Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị kwesịrị ịbụ echiche ezi ndị Kraịst banyere ihe ahụ ndị mmadụ na-emekarị bụ́ inye ndị ọzọ usoro ihe omume kọmputa ndị a na-ere ere ndị ha mepụtaghachiri?
Ụfọdụ ndị, n’ihie ụzọ, pụrụ ịgbalị ikwu na omume a ziri ezi site n’izo aka n’okwu Jisọs: “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu.” Otú ọ dị, Jisọs adịghị ezo aka n’inye ndị mmadụ mbipụta ma ọ bụ usoro ihe omume kọmputa ndị e mepụtaghachiri emepụtaghachi, bụ́ nke ikike mmepụtaghachi ha dị n’aka ndị mere ha, bụkwa ndị iwu na-achịkwa otú a ga-esi jiri ha mee ihe. Ihe ọ na-ekwu bụ inye ihe dị ka akụkụ nke ozi ahụ. Jisọs gwara ndị ozi ya na-aga n’obodo ukwu na obodo nta dị iche iche na ha gaje ikwusa Alaeze ahụ, gwọọ ndị ọrịa, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ. Kama ikwu ka e nye ha ego maka nke a, ndị ozi ahụ gaje ‘inye n’efu.’—Matiu 10:7, 8.
N’ihi ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke kọmputa onwe onye na nke achụmnta ego, usoro ihe omume kọmputa adịwo ọtụtụ ndị mkpa. Dị ka ọ na-adịkarị, a ghaghị ịzụta nke a azụta. N’ezie, ụfọdụ ndị na-ede usoro ihe omume kọmputa ndị ha na-ewepụta n’anaghị ego, bụ́kwa ndị ha na-ekwu na a pụrụ imepụtaghachi ha ma nyekwa ha ndị ọzọ. Ma a na-ere ihe ka ọtụtụ n’usoro ihe omume kọmputa ere. Ma ọ̀ bụ nke ha ga-eji na-eme ihe n’ebe obibi ma ọ bụ maka achụmnta ego, a na-atụ anya ka ndị ga-eji usoro ihe omume kọmputa eme ihe zụrụ ya azụrụ, kwụọ ụgwọ ya. Ọ bụrụ na mmadụ ewere ma ọ bụ mepụtaghachi usoro ihe omume kọmputa
n’akwụghị ụgwọ, nke ahụ ga-abụ ihe iwu megidere, dịkwa ka iji ígwè photocopier mepụtaghachi otu akwụkwọ dum, ọbụna mgbe a ga-enye ya mmadụ n’efu.A na-anata akwụkwọ ikike maka ihe ka ọtụtụ n’usoro ihe omume kọmputa (gụnyere egwuregwu), a na-achọkwa ka onye nwe ha ma ọ bụ onye ji ha eme ihe mee ihe kwekọrọ n’otú a kpọrọ aha isi jiri ha mee ihe na otú a na-agaghị esi jiri ha mee ihe. Ọtụtụ akwụkwọ ikike dị otú ahụ na-ekwupụta na nanị otu onye pụrụ inweta ma jiri usoro ihe omume ahụ mee ihe—nke na-abụkarị itinye ya nanị n’otu kọmputa, ma ọ̀ bụ kọmputa dị n’ebe obibi ma ọ bụ nke dị n’ụlọ ahịa ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. Ụfọdụ akwụkwọ ikike na-ekwu na onye ji ya eme ihe pụrụ inwe otu ọzọ o chekwaara onwe ya, ma ọ gaghị emepụtaghachi ya maka ndị ọzọ. Ọ bụrụ na onye nwe ya chọrọ inye mmadụ usoro ihe omume ahụ dum (gụnyere akwụkwọ ikike na ihe odide ntụziaka ya), ọ pụrụ ime otú ahụ. Otú ọ dị, ọ ga-esi otú ahụ mee ka ikike ya onwe ya nwere iji ya eme ihe jedebe. Akwụkwọ ikike na-adịgasị iche, n’ihi ya onye na-azụrụ usoro ihe omume ma ọ bụ onye a na-enye ya kwesịrị ịchọpụta ihe akwụkwọ ikike ahụ kapịrị ọnụ.
