Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nlekọta na Ndị Ohu Na-eje Ozi, Ndị E Ji Usoro Ọchịchị Chineke Ahọpụta

Ndị Nlekọta na Ndị Ohu Na-eje Ozi, Ndị E Ji Usoro Ọchịchị Chineke Ahọpụta

Ndị Nlekọta na Ndị Ohu Na-eje Ozi, Ndị E Ji Usoro Ọchịchị Chineke Ahọpụta

“Na-ezenụ onwe unu na ìgwè atụrụ nta nile, nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya.”—ỌRỤ 20:28.

1, 2. Olee otú e si na-emezu Aịsaịa 60:22?

OGOLOGO oge gara aga, Jehova buru amụma na ihe dị ịrịba ama ga-eme na mgbe ọgwụgwụ. Site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, e kwuru, sị: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.”—Aịsaịa 60:22.

2 È nwere ihe àmà na-egosi na amụma a na-emezu taa? Eenụ! N’afọ ndị 1870, e guzobere otu ọgbakọ nke ndị Jehova n’Allegheny, Pennsylvania, U.S.A. Site n’obere ọnụ ọgụgụ dị otú ahụ ná mmalite, e nweela ọtụtụ iri puku ọgbakọ na-enwekwa ọganihu n’ụwa nile. Ọtụtụ nde ndị nkwusa Alaeze—mba nwere ume—nọ n’ihe karịrị ọgbakọ 91,000 ugbu a n’ala 235 gburugburu ụwa. N’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya, nke a na-egosikwu na Jehova na-eme ka nchịkọbata nke ndị na-efe ezi ofufe gakwuo ọsọ ọsọ tupu ntiwapụ nke “mkpagbu ukwu” ahụ, bụ́ nke dị nnọọ nso ugbu a.—Matiu 24:21; Mkpughe 7:9-14.

3. Gịnị ka ịbụ onye e mere baptism baa ‘n’aha nke Nna, nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ’ pụtara?

3 Mgbe ọtụtụ nde mmadụ a rarasịịrị onwe ha nye Jehova, n’ụzọ kwekọkwara ná ntụziaka Jisọs, e mere ha baptism baa “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.” (Matiu 28:19) Ịbụ ndị e mere baptism baa “n’aha nke Nna” pụtara na ndị a raara onwe ha nye nakweere Jehova dị ka Nna ha nke eluigwe na Onye Na-enye Ndụ ma na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ya. Baptism baa ‘n’aha nke Ọkpara’ pụtara na ha nakweere Jisọs Kraịst dị ka Onye Mgbapụta, Onye Ndú, na Eze ha. Ha ghọtakwara òkè mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike Chineke nọ n’ọru, na-ekere n’iduzi ndụ ha. Nke a na-egosi na e mewo ha baptism baa ‘n’aha nke Mmụọ Nsọ.’

4. Olee otú e si ahọpụta ndị Kraịst bụ́ ndị ozi?

4 N’oge e mere ndị ọhụrụ na-eso ụzọ baptism, a na-ahọpụta ha dị ka ndị ozi Jehova Chineke. Ònye na-ahọpụta ha? Ụkpụrụ dị n’okwu ndị e dekọrọ ná 2 Ndị Kọrint 3:5 dabara adaba n’ọnọdụ ha: “Iru eru anyị [dị ka ndị ozi] sitere na Chineke.” Ọ dịghị ihe ùgwù ha pụrụ ịchọ inweta karịrị ịbụ ndị Jehova Chineke n’onwe ya họpụtara! Mgbe e mesịrị ha baptism, ha ga-anọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ dị ka ndị ozi nke “ozi ọma” ahụ ma ọ bụrụhaala na ha na-anabata nduzi nke mmụọ Chineke ma nọgide na-etinye Okwu ya n’ọrụ.—Matiu 24:14; Ọrụ 9:31.

Nhọpụta E Ji Usoro Ọchịchị Chineke—Ọ Bụghị nke Ọchịchị Onye Kwuo Uche Ya—Eme

5. À na-eji usoro ọchịchị onye kwuo uche ya ahọpụta ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi? Kọwaa.

