Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụbọchị Ikpe Jehova Dị Nso!

Ụbọchị Ikpe Jehova Dị Nso!

Ụbọchị Ikpe Jehova Dị Nso!

“Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.”—ZEFANAỊA 1:14.

1. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Chineke nyere site n’ọnụ Zefanaịa?

JEHOVA CHINEKE na-aga ime ihe megide ndị ajọ omume. Gee ntị! Nke a bụ ịdọ aka ná ntị ya: “M ga-ekpochapụ mmadụ . . . M ga-ebipụkwa mmadụ n’elu ụwa.” (Zefanaịa 1:3) Eze Onyenwe anyị Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Zefanaịa, onye bụ́ ma eleghị anya nwa nwa nke Eze Hezekaịa kwesịrị ntụkwasị obi kwuo okwu ndị ahụ. Ihe ndị ahụ e kwuru n’oge ezi Eze Josaịa agbaghị àmà ihe ọma nye ndị na-emebi iwu bi n’ala Juda.

2. N’ihi gịnị ka ihe ndị Josaịa mere na-ejighị gbochie ụbọchị ikpe Jehova?

2 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na amụma Zefanaịa mere ka Josaịa na-eto eto matakwuo mkpa ọ dị ikpochapụ ofufe na-adịghị ọcha na Juda. Ma ihe eze ahụ mere iji kpochapụ okpukpe ụgha n’ala ahụ emeghị ka ajọ omume nile kwụsị n’etiti ndị ahụ ma ọ bụ kpuchie mmehie nke nna nna ya, bụ́ Eze Manase, bụ́ onye ‘mejuru Jerusalem n’ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.’ (2 Ndị Eze 24:3, 4; 2 Ihe E Mere 34:3) N’ihi ya, ụbọchị ikpe Jehova ga-abịarịrị.

3. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na o kwere omume ịlanari ‘ụbọchị iwe Jehova’?

3 Ma, a ga-enwe ndị ga-alanarị ụbọchị ahụ na-emenye egwu. Ya mere, onye amụma Chineke gbara ume, sị: “Tupu ụkpụrụ amụpụta nwa, (ụbọchị agabigawo dị ka igbogbo ọka), mgbe ọnụma nke iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu, mgbe ụbọchị iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zefanaịa 2:2, 3) N’ịbụ ndị bu olileanya nlanarị n’ụbọchị ikpe Jehova n’uche, ka anyị tụlee akwụkwọ Bible bụ́ Zefanaịa. N’ịbụ nke e dere na Juda tupu 648 T.O.A., ọ bụ akụkụ nke “okwu amụma” Chineke nke anyị nile kwesịrị iji obi anyị dum ṅaa ntị na ya.—2 Pita 1:19.

Jehova Esetịa Aka

4, 5. Olee otú e si mezuo Zefanaịa 1:1-3 n’ebe ndị ajọ omume nọ na Juda nọ?

4 “Okwu Jehova” nke Zefanaịa nụrụ ji ịdọ aka ná ntị ahụ e hotara na mbụ malite. Chineke kwupụtara, sị: “M ga-ekpochapụsị ihe nile n’elu ụwa; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta. M ga-ekpochapụ mmadụ na anụmanụ; M ga-ekpochapụ anụ ufe nke eluigwe, na azụ̀ nke oké osimiri, na ihe ịsụ ngọngọ nile, ha na ndị na-emebi iwu; M ga-ebipụkwa mmadụ n’elu ụwa; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Zefanaịa 1:1-3.

5 Ee, Jehova na-aga ikpochapụ ajọ omume n’ala Juda. Ònye ka Chineke ga-eji ‘kpochapụsịa ihe nile n’elu ụwa’? Ebe o doro anya na Zefanaịa buru amụma ná mmalite nke oge ọchịchị Eze Josaịa, bụ́ nke malitere na 659 T.O.A., okwu amụma ndị ahụ mezuru ná mbibi e bibiri Juda na isi obodo ya, bụ́ Jerusalem, site n’aka ndị Babilọn na 607 T.O.A. N’oge ahụ, e ‘kpochapụrụ’ ndị ajọ omume na Juda.

