Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eme Okwu Chineke Na-enweta Obi Ụtọ

Ndị Na-eme Okwu Chineke Na-enweta Obi Ụtọ

Ndị Na-eme Okwu Chineke Na-enweta Obi Ụtọ

“Anyị na-aghọta mgbakọ a dị ka ndokwa ọzọ nke Jehova ji akwadebe anyị maka ịrụkwu ọrụ Alaeze,” ka otu n’ime ndị ọkà okwu kwuru ná mmalite nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Anyị akwadebewo onwe anyị ịbụ ndị e ziri ihe banyere ndụ ezinụlọ obi ụtọ, ịbụ ndị a gbara ume ịnọ nzukọ Jehova nso, ịbụ ndị a kwaliri ịnọgide na-anụ ọkụ n’obi n’ozi Alaeze anyị, nakwa ịbụ ndị e chetaara mkpa ọ dị ịnọ na nche.”

MALITE ná ngwụsị May 2000, ọtụtụ nde ndị na-eme okwu Chineke na ndị enyi ha nubara n’ọtụtụ puku ebe a nọ nwee mgbakọ ndị ahụ gburugburu ụwa iji nweta nkụzi dị oké mkpa sitere na Bible. Gịnị ka ha mụtara ná mgbakọ ụbọchị atọ ahụ?

Ụbọchị Mbụ—Echezọghị Mmeso Ọma Jehova

N’okwu mmeghe, onyeisi oche gbara ndị na-ege ntị ume inweta ngọzi ndị na-abịa site n’ifekọ Jehova ọnụ ná mgbakọ ukwu dị iche iche. E mesiri ndị nile bịaranụ obi ike na a ga-eme ka okwukwe ha hikwuo nne nakwa na a ga-eme ka mmekọrịta ha na Jehova sikwuo ike.

“Chineke obi ụtọ” maara ihe dị anyị nile n’otu n’otu mkpa iji na-enwe obi ụtọ. (1 Timoti 1:11, NW) N’ihi ya, okwu bụ́ “Ime Uche Chineke Na-eweta Obi Ụtọ” mesiri ya ike na Okwu Jehova, bụ́ Bible, na-akọwapụta ụzọ kasị mma isi bie ndụ. (Jọn 13:17) Ajụjụ ọnụ ole na ole a gbara Ndịàmà Jehova jeworo ozi ruo ogologo oge gosipụtara otú ime uche Chineke n’ọnọdụ dịgasị iche si eme ka ndụ anyị nwekwuo nzube. Okwu sochirinụ bụ́, “Nwee Obi Ụtọ n’Ihi Ịdị Mma Jehova,” mere ka ọ pụta ìhè na, dị ka “ndị na-eṅomi Chineke,” ndị Kraịst kwesịrị ịzụlite ‘ịdị mma nile’ ná ndụ ha. (Ndị Efesọs 5:1, 9) Otu ụzọ pụtara ìhè isi mee nke a bụ site n’ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ.—Abụ Ọma 145:7.

Okwu bụ́ “Nọgidesie Ike Dị Ka Ị Na-ahụ Onye ahụ A Na-apụghị Ịhụ Anya” gosiri otú okwukwe siri ike si enyere anyị aka “ịhụ” Chineke nke a na-apụghị ịhụ anya. Ọkà okwu ahụ kọwara otú ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe si amata àgwà Chineke, gụnyere ikike ya ịmara ọbụna ihe anyị na-eche. (Ilu 5:21) Ndị a gbara ajụjụ ọnụ kọrọ nzọụkwụ ndị ha werewooro iji zụlite okwukwe siri ike karị ma na-ebute ọdịmma ime mmụọ ụzọ ná ndụ ha.

Nnọkọ nke ụtụtụ ji okwu bụ́ isi bụ́, “Toonụ Jehova—Onye Na-eme Ihe Ndị Dị Ebube,” mechie. O nyeere ndị na-ege ntị aka ịghọta na ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova, otú ahụ ka anyị na-ahụkwu ihe ndị mere anyị ga-eji na-eto ya dị ka Onye Na-eme ihe ndị dị ebube. Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Ka anyị na-atụle ọrụ okike dị ebube nke Chineke, tinyere ihe nile dị ebube ọ na-emere anyị ugbu a, ekele nke sitere n’obi na-akwali anyị ito ya. Ka anyị na-atụgharị uche n’ọrụ ebube ndị ọ rụwooro ndị ya n’oge ndị gara aga, anyị kwesịrị ito ya. Ka anyị na-atụlekwa nkwa nke ihe ndị dị ebube Jehova ka ga-eme, anyị na-achọkwa ụzọ ndị anyị ga-esi egosi obi ekele.”

