Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Òtù Na-achị Isi Si Dị Iche n’Ebe Ụlọ Ọrụ Iwu Kwadoro Dị

Ụzọ Òtù Na-achị Isi Si Dị Iche n’Ebe Ụlọ Ọrụ Iwu Kwadoro Dị

Ụzọ Òtù Na-achị Isi Si Dị Iche n’Ebe Ụlọ Ọrụ Iwu Kwadoro Dị

A NỌWO na-enwe nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania kemgbe January nke 1885. Mgbe nchịkọbata nke ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na-aga n’ihu ná ngwụsị narị afọ nke 19, ndị nduzi na ndị isi nke ụlọ ọrụ a bụ ndị nwere olileanya nke eluigwe. N’ezie, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịwo otú a mgbe nile.

E nwere otu dị iche. Na 1940, a họpụtara Hayden C. Covington—onye bụ́ mgbe ahụ onye ndụmọdụ Society n’okwu ikpe nakwa otu n’ime “atụrụ ọzọ” ahụ nke nwere olileanya elu ala—dị ka onye nduzi nke Society. (Jọn 10:16) O jere ozi dị ka osote onyeisi oche Society site na 1942 ruo 1945. N’oge ahụ, Nwanna Covington hapụrụ ọnọdụ ya dị ka onye nduzi iji mezuo ihe yiri mgbe ahụ ka ọ̀ bụ uche Jehova—na ndị nduzi na ndị isi nile nke ụlọ ọrụ Pennsylvania ga-abụ ndị Kraịst e tere mmanụ. Lyman A. Swingle nọchiri Hayden C. Covington na bọọdụ ndị nduzi, a họpụtakwara Frederick W. Franz dị ka osote onyeisi oche.

N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova ji kwere na ndị nduzi na ndị isi nile nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania kwesịrị ịbụ ndị Kraịst e tere mmanụ? Ọ bụ n’ihi na n’oge ahụ, bọọdụ ndị nduzi na ndị isi nke ụlọ ọrụ Pennsylvania na Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ́ nke nanị ndị ikom e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nọgideworo na-emejupụta, na-arụkọ ọrụ n’ụzọ chiri anya.

Nzukọ Kwa Afọ nke Mere Ihe Akụkọ

Ná nzukọ kwa afọ e nwere n’October 2, 1944, na Pittsburgh, ndị ọrụ nke ụlọ ọrụ Pennsylvania ahụ nakweere mkpebi isii ndị gbanwere akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ ya. Akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ ahụ nwere akụkụ kwuru ka e nye ndị tụnyere ụtụ ego n’ọrụ Society ohere nke ịtụli aka elu, ma mgbanwe nke atọ e mere wepụrụ akụkụ ahụ. Otu akụkọ a kọrọ banyere nzukọ kwa afọ ahụ kwuru, sị: “Ndị òtù nke Society agaghị akarị mmadụ 500 . . . Onye nke ọ bụla a họpụtara aghaghị ịbụ onye ozi oge nile nke Society ma ọ bụ ohu nwa oge nke kọmpịnị [ọgbakọ] nke Ndịàmà Jehova, ọ ghaghịkwa igosipụta mmụọ nke Onyenwe anyị.”

Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ bụ mmadụ ndị raara onwe ha nye Jehova kpam kpam ga-eme ntụli aka maka ịhọpụta ndị nduzi nke Society, n’agbanyeghị ego ole ha tụnyere iji mee ka ọrụ Alaeze ahụ gaa n’ihu. Nke a bịara kwekọọ ná mmeziwanye ahụ ji nke nta nke nta na-ewere ọnọdụ bụ́ nke e buru n’amụma n’Aịsaịa 60:17, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “N’ọnọdụ ọla M ga-eweta ọlaedo, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ osisi M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume M ga-eweta ígwè: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” N’izo aka n’ebe “ndị nlekọta” na ‘ndị na-achị achị’ nọ, amụma a rụtụrụ aka ná mmeziwanye ndị e mere n’usoro nhazi n’etiti ndị Jehova.

E weere nzọụkwụ a dị mkpa n’ime ka nzukọ a kwekọọ n’ọchịchị Chineke ná ngwụsị nke “[anyasị na ụtụtụ puku abụọ na narị atọ]” ahụ a kpọtụrụ aha na Daniel 8:14. N’oge ahụ, a ‘gụrụ ebe nsọ n’ebe ezi omume.’

