Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya

Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya

Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya

“Chọọnụ Jehova, . . . chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—ZEFANAỊA 2:3.

1. Ọnọdụ ime mmụọ dị aṅaa ka Juda nọ na ya mgbe Zefanaịa malitere ọrụ ibu amụma ya?

ZEFANAỊA malitere ọrụ ibu amụma ya n’oge dị oké egwu n’akụkọ ihe mere eme nke Juda. Ọnọdụ ime mmụọ nke mba ahụ dị nnọọ ala. Kama ịtụkwasị Jehova obi, ndị ahụ nọ na-elegara ndị nchụàjà na-ekpere arụsị na ndị na-agụ kpakpando anya maka nduzi. Ofufe Beal, tinyere ememe ihe ubi ya, jupụtara n’ala ahụ. Ndị ọchịchị—ndị isi, ndị a maara aha ha, na ndị ikpe—nọ na-emegbu ndị a tụrụ anya kpọmkwem ka ha chebe. (Zefanaịa 1:9; 3:3) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji kpebie ‘isetị aka ya’ megide Juda na Jerusalem iji bibie ha!—Zefanaịa 1:4.

2. Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na Juda?

2 Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú ọnọdụ ahụ dịruru ná njọ, e nwetụrụ olileanya. Ọ bụ Josaịa, bụ́ nwa Amọn, bụ eze ugbu a. N’agbanyeghị na Josaịa bụ nanị obere nwa, ọ hụrụ Jehova n’anya n’ezie. Ọ bụrụ na eze ọhụrụ ahụ eweghachi ofufe dị ọcha na Juda, lee ihe agbamume ọ ga-abụrụ mmadụ ole na ole ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke! A pụrụ ịkpali ndị ọzọ isonyere ha ma bụrụ ndị e chebere n’ụbọchị iwe Jehova.

Ihe Ndị A Chọrọ Iji Bụrụ Ndị E Chebere

3, 4. Olee ihe atọ a chọrọ bụ́ ndị mmadụ na-aghaghị ime iji bụrụ onye a ga-echebe “n’ụbọchị iwe Jehova”?

3 À pụrụ ichebe ụfọdụ ndị n’ezie n’ụbọchị iwe Jehova? Ee, ma ọ bụrụhaala na ha emezuo ihe atọ ahụ e kwupụtara na Zefanaịa 2:2, 3. Mgbe anyị na-agụ amaokwu ndị a, ka anyị rịba ihe ndị a a chọrọ ama karịsịa. Zefanaịa dere, sị: “Tupu ụkpụrụ amụpụta nwa, (ụbọchị agabigawo dị ka igbogbo ọka), mgbe ọnụma nke iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu, mgbe ụbọchị iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”

4 Ya mere, iji bụrụ onye e chebere, mmadụ aghaghị (1) ịchọ Jehova, (2) ịchọ ezi omume, na (3) ịchọ umeala n’obi. Ihe ndị a a chọrọ kwesịrị ịkpali nnọọ mmasị anyị taa. N’ihi gịnị? N’ihi na dị nnọọ ka ụbọchị ime mpịazi chere Juda na Jerusalem ihu na narị afọ nke asaa T.O.A., mba dị iche iche nke Krisendọm—n’ezie, ndị ajọ omume nile—na-aga izute Jehova Chineke ihu na ihu ná “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ iji mara onye ka ike. (Matiu 24:21) Onye ọ bụla nke chọrọ ka e chebe ya n’oge ahụ aghaghị ime ihe doro anya ugbu a. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịchọ Jehova, ịchọ ezi omume, na ịchọ umeala n’obi tupu oge agafee!

