Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgụ A Na-alụso Ịda Ogbenye—Ọ̀ Bụ Agha A Na-apụghị Imeri na Ya?

Ọgụ A Na-alụso Ịda Ogbenye—Ọ̀ Bụ Agha A Na-apụghị Imeri na Ya?

Ọgụ A Na-alụso Ịda Ogbenye—Ọ̀ Bụ Agha A Na-apụghị Imeri na Ya?

NDỊ na-aga njem nleta n’ụlọ ọrụ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na New York City na-ahụ Ụlọ Nzukọ nke Kansụl Na-ahụ Maka Akụ̀ na Ụba na Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya, nke nwere paịpụ na opi ndị a na-ahụ anya n’uko nke ebe ọha na eze na-anọ ekiri ihe na-emenụ. Onye na-edugharị ndị nleta na-akọwa, sị: “A na-ahụkarị uko ahụ ‘a na-arụchaghị arụcha’ dị ka ihe atụ na-echetara mmadụ na ọrụ imeziwanye ọnọdụ akụ̀ na ụba na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-arụ adịghị mgbe ọ ga-agwụ agwụ; a ga na-enwe mgbe nile ihe ndị a pụrụ imekwu iji meziwanye ọnọdụ ibi ndụ nke ndị bi n’ụwa.”

Ọ bụ ezie na Kansụl ahụ tinyere isi n’ọrụ ọma nke ịkwalite ọnọdụ ibi ndụ ka mma maka mmadụ nile, ọrụ ahụ yiri ka ọ dịghị agwụ agwụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’oge Jisọs Kraịst jere ozi n’ụwa na narị afọ mbụ O.A., o kwuru, sị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị n’ahụ m, n’ihi na O tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma.” (Luk 4:18) Gịnị bụ “ozi ọma” ahụ o zisara? Ọ bụ ozi banyere Alaeze ahụ nke Jehova Chineke, bụ́ onye bụụrụ “ogbenye ebe siri ike n’ime mkpa,” ga-eguzobe, nke Jisọs Kraịst ga-abụkwa Eze ya. Gịnị ka Alaeze ahụ ga-arụzu? Aịsaịa buru amụma, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma. O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:4-6, 8.

Ị̀ ga-enwe mmasị ịmatakwu otú Alaeze Chineke ga-esi “meziwanye ọnọdụ ibi ndụ nke ndị bi n’ụwa,” ka ha wee gharazie inwe ihe ga-akọ ha? Lee ihe e dere n’okpuru ebe a iji mara otú ị pụrụ isi mee ka onye nkụzi ruru eru bịa na nke gị iji gosikwuo gị ihe Bible na-ekwu n’okwu ndị dị otú ahụ.