“Ọrụ Magburu Onwe Ya”
Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè, Ndị Kwezuwokwara Ihe Nile
“Ọrụ Magburu Onwe Ya”
SITE ná mmalite akụkọ ihe mere eme ha nke oge a, Ndịàmà Jehova enwewo oké mmasị n’otu n’ime amụma Jisọs Kraịst, bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ka 1914—mmalite nke “mgbe ikpeazụ”—kpụdewere nso, ndị Mmụta Bible nwere ezi obi ji nkwenye siri ike malite ọrụ izi ihe zuru ụwa ọnụ a na-enwetụbeghị ụdị ya bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.—2 Timoti 3:1.
Iji mezuo nzube ha bụ́ ikwusa ozi ọma ahụ n’ụwa nile, ndị ohu Jehova a ji otu usoro nke dị ọhụrụ, pụtara ìhè, ma doo anya, mee ihe. Iji mụtakwuo banyere ya, ka anyị laghachi azụ n’oge gara aga.
Ụzọ Ọhụrụ Isi Kpọsaa Ozi Ọma Ahụ
Ọ bụ na January nke afọ 1914. Were ya na i so mmadụ 5,000 ndị ọzọ nọdụ ala n’otu ụlọ mgbakọ gbara ọchịchịrị na New York City. N’ihu unu ka a na-egosi otu nnukwu ihe nkiri a na-emegharị ahụ na ya. Otu nwoke isi ya chara awọ nke yi ogologo kootu apụta n’ihe nkiri ahụ. I kiritụla ihe nkiri sịnịma ndị a na-adịghị ekwu okwu na ha, ma nwoke a na-ekwu okwu, ị na-anụkwa ihe ọ na-ekwu. Ị na-ekiri ihe pụtara nnọọ ọhụrụ bụ́ nke a na-egosi na nke mbụ ya, ozi dị na ya pụkwara iche. Onye ahụ na-ekwu okwu bụ Charles Taze Russell, onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, ihe ahụ ị na-ekirikwa bụ “Photo-Drama of Creation.”
C. T. Russell chọpụtara ikike ihe nkiri a na-emegharị ahụ na ha nwere n’irute ìgwè mmadụ. Ya mere, na 1912, ọ malitere ịhazi “Photo-Drama of Creation.” N’ikpeazụ, ọ bịara bụrụ foto slide na ihe nkiri a na-emegharị ahụ na ya nke na-ewe awa asatọ, bụ́ nke nwere àgwà na ụda olu zuru ezu.
N’ịbụ nke e mere ka a na-egosi ya ná nkebi anọ, “Photo-Drama” ahụ gosiri ndị kiriri ya akụkọ ihe mere eme nke mmadụ site n’okike ruo ná mmezu nke nzube Jehova Chineke maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ n’ọgwụgwụ Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst. Ọtụtụ afọ ga-agafe tupu iji nkà na ụzụ eme ihe n’otu ụzọ ahụ ana-enwe ihe ịga nke ọma n’achụmnta ego. Ma, ọtụtụ nde mmadụ kiriri “Photo-Drama of Creation” ahụ n’efu!
A haziri egwú ndị bụ́ ịgba a kpọnyere na teepu nakwa okwu 96 e tinyere n’ígwè phonograph maka “Photo-Drama” ahụ. E ji ihe osise ndị na-egosi akụkọ ihe mere eme nke ụwa mee ụdị slide bụ́ Stereopticon. Ọ dịkwa mkpa ise ọtụtụ narị ihe osise ọhụrụ. E ji nlezianya jiri aka see ụfọdụ n’ime ihe ngosi slide ndị ahụ tụrụ àgwà. E mekwara nke a ugboro ugboro, n’ihi na, ka oge na-aga, e mepụtara 20 bụ́ ndị nke ọ bụla n’ime ha nwere nkebi anọ. Nke a mere ka o kwe
omume igosi otu akụkụ nke “Photo-Drama” ahụ n’obodo 80 dị iche iche n’ụbọchị ọ bụla!Ihe Ndị Anya Na-ahụghị
Gịnị bụ ihe ndị anya na-ahụghị bụ́ ndị weere ọnọdụ n’oge a na-egosi “Photo-Drama” ahụ? “Ihe Nkiri ahụ ji foto Nwanna Russell malite,” ka Onye Mmụta Bible bụ́ Alice Hoffman kwuru. “Ka ọ pụtara n’ihe nkiri ahụ, egbugbere ọnụ ya amalitekwa imegharị, a na-amalite ịkpọ ígwè phonograph, . . . anyị na-anụkwa olu ya.”
N’izo aka n’ụdị foto na-egosipụta ihe ọsọ ọsọ, Zola Hoffman chetara, sị: “Anọdụrụ m ala n’ebe ahụ n’oké ijuanya ka anyị na-ekiri ihe ngosi nke ụbọchị okike. E nwere okooko ọhịa ndị dị ebe ahụ bụ́ ndị anyị ji anya anyị hụ ka ha na-agbawa.”
