Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Soro Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ Na Ụkwụ

Soro Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ Na Ụkwụ

Soro Nzukọ Jehova Na-aga Ụkwụ Na Ụkwụ

“Chineke nke udo . . . mee ka unu zuo okè n’ezi ihe nile ọ bụla ime ihe Ọ na-achọ.”—NDỊ HIBRU 13:20, 21.

1. Gịnị bụ ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa, olekwa ka a gụtara dị ka ndị nọ n’okpukpe ụfọdụ?

N’AFỌ 1999, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa ruru ijeri isii! Akwụkwọ bụ́ The World Almanac na-egosi na n’ime ọnụ ọgụgụ a, ihe dị ka 1,165,000,000 bụ ndị Alakụba; 1,030,000,000 bụ ndị Roman Katọlik; 762,000,000 bụ ndị Hindu; 354,000,000 bụ ndị Buddha; 316,000,000 bụ ndị Protestant; 214,000,000 bụkwa ndị Ọtọdọks.

2. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ọnọdụ okpukpe dịnụ taa?

2 N’ihi nkewa na ọgba aghara okpukpe dịnụ taa, nde mmadụ nile a hà pụrụ ịdị na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke? Ee e, “n’ihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama Ọ bụ Chineke nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33) N’aka nke ọzọ, gịnị banyere òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ndị ohu Jehova? (1 Pita 2:17) Nnyocha e leziri anya mee na-egosi na ‘Chineke nke udo na-eme ka ha zuo okè n’ezi ihe nile ọ bụla ime ihe Ọ na-achọ.’—Ndị Hibru 13:20, 21.

3. Gịnị mere na Jerusalem na Pentikọst 33 O.A., n’ihi gịnịkwa?

3 N’ezie, ọnụ ọgụgụ ndị bụ́ Ndịàmà Jehova abụghị ihe e ji amata ma hà nwere ihu ọma Chineke; e jighị ọnụ ọgụgụ enweta mmasị Chineke. Ọ họrọghị ụmụ Israel n’ihi na ha “bara ụba” karịa ndị nile. N’ezie, ha “dị ole na ole” karịa ha. (Deuterọnọmi 7:7) Ma, ebe ọ bụ na Israel ekwesịghị ntụkwasị obi, na Pentikọst 33 O.A., Jehova tụgharịrị ihu ọma ya gaa n’ọgbakọ ọhụrụ nke ụmụazụ Jisọs Kraịst mejupụtara. E ji mmụọ nsọ Jehova tee ha mmanụ, ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi gaa n’ihu ikwusara ndị ọzọ eziokwu banyere Chineke na Kraịst.—Ọrụ 2:41, 42.

Ịnọgide Na-aga n’Ihu

4. N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji kwuo na ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ nọgidere na-aga n’ihu?

4 Na narị afọ mbụ, ọgbakọ ndị Kraịst nọgidere na-aga n’ihu, na-emepe ókèala ndị ọhụrụ, na-eme ndị na-eso ụzọ, ma na-enweta nghọta ka ukwuu banyere nzube Chineke. Ndị Kraịst oge mbụ nọgidere na-eso ìhè ime mmụọ e kpughere site n’akwụkwọ ozi ndị e dere site n’ike mmụọ nsọ Chineke, na-aga ụkwụ na ụkwụ. N’ịbụ ndị nleta ndị ozi na ndị ọzọ letara ha kpaliri, ha jezuru ozi ha. E dekọrọ ihe a nke ọma n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.—Ọrụ 10:21, 22; 13:46, 47; 2 Timoti 1:13; 4:5; Ndị Hibru 6:1-3; 2 Pita 3:17, 18.