5. Gịnị ka ‘ịchọ Jehova’ taa gụnyere?

5 Ị pụrụ ikwu, sị: ‘Abụ m ohu Chineke raara onwe ya nye, nke e mere baptism, otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ̀ bụ na mụ emezubeghị ihe ndị ahụ a chọrọ?’ N’ezie, a chọrọ ihe karịrị anyị ịrara onwe anyị nye Jehova. Israel bụ mba raara onwe ya nye, ma n’oge Zefanaịa, ndị Juda adịghị ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye ahụ. N’ihi ya, a jụrụ mba ahụ n’ikpeazụ. ‘Ịchọ Jehova’ taa na-agụnye ịzụlite na ịnọgide soro ya na-enwe mmekọrịta onwe onye na-ekpo ọkụ ná nzukọ elu ala ya. Ọ pụtara ịmata otú Chineke si ele ihe anya na ịdị na-eche banyere mmetụta ya. Anyị na-achọ Jehova mgbe anyị ji nlezianya na-amụ Okwu ya, na-atụgharị uche na ya, ma na-etinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ná ndụ anyị. Ka anyị jikwa ikpesi ekpere ike na-achọ nduzi Jehova ma na-agbaso nduzi nke mmụọ nsọ ya, mmekọrịta anyị na ya na-echikwu anya, a na-akpalikwa anyị iji ‘obi, mkpụrụ obi, na ike anyị nile’ na-ejere ya ozi.—Deuterọnọmi 6:5; Ndị Galetia 5:22-25; Ndị Filipaị 4:6, 7; Mkpughe 4:11.

6. Olee otú anyị si ‘achọ ezi omume,’ n’ihi gịnị ka nke a ji ekwe omume ọbụna n’ụwa a?

6 Ihe nke abụọ a chọrọ nke e hotara na Zefanaịa 2:3 bụ ‘ịchọ ezi omume.’ Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị mere mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ anyị ka anyị wee ruo eruo maka baptism ndị Kraịst, ma anyị aghaghị ịnọgide na-akwado ụkpụrụ ezi omume nke Chineke ná ndụ anyị nile. Ụfọdụ, bụ́ ndị malitere nke ọma n’akụkụ a ekwewo ka ụwa metọọ ha. Ọ dịghị mfe ịchọ ezi omume, n’ihi na ndị na-ewere mmekọahụ rụrụ arụ, ịgha ụgha, na mmehie ndị ọzọ dị ka ihe na-adịghị ihe ha mere gbara anyị gburugburu. Ma, ọchịchọ siri ike nke ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ pụrụ imeri ọchịchọ ọ bụla nke ịbụ ndị ụwa nabatara site n’ịgbalị ikwekọ n’ụkpụrụ ya. Juda kwụsịrị inwe ihu ọma Chineke n’ihi iṅomi ndị agbata obi ya na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ihi ya, kama iṅomi ụwa, ka anyị bụrụ ndị “na-eṅomi Chineke,” na-azụlite “mmadụ ọhụrụ [ahụ], nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.”—Ndị Efesọs 4:24; 5:1.

7. Olee otú anyị si ‘achọ umeala n’obi’?

7 Ihe nke atọ e kwuru na Zefanaịa 2:3 bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka e zobe anyị n’ụbọchị iwe Jehova, anyị aghaghị ‘ịchọ umeala n’obi.’ Kwa ụbọchị, anyị na ndị ikom, ndị inyom, na ndị na-eto eto bụ́ ndị na-adịtụghị umeala n’obi na-emekọ ihe. Nye ha, ịdị nwayọọ n’obi bụ ntụpọ. A na-ewere ido onwe onye n’okpuru dị ka nnukwute adịghị ike. Ha na-achọ oké ihe, na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ma bụrụ ndị na-ekwesi olu ike n’echiche nke ha, na-ekwere na a ghaghị ịnakwere ihe ndị ha weere dị ka “ihe ndị ruuru” ha na ihe ndị ha nwere mmasị na ha n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe. Lee ihe mwute ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na anyị amụta ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ! Ugbu a bụ oge ‘ịchọ umeala n’obi.’ N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ido onwe anyị n’okpuru Chineke, jiri obi umeala na-anakwere ịdọ aka ná ntị ya ma na-eme ihe kwekọrọ n’uche ya.

N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ na “Eleghị Anya” A Ga-Ezobe Mmadụ?