5 A chọrọ nlekọta bụ́ ịgba site n’aka ndị nlekọta ruru eru na enyemaka zuru ezu nke ndị ohu na-eje ozi iji na-egbo mkpa ime mmụọ nke ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị ozi na-arụsi ọrụ ike. (Ndị Filipaị 1:1) È si aṅaa ahọpụta ndị ikom dị otú ahụ ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe? Ọ bụghị site n’usoro e ji eme ihe na Krisendọm. Dị ka ihe atụ, a dịghị eji usoro ọchịchị onye kwuo uche ya ahọpụta ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, ya bụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ ịtụliri onye ahụ aka. Kama nke ahụ, a na-eji usoro ọchịchị Chineke eme nhọpụta ndị a. Gịnị ka nke ahụ pụtara?

6. (a) Gịnị bụ ezi ọchịchị Chineke? (b) Gịnị mere nhọpụta a na-ahọpụta ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi ji kwekọọ n’ọchịchị Chineke?

6 N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ezi ọchịchị Chineke bụ ịchịisi ya. Ndịàmà Jehova na-eji ọchịchọ obi ha edo onwe ha n’okpuru ịchịisi ya ma na-emekọ ihe ọnụ iji na-eme uche Chineke. (Abụ Ọma 143:10; Matiu 6:9, 10) Nhọpụta a na-ahọpụta ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi kwekọrọ n’ọchịchị Chineke n’ihi na usoro nke ịtụ aro na ịhọpụta ndị ikom dị otú ahụ a pụrụ ịtụkwasị obi na-ekwekọ ná ndokwa Chineke dị ka e dekọrọ ya n’Akwụkwọ Nsọ. Dịkwa ka ‘onye bụụrụ ihe nile onyeisi,’ n’ezie, o ruuru Jehova ikpebi otú nzukọ ya a na-ahụ anya ga-esi na-aga.—1 Ihe E Mere 29:11; Abụ Ọma 97:9.

7. Olee otú e si achịkwa Ndịàmà Jehova?

7 N’ụzọ dị iche n’ọtụtụ òtù okpukpe nke Krisendọm, Ndịàmà Jehova adịghị ekpebiri onwe ha ụdị nhazi okpukpe ha ga-eji na-eme ihe. Ndị Kraịst a obi ha ziri ezi na-agbalịsi ike ịrapara n’ụkpụrụ Jehova. A dịghị eji ụdị ọchịchị chọọchị nke dị n’aka ọgbakọ, n’aka ndị isi, ma ọ bụ n’aka òtù ndị ụkọchukwu ahọpụta ndị nlekọta nọ n’etiti ha. Ọ bụrụ na ihe nke ụwa anwaa ịbata n’usoro nhọpụta ndị a, ndị Jehova adịghị ekwe. Ha na-eji nguzo siri ike anọgide na-ewere nguzo ahụ ndị ozi kwupụtara nnọọ nke ọma na narị afọ mbụ mgbe ha kwuru, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’ụzọ dị otú ahụ, Ndịàmà na-edo onwe ha n’okpuru Chineke n’ihe nile. (Ndị Hibru 12:9; Jemes 4:7) Ịgbaso usoro ọchịchị Chineke na-eweta nnwapụta Chineke.