5. Gịnị mere nzukọ Chineke ji aga n’ihu taa, gịnịkwa mere anyị ji kwesị iso ya na-aga ụkwụ na ụkwụ?

5 Dị ka ndị Kraịst oge mbụ, Ndịàmà Jehova nke oge a ji ụzọ dị nta malite. (Zekaraịa 4:8-10) Kemgbe ngwụsị narị afọ nke 19, e nwewo ihe àmà doro anya na mmụọ Chineke dịnyeere nzukọ ya. Ebe ọ bụ na anyị adaberewo, ọ bụghị n’ike mmadụ, kama ná nduzi nke mmụọ nsọ, anyị anọgidewo na-enwe ọganihu ná nghọta anyị na-enwe banyere Akwụkwọ Nsọ nakwa n’ime uche Chineke. (Zekaraịa 4:6) Ugbu a anyị nọ na “mgbe ikpeazụ,” ọ dị mkpa ka anyị soro nzukọ Jehova nke na-aga n’ihu na-aga ụkwụ na ụkwụ. (2 Timoti 3:1-5) Ime otú ahụ na-eme ka anyị nwee ike ime ka olileanya anyị dịgide, na-emekwa ka anyị nwee ike ikere òkè n’ịgba àmà banyere Alaeze Chineke nke e guzobere, tupu ọgwụgwụ ikpeazụ nke usoro ihe a.—Matiu 24:3-14.

6, 7. Olee akụkụ atọ ndị nzukọ Jehova gaworo n’ihu na ha anyị gaje ịtụle?

6 E nwere ndị nọ n’etiti anyị malitere iso nzukọ Jehova n’afọ ndị 1920, 1930, nakwa ndị nke 1940. N’afọ ndị mbụ ahụ, ònye n’ime anyị pụrụ ichewo banyere uto dị ịrịba ama na mwuli elu na-aga n’ihu nke nzukọ a ruo n’oge a? Chee echiche banyere ihe omume ndị dị ịrịba ama meworo n’akụkọ ihe mere eme anyị nke oge a! N’ezie, ọ bụ ihe na-akwụghachi ụgwọ n’ụzọ ime mmụọ ịtụgharị uche n’ihe Jehova rụzuworo site n’aka ndị ya a haziri n’ụzọ ọchịchị Chineke.

7 Devid oge ochie nwere mmasị miri emi mgbe ọ tụgharịrị uche n’oké ọrụ nile nke Jehova. “A sị na aga m egosi kwuokwa okwu banyere ha,” ka o kwuru, “ha karịrị ịgụ ọnụ.” (Abụ Ọma 40:5) Anyị nwekwara otu ihe isi ike ahụ, n’enweghị ike ịkọcha ọtụtụ ihe ukwu na ihe ndị kwesịrị otuto Jehova mere n’oge anyị. Otú o sina dị, ka anyị tụlee akụkụ atọ nzukọ Jehova gaworo n’ihu: (1) ìhè ime mmụọ na-aga n’ihu, (2) ozi ka mma a gbasawanyere agbasawanye, na (3) mgbanwe ndị a na-eme n’oge ha n’usoro e ji ahazi nzukọ a.

Inwe Ekele Maka Ìhè Ime Mmụọ

8. N’ikwekọ n’Ilu 4:18, gịnị ka ìhè ime mmụọ meworo ka anyị nwee ike ịghọta banyere Alaeze ahụ?

8 N’ihe banyere ìhè ime mmụọ na-aga n’ihu, Ilu 4:18 abụwo eziokwu. Ọ na-asị: “Okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ na-aga n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” Lee ekele anyị nwere maka ìhè ime mmụọ na-aga n’ihu nke na-amụkwasị anyị! Ná mgbakọ e mere na Cedar Point, Ohio, na 1919, e mere ka Alaeze Chineke pụta ìhè. Jehova ji Alaeze ahụ edo aha ya nsọ, jirikwa ya ewepụ ọbụbụeze ya n’ụta. N’ezie, ìhè ime mmụọ emewo ka anyị nwee ike ịghọta na site na Jenesis ruo Mkpughe, Bible na-agba àmà banyere nzube Jehova ido aha ya nsọ site n’Alaeze ahụ nke Ọkpara ya na-achị. Na ya ka olileanya dị ebube nke ndị nile hụrụ ezi omume n’anya dabeere.—Matiu 12:18, 21.

9, 10. N’afọ ndị 1920, gịnị ka a mụtara banyere Alaeze ahụ nakwa banyere nzukọ abụọ na-emegiderịta onwe ha, oleekwa otú nke a siworo bụrụ ihe enyemaka?