Nnọkọ nke ehihie ji okwu bụ́ “Ike Agwụla Gị n’Obi Ime Ihe Ọma” malite, bụ́ nke chetaara ndị nile na-ege ntị na nrụgide dị iche iche nke ụwa a na-agba akaebe na ọgwụgwụ dị nso. (2 Timoti 3:1) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ike agwụghị anyị, anyị pụrụ igosipụta na anyị “dị n’etiti ndị kwere ekwe inweta mkpụrụ obi ha.”—Ndị Hibru 10:39.

Olee ndụmọdụ Bible e nyere banyere ndụ ezinụlọ? Usoro isiokwu mbụ nke mgbakọ ahụ—“Na-erubere Okwu Chineke Isi”—ji akụkụ bụ́ “N’ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ,” malite. Ịhọrọ onye òtù ọlụlụ bụ otu n’ime mkpebi ndị kasị taa akpụ ndị mmadụ na-eme. N’ihi ya, ọ dị ndị Kraịst mkpa ichere ruo mgbe ha tozuru okè tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye, ha ga-alụkwa “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Akụkụ sochirinụ n’usoro isiokwu ahụ tụlere ọchịchọ Jehova chọrọ ka ezinụlọ nile nke ndị Kraịst na-enwe ihe ịga nke ọma dị ka njikọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ, o nyekwara ụzọ ndị dị irè a pụrụ isi mezuo nke a. Akụkụ nke ikpeazụ chetaara ndị nne na nna na ha ga-ebu ụzọ hụ Chineke n’anya tupu ha ana-akụziri ụmụ ha ịhụ ya n’anya.

Isi ihe e gosipụtara n’okwu bụ́ “Kpachara Anya Maka Asịrị” nyeere mmadụ nile aka ịhụ na ọ bụ ezie na ihe ndị dị ịtụnanya na-eme, anyị kwesịrị iji amamihe, ọ bụghị nzuzu, na-emeghachi omume mgbe anyị nụrụ akụkọ ndị na-akpali akpali. Ọ kaara ndị Kraịst mma ikwu ihe ha maara na ọ bụ eziokwu—ozi ọma Alaeze ahụ. Okwu sochirinụ bụ́, “Idi ‘Ogwu n’Anụ Ahụ’” kasiri nnọọ ọtụtụ ndị obi ma wulie ha elu. O nyeere ha aka ịhụ na n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị anyị pụrụ iche ihu n’esepụghị aka, Jehova pụrụ iwusikwu anyị ike site ná mmụọ nsọ ya, Okwu ya, na òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị. E nwetara agbamume dị ukwuu site n’ahụmahụ Pọl onyeozi nwere n’akụkụ a.—2 Ndị Kọrint 12:7-10; Ndị Filipaị 4:11, 13.

Ụbọchị mbụ ji okwu bụ́ “Isoro Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ,” mechie. A tụlere akụkụ atọ nke nzukọ Chineke nweworo ọganihu na ha karisịa: (1) nghọta na-amụba amụba nke ìhè ime mmụọ sitere n’aka Jehova, (2) ozi Chineke nyefeworo anyị, nakwa (3) mgbanwe ndị a na-eme n’oge ha n’ihe metụtara usoro nhazi. Mgbe ahụ, ọkà okwu ahụ ji obi ike kwuo, sị: ‘Anyị na-enwe obi ụtọ banyere ihe ndị dị n’ihu.’ Ọ jụrụ, sị: “À pụrụ inwe obi abụọ ọ bụla na anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji jigide obi ike anyị nwere na mbụ ruo ọgwụgwụ?” (Ndị Hibru 3:14) Azịza ya doro anya. Nke ahụ dugara ná mwepụta e wepụtara broshuọ ọhụrụ aha ya bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Ọ ga-abụ ihe enyemaka dị ike n’ịkụzi ihe iji nyere ndị na-agụghị akwụkwọ nke ọma ma ọ bụ ndị na-amaghị agụ ihe nke ọma aka ịmụta banyere Jehova.