8. Olee ọdịiche dị n’etiti usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na nke ọchịchị Chineke?

8 Dị ka ndị ozi nke Onye Ọchịchị Ukwu ahụ, bụ́ Jehova, anyị ga-eme nke ọma iburu ọdịiche dị n’etiti usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na nke ọchịchị Chineke n’uche. Usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na-achọ ka ọnụ ọgụgụ ndị ga-ekwuchitere ndị ahụ hara nhata, a na-ejikarịkwa mmadụ ime mkpọsa ka a họpụta ya na nhọpụta dabere n’ihe ka ọtụtụ ịtụliri onye ahụ aka, ama ha. A naghị eji usoro ndị dị otú ahụ eme ihe ná nhọpụta ndị e ji usoro ọchịchị Chineke eme. Ha adịghị esi n’aka mmadụ; ha adịghịkwa esi n’aka ụlọ ọrụ iwu kwadoro. Ikekwe, ka Pọl na-ezo aka ná nhọpụta Jisọs na Jehova họpụtara ya dị ka “onye ozi nke ndị mba ọzọ,” ọ gwara ndị Galetia na a họpụtara ya “ọ bụghị site na mmadụ, o siteghịkwa n’aka mmadụ, kama o sitere n’aka Jisọs Kraịst, sitekwa n’aka Chineke, bụ́ Nna, Onye mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Ndị Rom 11:13; Ndị Galetia 1:1.

Ndị Mmụọ Nsọ Họpụtara

9. Gịnị ka Ọrụ 20:28 na-ekwu banyere nhọpụta nke ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta?

9 Pọl chetaara ndị nlekọta bi n’Efesọs na Chineke esitewo ná mmụọ nsọ họpụta ha. O kwuru, sị: “Na-ezenụ onwe unu na ìgwè atụrụ nta nile, nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya, ka unu na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ, nke O ji ọbara nke [Ọkpara, NW] ya zụtara Onwe ya.” (Ọrụ 20:28, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ dị ndị Kraịst ahụ bụ́ ndị nlekọta mkpa ịnọgide na-abụ ndị mmụọ nsọ na-eduzi ka ha na-arụ ọrụ ha dị ka ndị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke. Ọ bụrụ na onye nọ n’ọnọdụ a họpụtara ahọpụta adịghịzi eru ụkpụrụ Chineke, ka oge na-aga, mmụọ nsọ ga-eme ka e wetuo ya n’ọnọdụ ya.

10. Olee otú o si bụrụ na mmụọ nsọ na-ekere òkè dị oké mkpa ná nhọpụta ndị e ji usoro ọchịchị Chineke eme?

10 Olee otú o si bụrụ na mmụọ nsọ na-ekere òkè dị oké mkpa? Nke mbụ, ọ bụ ike mmụọ nsọ ka e ji dee ihe ndekọ ahụ bu ihe ndị a chọrọ iji ruo eruo maka nlekọta ime mmụọ. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Timoti na Taịtọs, o depụtara ụkpụrụ ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi ga-ebi ndụ kwekọrọ na ya. N’ozuzu ya, o depụtara ihe dị ka ihe 16 a chọrọ iji ruo eruo. Dị ka ihe atụ, ndị nlekọta ga-abụ ndị a na-adịghị akalu, ndị anya udo, ndị uche ha zuru okè, ndị omume ha kwesịrị ekwesị, ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, ndị nwere ike izi ihe, na ndị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya dị ka ndị isi ezinụlọ. Ha ga-abụ ndị na-adịghị aṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè, ha agaghị abụ ndị na-ahụ ego n’anya, ha ga-abụ ndị na-egosipụta njide onwe onye. N’otu aka ahụ, e setịpụrụ ụkpụrụ ndị dị elu maka ndị ikom na-agbalị iru eru maka nhọpụta dị ka ndị ohu na-eje ozi.—1 Timoti 3:1-10, 12, 13; Taịtọs 1:5-9.

11. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị a na-aghaghị ịchọ n’aka ndị ikom na-agbalị iru eru maka ibu ọrụ ọgbakọ?