9 Ná mgbakọ e mere na Cedar Point, na 1922, ọkà okwu bụ́ isi bụ́ J. F. Rutherford gbara ndị Chineke ume, sị, “kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” N’isiokwu bụ́ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ,” bụ́ nke e bipụtara n’Ụlọ Nche (Bekee) nke March 1, 1925, a dọọrọ uche gaa ná nghọta ime mmụọ nke amụma ndị zoworo aka ná nguzobe nke Alaeze Chineke na 1914. N’afọ ndị 1920, a ghọtakwara na e nwere nzukọ abụọ na-emegiderịta onwe ha—nke Jehova na nke Setan. Ọgụ ahụ na-aga n’ihu n’etiti ha, anyị ga-anọkwa n’akụkụ na-enwe mmeri nanị ma ọ bụrụ na anyị esoro nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ.

10 Olee otú nghọta ime mmụọ dị otú ahụ siworo nyere anyị aka? Ebe ọ bụ na Alaeze Chineke na Eze ahụ bụ́ Jisọs Kraịst abụghị akụkụ nke ụwa, anyị apụghịkwa ịbụ akụkụ nke ụwa. Site n’ịnọpụ iche n’ụwa, anyị na-egosi na anyị dịnyeere eziokwu ahụ. (Jọn 17:16; 18:37) Mgbe anyị na-ahụ nsogbu ndị dị mgbagwoju anya na-eti ajọ usoro ihe a ihe otiti, lee ekele anyị na-enwe na anyị abụghị akụkụ nke nzukọ Setan! Leekwa ka anyị si bụrụ ndị nwere ihu ọma ịnọ ná nchebe ime mmụọ ná nzukọ Jehova!

11. Aha dị aṅaa dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ka ndị Chineke nakweere na 1931?

11 Ná mgbakọ e mere na Columbus, Ohio, na 1931, a kọwara Aịsaịa 43:10-12 n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị Mmụta Bible nakweere aha ahụ pụrụ iche bụ́ Ndịàmà Jehova. Lee oké ihe ùgwù ọ bụ ime ka a mara aha Chineke ka ndị ọzọ wee nwee ike ịkpọku ya ka e wee zọpụta ha!—Abụ Ọma 83:18; Ndị Rom 10:13.

12. Ìhè ime mmụọ dị aṅaa banyere oké ìgwè mmadụ ahụ ka e nyere na 1935?

12 Tupu afọ ndị 1930, ọtụtụ n’ime ndị Chineke nwetụrụ mgbagwoju anya banyere olileanya ha maka ọdịnihu. Ụfọdụ na-eche banyere ndụ eluigwe ma ozizi Bible banyere paradaịs elu ala dọọrọ mmasị ha. Ná mgbakọ e mere na Washington, D.C., na 1935, ọ bụ ihe na-akpali akpali ịnụ na oké ìgwè mmadụ nke Mkpughe isi 7 bụ ndị nwere olileanya elu ala. Kemgbe ahụ, nchịkọta nke oké ìgwè mmadụ ahụ agawo n’ihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịwanyere ukwuu. Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele na njimara nke oké ìgwè mmadụ ahụ abụghịrị anyị ihe omimi? Eziokwu bụ́ na a na-achịkọta ndị mmadụ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu site ná mba nile, agbụrụ nile, na asụsụ nile na-akpali anyị ịgasikwu ike ka anyị so nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ.

13. Olee oké ihe iseokwu e mere ka ọ pụta ìhè ná mgbakọ e nwere na St. Louis na 1941?

13 E mere ka oké ihe iseokwu nke kwesịrị imetụta ọha mmadụ pụta ìhè ná mgbakọ e nwere na St. Louis, Missouri, na 1941. Ọ bụ ọchịchị, ma ọ bụ ọbụbụeze eluigwe na ala. Nke a bụ ihe iseokwu a na-aghaghị idozi n’isi nso, ụbọchị dị egwu a ga-eme nke ahụ jikwa ọsọ na-abịa! Ihe ọzọ e mekwara ka ọ pụta ìhè na 1941 bụ ihe iseokwu yiri nke ahụ bụ́ banyere iguzosi ike n’ezi ihe, bụ́ nke na-enye anyị ohere igosipụta ebe anyị kwụ n’ihe banyere ọbụbụeze Chineke.

