Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ—Gịnị Mere Ha Ji Kwesị Ịmasị Gị?

Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ—Gịnị Mere Ha Ji Kwesị Ịmasị Gị?

Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ—Gịnị Mere Ha Ji Kwesị Ịmasị Gị?

Tupu a chọpụta Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, ihe odide ndị kasị ochie nke Akwụkwọ Nsọ Hibru malitere ịdị n’ihe dị ka narị afọ nke itoolu na nke iri O.A. À pụrụ ịdabere n’ihe odide ndị a n’ezie dị ka Okwu Chineke e depụtaghachiri n’ụzọ a pụrụ ịtụkwasị obi, ebe ọ bụ na e dechara Akwụkwọ Nsọ Hibru ihe karịrị nnọọ otu puku afọ tupu mgbe ahụ? Prọfesọ Julio Trebolle Barrera, bụ́ onye so n’ìgwè si mba dị iche iche bụ́ ndị editọ nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, na-ekwu, sị: “Isaiah Scroll (Akwụkwọ Mpịakọta Aịsaịa) [nke e si Qumran nweta] na-enye ihe akaebe a na-apụghị ịgbagha agbagha na ndepụtaghachi ndị odeakwụkwọ ndị Juu depụtaghachiri akụkụ ihe odide Bible n’ime oge karịrị otu puku afọ abụrụwo nnọọ nke a pụrụ ịtụkwasị obi na nke e ji nlezianya mee.”

AKWỤKWỌ mpịakọta Barrera na-ezo aka na ya nwere akụkụ nile nke akwụkwọ Aịsaịa. Ka ọ dị ugbu a, n’ime ihe karịrị ihe odide Bible 200 a chọtara na Qumran, a hụwo akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ nile nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ma e wezụga akwụkwọ Esta. N’adịghị ka Akwụkwọ Mpịakọta Aịsaịa, ihe ka ọtụtụ dị nanị n’iberibe, na-enwe ihe na-erughị otu ụzọ n’ụzọ iri nke akwụkwọ ọ bụla ọ bụ. Akwụkwọ Bible ndị a kasị mara amara na Qumran bụ Abụ Ọma (mkpụrụ 36), Deuterọnọmi (mkpụrụ 29), na Aịsaịa (mkpụrụ 21). Ndị a bụkwa akwụkwọ ndị a kasị ehota n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Ọ bụ ezie na akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ na-egosi na a gbanwebeghị Bible n’ụzọ bụ́ isi, ha na-ekpughekwa na, ruo n’ókè ụfọdụ, e nwere nsụgharị dị iche iche nke akụkụ ihe odide Bible Hibru ndị Juu ji mee ihe n’oge Ụlọ Nsọ nke Abụọ ahụ, nke ọ bụla nwere ọdịiche nke ya. Ọ bụghị akwụkwọ mpịakọta nile ahụ yiri akụkụ ihe odide Masora ná nsụpe ma ọ bụ ná nhazi okwu. Ụfọdụ yiri Septuagint Grik karị. N’oge mbụ, ụfọdụ ndị ọkà mmụta chere na ọdịiche ndị e nwere na Septuagint pụrụ ịbụ n’ihi ihe ndị nsụgharị dehiere ma ọ bụ ọbụna ihe ha ma ụma gbakwụnye. Ugbu a akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ na-ekpughe na ọtụtụ n’ime ọdịiche ndị a bụ n’ezie n’ihi ọdịiche ndị e nwere n’ihe odide Hibru. Nke a pụrụ ịkọwa ihe mere ndị Kraịst oge mbụ ji hota akụkụ ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ Hibru mgbe ụfọdụ na-eji okwu dị iche ná ndị dị n’akụkụ ihe odide Masora eme ihe.—Ọpụpụ 1:5; Ọrụ 7:14.

N’ihi ya, nchọpụta a bara uru e mere n’akwụkwọ mpịakọta Bible na n’iberibe ha na-enye ihe ndabere magburu onwe ya maka ịmụ akụkụ ihe odide Bible Hibru ndị e depụtaghachiri edepụtaghachi. Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ emesiwo ike uru Septuagint na Pentateuch nke Sameria bara n’iji akụkụ ihe odide ndị dị na ha eme ntụnyere. Ha na-eme ka ndị nsụgharị Bible nwekwuo ebe ndị ha ga-agbakwasị ụkwụ tụlee ebe ndị ha pụrụ imeziwanye ihe n’akụkụ ihe odide Masora. N’ọtụtụ ọnọdụ, ha na-akwado mkpebi Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ mere iweghachi aha Jehova n’ebe ndị e wepụworo ha n’akụkụ ihe odide Masora.

Akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ na-akọwa ụkpụrụ na nkwenkwe nke ịrọ òtù Qumran mere nnọọ ka o doo anya na ọ bụghị nanị otu ụdị nke Okpukpe Ndị Juu ka e nwere n’oge Jisọs. Ịrọ òtù Qumran nwere ọdịnala ndị dị iche na nke ndị Farisii na ndị Sadusii. O yiri ka ọ bụ ọdịiche ndị a mere ka ịrọ òtù ahụ gbaga n’ọzara. Ha ji ihie ụzọ chee na ha na-emezu Aịsaịa 40:3 banyere olu nọ n’ọzara na-eme ka ụzọ Jehova guzozie. Ọtụtụ iberibe akwụkwọ mpịakọta na-ezo aka n’ebe Mesaịa nọ, bụ́ onye ndị dere ha hụrụ ọbịbịa ya dị ka nke dị nso. Nke a na-akpali mmasị karịsịa n’ihi okwu Luk bụ́ na “ndị Juu nọ na-ele anya” ọbịbịa Mesaịa.—Luk 3:15.

Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ na-enyetụrụ anyị aka ịghọta ụdị ndụ ndị Juu biri n’oge Jisọs mere nkwusa. Ha na-enye ihe ọmụma ndị a pụrụ iji mee ntụnyere maka ihe ọmụmụ Hibru oge ochie na nke akụkụ ihe odide Bible. Ma, ọ ka dị mkpa inyochatụkwu akụkụ ihe odide nke ọtụtụ n’ime Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ya mere, a ka pụrụ inweta nghọta ọhụrụ. Ee, nchọpụta kasịnụ ndị ọkà mmụta ihe mgbe ochie meworo na narị afọ nke 20 nọgidere na-akpali mmasị nke ma ndị ọkà mmụta ma ndị mmụta Bible ka anyị na-aga n’ihu na narị afọ nke 21.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 7]

Ihe ndị e gwupụtara na Qumran: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.; ihe odide: Site n’aka Shrine of the Book, Ebe Ndebe Ihe Ochie Israel, Jerusalem