6-8. Gịnị ka e buru n’amụma na Zefanaịa 1:4-6, oleekwa otú e si mezuo amụma ahụ na Juda oge ochie?

6 Ka ọ na-ebu amụma ihe Chineke ga-eme ndị na-efe ofufe ụgha, Zefanaịa 1:4-6 na-ekwu, sị: “M ga-esetịkwa aka m imegide Juda, na imegide ndị nile bi na Jerusalem; M ga-ebipụkwa ndị Beal fọdụrụ n’ebe a, na aha ndị nchụàjà arụsị, ha na ndị nchụàjà nile; na ndị na-akpọ isiala nye usuu ihe nile dị n’eluigwe n’elu ụlọ nile; na ndị na-akpọ isiala, ndị na-aṅụrụ Jehova iyi, ndị jikwa Malkam aṅụ iyi; na ndị si n’iso Jehova laghachi azụ; na ndị na-achọghị Jehova, na-ajụghịkwa ase Ya.”

7 Jehova setịrị aka ya megide ndị Juda na Jerusalem. O kpebisiri ike igbu ndị na-efe chi ndị Kenean maka ihe ubi, bụ́ Beal, ofufe. A kpọrọ chi dị iche iche dị n’ógbè ahụ Beal n’ihi na ndị fere ha weere ha dị ka ndị nwere ike ma na-akpa ike n’ebe ụfọdụ kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, e nwere Beal nke ndị Moab na ndị Midian fere ofufe n’Ugwu Peoa. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1, 3, 6) Na Juda dum, Jehova ga-ekpochapụ ndị nchụàjà Beal, tinyere ndị nchụàjà na-ekwesịghị ntụkwasị obi si n’ebo Livaị bụ́ ndị na-emebi iwu Chineke site n’iso ha na-akpakọrịta.—Ọpụpụ 20:2, 3.

8 Chineke ga-ebibikwa ndị “na-akpọ isiala nye usuu ihe nile dị n’eluigwe,” dị ka ihe àmà na-egosi, ha na-agụ kpakpando ma na-efe anyanwụ ofufe. (2 Ndị Eze 23:11; Jeremaịa 19:13; 32:29) Chineke ga-awụsakwa iwe ya n’ahụ ndị na-anwa ịgwakọta ezi ofufe na okpukpe ụgha site ‘n’ịṅụrụ Jehova iyi, jirikwa Malkam na-aṅụ iyi.’ Ikekwe Malkam bụ aha ọzọ e ji mara Mọlek, chi bụ́ isi nke ndị Amọn. Ofufe Mọlek na-agụnye iji ụmụaka achụ àjà.—1 Ndị Eze 11:5; Jeremaịa 32:35.

Ọgwụgwụ nke Krisendọm Dị Nso!

9. (a) Ikpe gịnị mara Krisendọm? (b) N’adịghị ka ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ na Juda, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

9 Ihe a nile pụrụ ichetara anyị Krisendọm, nke mikpuru emikpu n’ofufe ụgha na ịgụ kpakpando. Òkè ọ na-ekerekwa n’iji ọtụtụ nde mmadụ achụ àjà n’elu ebe ịchụàjà nke agha dị iche iche ndị ụkọchukwu na-akwado na-asọ oyi n’ezie! Ya adịla mgbe anyị ga-adị ka ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ na Juda, bụ́ ndị “si n’iso Jehova laghachi azụ,” ghọọ ndị nwere omume ọ gbasaghị m, kwụsịkwa ịchọ ya ma ọ bụ ịchọ nduzi ya. Kama nke ahụ, ka anyị nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke.