14. Ná mgbakọ mba nile e nwere na 1950, gịnị ka a mụtara banyere ndị isi ahụ a kpọtụrụ aha n’Aịsaịa 32:1, 2?

14 Ná mgbakọ mba nile e nwere na New York City, na 1950, e mere ka a mata kpọmkwem ndị ndị isi a kpọtụrụ aha n’Aịsaịa 32:1, 2 bụ. Ọ bụ oge na-akpali akpali mgbe Nwanna Frederick Franz kwuru okwu n’isiokwu a ma kọwaa na ndị isi nke ụwa ọhụrụ ahụ nọ n’etiti anyị. Ná mgbakọ ahụ nakwa ná ndị sochiri ya, e nwewo ọtụtụ mgbukepụ nke ìhè ime mmụọ. (Abụ Ọma 97:11) Lee ekele anyị nwere na okporo ụzọ anyị “dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ na-aga n’ihu”!

Ịga n’Ihu n’Ozi Anyị

15, 16. (a) Olee otú anyị si gaa n’ihu n’ozi anyị n’afọ ndị 1920 na 1930? (b) Olee akwụkwọ ndị e jiworo kwalite ozi ndị Kraịst n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya?

15 Ụzọ nke abụọ nzukọ Jehova siworo gaa n’ihu metụtara ọrụ anyị bụ́ isi—nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20; Mak 13:10) Iji rụzuo ọrụ a, nzukọ a emewo ka anyị mata mkpa ọ dị ịmụba ozi anyị. Na 1922, a gbara ndị Kraịst nile ume ikere òkè n’ọrụ nkwusa. Ọ dịịrị onye ọ bụla ikwe ka ìhè ya nwuo ma si otú ahụ na-ekere òkè n’ịgbara eziokwu ahụ àmà. (Matiu 5:14-16) Na 1927, e mere ihe iji wepụta Sunday iche dị ka ụbọchị ozi ubi. Malite na February 1940, ọ ghọrọ ihe zuru ebe nile bụ́ ịhụ Ndịàmà n’okporo ámá nke ógbè azụmahịa ka ha na-enyefe Ụlọ Nche na Consolation (bụ́ Teta! ugbu a).

16 N’afọ 1937, e wepụtara akwụkwọ nta bụ́ Model Study, bụ́ nke na-emesi ike mkpa ọ dị ime nletaghachi iji kụziere ndị ọzọ eziokwu Bible. N’afọ ndị sochirinụ, e mesiri iduzi ọmụmụ Bible ike nke ukwuu. A kwalitere akụkụ a nke ozi ahụ site n’ibipụta akwụkwọ ndị bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” na 1946 na Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi na 1968. Ka ọ dị ugbu a, anyị na-eji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi eme ihe. Itụle akwụkwọ dị otú ahụ n’ụzọ zuru ezu na-atọ ntọala siri ike nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka ime ndị na-eso ụzọ.

Iso Nnụcha Ndị A Na-eme n’Usoro Nhazi Na-aga n’Ihu

17. N’ikwekọ n’Aịsaịa 60:17, olee otú nzukọ Jehova siworo gaa n’ihu?

17 Ụzọ nke atọ nzukọ Jehova siworo gaa n’ihu metụtara nnụcha ndị a na-anụcha usoro nhazi ya. Dị ka Aịsaịa 60:17 si kwuo, Jehova kwere nkwa, sị: “N’ọnọdụ ọla, M ga-eweta ọlaedo, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ osisi M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume M ga-eweta ígwè: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” N’ikwekọ n’amụma a, e mewo ihe iji mee ka nlekọta nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na ịzụ ìgwè atụrụ ahụ ka mma.