Onye egwú na-amasịkarị bụ́ Karl F. Klein nke so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-agbakwụnye, sị: “N’otu oge ahụ a na-egosi foto ndị a, e nwere nnọọ ọmarịcha egwú ndị a kụnyere na ya, egwú ndị dị ka Narcissus na Humoreske.”
E nwekwara ihe ndị ọzọ kwesịrị ncheta merenụ. “Mgbe ụfọdụ, ihe mberede ndị na-atọ ọchị na-eme,” ka Clayton J. Woodworth, Jr., chetara. “N’otu oge, ka teepu nọ na-agụ ‘Fegoo n’Ugwu Gị Dị Ka Nnụnụ,’ otu akatamkpo gigantosaurus, bụ́ anụ buru nnọọ ibu nke dịrị tupu Iju Mmiri ahụ, pụtara n’ihe nkiri ahụ”!
E wezụga “Photo-Drama of Creation” ahụ a na-egosikarị, n’oge na-adịghị anya e nwere usoro ihe nkiri bụ́ “Eureka Drama.” (Lee igbe.) Ihe mejupụtara otu bụ okwu ihu ọha na egwú ndị a kpọnyere na teepu. Ihe mejupụtara nke ọzọ bụ ma ihe ndị ahụ a kpọnyere na teepu ma slide. Ọ bụ ezie na “Eureka Drama” ahụ enweghị foto ndị a na-emegharị ahụ na ha, ọ na-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma ma e gosi ya n’ógbè ndị mmadụ na-ebijupụtaghị.
Ngwá Ọrụ Dị Ike n’Ịgba Àmà
Ka ọ na-erule ngwụsị 1914, e gosiwo ìgwè mmadụ ngụkọta ha karịrị 9,000,000 “Photo-Drama” ahụ n’Ebe Ugwu America, Europe, na Australia. Ọ bụ ezie na Ndị Mmụta Bible ahụ dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ, ha nwere nkwenye siri ike a chọrọ iji jiri ụzọ ọhụrụ a na-akpọsa ozi ọma ahụ. Ha ji obi ụtọ nye onyinye ego a chọrọ iji kwụọ ụgwọ ebe ndị kwesịrị ekwesị maka ihe ngosi ndị a. Otú ahụ ka o si bụrụ na “Photo-Drama of Creation” ahụ rụrụ ọrụ dị ukwuu n’ime ka ndị kiriri ya mara Okwu na nzube Chineke.
N’akwụkwọ ozi otu onye degaara C. T. Russell, o dere, sị: “Ọbịbịa mbụ ahụ m bịara kirie Ihe Nkiri gị bụ oge oké mgbanwe ná ndụ m; ma ọ bụ, ka m sị, oge oké mgbanwe n’ihe ọmụma m nwere na Bible.” Onye ọzọ kwuru, sị: “Ọ fọwo nke nta ka ihe ụrà nke enwekwaghị mmasị n’okpukpe bufuo m, m na-echekwa na ọ bụ ‘Photo-Drama of Creation’ ahụ e gosiri n’ebe a n’oge okpomọkụ gara aga zọpụtara m. . . . Ugbu a, enwere m udo ahụ nke ụwa na-apụghị inye, bụkwa nke m na-agaghị ahapụ ọ sọkwa ya nye m akụ̀ n’ụba ya nile.”
Demetrius Papageorge, onye rụworo ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Society ruo ogologo oge, kwuru, sị: “‘Photo-Drama’ ahụ bụ ọrụ magburu onwe ya, ma ọ bụrụ na anyị atụlee ọnụ ọgụgụ dị nta nke Ndị Mmụta Bible na obere ego e nwere. N’ezie, mmụọ Jehova dịkwasịrị ya!”
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
“Eureka Drama”
Ọnwa asatọ e gosisịrị “Photo-Drama” ahụ na nke mbụ ya, Society hụrụ mkpa ọ dị iwepụta ụdị ya ọzọ nke a kpọrọ “Eureka Drama.” Ka a nọgidere na-egosi akụkụ nile nke “Photo-Drama” ahụ n’obodo ukwu dị iche iche, e jikwa ihe nkiri “Eureka” ahụ gosi otu ozi ahụ bụ́ isi n’obodo nta nakwa n’ime ime obodo dị iche iche. A kọwara otu akụkụ nke “Eureka Drama” ahụ dị ka nke na-enye “ụmụnna nwanyị ohere pụrụ iche” ime nkwusa. N’ihi gịnị? N’ihi na igbe teepụ phonograph ya dị nanị kilogram 14 n’arọ. Otú ọ dị, maka ihe ngosi, ọ ga-adịkwa mkpa ibu ígwè phonograph.