Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ Inwe Obi Ụtọ n’Ezie?

Ị̀ Pụrụ Inwe Obi Ụtọ n’Ezie?

Ị̀ Pụrụ Inwe Obi Ụtọ n’Ezie?

GEORGE ji mmụmụ ọnụ ọchị kelee mmadụ nile. Nye ya, ndụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa e kwesịrị ịnụ ụtọ ya. E ji obi ụtọ na inwe nchekwube mara ya—ọ dị otú ahụ ọbụna karị ka ọ malitere inwe ihe mgbu nke ịka nká. Ruo ụbọchị ọ nwụrụ, a maara George dị ka onye obi ụtọ. Ị̀ na-enwe obi ụtọ dị ka George? Ị̀ na-ele ụbọchị ọhụrụ ọ bụla anya dị ka onyinye e kwesịrị ịnụ ụtọ ya? Ka atụmanya nke ụbọchị ọhụrụ ọ̀ na-akụda gị obi ma ọ bụ ọbụna na-emenye gị ụjọ? Ọ̀ dị ihe na-anapụ gị obi ụtọ?

A kọwawo obi ụtọ dị ka ọnọdụ ọma na-adịgidetụ adịgide. Ihe e ji amata ya bụ mmetụta uche nke na-amalite site n’inwe afọ ojuju ruo n’inwe ọṅụ miri emi ma dị ukwuu nakwa inwe ọchịchọ ebumpụta ụwa ka ọnọdụ ahụ dịgide. Obi ụtọ dị otú ahụ ọ̀ dị adị n’ezie?

Taa, ndị mmadụ na-akwalite echiche bụ́ na ndị mmadụ ga-enwe obi ụtọ nanị ma ọ bụrụ na ha nwere nnọọ akụ̀ na ụba. Ọtụtụ ndị adịghị enwe ohere n’ihi mgbalị siri ike ndị ha na-eme ịba ọgaranya. Site n’ime otú ahụ, ọtụtụ ndị na-achụ mmekọrịta ha na ndị ọzọ na ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ n’àjà. Dị ka ụmụ ahụhụ nọ ná mkpu, ha na-anọgide na-agbagharị, ha enweghịkwa oge buru ibu iji tụgharịa uche ma ọ bụ iji soro ibe ha nọrịa. N’ụzọ kwere nghọta, “ọnụ ọgụgụ ndị a na-achọpụta na ha nwere nkụda mmụọ nọgidere na-arị elu,” ka otu akụkọ dị na Los Angeles Times na-ekwu, “afọ ndị mmadụ na-anọ amalite inwe [nkụda mmụọ] nọgidekwara na-adalata. . . . Ọgwụ ndị na-akwụsị oké nkụda mmụọ sokwa n’ime ọgwụ ndị kasị agara ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ ahịa.” Ọtụtụ nde na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ na-anwa iji mmanya na-aba n’anya abịajụ nsogbu ha. Ụfọdụ ndị na-emefu ego aghara aghara mgbe ha nwere nkụda mmụọ. N’otu nnyocha e mere, “ọ bụ ndị inyom pụtara dị ka ndị o yikarịsịrị ka hà na-etinye isi n’ịzụ ihe aghara aghara dị ka ihe ngwọta,” ka akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ The Guardian na-ekwu. “O ji okpukpu atọ yie ka ha ga-azụ ihe karịa ndị ikom mgbe ha nwere nkụda mmụọ.”

Otú ọ dị, a dịghị achọta ezi obi ụtọ n’ụlọ ahịa, n’ime karama, n’ọgwụ, na ndụdụ, ma ọ bụ n’ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀. A dịghị ere obi ụtọ ere; a na-enweta ya n’efu. Olee ebe anyị pụrụ ịchọta onyinye dị oké ọnụ ahịa otú ahụ? Anyị ga-atụle nke ahụ n’isiokwu na-esonụ.