18, 19. Nnụcha ndị dị aṅaa ka e meworo n’usoro nhazi n’ime afọ ndị gafeworonụ?

18 Na 1919, a họpụtara onye nduzi ije ozi n’ọgbakọ ọ bụla rịọrọ ka a hazie ya maka ozi ubi. Nke a kwalitere ozi anyị na-eje n’ubi. A kwụsịrị ịhọpụta ndị okenye na ndị dikọn site n’ime ntụli aka na 1932, na-egosipụta nkwụsị anyị kwụsịrị iji usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na-eme ihe. E nwere ọganihu ọzọ pụtara ìhè na 1938 mgbe a malitere ịhọpụta ndị ohu nile n’ọgbakọ n’ụzọ kwekọkwuru nnọọ ná ndokwa maka nhọpụta n’ụzọ ọchịchị Chineke n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ. (Ọrụ 14:23; 1 Timoti 4:14) Na 1972, a họpụtara ndị nlekọta na ndị ohu na-eje ozi ije ozi, dị ka ndi ikom dị otú ahụ mere n’etiti ndị Kraịst oge mbụ. Kama ime ka ọ bụrụ nanị otu onye na-eje ozi dị ka onye nlekọta ọgbakọ, Ndị Filipaị 1:1 na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ na-egosi na ndị ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka ịbụ ndị nlekọta ga-emejupụta òtù ndị okenye.—Ọrụ 20:28; Ndị Efesọs 4:11, 12.

19 Na 1975, e mere ndokwa ka kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-elekọta ọrụ zuru ụwa ọnụ nke nzukọ Chineke. A họpụtara Kọmitii Alaka ilekọta ọrụ ahụ n’ókèala ha dị iche iche. Kemgbe ahụ, e lekwasịwo anya n’ime ka ọrụ dị mfe n’isi ụlọ ọrụ nakwa n’alaka dị iche iche nke Watch Tower Society iji “jide ihe ndị ka mkpa n’aka.” (Ndị Filipaị 1:9, 10, NW) Ibu ọrụ ndị dị n’ubu ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru Kraịst gụnyere ibute ụzọ n’ọrụ nzisa ozi ọma, izi ihe n’ọgbakọ, na ịzụ ìgwè atụrụ Chineke nke ọma.—1 Timoti 4:16; Ndị Hibru 13:7, 17; 1 Pita 5:2, 3.

Idu Ndú Dị Irè nke Jisọs

20. Iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ na-achọ ka anyị nakwere gịnị banyere ọnọdụ Jisọs?

20 Isoro nzukọ Jehova nke na-aga n’ihu na-aga ụkwụ na ụkwụ chọrọ anyị ịnakwere ọrụ Chineke nyere Jisọs Kraịst dị ka “isi nzukọ Ya.” (Ndị Efesọs 5:22, 23) Ihe ọzọ kwesịkwara ịrịba ama bụ Aịsaịa 55:4, bụ́ ebe a gwara anyị, sị: “Lee, [Jehova enyewo] ya ka ọ bụrụ onye àmà nye ndị nile dị iche iche, ka ọ bụrụ onye ndú na onye iwu nye ndị nile dị iche iche.” N’ezie, Jisọs maara otú e si edu ndú. Ọ makwaara atụrụ ya na ihe ha na-eme. N’ezie, mgbe o nyochara ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor, o kwuru ugboro ise, sị: “Amatara m ọrụ gị nile.” (Mkpughe 2:2, 19; 3:1, 8, 15) Jisọs makwaara mkpa anyị, dịkwa ka Nna ya, bụ́ Jehova, maara. Tupu ọ kụzie ekpere nlereanya ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Nna unu matara ihe nile dị unu mkpa, mgbe unu aka-arịọghị Ya.”—Matiu 6:8-13.

