ọhụrụ?
A NỌ na Paris nakwa na New York City mee ememe Afọ Mba Nile Maka Omenala Udo na September 14, 1999. Ọ bụ Nzukọ Ezumezu nke Mba Ndị Dị n’Otu kpọsara nke a maka afọ 2000. Federico Mayor, onye bụbu ọga kpata kpata nke òtù UNESCO, rịọsiri arịrịọ ike “ka e kepụta òtù zuru ụwa ọnụ nke ga-ejikọ aka weta omenala udo na nke emeghị ihe ike.”
Òtù UNESCO nwere ụkpụrụ bụ́ na “ebe ọ bụ na agha na-esi n’uche ndị mmadụ amalite, ọ bụ n’uche ndị mmadụ ka a na-aghaghị ịkụnye ihe ndị na-echebe udo.” N’ikwekọ na nke a, òtù ahụ na-ezube ịkwalite omenala udo site ná “mmụta, mkparịta ụka, na imekọ ihe ọnụ.” Maazị Mayor kwuru na o zughị ezu “ịbụ ndị dị n’udo, o zughị ezu ịbụ ọbụna ndị na-emegide agha, kama ịbụ ndị na-eme udo.”
N’ụzọ dị mwute, udo adịtụghị n’afọ 2000. Akụkọ ihe mere eme nke oge a—gụnyere ihe ndị mere n’afọ 2000—emewo ka ọ pụta ìhè na ụmụ mmadụ apụghị igbochi agha na ime ihe ike n’agbanyeghị mgbalị ndị ha ji ezi obi eme iji gbochie ha.
Otú ọ dị, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na e jikọrọ udo na mmụta. Ihe dị ka afọ 2,700 gara aga, Aịsaịa onye amụma buru n’amụma, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Tupu o mee, otu onye amụma ahụ hụrụ oge ndị si ná mba nile ga-enuba n’ofufe dị ọcha nke Jehova Chineke iji mụta banyere ụzọ Ya nile. Gịnị ga-esi na ya pụta? “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:2-4, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’ụzọ kwekọrọ n’amụma ahụ, Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ọrụ izi ihe zuru ụwa ọnụ bụ́ nke nyewoororị ọtụtụ nde mmadụ aka imeri ịkpọasị nke mba na nke agbụrụ bụ́ nke kpataworo ihe ka ọtụtụ n’agha ndị a lụworo.
N’ikpeazụ, agha agaghịzi adị n’okpuru Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-eweta udo na nchebe na-adịgide adịgide n’ụwa. (Abụ Ọma 72:7; Daniel 2:44) Mgbe ahụ, a ga-emezu okwu ọbụ abụ ahụ bụ́: “Hụ ọrụ nile nke Jehova, Onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 46:8, 9.