10. Olee otú ị ga-esi akọwa ihe Zefanaịa 1:7 pụtara n’ụzọ amụma?

10 Ihe onye amụma ahụ kwuziri kwesịrị ma ndị ajọ omume nke Juda ma ndị ajọ omume nke oge anyị. Zefanaịa 1:7 na-ekwu, sị: “Dere duu n’ihu Onyenwe anyị Jehova: n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso: n’ihi na Jehova edoziwo àjà, O dowo ndị Ọ kpọrọ oriri nsọ.” N’ụzọ doro anya, ‘ndị a a kpọrọ’ bụ ndị Kaldea bụ́ ndị iro nke Juda. “Àjà” ahụ bụ Juda n’onwe ya, gụnyere isi obodo ya. Zefanaịa si otú a maa ọkwa banyere nzube Chineke ibibi Jerusalem, amụma a zokwara aka ná mbibi nke Krisendọm. N’ezie, ebe ọ bụ na ụbọchị ikpe Chineke dị nnọọ nso taa, ụwa nile kwesịrị ‘idere duu n’ihu Onyenwe anyị Jehova’ ma nụrụ ihe ọ na-ekwu site n’ọnụ “ìgwè atụrụ nta” nke ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” ya. (Luk 12:32; Jọn 10:16) A gaje igbu ndị nile na-agaghị ege ntị, ndị sikwa otú ahụ emegide ịchịisi Alaeze Chineke.—Abụ Ọma 2:1, 2.

N’isi Nso—Ụbọchị Ịkwasi Ákwá Ike!

11. Gịnị ka Zefanaịa 1:8-11 pụtara n’ụzọ bụ́ isi?

11 Banyere ụbọchị Jehova, Zefanaịa 1:8-11 na-agbakwụnye, sị: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị àjà Jehova, na M ga-eji mmehie ndị isi, jikwa mmehie ụmụ eze, jikwa mmehie ndị nile na-eyi uwe ala ọzọ, leta ha. M ga-ejikwa mmehie onye ọ bụla nke na-amabiga mbata ụzọ leta ya n’ụbọchị ahụ, bụ́ ndị na-emeju ụlọ ndị nwe ha n’ihe ike na aghụghọ. Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), na olu iti mkpu ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá azụ̀ daa, ya na ịkwasi ákwá ike site n’obodo nke abụọ, na oké ntiwa site n’ugwu nta nile. Kwasienụ ákwá ike, unu ndị bi na Maktesh, n’ihi na ndị Kenean nile alawo n’iyi: e bipụwo ndị nile e boro ọlaọcha.”

12. Olee otú o si bụrụ na a hụrụ ụfọdụ ka ha “na-eyi uwe ala ọzọ”?

12 Jehoahaz, Jehoịakim, na Jehoịakin ga-anọchi Eze Josaịa. Ọchịchị Zedekaịa, nke e ji mbibi Jerusalem mara, ga-esochizi. N’agbanyeghị na ha na-eche ọdachi dị otú ahụ ihu, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ha chọrọ ka mba ndị ha na ha gbara agbata obi nabata ha site ‘n’iyi uwe ala ọzọ.’ N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị taa na-egosi n’ọtụtụ ụzọ na ha abụghị akụkụ nke nzukọ Jehova. Dị ka ndị na-egosipụta na ha bụ akụkụ nke nzukọ Setan, a ga-enye ha ntaramahụhụ.

13. N’ụzọ kwekọrọ n’amụma Zefanaịa, gịnị ga-eme mgbe ndị Babilọn ga-awakpo Jerusalem?

13 ‘Ụbọchị’ ime mpịazi ahụ nke Juda kwekọrọ n’ụbọchị Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ndị iro ya, iji weta ajọ omume ná njedebe, na iji gosipụta na ọ kasị ihe nile elu. Mgbe ndị Babilọn ga na-awakpo Jerusalem, iti mkpu ga-esi n’Ọnụ Ụzọ Ámá Azụ̀ daa. Ma eleghị anya, e nyere ya aha ahụ n’ihi na ọ dịdewere ahịa azụ̀. (Nehemaịa 13:16) Usuu ndị Babilọn ga-abanye n’akụkụ a kpọrọ obodo nke abụọ, “oké ntiwa site n’ugwu nta nile” pụkwara ịpụta mkpọtụ nke ndị Kaldea na-abịanụ. Ndị bi na Maktesh, bụ́ ma eleghị anya ebe elu nke Ndagwurugwu Tyropoeon, ‘ga-akwasi ákwá ike.’ N’ihi gịnị ka ha ga-eji kwasie ákwá ike? N’ihi na azụmahịa, tinyere nke “ndị nile e boro ọlaọcha,” ga-akwụsị ịdị n’ebe ahụ.