8. Gịnị ka a na-egosi site n’ojiji e ji okwu ahụ bụ́ “eleghị anya” mee ihe na Zefanaịa 2:3?

8 Rịba ama na Zefanaịa 2:3 na-ekwu, sị: “Eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” N’ihi gịnị ka e ji jiri okwu bụ́ “eleghị anya” mee ihe mgbe a na-agwa “ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa” okwu? Ndị ahụ dị umeala n’obi emewo ihe ndị pụtara ìhè, ma ohere adịghị maka mmadụ ịtụkwasị obi n’onwe ya. Ha abịarubeghị ná njedebe nke ndụ ha n’ikwesị ntụkwasị obi. O kwere nghọta na ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịdaba ná mmehie. Ọ bụkwa otu ihe ahụ banyere anyị. Jisọs kwuru, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ee, nzọpụta n’ụbọchị iwe Jehova dabeere n’anyị ịnọgide na-eme ihe ziri ezi n’anya ya. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe i kpebisiri ike ime?

9. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ziri ezi ka Eze Josaịa na-eto eto weere?

9 Ihe àmà na-egosi na ná mmeghachi omume nye okwu Zefanaịa, a kpaliri Eze Josaịa ‘ịchọ Jehova.’ Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “N’afọ nke asatọ nke ọ bụ eze, mgbe [Josaịa] onwe ya nọ na nwata [ihe dị ka afọ 16], ọ malitere ịchọ Chineke nke Devid nna ya.” (2 Ihe E Mere 34:3) Josaịa nọgidekwara ‘na-achọ ezi omume,’ n’ihi na anyị na-agụ, sị: “N’afọ nke iri na abụọ [mgbe Josaịa dị ihe dị ka afọ 20] ka ọ malitekwara ime Juda na Jerusalem ka ha dị ọcha pụọ n’ebe dị elu nile, na Asherim, na arụsị nile a pịrị apị, na arụsị nile a wụrụ awụ. Ha wee kwatuo ebe ịchụàjà Bealim n’ihu ya.” (2 Ihe E Mere 34:3, 4) Josaịa ‘chọkwara umeala n’obi,’ o ji obi umeala mee ihe iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ site n’ikpochapụ ikpere arụsị na omume okpukpe ụgha ndị ọzọ n’ala ahụ. Lee ka ndị ọzọ dị nwayọọ n’obi na-aghaghị isiworị ṅụrịa ọṅụ n’ihe omume ndị ahụ!

10. Gịnị mere na Juda na 607 T.O.A., ma ole ndị ka e chebere?

10 Ọtụtụ ndị Juu chigharịkwuuru Jehova n’oge ọchịchị Josaịa. Otú ọ dị, mgbe eze ahụ nwụsịrị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ laghachiri n’ụzọ mbụ ha—n’omume ndị Chineke na-adịghị anabata ma ọlị. Dị ka Jehova kpebiworo, ndị Babilọn meriri Juda, ma bibie isi obodo ya, bụ́ Jerusalem, na 607 T.O.A. Ma, olileanya ka dị. E chebere Jeremaịa onye amụma, onye Etiopia bụ́ Ebed-melek, ụmụ Jonadab, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke n’ụbọchị iwe Jehova ahụ.—Jeremaịa 35:18, 19; 39:11, 12, 15-18.

Ndị Iro Chineke—Maranụ!

11. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ịma aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke taa, ma gịnị ka ndị iro nke ndị Jehova ga-eme nke ọma ịtụle?

11 Ka anyị na-echere ụbọchị iwe Jehova nke ga-abịakwasị ajọ usoro ihe a, anyị ‘na-adaba n’ọnwụnwa dị iche iche.’ (Jemes 1:2) N’ọtụtụ ala ebe ndị a na-ekwu na e ji nnwere onwe ife ofufe kpọrọ ihe, ndị ụkọchukwu bụ́ ndị na-eji aghụghọ enweta ihe ha chọrọ ejiriwo mmetụta ha nwere n’ebe ndị ọchịchị nọ mee ihe iji kpatara ndị Chineke ajọ mkpagbu. Mmadụ ndị na-enweghị ụkpụrụ na-ebo Ndịàmà Jehova ebubo ụgha, na-akpọ ha “òtù nzuzo dị ize ndụ.” Chineke maara ihe ndị ha na-eme—ọ gaghị elefuru ha anya n’enyeghị ha ntaramahụhụ. Ndị iro ya ga-eme nke ọma ịtụle ihe mere ndị iro oge ochie nke ndị ya dị ka ndị Filistia. Amụma ahụ na-ekwu, sị: “Geza ga-abụ ebe a hapụrụ ahapụ, Ashkelọn ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu: Ashdọd, n’etiti ehihie ka a ga-achụpụ ya, a ga-efopụkwa Ekrọn.” A ga-ebibi Geza, Ashkelọn, Ashdọd, na Ekrọn bụcha obodo nke ndị Filistia.—Zefanaịa 2:4-7.

