Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Dibịa Anya Akụọ Mkpụrụ

Otu Dibịa Anya Akụọ Mkpụrụ

Otu Dibịa Anya Akụọ Mkpụrụ

Olee otú mgbalị nke otu dibịa anya nọ na Lviv, Ukraine, si metụta nguzobe e guzobere otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke asụsụ Russian dị na Haifa, Israel, bụ́ ebe dị ihe dị ka kilomita 2,000 site n’ebe ahụ ma bụrụ ebe a ga-agafe ọtụtụ mba tupu e ruo? Nke a bụ akụkọ na-egosi izi ezi nke ihe Bible kwuru n’Eklisiastis 11:6: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ewepụkwala aka gị n’anyasị: n’ihi na ị dịghị ama [ebe nke a ga-eme nke ọma, NW].”

AKỤKỌ anyị na-amalite na 1990 mgbe Ella, nwa agbọghọ bụ́ onye Juu, bi na Lviv. Ella na ezinụlọ ya nọ na-akwadebe ịkwaga Israel. N’oge na-adịghị anya tupu njem ha, Ella na otu dibịa anya bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova yiri agba. N’oge ahụ, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Ukraine. Otú o sina dị, dibịa anya ahụ butere ụzọ n’ịgwa Ella banyere ihe ndị o kweere bụ́ ndị dabeere na Bible. Ọ tụrụ Ella n’anya mgbe ọ gwara ya na Chineke nwere aha aka. Nke ahụ kpaliri ọchịchọ Ella nwere ịmata ihe, nkwurịta okwu dabeere na Bible sochikwara.

Nkwurịta okwu ahụ tọrọ Ella ụtọ nke ukwuu nke na ọ rịọrọ ka ha kwurịta ọzọ n’izu na-eso ya nakwa ọzọ n’izu na-eso nke ahụ. Mmasị ya nọ na-eto eto, ma e nwere otu nsogbu dịnụ. Oge ezinụlọ ahụ ga-agawa Israel na-eru oké nso. Ella ka nwere nnukwu ihe ọ ga-amụta! Iji jiri oge fọdụrụ mee ihe n’ụzọ kasị mma, ọ rịọrọ ka a na-eduziri ya ọmụmụ Bible kwa ụbọchị ruo mgbe ọ ga-eme njem. Ọ bụ ezie na Ella amaliteghachighị ọmụmụ ihe ya ozugbo o ruru Israel, mkpụrụ nke eziokwu agbanyewo mkpọrọgwụ n’obi ya. Tupu afọ ahụ ana-agwụsị, ọ mụsiwere Bible ike ọzọ.

Agha tiwapụrụ na Persian Gulf, Iraq wee kwawa Israel mgbọ ogbunìgwè. Nke a bụ isiokwu ndị mmadụ kpụ n’ọnụ. Otu ụbọchị ná nnukwu ụlọ ahịa, Ella nụpeere ka otu ezinụlọ na-asụ asụsụ Russian, bụ́ ndị kwabatara ọhụrụ, na-akparịta ụka. Ọ bụ ezie na ya onwe ya ka na-amụ Bible, Ella gakwuuru ezinụlọ ahụ wee gwa ha banyere nkwa Bible kwere maka ụwa nke udo ga-adị n’ime ya. N’ihi ya, Galina, bụ́ nne ha ochie; Natasha, bụ́ nne ha; Sasha (Ariel), bụ́ nwa ha nwoke; na Ilana, bụ́ nwa ha nwanyị, sonyechara Ella n’ọmụmụ Bible ya.

Sasha bụ onye mbụ si n’ezinụlọ ahụ ruru n’ókè ịbụ onye e mere baptism—n’agbanyeghị ọtụtụ ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ọ bụ otu n’ime ụmụ akwụkwọ kasị eme nke ọma, a chụpụrụ ya n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na akọ na uche ya dị ka onye Kraịst ekweghị ya ikere òkè n’ọzụzụ na-akwadebe mmadụ ịghọ onye agha, nke bụ́ otu akụkụ nke usoro ihe ọmụmụ a chọrọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. (Aịsaịa 2:2-4) Okwu ikpe Sasha ruru Ụlọikpe Dị Elu nke Israel dị na Jerusalem, bụ́ nke e kwesịrị ịja mma maka inye iwu ịnabataghachi Sasha ka o wee nwee ike ịgụcha usoro agụmakwụkwọ ahụ. Okwu ikpe ahụ gbasazuru mba ahụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Israel bịara mata ihe Ndịàmà Jehova kweere. *

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, Sasha banyere n’ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Taa, ọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche na okenye ọgbakọ. Nwanne ya nwanyị, bụ́ Ilana, esonyeworo ya n’ozi oge nile. Ma nne ha ma nne ha ochie bụ Ndịàmà e mere baptism. Mkpụrụ nke dibịa anya ahụ kụrụ ka na-amị mkpụrụ!