21. Olee otú idu ndú Jisọs si apụta ìhè n’ọgbakọ ndị Kraịst?

21 Olee otú idu ndú Jisọs si apụta ìhè? Otu ụzọ bụ site n’aka ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ.” (Ndị Efesọs 4:8, NW) Mkpughe 1:16 na-akọwa ndị nlekọta e tere mmanụ dị ka ndị nọ n’aka nri Kraịst, n’okpuru nduzi ya. Taa, Jisọs na-eduzi ndokwa maka ịbụ okenye, ma ndị ikom dị otú ahụ hà nwere olileanya eluigwe ma ọ bụ nke elu ala. Dị ka a kọwara n’isiokwu bu ụzọ, a na-eji mmụọ nsọ ahọpụta ha n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) Na narị afọ mbụ, otu ìgwè nke ndị okenye nọ na Jerusalem mejupụtara òtù na-achị isi bụ́ nke lekọtara ọgbakọ dị iche iche nakwa ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’ozuzu ya. A na-agbaso otu ụkpụrụ ahụ taa ná nzukọ Jehova.

Soro Ya Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ!

22. Enyemaka dị aṅaa ka Òtù Na-achị Isi na-enye?

22 E nyefewo “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” bụ́ nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-anọchite anya ya, ọrụ ịkwalite ọdịmma Alaeze n’ụwa. (Matiu 24:45-47) N’ụzọ bụ́ isi, Òtù Na-achị Isi na-ahụ maka inye ọgbakọ ndị Kraịst ntụziaka na nduzi ime mmụọ. (Ọrụ 6:1-6) Otú ọ dị, mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha metụtara ndị ofufe ibe anyị, Òtù Na-achị Isi na-agwa otu ụlọ ọrụ iwu kwadoro ma ọ bụ karị inye ihe enyemaka na imezi ma ọ bụ iwughachi ụlọ obibi na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a lara n’iyi. Ọ bụrụ na e ji obi ọjọọ mesoo ụfọdụ ndị Kraịst ihe ma ọ bụ kpagbuo ha, a na-eme ihe iji wulie ha elu n’ụzọ ime mmụọ. “N’oge nsogbu,” a na-emekwa mgbalị nile iji mee ka ọrụ nkwusa ahụ na-aga n’ihu.—2 Timoti 4:1, 2, NW.

23, 24. N’agbanyeghị ihe na-abịakwasị ndị ya, gịnị ka Jehova na-enye n’esepụghị aka, gịnịkwa kwesịrị ịbụ mkpebi anyị?

23 N’agbanyeghị ihe na-abịakwasị ndị ya, Jehova na-enye nri ime mmụọ na nduzi dị mkpa n’esepụghị aka. Chineke na-enyekwa ụmụnna nwoke ndị tozuru okè mmata na nghọta iji kwadebe maka ịgakwu n’ihu na imekwu nnụcha ná nzukọ ọchịchị Chineke. (Deuterọnọmi 34:9; Ndị Efesọs 1:16, 17) Jehova, n’esepụghị aka, na-enye anyị ihe dị anyị mkpa iji rụzuo ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị na iji jezuo ozi anyị n’ụwa nile.—2 Timoti 4:5.

24 Anyị nwere obi ike zuru ezu na Jehova agaghị agbahapụ ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ma ọlị; ọ ga-azọpụta ha “n’oké mkpagbu” ahụ na-abịanụ. (Mkpughe 7:9-14; Abụ Ọma 94:14; 2 Pita 2:9) Anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji nọgide na-enwe obi ike ahụ anyị nwere na mbụ ruo ọgwụgwụ. (Ndị Hibru 3:14) Ya mere, ka anyị kpebisie ike ịnọgide na-eso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị mere anyị pụrụ iji kwuo na nzukọ Jehova na-anọgide na-aga n’ihu?

• Olee ihe àmà e nwere na ndị Chineke na-enweta ìhè ime mmụọ na-aga n’ihu?

• Olee otú e siworo nwee ọganihu n’ozi ndị Kraịst?

• Nnụcha ndị dị aṅaa bịara n’oge ha ka e meworo n’usoro nhazi n’etiti ndị ohu Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 17]

Dị ka Devid, anyị apụghị ịgụkọ oké ọrụ nile nke Jehova

[Foto dị na peeji nke 18]

Ìgwè atụrụ Chineke eritewo uru site ná nnụcha ndị a na-eme n’oge ha n’usoro nhazi