Ụbọchị nke Abụọ—Nọgide Na-akọ Banyere Oké Ọrụ Nile nke Chineke

Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ ji usoro isiokwu bụ́ “Ndị Ozi nke Okwu Chineke” gaa n’ihu. Akụkụ nke mbụ dọọrọ uche gaa n’ihe ịga nke ọma a na-enwe ugbu a n’ọrụ nkwusa anyị zuru ụwa ọnụ. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ bụ́ ndị na-ajụ ozi Alaeze ahụ na-ama ntachi obi anyị n’ọrụ a aka. Ụfọdụ ndị nkwusa jeworo ozi ruo ogologo oge kọwara otú ha siworo nọgide na-enwe ọṅụ n’ozi site n’idozi uche na obi ha iji zute ihe ịma aka nke enweghị mmasị na mmegide. Akụkụ nke abụọ chetaara ndị bịara mgbakọ na Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ijekwuru ndị mmadụ n’ebe nile, ma n’ụzọ a kwadebere akwadebe ma na mberede. Akụkụ nke ikpeazụ kọwakwara ụzọ dị iche iche sara mbara ndị Kraịst nile pụrụ isi mụbaa ozi onwe onye ha. Ọkà okwu ahụ mesiri ya ike na iji mee nke a, anyị kwesịrị ibute Alaeze Chineke ụzọ karịsịa, ọbụna ma a sị na ime otú ahụ na-agụnye ahụ erughị ala na ịnapụ onwe onye ihe.—Matiu 6:19-21.

Ebe ọ bụ na anyị bi n’ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ́ nke oké ọchịchọ maka ihe onwunwe jupụtara na ya, okwu bụ́ “Zụlite Nsọpụrụ Chineke n’Inwezu Ihe Nile Dị Mkpa” bịara nnọọ n’oge ya. N’ime ka ụfọdụ n’ime okwu ya dabere na 1 Timoti 6:6-10, 18, 19, ọkà okwu ahụ gosipụtara otú nsọpụrụ Chineke si enyere ndị Kraịst aka izere ịhụ ego n’anya, bụ́ nke pụrụ ịrafu ha ma kpatara ha ọtụtụ ihe mgbu. O mesiri ya ike na ihe ọ sọrọ ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị ya bụrụ, obi ụtọ na-adabere ná mmekọrịta anyị na Jehova nakwa n’ọdịmma ime mmụọ anyị. Isi ihe e kwuru n’okwu bụ́ “Emenyeghị Chineke Ihere” kpaliri ọtụtụ ndị nke ukwuu. E mesiri eziokwu ahụ bụ́ na ọ dịghị mgbe Jehova na-echezọ Ndịàmà ya na-ekwesị ntụkwasị obi, ike. Ihe nlereanya na-enweghị atụ nke Jisọs Kraịst—onye “dị otu aka ahụ ụnyaahụ na taa, ee, ruokwa mgbe nile ebighị ebi”—ga-enyere ọtụtụ ndị aka ịnọgide na-eji ntachi obi agba ọsọ ndụ ahụ.—Ndị Hibru 13:8.

Okwu e ji mechie nnọkọ nke ụtụtụ bụ okwu baptism—nke na-abụkarị ihe dị ịrịba ama ná mgbakọ ukwu nke Ndịàmà Jehova. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ ịhụ ndị ọhụrụ raara onwe ha nye ka ha na-eso ijeụkwụ Jisọs site n’ikwe ka e mee ha baptism ime mmiri! (Matiu 3:13-17) Ndị nile weere nzọụkwụ a emezuworị ihe dị ukwuu dị ka ndị na-eme okwu Chineke. Ọzọkwa, mgbe e mere ha baptism, ha na-aghọ ndị ozi a họpụtara ahọpụta nke ozi ọma ahụ, na-enweta ọṅụ dị ukwuu site n’ịmara na ha na-ekere òkè n’ido aha Jehova nsọ.—Ilu 27:11.

E nyere ndụmọdụ a kapịrị ọnụ n’okwu bụ́ “Ntozu Okè Dị Mkpa ‘Iji Tụlee Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ.’” Ụkpụrụ ezi ihe na ihe ọjọọ nke ụwa dara ada n’ụzọ dị mwute. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịdabere n’ụkpụrụ Jehova. (Ndị Rom 12:2) A gbara mmadụ nile ume ịrụsi ọrụ ike iji nweta nghọta ziri ezi nke ụzọ Chineke na iji tozuo okè. Mgbe ahụ, site n’ime ya eme, anyị ga-azụ ike nghọta anyị “ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.”—Ndị Hibru 5:11-14.