Otú ọ dị, mgbe nzukọ kwa afọ ahụ mere ihe akụkọ gasịrị na 1944, e nwere ajụjụ dị oké mkpa dịgiderenụ. Ebe ọ bụ na Òtù Na-achị Isi na ụlọ ọrụ Pennsylvania nke nwere ndị nduzi asaa na-arụkọ ọrụ n’ụzọ chiri anya mgbe ahụ, nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị mgbe Òtù Na-achị Isi pụrụ ịkarị ndị Kraịst asaa e tere mmanụ? Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ọ bụ ndị ọrụ nke ụlọ ọrụ ahụ na-atụli aka maka ịhọpụta ndị nduzi, ndị ọrụ nke ụlọ ọrụ ahụ hà nọ na-ahọpụta ndị Òtù Na-achị Isi ná nzukọ kwa afọ ahụ n’afọ ọ bụla? Ndị nduzi na ndị isi nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na ndị so n’Òtù Na-achị Isi hà bụ́ nnọọ otu ndị, ka hà dị iche?

Nzukọ Kwa Afọ Ọzọ A Na-apụghị Ichefu Echefu

A zara ajụjụ ndị a ná nzukọ kwa afọ e nwere n’October 1, 1971. N’oge ahụ, otu n’ime ndị ọkà okwu kwuru na òtù na-achị isi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” dịwara ọtụtụ afọ tupu Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania amalite ịdị. (Matiu 24:45-47) E guzobere òtù na-achị isi na Pentikọst nke 33 O.A., bụ́ ihe karịrị narị afọ 18 tupu ụlọ ọrụ Pennsylvania ahụ amalite ịdị. Na mbụ, òtù na-achị isi ahụ nwere, ọ bụghị ndị ikom 7, kama ndị ozi 12. Ihe àmà na-egosi na e mesịrị mụbaa ọnụ ọgụgụ ndị mejupụtara ya, n’ihi na ‘ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem’ nọ na-edu ndú.—Ọrụ 15:2.

Na 1971, otu onye ọkà okwu ahụ kọwara na ndị òtù nke Watch Tower Society apụghị ịtụli aka maka ịhọpụta ndị ga-eso n’Òtù Na-achị Isi. N’ihi gịnị? “N’ihi na,” ka o kwuru, “ọ bụghị mmadụ na-ahọpụta òtù na-achị isi nke òtù ‘ohu’ ahụ. Ọ bụ . . . Jisọs Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ ezi ndị Kraịst nakwa Onyenwenụ na Nna Ukwu nke òtù ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,’ na-ahọpụta ya.” Ya mere, n’ụzọ doro anya, ndị ọrụ nke ụlọ ọrụ ọ bụla iwu kwadoro apụghị ịhọpụta ndị Òtù Na-achị Isi.

N’ịga n’ihu, ọkà okwu ahụ kwuru okwu a dị nnọọ ịrịba ama: “Òtù na-achị isi enweghị ndị isi dị ka Bọọdụ Nduzi nke Society nwere, ya bụ, onyeisi oche, osote onyeisi oche, odeakwụkwọ-ochebe ego na osote odeakwụkwọ-ochebe ego. O nwere onyeisi oche nkịtị.” Ruo ọtụtụ afọ, onyeisi oche nke ụlọ ọrụ ahụ dị na Pennsylvania na-abụkwa onyeisi oche nke Òtù Na-achị Isi. Nke a agaghịzi adị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ndị so n’Òtù Na-achị Isi ahaghị nhata n’ahụmahụ ma ọ bụ n’ikike, ha ga-enwe ibu ọrụ hà nhata. Ọkà okwu ahụ gbakwụnyere, sị: “Onye ọ bụla so n’òtù na-achị isi pụrụ ịbụ onyeisi oche nke òtù ahụ n’abụghị n’otu oge ahụ onyeisi oche nke . . . Society . . . Ọ dabeere nnọọ n’otú usoro ịbụ onyeisi oche nke òtù na-achị isi si na-agagharị n’etiti ndị so na ya.”

Ná nzukọ kwa afọ ahụ a na-agaghị echefu echefu na 1971, e gosiri n’ụzọ doro anya ọdịiche dị n’etiti ndị so n’Òtù Na-achị Isi bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na ndị nduzi nke ụlọ ọrụ Pennsylvania. Ma, ndị so n’Òtù Na-achị Isi nọgidere na-eje ozi dị ka ndị nduzi na ndị isi nke Society. Otú ọ dị, taa, ajụjụ na-ebilite bụ́: È nwere ihe dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere ndị nduzi nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-aghaghị iji bụrụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi?