Ọtụtụ mba na-ejikọ aka ná nkwekọrịta maka ikike mmepụtaghachi nke na-echebe “ihe e ji ọgụgụ isi mepụta,” dị ka usoro ihe omume kọmputa, ha na-agbalịkwa ịhụ na e debere iwu na-achịkwa ikike mmepụtaghachi. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times nke January 14, 2000, kọrọ na “ndị ọrụ uwe ojii Germany na Denmark nwụchiri ndị so n’òtù ha kọwara dị ka òtù a ma ama ná ndị na-ezuru usoro ihe omume kọmputa n’ohi” bụ́ nke na-emepụtaghachi ma na-ekesa usoro ihe omume na egwuregwu kọmputa, ọbụna si n’Internet na-ere ụfọdụ.
Olee ebe ọgbakọ ndị Kraịst guzo na nke a? Mak 12:17) Nke ahụ na-eme ka ọ dị ndị Kraịst mkpa irube isi n’iwu obodo bụ́ ndị na-emegideghị iwu Chineke. N’ihe metụtara gọọmenti, Pọl onyeozi dere, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya . . . Onye na-edo onwe ya megide onye ahụ na-achị isi, ọ na-eguzogide iwu Chineke nyere: ma ndị na-eguzogide ga-anata ikpe nye onwe ha.”—Ndị Rom 13:1, 2.
Jisọs kwuru, sị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Ọ bụghị ọrụ ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst inyocha kọmputa nke ndị ọzọ, dị ka a ga-asị na e nyere ha ike ịkọwa na ịhụ na e debere iwu na-achị ikike mmepụtaghachi ihe. Ma ha kwenyere ma na-akụzi na ndị Kraịst kwesịrị izere iwere ihe na-abụghị nke ha, na ha kwesịkwara ịgbalịsi ike ịdị na-erube isi n’iwu. Nke a na-echebe ndị Kraịst pụọ n’ịbụ ndị a na-ata ahụhụ dị ka ndị na-ada iwu, ọ na-emekwa ka ha nwee ezi akọ na uche n’ihu Chineke. Pọl dere, sị: “N’ihi ya ọ dị mkpa ido onwe unu n’okpuru ya, ọ bụghị nanị n’ihi iwe ahụ, kama ọ bụkwa n’ihi akọ na uche.” (Ndị Rom 13:5) N’otu aka ahụ, Pọl kwupụtara ọchịchọ ezi ndị Kraịst n’okwu ndị a: “E mere ka anyị kwenye na anyị nwere akọ na uche ọma, ebe anyị na-achọ ibi obi nke ọma n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18.
[Igbe dị na peeji nke 29]
Ụfọdụ ụlọ ọrụ achụmnta ego na ụlọ akwụkwọ na-agbata akwụkwọ ikike ndị a na-adị ọtụtụ enwe bụ́ ndị na-egosipụta mmadụ ole e nyere ohere iji usoro ihe omume ahụ mee ihe. Na 1995, ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova tụlere otu isiokwu e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị (mbipụta nke United States) bụ́ nke ndụmọdụ a dị na ya:
“Ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ọrụ ndị na-akwadebe ma na-ere usoro ihe omume kọmputa na-ejichi ikike imepụtaghachi ha, ha na-enyekwa akwụkwọ ikike na-egosi otú a pụrụ isi jiri usoro ihe omume ahụ na-eme ihe n’ụzọ iwu kwadoro. Akwụkwọ ikike ahụ na-ekwukarị na onye nwe ya apụghị inye ndị ọzọ usoro ihe omume ahụ e mepụtaghachiri emepụtaghachi; n’ezie, iwu mba nile maka ikike mmepụtaghachi ihe na-eme ka ime otú ahụ bụrụ ihe iwu megidere. . . . Ụfọdụ nnukwu ụlọ ọrụ na-ere kọmputa ndị bu usoro ihe omume ndị a nataworo ikike maka ha. Otú ọ dị, ụfọdụ ụlọ ahịa na-ere kọmputa adịghị enye akwụkwọ ikike n’ihi na usoro ihe omume ndị kọmputa ha bu bụ ndị e mepụtaghachiri n’ụzọ iwu megidere, nke pụtara na onye zụrụ ha na-ada iwu ma o jiri usoro ihe omume ndị ahụ mee ihe. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst kwesịrị izere itinye, ma ọ bụ iwepụta, ihe ọ bụla a na-enyeghị ikike ka e mepụtaghachi ya (dị ka e si eme mbipụta Society) na bọọdụ nzipụ ozi kọmputa bụ́kwa nke a na-emepụtaghachi n’anataghị ikike iwu kwadoro site n’aka ndị nwe ya.”