14. Ruo n’ókè ha aṅaa ka nnyocha Chineke ga-enyocha ndị na-ekwu na ha na-efe ya ofufe ga-asa mbara?

14 Ruo n’ókè ha aṅaa ka nnyocha Jehova ga-enyocha ndị na-ekwu na ha na-efe ya ofufe ga-asa mbara? Amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Ọ ga-erukwa, na mgbe ahụ, na M ga-achịrị oriọna chọsie ike n’ime Jerusalem; M ga-ejikwa mmehie ndị ikom ahụ ndị rahụrụ arahụ n’ịdị ka mmanya vine doro edo leta ha, ndị na-asị n’obi ha, Jehova agaghị eme ezi ihe, Ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ. Akụ̀ ha ga-aghọkwa ihe a pụnarawooro ha, ụlọ nile ha ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu: ee, ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, ma ha agaghị aṅụ mmanya vine ha.”—Zefanaịa 1:12, 13.

15. (a) Gịnị gaje ime ndị nchụàjà si n’ezi ofufe dapụ nke Jerusalem? (b) Gịnị na-echere ndị na-ekpe okpukpe ụgha taa?

15 Ndị nchụàjà nke Jerusalem bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na-agwakọta ofufe Jehova na okpukpe ụgha. Ọ bụ ezie na ha na-eche na a pụghị ịhụ ha, Chineke ga-achọta ha dị ka a ga-asị na o ji oriọna na-enwusi ike bụ́ nke ga-achabanye n’ọchịchịrị ime mmụọ ahụ ha gbabaworo. Ọ dịghị onye ga-agbanahụ nkwupụta na mmezu nke ikpe Chineke. Ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị onwe ha juru afọ, agbadawo n’ala nọrọ dị ka ikè mmanya nke dị n’ite mmanya. Ha achọghị ịbụ ndị e ji nkwupụta ọ bụla metụtara aka Chineke ga-etinye n’ihe omume mmadụ nye nsogbu, ma ha agaghị agbanahụ mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi ha. Ndị na-ekpe okpukpe ụgha taa, gụnyere ndị òtù nke Krisendọm na ndị siworo n’ofufe Jehova dapụ agaghị agbanahụkwa ya. Ebe ha na-agọpụ na ugbu a abụghị “mgbe ikpeazụ,” ha na-ekwu n’ime obi ha, “Jehova agaghị eme ezi ihe, Ọ gaghị emekwa ihe ọjọọ.” Lee ka ha si hie ụzọ!—2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4, 10.

16. Gịnị ga-eme mgbe a ga-emezu ikpe Chineke n’ahụ Juda, oleekwa otú ịmara nke ahụ kwesịrị isi metụta anyị?

16 A dọrọ ndị Juda si n’ezi ofufe dapụ aka ná ntị na ndị Babilọn ga-akwakọrọ akụ̀ na ụba ha, bibie ụlọ ha, ma were mkpụrụ nke ubi vine ha. Ihe onwunwe agaghị aba uru mgbe a ga-emezu ikpe Chineke n’ahụ Juda. Ọ ga-adịkwa otú ahụ mgbe ụbọchị ikpe Jehova ga-abịakwasị usoro ihe dị ugbu a. Ya mere, ka anyị na-ele ihe anya n’ụzọ ime mmụọ ma ‘kpadoo akụ̀ n’eluigwe’ site n’ibute ozi Jehova ụzọ ná ndụ anyị!—Matiu 6:19-21, 33.