11 Ntụle a tụlere iru eru ndị a na-egosi na ndị na-edu ndú n’ofufe Jehova ga-abụrịrị ezi ndị nlereanya n’omume ndị Kraịst. Ndị ikom bụ́ ndị na-agbalị iru eru maka ibu ọrụ ọgbakọ aghaghị inye ihe àmà na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ n’ime ha. (2 Timoti 1:14) Ọ ghaghị ịpụta ìhè na mmụọ Chineke na-amịpụta n’ime ndị ikom a mkpụrụ nke “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Ha ga-egosipụta mkpụrụ ndị dị otú ahụ n’otú ha si emeso ndị kwere ekwe ibe ha na ndị ọzọ ihe. N’ezie, ụfọdụ pụrụ ịkasị na-eme nke ọma n’igosipụta mkpụrụ ụfọdụ nke mmụọ nsọ, ebe ndị ọzọ pụrụ ịkasị na-emezu ihe ndị ọzọ a chọrọ n’aka ndị nlekọta. Otú ọ dị, n’ụzọ ndụ ha n’ozuzu ya, ndị nile na-atụ anya ịbụ ndị a ga-ahọpụta dị ka ndị nlekọta ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi kwesịrị igosipụta na ha bụ ndị ikom ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, na-emezu ihe Okwu Chineke chọrọ n’aka ha.

12. Olee ndị a pụrụ ikwu na ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ha?

12 Mgbe Pọl gbara ndị ọzọ ume iṅomi ya, ọ pụrụ iji nkwuwa okwu mee otú ahụ n’ihi na ya onwe ya nọ na-eṅomi Jisọs Kraịst, bụ́ onye ‘hapụụrụ anyị ihe ilereanya, ka anyị wee soo ijeụkwụ Ya nile.’ (1 Pita 2:21; 1 Ndị Kọrint 11:1) N’ụzọ dị otú a, a pụrụ ikwu na ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ndị na-emezu ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ ha n’aka n’oge a họpụtara ha dị ka ndị nlekọta ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi.

13. Olee otú mmụọ nsọ na-esi enyere ndị na-atụ aro ịhọpụta ndị ikom maka ije ozi n’ọgbakọ aka?

13 E nwere ihe ọzọ na-egosi otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ n’ịtụ aro nakwa n’ịhọpụta ndị nlekọta. Jisọs kwuru na ‘Nna anyị nke eluigwe na-ewere Mmụọ Nsọ nye ndị na-arịọ Ya?’ (Luk 11:13) Ya mere mgbe ndị okenye ọgbakọ zukọrọ iji tụọ arọ ka a họpụta ndị ikom maka ibu ọrụ ọgbakọ, ha na-ekpe ekpere ka mmụọ Chineke duzie ha. Ha na-eme ka aro ha dabere n’ihe e kwuru n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ, mmụọ nsọ na-emekwa ka ha nwee ike ịghọta ma onye a na-ekwu okwu ịhọpụta ọ̀ na-emezu ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ. Ndị na-atụ aro ahụ agaghị abụ ndị ọdịdị elu ahụ, agụmakwụkwọ, ma ọ bụ ikike ebumpụta ụwa mmadụ ga-emetụta n’ụzọ gabigara ókè. Isi ihe ha ga-elekwasị anya aghaghị ịbụ ma onye ahụ ọ̀ bụ nwoke ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, onye ndị òtù ọgbakọ na-agaghị ala azụ ịgakwuru maka ndụmọdụ ime mmụọ.

14. Gịnị ka anyị na-amụta site n’Ọrụ 6:1-3?

14 Ọ bụ ezie na òtù ndị okenye na-eso ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ekere òkè n’ịtụ aro ịhọpụta ụmụnna nwoke maka ije ozi dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, a na-eme nke bụ́ nhọpụta kpọmkwem n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ e setịpụrụ na narị afọ mbụ. N’otu oge, e nwere mkpa maka ndị ikom ruru eru n’ụzọ ime mmụọ ilebara otu ọrụ dị mkpa anya. Òtù na-achị isi nyere ntụziaka a na-esonụ, sị: “Chọpụtanụ n’etiti unu ndị ikom asaa ndị a gbaara ha ezi àmà, ndị jupụtara ná Mmụọ Nsọ na amamihe, ndị anyị ga-eme ndị isi n’ọrụ a dị mkpa.” (Ọrụ 6:1-3) Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị ikom nọ n’ebe e nwere mkpa ahụ tụrụ aro maka nhọpụta, ọ bụ ndị ikom nwere ọnọdụ ije ozi nọ na Jerusalem ebe ahụ mere nhọpụta ahụ. A na-agbaso ụkpụrụ yiri nke ahụ taa.