Ihe sochiziri bụ usoro isiokwu bụ́ “Rụsịe Ọrụ Ike Iji Zụlite Iji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe.” Ezi ndị Kraịst na-aghọta mkpa ọ dị ịzụlite na ịnọgide na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Nke a chọrọ ịrụsi ọrụ ike—ịgụ ihe, ịmụ ihe, na ịtụgharị uche. (Matiu 7:13, 14; Luk 13:24) Ndị ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe na-ekerekwa òkè “n’ekpere na arịrịọ nile.” (Ndị Efesọs 6:18) Anyị na-aghọta na ekpere anyị na-ekpughe otú okwukwe na nararanye anyị miruru emi, otú anyị na-ejiru ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, nakwa ihe anyị na-ewere dị ka “ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10, NW) E mesikwara mkpa ọ dị iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya na nke ịhụnanya ike, ụdị ahụ nwa na-erube isi na nna dị obiọma na-enwe. Ọ bụghị nanị na anyị nwere okpukpe—ọ bụ ezie na ọ bụ ezigbo ya—kama anyị kwesịrị ịzụlite okwukwe siri ike, ‘dị ka anyị na-ahụ Chineke.’—Ndị Hibru 11:6, 27.

E kwukwuru okwu metụtara ọganihu ime mmụọ n’okwu bụ́ “Mee Ka Ọganihu Gị Pụta Ìhè.” A tụlere akụkụ atọ a ga-enwe ọganihu dị otú ahụ na ha: (1) inwekwu ihe ọmụma, nghọta, na amamihe, (2) ịmịpụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke, nakwa (3) ịrụzu ọrụ dịịrị anyị dị ka ndị òtù ezinụlọ.

Ná mmechi nke okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ́, “Ịga Ije n’Ìhè Okwu Chineke nke Na-enwuwanye Enwu,” obi tọrọ ndị bịara mgbakọ ụtọ inweta akwụkwọ ọhụrụ bụ́, Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I. Nke a bụ nke mbụ n’ime mpịakọta abụọ na-atụle akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa site n’isiakwụkwọ gaa n’isiakwụkwọ. “Akwụkwọ Aịsaịa nwere ozi maka anyị taa,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. Ọ gara n’ihu, sị: “Ee, ọtụtụ n’ime amụma ya mezuru laa azụ n’ụbọchị Aịsaịa. . . . Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime amụma Aịsaịa na-enwe mmezu ha taa, ụfọdụ ga-emezukwa n’ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa.”

Ụbọchị nke Atọ—Bụrụnụ Ndị Na-eme Okwu Jehova

Ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ ji ntụle nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị malite. Usoro isiokwu bụ́ “Amụma Bara Uru nke Zefanaịa Maka Ndị Na-eme Uche Chineke,” sochiziri. Okwu atọ nke usoro isiokwu a gosipụtara na, dị ka Jehova mere n’ụbọchị nke Juda na-enupụ isi, ọ ga-ata ndị jụrụ ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ya ugbu a ahụhụ. Ebe ọ bụ na ha na-emehie megide Chineke, ha ga-ejegharị n’enweghị enyemaka dị ka ndị kpuru ìsì, n’enweghị ike inweta mgbapụta. Otú ọ dị, ezi ndị Kraịst na-eji ikwesị ntụkwasị obi anọgide na-achọ Jehova, a ga-ezobekwa ha n’ụbọchị iwe Chineke. Ọzọkwa, ha na-enweta ọtụtụ ngọzi ọbụna ugbu a. Ha nwere ohere a gọziri agọzi ịsụ “asụsụ dị ọcha” nke eziokwu Bible. (Zefanaịa 3:9, NW) Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Ịsụ asụsụ dị ọcha na-agụnye ọ bụghị nanị ikweta n’eziokwu ahụ na ịkụziri ya ndị ọzọ kamakwa ime ka omume anyị kwekọọ n’iwu na n’ụkpụrụ Chineke.”