Azịza ya bụ ee e. Ụlọ ọrụ Pennsylvania abụghị nanị ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji eme ihe. E nwere ndị ọzọ. Otu bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Incorporated. Ọ na-eme ka ọrụ anyị na-aga n’ihu na United States. Ngọzi Jehova dịkwasịrị n’ụlọ ọrụ ahụ n’ụzọ doro anya, n’agbanyeghị na ndị nduzi na ndị isi ya bụ ndị sitere ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ n’ụzọ bụ́ isi. A na-eji International Bible Students Association eme ihe na Britain. A na-eji ụlọ ọrụ ndị ọzọ iwu kwadoro eme ihe iji kwalite ọdịmma Alaeze n’ala ndị ọzọ. Ha nile ji ịdị n’otu na-enye aka, nweekwa ọrụ ha na-arụ n’ime ka e kwusaa ozi ọma ahụ n’elu ala dum. N’agbanyeghị ebe ha dị ma ọ bụ ndị na-eje ozi dị ka ndị nduzi ma ọ bụ ndị isi ha, Òtù Na-achị Isi na-eduzi ma na-eji ụlọ ọrụ ndị a eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ọchịchị Chineke. N’ihi ya, ụlọ ọrụ ndị dị otú ahụ nwere ọrụ ndị e nyere ha ịrụ n’ime ka ọdịmma Alaeze gaa n’ihu.

Ọ baara anyị uru inwe ụlọ ọrụ ndị iwu kwadoro. Anyị si otú ahụ ekwekọ n’iwu ndị dị n’ógbè nakwa ná mbà, dị ka Okwu Chineke si chọọ. (Jeremaịa 32:11; Ndị Rom 13:1) Ụlọ ọrụ ndị iwu kwadoro na-eme ka ọrụ anyị nke ịgbasa ozi Alaeze ahụ site n’ibipụta Bible, akwụkwọ, magazin, broshuọ, na ngwá ọrụ ndị ọzọ, ka mfe. Ụlọ ọrụ ndị dị otú ahụ na-ejekwa ozi dị ka ngwá ọrụ ndị iwu kwadoro n’ịhụ maka okwu ndị metụtara ihe onwunwe, ọrụ enyemaka, nkwekọrịta maka iji ihe owuwu mgbakọ na ihe ndị ọzọ, eme ihe. Anyị nwere ekele maka ozi ụlọ ọrụ ndị dị otú ahụ iwu kwadoro na-eje.

E Bute Aha Jehova Ụzọ

Na 1944, e dezigharịrị Akụkụ nke Abụọ nke akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania iji mee ka nzube nke ụlọ ọrụ a pụta ìhè. Dị ka akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ ahụ si kwuo, nzube Society gụnyere nzube a bụ́ isi: “Ikwusa oziọma nke alaeze Chineke dị n’okpuru Kraịst Jisọs ná mba nile dị ka àmà nye aha, okwu na ọkaaka nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile bụ́ JEHOVA.”

Kemgbe 1926, ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi’ ebutewo aha Jehova ụzọ. Mgbe dị ịrịba àmà karịsịa bụ 1931 bụ́ mgbe Ndị Mmụta Bible nakweere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10-12) Mbipụta Society ndị meworo ka aha Chineke pụta ìhè gụnyere akwụkwọ ndị bụ́ Jehovah (1934), “Ka Edo Aha-Gi Nsọ” (1961), na “The Nations Shall Know That I Am Jehovah”—How? (1971).

A ghaghị ịkpọtụ New World Translation of the Holy Scriptures aha n’ụzọ pụrụ iche, bụ́ nke e bipụtara n’ozuzu ya n’asụsụ Bekee na 1960. O bu aha Jehova n’ebe ọ bụla Tetragrammaton [okwu dị mkpụrụ akwụkwọ anọ] pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Nsụgharị a tinyekwara aha Chineke n’ebe dị 237 n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ́ ebe ntụle e ji nlezianya mee gosiri na nke a dị mkpa. Lee ekele anyị nwere na, n’ọtụtụ ụzọ, Jehova ekwewo ka “ohu” ahụ na Òtù Na-achị Isi ya jiri ngwá ọrụ obibi akwụkwọ ha na ụlọ ọrụ ha iwu kwadoro na-eme ihe n’ime ka a mara aha ya n’elu ala nile!