12. Gịnị mere Filistia, Moab, na Amọn?

12 Amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Anụwo m ịta ụta Moab, na nkwulu nile nke ụmụ Amọn, nke ha jiworo taa ndị m ụta, mee onwe ha ukwuu megide ókèala ha.” (Zefanaịa 2:8) N’eziokwu, Ijipt na Etiopia hụsiri anya n’aka ndị Babilọn wakporo ha. Ma gịnị bụ ihe Chineke kpere n’ikpe megide Moab na Amọn, bụ́ mba ndị sitere n’eriri Lọt, bụ́ nwa nwanne Abraham? Jehova buru n’amụma, sị: “Moab ga-adị ka Sọdọm, ụmụ Amọn ga-adịkwa ka Gọmọra.” N’adịghị ka ndị nne nne ha—ụmụ nwanyị abụọ nke Lọt, bụ́ ndị lanarịrị mbibi nke Sọdọm na Gọmọra—a gaghị echebe Moab na Amọn dị mpako pụọ n’ikpe Chineke. (Zefanaịa 2:9-12; Jenesis 19:16, 23-26, 36-38) Olee ebe mba Filistia na obodo ya dị iche iche dị taa? Gịnịkwa banyere Moab na Amọn ahụ dịbu mpako? Chọọ ha otú ọ bụla i nwere ike, ị pụghị ịhụ ha.

13. Gịnị ka ndị ọkà mmụta ihe ochie chọpụtara na Nineve?

13 N’oge Zefanaịa, Alaeze Ukwu Asiria nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ike ya. N’ịkọwa otu mpaghara nke otu obí eze ọ chọpụtara n’isi obodo Asiria bụ́ Nineve, ọkà mmụta ihe ochie bụ́ Austen Layard dere, sị: “Uko ụlọ ya . . . bụ ndị e kewara ná nkebi ná nkebi ndị nwere akụkụ anọ há nhata, ndị e sere okooko osisi, ma ọ bụ oyiyi anụmanụ na ha. E ji ọdụ́ machite akụkụ ime nke ụfọdụ n’ime ha, ọnụ ọnụ nkebi nke ọ bụla nwekwara ihe ndị mara mma na ihe ndị a kpụrụ akpụ gburugburu ya. Ọ pụrụ ịbụ na e ji ibe ọlaedo na ọlaọcha ndị dị mpempe, ma ọ bụ ọbụna ndị dị mkputamkpu karị machite ohiere ha, tinyere akụkụ ahụ nke ime ụlọ ha; e jikwa osisi ndị a na-adịghị ahụkebe, nke osisi cedar buru nnọọ ibu na ya, rụọ ihe ndị e ji osisi rụọ.” Otú ọ dị, dị ka e kwuru n’amụma Zefanaịa, a ga-ebibi Asiria, isi obodo ya kwa, bụ́ Nineve, ga-aghọ “ebe tọgbọrọ n’efu.”—Zefanaịa 2:13.

14. Olee otú e si mezuo amụma Zefanaịa n’ahụ Nineve?

14 Nanị afọ 15 mgbe Zefanaịa busịrị amụma ahụ, e bibiri Nineve ahụ dị ike, e mere ka obí eze ya ghọọ mkpọmkpọ ebe. Ee, e mere ka obodo ahụ dị mpako ghọọ uzuzu. E ji okwu ndị a kọwaa n’ụzọ doro anya otú mbibi ahụ haruru: “Ma okwolo ma ebinta ga-anọ ọnọdụ abalị n’isi ogidi ya nile: gee ntị olu ha na-abụ abụ n’ime windo; ime mkpọmkpọ ga-adị ná mbata ụzọ.” (Zefanaịa 2:14, 15) Ụlọ ndị mara oké mma nke Nineve ga-adị mma nanị maka ebinta na okwolo ibi n’ime ha. A gaghị na-anụkwa mkpọtụ azụmahịa, mkpu nke ndị dike, ukwe ndị nchụàjà n’okporo ámá obodo ahụ. Nanị ihe a ga na-anụ n’ụzọ ndị ahụ na-ekwobu ekwo bụ olu si na windo na-abụ abụ na-emenye ụjọ, ma eleghị anya abụ nnụnụ ma ọ bụ mkpọtụ nke ifufe. N’otu aka ahụ, ka ndị iro nile nke Chineke bịa ná njedebe ha!

15. Gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’ihe mere Filistia, Moab, Amọn, na Asiria?

15 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe mere Filistia, Moab, Amọn, na Asiria? Ọ bụ nke a: Dị ka ndị ohu Jehova, ọ dịghị ihe anyị ga-atụ ụjọ ya n’aka ndị iro anyị. Chineke na-ahụ ihe ndị na-emegide ndị ya na-eme. Jehova mere ihe megide ndị iro ya n’oge gara aga, ọ ga-emekwa ka ikpe ya bịakwasị ụwa dum mmadụ bi taa. Ma a ga-enwe ndị ga-alanarị—‘oké ìgwè mmadụ ndị si ná mba nile pụta.’ (Mkpughe 7:9) Ị pụrụ iso n’ime ha—ma ọ bụ nanị ma ị nọgide na-achọ Jehova, na-achọ ezi omume, na-achọkwa umeala n’obi.

Ahụhụ Ga-adịrị Ndị Ji Anyaike Emebi Iwu!

16. Gịnị ka amụma Zefanaịa kwuru banyere ndị isi na ndị ndú okpukpe nke Juda, n’ihi gịnịkwa ka okwu ndị a ji kwesị Krisendọm?

16 Amụma Zefanaịa na-elekwasị Juda na Jerusalem anya ọzọ. Zefanaịa 3:1, 2 na-ekwu, sị: “Ahụhụ dịrị obodo nke na-enupụ isi, nke rụwokwara arụ, obodo ahụ nke na-eme ihe ike! O geghị ntị olu Chineke; ọ naraghị ịdọ aka ná ntị; Jehova ka ọ na-atụkwasịghị obi; Chineke ya ka ọ na-abịakwuteghị nso.” Lee ọdachi ọ bụ na a ṅaghị ntị ná mgbalị ndị Jehova mere ịdọ ndị ya aka ná ntị! N’ezie, obi ịta mmiri nke ndị isi, ndị a ma ama, na ndị ikpe ya jọgburu onwe ya. Zefanaịa katọrọ omume enweghị ihere nke ndị ndú okpukpe, na-asị: “Ndị amụma ya bụ ndị obi ha na-adịghị n’otu ebe, ndị nghọgbu: ndị nchụàjà ya emewo ka ihe nsọ ghara ịdị nsọ, ha emewo iwu ihe ike.” (Zefanaịa 3:3, 4) Lee ka okwu ndị ahụ si kwekọọ nnọọ nke ọma n’ọnọdụ nke ndị amụma na ndị ụkọchukwu Krisendọm taa! N’ụzọ mkparị, ha ewepụwo aha Chineke n’ime nsụgharị Bible ha dị iche iche, ha akụziwokwa ozizi ndị na-ezighị ezi banyere Onye ahụ ha na-ekwu na ha na-efe ofufe.

17. Ma ndị mmadụ hà gere ntị ma hà egeghị, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji nọgide na-akpọsa ozi ọma ahụ?