“Oké Ụbọchị Jehova Dị Nso”

17. Dị ka Zefanaịa 1:14-16 si kwuo, ruo ókè hà aṅaa ka ụbọchị ikpe Jehova dị nso?

17 Ruo ókè hà aṅaa ka ụbọchị ikpe Jehova dị nso? Dị ka Zefanaịa 1:14-16 si kwuo, Chineke na-enye mmesi obi ike a: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu: gee ntị olu ụbọchị Jehova; dike na-eti mkpu dị ilu n’ebe ahụ. Ụbọchị nrubiga ókè nke iwe ka ụbọchị ahụ bụ, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị, ụbọchị opi ike na iti mkpu agha, imegide obodo nile e wusiri ike, na imegide ụlọ nkuku nile dị elu.”

18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwubi na ụbọchị ikpe Jehova ka dị anya?

18 A dọrọ ndị nchụàjà, ndị isi, na ndị Juda na-enupụ isi aka ná ntị na “oké ụbọchị Jehova dị nso.” Nye Juda, ‘ụbọchị Jehova gaje ime ngwa nke ukwuu.’ N’otu aka ahụ n’oge anyị, ka onye ọ bụla ghara iche na Jehova imezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ndị ajọ omume ga-ewere ọnọdụ n’oge dị anya n’ọdịnihu. Kama nke ahụ, dị ka Chineke mere ihe ngwa ngwa na Juda, otú ahụ ka ọ ga-eme ka ụbọchị ọ ga-emezu ihe o kpere n’ikpe ‘mee ngwa.’ (Mkpughe 16:14, 16) Lee oge oké ihe mgbu nke ahụ ga-abụrụ ndị nile na-eleghara ịdọ aka ná ntị Jehova nke Ndịàmà ya na-enye anya nakwa ndị jụrụ ife ezi ofufe!

19, 20. (a) Olee akụkụ ụfọdụ ndị mejupụtara ngosipụta iwe Chineke n’ahụ Juda na Jerusalem? (b) N’ihi mbibi na-agaghị agụnye mmadụ nile nke na-eche usoro ihe a ihu, olee ajụjụ ndị a na-ajụ?

19 Ngosipụta iwe Chineke nke o gosipụtara n’ahụ Juda na Jerusalem bụ “ụbọchị ahụhụ na mkpagbu.” Ndị Babilọn na-eme mwakpo mere ka ndị bi na Juda taa ọtụtụ ahụhụ, gụnyere oké nchegbu ka ha na-eche ọnwụ na mbibi ihu. “Ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu” ahụ bụ ụbọchị ọchịchịrị, igwe ojii, na oké ọchịchịrị, ikekwe ọ bụghị nanị n’ụzọ ihe atụ kamakwa n’ụzọ nkịtị, n’ihi na anwụrụ ọkụ na ozu ndị mmadụ jupụtara ebe nile. Ọ bụ “ụbọchị opi ike na iti mkpu agha,” ma ịdọ aka ná ntị nile ahụ bụ n’efu.

20 Ndị nche nke Jerusalem apụghị ime ihe ọ bụla ka ndị Babilọn ji osisi ha ji akụtu ihe kụtuo “ụlọ nkuku nile dị elu.” Ihe nchebe dị iche iche nke ajọ usoro ihe dị ugbu a agaghị abakwa uru megide ngwá agha dị n’ebe nkwakọba ihe agha nke Chineke nke dị n’eluigwe, bụ́ ndị ọ kwadebeworo maka ya iji ha mee ihe ná mbibi nke na-agaghị agụnye mmadụ nile. Ì nwere olileanya ịbụ onye a na-agaghị ebibi? Ị̀ kwụrụsiwo ike n’akụkụ Jehova, bụ́ ‘onye na-edebe ndị nile na-ahụ Ya n’anya; ma ndị nile na-emebi iwu ka Ọ ga-ekpochapụ’?—Abụ Ọma 145:20.

21, 22. Olee otú a ga-esi emezu Zefanaịa 1:17, 18 n’oge anyị?