15. Olee otú Òtù Na-achị Isi si ekere òkè n’okwu metụtara ịhọpụta ndị ikom?

15 Ọ bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-ahọpụta ndị nile so na Kọmitii Alaka. Mgbe Òtù Na-achị Isi na-ekpebi onye pụrụ ibu oké ibu ọrụ dị otú ahụ, ha na-eburu n’uche okwu Jisọs bụ́: “Onye ọ bụla e nyere ihe ukwu, n’aka ya ka a ga-achọkwa ihe ukwu: onye ha nyekwara ihe ukwu n’aka idebe, n’aka ya ka ha ga-ajụ ihe nke ka.” (Luk 12:48) Tụkwasị n’ịhọpụta ndị so na Kọmitii Alaka, Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị okenye Betel na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Otú ọ dị, ha na-enyefe ụmụnna nwoke a pụrụ ịtụkwasị obi ọrụ imere ha ụfọdụ nhọpụta ndị ọzọ. E nwekwara ụkpụrụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka nke a.

‘Doo Mmadụ Ndị Okenye, Dị Ka Mụ Onwe M Nyere Gị Iwu’

16. Gịnị mere Pọl ji hapụ Taịtọs na Krit, gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere nhọpụta ndị e ji usoro ọchịchị Chineke eme taa?

16 Pọl gwara onye ọrụ ibe ya bụ́ Taịtọs, sị: “N’ihi nke a ka m hapụrụ gaa na Krit, ka i wee dozie ihe fọdụrụ, dookwa mmadụ ndị okenye n’obodo nile ọ bụla, dị ka mụ onwe m nyere gị iwu.” (Taịtọs 1:5) Pọl depụtaziri iru eru ndị Taịtọs ga-ele anya ha n’ebe ndị ikom ga-eru eru maka nhọpụta dị otú ahụ nọ. Ya mere, taa, Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ụmụnna nwoke ruru eru n’alaka dị iche iche ịnọchite anya ya n’ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. A na-eji nlezianya ahụ na ndị na-anọchite anya Òtù Na-achị Isi ghọtara nke ọma ma na-agbaso ụkpụrụ nduzi nke Akwụkwọ Nsọ maka ime nhọpụta ndị dị otú ahụ. N’ihi ya, ọ bụ ná nduzi nke Òtù Na-achị Isi ka a na-ahọpụta ndị ikom ruru eru ije ozi n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile.

17. Olee otú alaka ụlọ ọrụ si ahụ maka aro ndị a tụrụ ịhọpụta ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi?

17 Mgbe e wetara aro maka ịhọpụta ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society, ndị ikom nwere ahụmahụ na-adabere ná mmụọ Chineke maka nduzi n’ime nhọpụta ndị ahụ. Ndị ikom a na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ga-aza ajụjụ, na-amara na ha agatụghị ebikwasị onye ọ bụla aka n’isi ọsọ ọsọ, ka ha ghara iso ya nwekọọ mmehie ya.—1 Timoti 5:22.

18, 19. (a) Olee otú e si eme ka a mara na a họpụtawo mmadụ? (b) Olee usoro a na-agbaso n’ịtụ aro na n’ịhọpụta mmadụ?

18 A pụrụ iji akwụkwọ ozi e suru stamp nke ụlọ ọrụ iwu kwadoro mee ka a mata na a họpụtawo mmadụ. A pụrụ iji akwụkwọ ozi dị otú ahụ họpụta ihe karịrị otu nwanna n’ọgbakọ.