17 Jehova ji nchebara echiche dọọ ndị ya nke oge ochie aka ná ntị banyere ihe ọ na-aga ime. O zipụrụ ndị ohu ya bụ́ ndị amụma—Zefanaịa na Jeremaịa, tinyere ndị ọzọ—ịgba ndị ahụ ume ichegharị. Ee, “Jehova . . . [adịghị] eme ajọ omume; kwa ụtụtụ ka Ọ na-eme ka ikpe Ya pụta ìhè, ọ dịghị mgbe Ọ na-adịghị.” Gịnị bụ mmeghachi omume ha? “Ma onye ajọ omume adịghị ama ihere,” ka Zefanaịa kwuru. (Zefanaịa 3:5) A na-akpọsa ịdọ aka ná ntị yiri nke ahụ n’oge a. Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa nke ozi ọma ahụ, ị na-ekere òkè n’ọrụ ịdọ aka ná ntị a. Nọgide na-akpọsa ozi ọma ahụ n’esepụghị aka! Ma ndị mmadụ hà gere ntị ma hà egeghị, ozi gị nwere ihe ịga nke ọma n’anya Chineke ma ọ bụrụhaala na i ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ya; ọ dịghị gị mkpa ime ihere ka i ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ Chineke.

18. Olee otú a ga-esi emezu Zefanaịa 3:6?

18 Mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe agaghị ejedebe ná mbibi nke Krisendọm. Jehova na-eme ka nkatọ ya sakwuo mbara ịgụnye mba nile: “Ebipụwo m mba dị iche iche, ụlọ nkuku nile ha tọgbọrọ n’efu; emewo m ka èzí nile ha bụrụ mkpọmkpọ ebe, onye ngabiga wee ghara ịdị: e mebisịwo obodo nile ha.” (Zefanaịa 3:6) Okwu ndị a kwesịrị nnọọ ntụkwasị obi nke na Jehova na-ekwu banyere mbibi ahụ dị ka a ga-asị na o werewo ọnọdụ. Gịnị mere obodo Filistia, Moab, na Amọn? Gịnịkwa banyere isi obodo Asiria, bụ́ Nineve? Mbibi ha bụ taa ihe ịdọ aka ná ntị nye mba nile. E kwesịghị ịkwa Chineke emo.

Nọgide Na-achọ Jehova

19. Olee ajụjụ ndị na-akpali iche echiche anyị nwere ike ịjụ?

19 N’oge Zefanaịa, Chineke wesara ndị ji obi ọjọọ ‘na-ebibi omume nile ha’ iwe. (Zefanaịa 3:7) Otu ihe ahụ ga-eme n’oge anyị. Ị̀ na-ahụ ihe àmà na-egosi na ụbọchị iwe Jehova dị nso? Ị̀ na-anọgide ‘na-achọ Jehova’ site n’ịgụchi Okwu ya anya—kwa ụbọchị? Ị̀ ‘na-achọ ezi omume’ site n’ibi ndụ nke omume dị ọcha bụ́ nke kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke? Ị̀ ‘na-achọkwa umeala n’obi’ site n’igosipụta àgwà ịdị nwayọọ, nke ido onwe onye n’okpuru n’ebe Chineke nọ na n’ebe ndokwa ya maka nzọpụta dị?

20. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu ikpeazụ nke usoro isiokwu a dabeere n’amụma Zefanaịa?

20 Ọ bụrụ na anyị ejiri ikwesị ntụkwasị obi nọgide na-achọ Jehova, ezi omume, na umeala n’obi, anyị pụrụ ịtụ anya inweta ọtụtụ ngọzi kpọmkwem ugbu a—ee, ọbụna na “mgbe ikpeazụ” a na-ele okwukwe ule. (2 Timoti 3:1-5; Ilu 10:22) Ma anyị pụrụ ime nke ọma ịjụ, sị, ‘N’ụzọ dị aṅaa ka e si agọzi anyị dị ka ndị ohu Jehova nke oge a, ngọzi ndị dịkwa aṅaa nke ga-abịa n’ọdịnihu ka amụma Zefanaịa na-esetịpụ n’ihu ndị a ga-echebe n’ụbọchị iwe Jehova nke ji ọsọ na-abịa?’

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú ndị mmadụ si ‘achọ Jehova’?

• Gịnị ka ‘ịchọ ezi omume’ gụnyere?

• Olee otú anyị pụrụ isi ‘chọọ umeala n’obi’?

• N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọgide na-achọ Jehova, ezi omume, na umeala n’obi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ na-achọ Jehova site n’ịmụ Bible na ikpesi ekpere ike?

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

N’ihi na ha nọgidere na-achọ Jehova, oké ìgwè mmadụ ga-alanarị ụbọchị iwe ya