21 Lee ụbọchị ikpe nke na-emenye ụjọ nke e buru amụma ya na Zefanaịa 1:17, 18! “M ga-emekwa ka mkpa kpaa mmadụ,” ka Jehova Chineke na-ekwu, “ha ewee jegharịa dị ka ndị ìsì, n’ihi na ọ bụ Jehova ka ha mehieworo megide: a ga-awụsịkwa ọbara ha dị ka ájá, wụsịakwa anụ ahụ ha dị ka nsị́. Ọlaọcha ha ma ọ bụ ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha anapụta n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova; ma a ga-eji ọkụ nke ekworo Ya ripịa ala ha nile: n’ihi na ngwụsị, nke bụ́ nanị obi ọlụlọ mmiri, ka Ọ ga-eme ka ndị nile bi n’ala nke a gwụsịa.”

22 Dị ka Jehova mere n’oge Zefanaịa, ọ ga-ewetara “ndị nile bi n’ala,” ndị jụrụ ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ya, ahụhụ. Ebe ọ bụ na ha na-emehie megide Chineke, ha ga-ejegharị dị ka ndị ìsì na-enweghị onye enyemaka, n’enweghị ike inweta mgbapụta. N’ụbọchị ikpe Jehova, “a ga-awụsịkwa ọbara ha dị ka ájá,” dị ka ihe na-abaghị uru. Ọgwụgwụ ha ga-abụ ọgwụgwụ na-eme ihere n’ezie, n’ihi na Chineke ga-atụsasị ozu—ọbụna eriri afọ—nke ndị a na-emebi iwu n’elu ala, “dị ka nsị́.”

23. Ọ bụ ezie na ndị na-emebi iwu agaghị alanarị ‘ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova,’ olileanya dị aṅaa ka amụma Zefanaịa na-esetịpụ?

23 Ọ dịghị onye pụrụ ịzọpụta ndị na-alụso Chineke na ndị ya ọgụ. Ma ọlaọcha ma ọlaedo apụghị ịgbapụta ndị Juda na-emebi iwu, ọbụna dị ka akụ̀ na ụba na ihe iri ngo ndị a kwakọbara na-agaghị eweta nchebe ma ọ bụ ụzọ mgbapụ “n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova” megide Krisendọm na ihe fọdụrụ n’usoro ihe a. N’ụbọchị mkpebi ikpe ahụ, ọkụ nke ekworo Chineke ‘ga-eripịa ala nile’ ka ọ na-egbuchapụ ndị ajọ omume. Ebe ọ bụ na anyị nwere okwukwe n’okwu amụma Chineke, anyị kwenyesiri ike na anyị abamiela ugbu a na “mgbe ọgwụgwụ.” (Daniel 12:4) Ụbọchị ikpe Jehova dị nso, ọ ga-abọkwa ọ́bọ̀ n’oge na-adịghị anya n’ahụ ndị iro ya. Ma, amụma Zefanaịa na-esetịpụ olileanya nke mgbapụta. Ya mere, gịnị ka a chọrọ anyị n’aka ma ọ bụrụ na a ga-echebe anyị n’ụbọchị iwe Jehova?

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú amụma Zefanaịa si mezuo n’ahụ Juda na Jerusalem?

• Gịnị na-echere Krisendọm na ndị ajọ omume nile nke oge anyị?

• Gịnị mere anyị ekwesịghị iche na ụbọchị ikpe Jehova ga-abịa n’ọdịnihu dị anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Zefanaịa ji anyaike kwupụta na ụbọchị ikpe Jehova dị nso

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site na Self-Pronouncing Edition of the Holy Bible, nke nwere nsụgharị King James na Revised

[Foto dị na peeji nke 15]

Ụbọchị Jehova bịakwasịrị Juda na Jerusalem site n’aka ndị Babilọn na 607 T.O.A.

[Foto dị na peeji nke 16]

Ị̀ na-atụ anya ịbụ onye a na-agaghị ebibi mgbe Jehova ga-ebibi ndị ajọ omume?