19 Ọ bụ Jehova site n’aka Ọkpara ya na òtù anya na-ahụ nke Chineke ji eme ihe n’ụwa, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na Òtù Na-achị Isi ya, na-eme nhọpụta ndị e ji usoro ọchịchị Chineke eme. (Matiu 24:45-47) Mmụọ nsọ na-atụzi, ma ọ bụ na-eduzi usoro nile nke ịtụ arọ na ịhọpụta mmadụ dị otú ahụ. Otú a ka ọ dị n’ihi na e depụtara iru eru ndị ahụ n’Okwu Chineke, bụ́ nke e dere n’ike mmụọ nsọ, onye ahụ a họpụtara na-enyekwa ihe àmà nke ịbụ onye na-amị mkpụrụ nke mmụọ ahụ. Ya mere, a ga-ele nhọpụta ahụ anya dị ka nke mmụọ nsọ na-eme. Dị nnọọ ka e ji usoro ọchịchị Chineke họpụta ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi na narị afọ mbụ, otú ahụ ka ọ dị taa.

Inwe Ekele Maka Nduzi Jehova

20. Gịnị mere anyị ji enwe otu mmetụta ahụ Devid nwere dị ka e dekọrọ ya n’Abụ Ọma 133:1?

20 N’oge a e nwere ọganihu ime mmụọ na ịba ụba nke ọchịchị Chineke n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, anyị na-enwe ekele na nhọpụta nke ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi dị Jehova n’aka n’ụzọ bụ́ isi. Ndokwa a dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na-enye aka ime ka a nọgide na-enwe ụkpụrụ ezi omume ndị dị elu nke Chineke n’etiti anyị dị ka Ndịàmà Jehova. Ọzọkwa, mmụọ ndị Kraịst na mgbalị ndị ikom a ji ezi obi eme na-atụnye ụtụ dị ukwuu n’udo na ịdị n’otu anyị dị ebube dị ka ndị ohu Jehova. Ya mere, dị ka ọbụ abụ bụ́ Devid, a na-akpali anyị ikwupụta, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!”—Abụ Ọma 133:1.

21. Olee otú e si na-emezu Aịsaịa 60:17 taa?

21 Lee ekele anyị na-enwe maka nduzi Jehova na-enye site n’Okwu na mmụọ nsọ ya! N’eziekwa, okwu ndị ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 60:17 dị ịrịba ama: “N’ọnọdụ ọla M ga-eweta ọlaedo, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ osisi M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume M ga-eweta ígwè: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” Ka e jiworo nke nta nke nta na-etinyezu usoro ọchịchị Chineke n’ọrụ n’etiti Ndịàmà Jehova, anyị enwewo ọnọdụ ndị a a gọziri agọzi ná nzukọ elu ala dum nke Chineke.

22. Gịnị ka anyị nwere ekele maka ya n’ụzọ ziri ezi, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

22 Anyị nwere ekele miri emi maka ndokwa ndị e mere n’ụzọ ọchịchị Chineke n’etiti anyị? Anyị nwekwara ekele dị ukwuu maka ọrụ siri ike ma na-enye afọ ojuju nke ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi e ji usoro ọchịchị Chineke họpụta, na-arụ. Anyị ji obi anyị dum ebuli Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya elu, bụ́ onye meworo ka anyị nwee ọganihu ime mmụọ ma gọzie anyị n’ụba. (Ilu 10:22) Ya mere, ka anyị kpebisie ike iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ. Karịsịa, ka anyị nọgide na-eji ịdị n’otu na-ejekọ ozi ọnụ iji wetara aha ukwu dị nsọ nke Jehova nsọpụrụ na otuto.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ọ bụ usoro ọchịchị Chineke, ọ bụghị nke ọchịchị onye kwuo uche ya, ka e ji ahọpụta ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi?

• Olee otú mmụọ nsọ si ahọpụta ndị ikom bụ́ ndị Kraịst a pụrụ ịtụkwasị obi?

• Olee otú Òtù Na-achị Isi si ekere òkè ná nhọpụta nke ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi?

• N’ihe banyere nhọpụta ndị e ji usoro ọchịchị Chineke eme, gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enwe ekele n’ebe Jehova nọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwere ihe ùgwù ije ozi site n’ịbụ ndị e ji usoro ọchịchị Chineke họpụta