A Kwalite Nkesa nke Okwu Chineke

Ndị Jehova anọgidewo na-agbara aha ya àmà, ha akwadowokwa Okwu ya site n’ibipụta na ikesa ọtụtụ nde akwụkwọ ndị dabeere na Bible nakwa Bible n’onwe ya. Ná mmalite afọ ndị 1900, Watch Tower Society nwetara ikike ibipụtaghachi Bible bụ́ The Emphatic Diaglott, bụ́ Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst nke Benjamin Wilson sụgharịrị n’asụsụ Grik na Bekee. Society bipụtara nsụgharị nke Ndị Mmụta Bible nke King James Version, bụ́ nke gụnyere ihe odide ntụkwasị dị peeji 500. Na 1942 o bipụtara King James Version nwere ntụaka etiti peeji. E mesịa, na 1944, Society malitere ibipụta American Standard Version nke 1901, bụ́ nke ji aha Chineke eme ihe. Aha Jehova pụtakwara ìhè na The Bible in Living English, nke Stephen T. Byington dere, bụ́ nke Society bipụtara na 1972.

Ụlọ ọrụ ndị iwu kwadoro bụ́ ndị Ndịàmà Jehova ji eme ihe enyewo aka n’ibipụta na n’ikesa nsụgharị Bible nile a. Otú ọ dị, nke dị ịrịba ama karịsịa bụ imekọ ihe ọnụ dị n’etiti Watch Tower Society na ìgwè Ndịàmà Jehova e tere mmanụ nke gụnyere Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ. Anyị na-aṅụrị ọṅụ na taa, e bipụtawo n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, ihe karịrị 106,400,000 nke nsụgharị a n’asụsụ 38. Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bụ n’ezie òtù Bible!

‘E mewo ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi onyeisi ihe nile onyenwe ya nwere.’ Ihe ndị a gụnyere ihe ndị e wuru n’isi ụlọ ọrụ dị na New York State, U.S.A., na alaka 110 ndị na-arụ ọrụ ugbu a gburugburu ụwa. Ndị so n’òtù ohu ahụ maara na a ga-akpọ ha ịza ajụjụ maka ụzọ ha siworo jiri ihe e nyefeworo ha mee ihe. (Matiu 25:14-30) Ma, nke a adịghị egbochi ‘ohu’ ahụ ikwe ka ndị nlekọta ruru eru n’etiti “atụrụ ọzọ” ahụ buru ibu ọrụ ndị metụtara iwu na nhazi. N’ezie, nke a na-enye ndị so n’Òtù Na-achị Isi ohere itinyekwu oge ‘n’ekpere, na n’ije ozi okwu Chineke.’—Ọrụ 6:4.

Ruo ókè ọnọdụ ndị dị n’ụwa nyeruru ohere, Òtù Na-achị Isi, bụ́ ndị na-anọchite anya “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ga-eji ụlọ ọrụ ndị iwu kwadoro na-eme ihe. Ndị a bara uru, ma ha abụghị ndị a na-apụghị ime ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na ha adịghị. Ọ bụrụ na e jiri iwu gọọmenti kposaa ụlọ ọrụ iwu kwadoro, ọrụ nkwusa ahụ ka ga-aga n’ihu. Ọbụna ugbu a, n’ala ebe ndị e nwere ihe mgbochi bụ́kwa ebe a na-ejighị ụlọ ọrụ iwu kwadoro eme ihe, a na-akpọsa ozi Alaeze ahụ, a na-eme ndị na-eso ụzọ, a na-anọgidekwa na-enwe ịba ụba nke ọchịchị Chineke. Ọ dị otú ahụ n’ihi na Ndịàmà Jehova na-akụ mkpụrụ ma na-akwọsa ya mmiri, ma ọ bụ ‘Chineke na-anọgide na-eme ka ọ na-aba ụba.’—1 Ndị Kọrint 3:6, 7.

Ka anyị na-elega anya n’ọdịnihu, anyị nwere obi ike na Jehova ga na-elekọta mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ndị ya. Ya na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-anọgide na-enye nduzi na nkwado sitere n’eluigwe bụ́ ndị dị mkpa iji rụzuo ọrụ nkwusa Alaeze. N’ezie, ihe ọ bụla anyị na-arụzu dị ka ndị ohu Chineke bụ nke a na-eme ‘ọ bụghị site n’usuu ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na Mmụọ Jehova.’ (Zekaraịa 4:6) Ya mere, anyị na-ekpe ekpere maka enyemaka Chineke, na-amara na site n’ume Jehova na-enye, anyị ga-enwe ike ịrụzu ọrụ o nyeworo anyị ịrụ na mgbe ọgwụgwụ a!