Ka ọ dịgodị, Ella nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ, n’oge na-adịghịkwa anya o mewere nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ọnụ ụzọ mbụ ọ gara, Ella zutere Faina, bụ́ onye si Ukraine kwabata n’oge na-adịbeghị anya. Faina nọ na-enwe ịda mbà n’obi. Ella mesịrị nụ na obere oge tupu ya akụọ aka n’ọnụ ụzọ Faina, nwanyị a obi na-erughị ala ekpegaworo Chineke ekpere, sị: “Amaghị m onye ị bụ, ma ọ bụrụ na ị na-aṅa m ntị, nyere m aka.” Ya na Ella nwere mkparịta ụka na-akpali akpali. Faina jụrụ ọtụtụ ajụjụ ma jiri nlezianya tụlee ihe ndị a zara ya. Ka oge na-aga, o kwenyesiri ike na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu sitere na Bible. Ọ haziri usoro ihe ọmụmụ ya na mahadum ka o wee nwee ike isonyere ọgbakọ na ikere òkè n’ọrụ nkwusa karị. Na May 1994, e mere Faina baptism. Ya onwe ya kwa weere ozi ịsụ ụzọ, jiri ọrụ kọmputa ọ na-arụ nwa oge na-akwado onwe ya.

Na November 1994, ka Ella na-arụ ọrụ nkwusa, ike gwụrụ ya nke ukwuu na mberede. Ọ gara ụlọ ọgwụ bụ́ ebe nnyocha e mere kpughere na o nwere ọnyá afọ na-agba ọbara. Ka ọ na-erule mgbede, ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin Ella agbadawo ruo 7.2. Otu okenye nọ n’ọgbakọ Ella, bụ́ onyeisi oche nke Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ (HLC) n’ógbè ahụ, gwara ndị dọkịta ọtụtụ usoro e ji agwọ ọrịa n’achọghị iji ọbara mee ihe. * A wara ya ahụ n’ụzọ gara nke ọma n’ejighị ọbara, Ella gbakechakwara.—Ọrụ 15:28, 29.

Nke ahụ masịrị nnọọ onye gwọrọ Ella bụ́ ọkachamara n’ọrịa ụmụ nwanyị, bụ́ Karl, onye Juu a mụrụ na Germany. O wee cheta na ndị mụrụ ya, bụ́ ndị lanarịrị Oké Mgbukpọ, maararịị Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Karl jụrụ ọtụtụ ajụjụ. Ọ bụ ezie na Karl adịghị enwe ohere n’ihi ọrụ ịgwọ ọrịa ọ na-arụ, o wepụtara oge maka ịmụchi Bible anya. Ka ọ na-erule afọ na-eso ya, ọ gawala nzukọ ndị Kraịst a na-enwe kwa izu.

Gịnị ka mkpụrụ nke dibịa anya ahụ kụrụ rụpụtaworo? Anyị ahụworịị ihe mere Sasha na ezinụlọ ya. Ma banyere Ella, ọ bụ onye ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ada ya, bụ́ Eina, onye ka si ụlọ akwụkwọ dị elu pụta, na-arụ ọrụ nke ya dị ka ọsụ ụzọ. Faina na-ejekwa ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ma banyere Karl, bụ́ ọkachamara n’ọrịa ụmụ nwanyị bụ́ onye gwọrọ Ella, ọ bụzi Onyeàmà e mere baptism na ohu na-eje ozi, ọ na-agwa ndị ọ na-agwọ ọrịa nakwa ndị ọzọ banyere eziokwu Bible bụ́ nke nwere ikike ịgwọ ọrịa.

Obere ìgwè ahụ na-asụ asụsụ Russian si mba ọzọ kwabata bụ́ nke malitere dị ka otu akụkụ nke Ọgbakọ Haifa Hibru aghọwo ọgbakọ asụsụ Russian na-anụ ọkụ n’obi nke nwere ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 120. Ihe so kpata mmụba a bụ eziokwu bụ́ na otu dibịa anya nọ na Lviv ji ohere o nwere mee ihe ịkụ mkpụrụ!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Maka nkọwa zuru ezu, lee mbipụta Teta! (Bekee) nke November 8, 1994, peeji nke 12-15.

^ par. 9 Ndị òtù HLC na-anọchite anya Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa, ha na-enye aka n’inwe nkwurịta okwu n’etiti onye ọrịa na onye ọrụ ụlọ ọgwụ. Ha na-enyekwa ihe ọmụma banyere ụzọ ndị ọzọ a pụrụ isi gwọọ ọrịa bụ́ ndị dabeere ná nchọpụta kasị ọhụrụ e mere n’ịgwọ ọrịa.

[Map dị na peeji 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

UKRAINE

ISRAEL

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Ella na ada ya, bụ́ Eina

[Foto dị na peeji nke 31]

Ìgwè Ndịàmà nwere obi ụtọ na-asụ asụsụ Russian na Haifa. Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: Sasha, Ilana, Natasha, Galina, Faina, Ella, Eina, na Karl