Ndị bịara mgbakọ ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi chere ihe nkiri bụ́ “Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị Maka Ụbọchị Anyị.” Ihe nkiri a e yi uwe ihe nkiri mee gosipụtara otú ọtụtụ puku ndị Israel si tụfuo ndụ ha n’ókè nke Ala Nkwa ahụ n’ihi na ha chezọrọ Jehova ma bụrụ ndị ndị inyom na-ekpere arụsị rabara n’ịkwa iko nakwa n’ofufe ụgha. Ná mmalite, otu n’ime ndị bụ́ isi n’ihe nkiri ahụ—Jamin—amaghị nke ọ ga-eso eso n’etiti ihe ụra nke ndị inyom Moab na nrara ọ raara onwe ya nye Jehova. Echiche ụgha na nke aghụghọ nke Zimri na-adịghị asọpụrụ Chineke pụtara nnọọ ìhè, dịkwa ka okwukwe na nraranye Fineas pụtara. E gosipụtara nnọọ ihe ize ndụ dị n’ịbụ ndị ha na ndị na-ahụghị Jehova n’anya na-akpakọrịta.

Ihe nkiri ahụ doziri uche maka okwu sochirinụ bụ́, “Unu Aghọla Ndị Na-anụ Ma Na-echezọ.” Ntụle nke 1 Ndị Kọrint 10:1-10 gosipụtara na Jehova na-anwale nrubeisi anyị iji mara iru eru anyị inweta ihe nketa n’ụwa ọhụrụ ahụ. Nye ụfọdụ ndị, ọchịchọ anụ ahụ na-ewezụga ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ n’ụsọ ọbụna ugbu a, bụ́ mgbe ọ fọrọ nke nta ka anyị banye n’ime usoro ihe ọhụrụ ahụ. A gbara mmadụ nile ume ka ha ghara ịtụfu ohere nke ‘ịba n’izu ike Jehova.’—Ndị Hibru 4:1.

Isiokwu okwu ihu ọha bụ “Ihe Mere A Ga-eji Na-echebara Oké Ọrụ Nile nke Chineke Echiche.” “Oké ọrụ nile” nke Jehova na-egosipụta amamihe ya na ikike o nwere n’ebe ihe o kere eke a na-ahụ anya dị bụ́ ndị gbachara anyị gburugburu. (Job 37:14) Ajụjụ ụfọdụ na-akpali iche echiche Jehova jụrụ Job zuru ezu ime ka o nwee mmasị n’ike nke Onye Okike pụrụ ime ihe nile. Jehova ga-arụkwara ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi “oké ọrụ” dị iche iche n’ọdịnihu. Ọkà okwu ahụ kwubiri, sị: “Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji chebara oké ọrụ nile nke Jehova echiche—ihe ndị o mere n’oge gara, ihe ndị ọ na-eme gburugburu anyị ugbu a n’ihe okike, na ihe o kwere nkwa ime n’ọdịnihu dị nso.”

Mgbe a chịkọtasịrị ihe ọmụmụ Ụlọ Nche dịịrị izu, e kwuru okwu ikpeazụ nke mgbakọ ahụ. N’ịbụ nke isiokwu ya bụ “Jiri Ihe Ùgwù Gị Dị Ka Onye Na-eme Okwu Chineke Kpọrọ Ihe nke Ukwuu,” okwu a na-akpali akpali mesiri ya ike na ọ bụ ihe ùgwù ịbụ ndị na-eme okwu Chineke. (Jemes 1:22) E chetaara ndị na-ege ntị na ihe ùgwù anyị dị ka ndị na-eme okwu Chineke pụrụ iche, ka anyị na-egosipụtakwu ya, otú ahụ ka anyị ga na-ejikwu ya akpọrọ ihe nke ukwuu. A gbara ndị nile bịaranụ ume ịtụgharị uche n’ihe mkpali ndị bara uru ha nwetara ná mgbakọ distrikti a n’ọchịchọ ha ịbụ ndị na-eme okwu Chineke ruo n’ókè kasị zuo ezuo. Nke ahụ bụ nanị ụzọ isi nweta obi ụtọ kasị ukwuu a pụrụ inweta.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!

N’ehihie Friday, e wepụtara broshuọ ọhụrụ aha ya bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! E nwere mkpa dị ukwuu maka nkụzi Bible e mere ka ọ dị mfe n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, a ga-ejikwa broshuọ a gboo mkpa ahụ. Ọ ga-abụ ngọzi dị ukwuu nye ndị gara akwụkwọ nanị nke nta ma ọ bụ ndị na-amaghị agụ ihe nke ọma.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ

Ndị bịara mgbakọ nwere obi ụtọ inweta Mpịakọta nke I nke akwụkwọ ahụ dị mpịakọta abụọ bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ. Ná mbipụta a, e mere ka uru amụma Aịsaịa bara maka oge anyị pụta ìhè.